Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 1/15 p. 17-p. 20 para. 10
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezra

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezra
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E WUGHACHIRI ỤLỌ NSỌ AHỤ
  • (Ezra 1:1–6:22)
  • EZRA ABỊA JERUSELEM
  • (Ezra 7:1–10:44)
  • Jehova Na-emezu Nkwa Ya
  • Ka Obi Sie Gị Ike na Jehova Ga-enyere Gị Aka Mgbe Ihe Siiri Gị Ike
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Ezra Kụziri Iwu Chineke
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Izi Ihe Gị Ọ̀ Dị Irè?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Jehova Chọrọ Ka Anyị Jiri Obi Anyị Niile Na-efe Ya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 1/15 p. 17-p. 20 para. 10

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ezra

AKWỤKWỌ Bible bụ́ Ezra malitere n’ebe Ihe E Mere nke Abụọ kwụsịrị. Ihe Ezra onye nchụàjà bụ́ onye dere ya ji malite bụ akụkọ banyere iwu Eze Saịrọs nke Peshia nyere ka ndị Juu fọdụrụnụ e ji eji na Babilọn laghachi n’ala nna ha. E ji ihe ndị Ezra mere iji mee ka ndị merụrụ onwe ha n’ebe ndị Babilọn nọ dị ọcha mechie akụkọ ahụ. N’ozuzu, akwụkwọ ahụ kọrọ ihe mere n’ime afọ 70—malite na 537 ruo 467 T.O.A.

Ezra nwere ihe doro anya o bu n’obi dee akwụkwọ ahụ: igosi otú Jehova si mezuo nkwa Ya ịtọhapụ ndị ya e ji eji na Babilọn na iweghachi ezi ofufe na Jeruselem. N’ihi ya, Ezra lekwasịrị anya nanị n’ihe ndị metụtara nzube a. Akwụkwọ Ezra bụ akụkọ nke otú e si wughachi ụlọ nsọ ahụ na otú e si weghachi ofufe Jehova n’agbanyeghị mmegide e megidere ndị Chineke na ezughị okè ha. Akụkọ ahụ na-adọrọ mmasị anyị nke ukwuu n’ihi na anyị bikwa n’oge mweghachi nke ezi ofufe. Ọtụtụ ndị na-eruba ‘n’ugwu Jehova’ dị ka osimiri, n’oge na-adịghịkwa anya, ụwa nile gaje ‘ijupụta n’ọmụma ebube Jehova.’—Aịsaịa 2:2, 3; Habakuk 2:14.

E WUGHACHIRI ỤLỌ NSỌ AHỤ

(Ezra 1:1–6:22)

N’irubere iwu Saịrọs nyere ka ndị Juu laa isi, ihe dị ka iri puku ndị Juu ise e ji eji na Babilọn so Zerubabel, ma ọ bụ Sheshbaza Onye Na-achị Achị laghachi Jeruselem. Ndị ahụ lọghachirinụ wuru ebe ịchụàjà ozugbo n’ebe ọ dịbu, ma malite ịchụrụ Jehova àjà.

N’afọ sochirinụ, ndị Izrel tọrọ ntọala ụlọ Jehova. Ndị iro nọgidere na-emegide ọrụ mwughachi ahụ ma mesịa nwee ihe ịga nke ọma n’ime ka eze nye iwu ka a kwụsị ọrụ ahụ. Ndị amụma bụ́ Hagaị na Zekaraịa gbara ndị ahụ ume bụ́ nke mere ka ha maliteghachi iwu ụlọ nsọ ahụ n’agbanyeghị iwu ahụ e nyere ka a kwụsị ọrụ ahụ. Ụjọ imegide iwu a na-apụghị ịgbanwe agbanwe nke ndị Peshia, bụ́ nke Saịrọs nyere na mbụ, mere ka ndị iro ha kwụsị inye ha nsogbu. Nnyocha nke eze nyere iwu ka e mee mere ka a hụ iwu Saịrọs nyere banyere “ụlọ Chineke n’ime Jeruselem.” (Ezra 6:3) Ọrụ ahụ gara nnọọ n’ihu n’enweghị ihe mgbochi ruo mgbe a rụchara ya.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:3-6—Ọ̀ pụtara na okwukwe ndị Izrel na-esoghị laghachi n’ala nna ha esighị ike? Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ alaghachighị Jeruselem n’ihi na ha hụrụ ihe onwunwe n’anya ma ọ bụ n’ihi na ha ejighị ezi ofufe kpọrọ ihe, ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị mmadụ nile na-alaghachighị. Nke mbụ bụ na njem otu puku kilomita na narị isii ahụ e mere iji ruo Jeruselem were ọnwa anọ ma ọ bụ ise. Ọzọkwa, ibi n’ala nke tọgbọrọ n’efu ruo afọ 70 na iwughachi ya ga-achọ ike ọkpụkpụ aka. N’ihi ya, o doro anya na ọnọdụ ọjọọ ndị dị ka ọrịa, nká, na ibu ọrụ ezinụlọ, gbochiri ụfọdụ ịlaghachi.

2:43—Ole ndị bụ ndị Netinim? Ha abụghị ndị Izrel ma ha jere ozi dị ka ndị ohu ụlọ nsọ ma ọ bụ ndị ozi. N’ime ha, e nwere ụmụ ndị Gibiọn nke oge Jọshụa na ndị ọzọ bụ́ “ndị Devid na ndị isi nyere ka ha fee ofufe nke ndị Livaị.”—Ezra 8:20.

2:55—Ole ndị bụ ụmụ ndị ohu Solomọn? Ha abụghị ndị Izrel ma e nyere ha ọrụ pụrụ iche n’ozi Jehova. Ọ pụrụ ịbụ na ha jere ozi dị ka ndị odeakwụkwọ ma ọ bụ ndị ndepụtaghachi n’ụlọ nsọ ma ọ bụ rụọ ọrụ dị ka ndị nlekọta.

2:61-63—Ndị Izrel ahụ si ná ndọrọ n’agha na-alọta hà nwere Ìhè na Izu Okè ahụ e ji mee ihe mgbe a chọrọ azịza n’aka Jehova? Ndị na-azọrọ na ha si n’usoro ọmụmụ ndị nchụàjà bụ́ ndị a na-ahụghị aha ha n’ihe ndekọ usoro ọmụmụ ndị nchụàjà gaara eji Ìhè ahụ na Izu Okè ahụ gosi na ha si n’eriri ndị nchụàjà. Ezra kwuru nke a nanị iji gosi na a sị na ha dị, a gaara iji ha gosi osuso ọmụmụ ndị mmadụ. Akwụkwọ Nsọ ekwughị na e ji Ìhè ahụ na Izu Okè ahụ mee ihe n’oge ahụ ma ọ bụ mgbe ọ gasịrị. Akụkọ ọdịnala ndị Juu kwuru na Ìhè ahụ na Izu Okè ahụ kwụsịrị ịdị mgbe e bibiri ụlọ nsọ ahụ n’afọ 607 T.O.A.

3:12—Gịnị mere “ndị okenye ndị hụrụ ụlọ mbụ” nke Jehova ji kwaa ákwá? Ndị ikom a chetara otú ụlọ nsọ ahụ Solomọn wuru dịruru n’ebube. Ntọala nke ụlọ nsọ ọhụrụ ahụ nke ha na-ahụ bụ “ihe efu n’anya [ha]” ma e jiri ya tụnyere nke mbụ. (Hagaị 2:2, 3) Mgbali ha ọ̀ ga-eweghachi ebube nke ụlọ nsọ mbụ ahụ? Ọ ghaghị ịbụ na o wutere ha, n’ihi ya kwa, ha kwara ákwá.

3:8-10; 4:23, 24; 6:15, 16—Afọ ole ka o were iji wughachi ụlọ nsọ ahụ? A tọrọ ntọala ụlọ nsọ ahụ n’afọ 536 T.O.A.—“n’afọ nke abụọ nke ọbịbịa ha.” A kwụsịrị ihe owuwu ahụ n’oge Eze Ataksaksis, n’afọ 522 T.O.A. Mmachibido iwu ahụ nọgidere ruo n’afọ 520 T.O.A., afọ nke abụọ nke Eze Daraịọs. E wuchara ụlọ nsọ ahụ n’afọ nke isii nke ọchịchị ya, ma ọ bụ n’afọ 515 T.O.A. (Lee igbe ahụ isiokwu ya bụ “Eze ndị Peshia Malite n’Afọ 537 ruo 467 T.O.A.”) N’ihi ya, e ji ihe dị ka afọ 20 wuchaa ụlọ nsọ ahụ.

4:8–6:18—N’ihi gịnị ka e ji dee amaokwu ndị a n’Aramaic? Akụkụ ka ukwuu nke amaokwu ndị a bụ akwụkwọ ozi ndị ọrụ gọọmenti degaara ndị eze na ihe ha zaghachiri. Ezra si n’ihe ndekọ ọha na eze ndị e dere n’asụsụ Aramaic, bụ́ asụsụ e ji eme ihe n’azụmahịa na n’ọrụ gọọmenti n’oge ahụ, dere ha. Akụkụ Bible ndị ọzọ e dere n’asụsụ ụmụ Shem oge ochie a bụ Ezra 7:12-26, Jeremaịa 10:11, na Daniel 2:4b–7:28.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

1:2. Ihe Aịzaịa buru n’amụma ihe dị ka narị afọ abụọ tupu mgbe ahụ mezuru. (Aịsaịa 44:28) Amụma ndị dị n’Okwu Jehova ga-emezurịrị.

1:3-6. Dị ka ndị Izrel ụfọdụ bụ́ ndị nọgidere na Babịlọn, ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova apụghị ije ozi oge nile ma ọ bụ jee ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-akwado ma na-agba ndị pụrụ ije ozi ndị dị otú ahụ ume, na-enyekwa onyinye afọ ofufo iji mee ka ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na nke ime ndị na-eso ụzọ na-aga n’ihu.

3:1-6. N’ọnwa nke asaa n’afọ 537 T.O.A. (Tishri, nke kwekọrọ na September/October), ndị ahụ lọghachirinụ bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi chụrụ àjà mbụ ha. Ndị Babilọn abanyela Jeruselem n’ọnwa nke ise (Ab, nke kwekọrọ na July/August) n’afọ 607 T.O.A., ọnwa abụọ ka nke ahụ gasịkwara e bibichaala obodo ahụ. (2 Ndị Eze 25:8-17, 22–26) Dị ka e buru n’amụma, ntọgbọrọ n’efu nke Jeruselem bụ́ nke ga-adịru afọ 70 kwụsịrị kpọmkwem mgbe oge ahụ zuru. (Jeremaịa 25:11; 29:10) Ihe ọ bụla Okwu Jehova buru n’amụma na-emezurịrị.

4:1-3. Ndị Juu ahụ fọdụrụnụ bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi jụrụ ihe gaara ejikọ ha na ndị na-ekpe okpukpe ụgha. (Ọpụpụ 20:5; 34:12) N’otu aka ahụ, ndị na-efe Jehova taa adịghị ekere òkè ná ngwakọta ofufe ọ bụla.

5:1-7; 6:1-12. Jehova pụrụ ịgbanwe ọnọdụ iji mee ka ihe gaara ndị ya nke ọma.

6:14, 22. Iji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ Jehova na-eweta ihu ọma na ngọzi ya.

6:21. Ịhụ ọganihu nke ọrụ Jehova kpaliri ndị Sameria bi n’ala ndị Juu n’oge ahụ na ndị Juu ahụ lọghachirinụ bụ́ ndị dabarala n’ikpere arụsị ime mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ ha. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ Chineke nyere anyị, nke gụnyere ọrụ nkwusa Alaeze ahụ?

EZRA ABỊA JERUSELEM

(Ezra 7:1–10:44)

Ọ gafewo afọ 50 kemgbe a rarasịịrị ụlọ Jehova ahụ e wughachiri ewughachi nye. Nke ahụ bụ n’afọ 468 T.O.A. Ezra kpọọrọ ndị fọdụrụnụ ná ndị Chineke ma were ego nile e nyere n’onyinye si Babilọn gaa Jeruselem. Gịnị ka ọ hụrụ n’ebe ahụ?

Ndị isi gwara Ezra, sị: “Ndị Izrel, na ndị nchụàjà, na ndị Livaị, ha ekewapụghị onwe ha n’etiti ndị dị iche iche nke ala ọzọ, na-eme dị ka ihe arụ ha si dị.” Ọzọkwa, “aka ndị isi na ndị na-achị ala bu ụzọ ná mmekpu a.” (Ezra 9:1, 2) Akpata oyi wụrụ Ezra n’ahụ́. A gbara ya ume ka ọ ‘dị ike ma mee ihe.’ (Ezra 10:4) Ezra mere ihe iji mezie ihe, ndị ahụ kwadokwara ya.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

7:1, 7, 11—Amaokwu ndị a nile, hà na-ezo aka n’Ataksaksis nke kwụsịrị ọrụ owuwu ihe ahụ? Ee e. Ataksaksis bụ aha ma ọ bụ utu aha e nyere ndị eze Peshia abụọ. Otu bụ Bardiya ma ọ bụ Gaumata, bụ́ onye nyere iwu ka a kwụsị iwu ụlọ nsọ ahụ n’afọ 522 T.O.A. Ataksaksis nke nọ n’oge Ezra bịara Jeruselem bụ Ataksaksis Longimanus.

7:28–8:20—Gịnị mere ọtụtụ ndị Juu nọ na Babilọn ji laa azụ iso Ezra laghachi Jeruselem? N’agbanyeghị na ọ karịala afọ 60 ìgwè ndị Juu mbụ laghachiri n’ala nna ha, ọ ka bụ mmadụ ole na ole bi na Jeruselem. Ịlaghachi Jeruselem pụtara ịmaliteghachi ndụ n’isi n’ọnọdụ ndị siri ike ma dị ize ndụ. Jeruselem nke oge ahụ abụghị ebe ndị Juu, bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ihe na-agara ha nke ọma n’ụzọ ihe onwunwe na Babilọn, ga-anọ kpata nnukwu ego. Ihe a na-agaghị echefu bụ njem ahụ dị ize ndụ ha ga-eme iji laghachi. Ndị ahụ na-alaghachinụ aghaghị inwe okwukwe siri ike na Jehova, ịnụ ọkụ n’obi maka ezi ofufe, na obi ike iji mee njem ahụ. Ọbụna Ezra mere onwe ya ka ọ dị ike n’ihi na aka Jehova dị n’ahụ́ ya. N’ihi agbamume Ezra, otu puku na narị ezinụlọ ise—eleghị anya ndị ọnụ ọgụgụ ha dị puku mmadụ isii—sooro ya lawa. Ka e mesịrị, Ezra mekwara ihe ọzọ, ndị Livaị 38 na narị ndị Netinim abụọ na iri abụọ sonyekwaara ya.

9:1, 2—Olee otú ndị Izrel na ndị ala ahụ ịlụrịta di na nwunye dịruru ná njọ? Mba ahụ e weghachiri eweghachi ga-echebe ofufe Jehova ruo mgbe Mezaịa ga-abịa. Iso ndị ọzọ bi ebe ahụ alụrịta di na nwunye bụ nnọọ ihe ize ndụ nye ezi ofufe. Ọ bụrụ na ụfọdụ esoro ndị na-ekpere arụsị nwee nkekọ nke alụmdi na nwunye, mba ahụ n’ozuzu pụrụ imesị bụrụzie akụkụ nke mba ndị ahụ na-ekpere arụsị. Ofufe dị ọcha gaara apụ n’anya kpamkpam n’ụwa. Mgbe ahụ, oleezi ndị Mezaịa ahụ ga-abịakwute? Ka a sịkwa ihe mere akpata oyi jiri wụọ Ezra n’ahụ́ mgbe ọ hụrụ ihe merenụ!

10:3, 44—Gịnị mere e ji chụlaa ndị inyom ahụ na ụmụ ha? A sị na a hapụrụ ụmụaka ndị ahụ, ọ ga-adị mfe karị ndị inyom ahụ a chụlara achụla ịlọghachi n’ihi ha. Ọzọkwa, ụmụaka na-achọkarị nlekọta nke nne ha.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

7:10. Dị ka onye na-amụchi Okwu Chineke anya na onye na-akụzi ya n’ụzọ dị irè, Ezra setịpụụrụ anyị ihe nlereanya. O ji ekpere dozie obi ya ịchọ Iwu Jehova. Ka Ezra nọ na-agụ ya, ọ ṅara nnọọ ntị n’ihe nile Jehova na-ekwu. Ezra tinyere ihe ndị ọ mụtara n’ọrụ ma tinyesie mgbalị ike izi ndị ọzọ ihe.

7:13. Jehova chọrọ ka ndị ga-ejere ya ozi mee otú ahụ site n’obi ha.

7:27, 28; 8:21-23. Ezra nyere Jehova otuto, rịọ ya arịrịọ sitere n’obi tupu ya ana-eme njem ahụ dị anya na nke dị ize ndụ gaa Jeruselem, ọ dịkwa njikere itinye onwe ya n’ihe ize ndụ iji wetara Chineke otuto. O si otú ahụ setịpụrụ anyị ezi ihe nlereanya.

9:2. Anyị aghaghị iwere ndụmọdụ ahụ e nyere anyị ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị” dị ka ihe dị oké mkpa.—1 Ndị Kọrint 7:39.

9:14, 15. Mkpakọrịta ọjọọ pụrụ iduga n’enwekwaghị ihu ọma Jehova.

10:2-12, 44. Ndị lụrụ ndị inyom mba ọzọ ji obi umeala chegharịa ma gbanwee ụzọ ọjọọ ha. Àgwà ha na ihe ndị ha mere bụụrụ anyị ezi ihe nlereanya.

Jehova Na-emezu Nkwa Ya

Lee nnọọ ka akwụkwọ Ezra si baara anyị uru! Kpọmkwem mgbe oge Jehova kara aka ruru, o mezuru nkwa o kwere ịtọhapụ ndị ya e ji eji na Babilọn na iweghachi ofufe dị ọcha na Jeruselem. Nke ahụ, ọ́ dịghị eme ka okwukwe anyị nwere n’ebe Jehova nọ nakwa ná nkwa ya sie ike?

Cheedị banyere ihe nlereanya ndị dị n’akwụkwọ Ezra. Ezra na ndị ahụ fọdụrụnụ bụ́ ndị lọghachirinụ iji kere òkè n’iweghachi ezi ofufe na Jeruselem bụ ezi ihe nlereanya nye anyị n’ihe banyere iji obi anyị nile eme uche Chineke. Akwụkwọ a kọkwara banyere okwukwe nke ndị mba ọzọ bụ́ ndị tụrụ egwu Chineke na ịdị umeala n’obi nke ndị mere ihe ọjọọ chegharịrị echegharị. N’ezie, okwu Ezra sitere n’ike mmụọ nsọ na-egosi n’ụzọ doro anya na “okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.”—Ndị Hibru 4:12.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

EZE NDỊ PESHIA MALITE N’AFỌ 537 RUO 467 T.O.A.

Saịrọs Onye Ukwu (Ezra 1:1) nwụrụ n’afọ 530 T.O.A.

Cambyses, ma ọ bụ Ahasuerọs (Ezra 4:6) malite n’afọ 530-522

T.O.A.

Ataksaksis—Bardiya (Ezra 4:7) n’afọ 522 T.O.A. (E gburu

ma ọ bụ Gaumata ya mgbe ọ chịsịrị nanị

ọnwa asaa)

Daraịọs nke Mbụ (Ezra 4:24) malite n’afọ 522-486

T.O.A.

Xerxes, ma ọ bụ Ahasuerọsa malite n’afọ 486-475

T.O.A. (Ọ chịrị dị ka

onye so Daraịọs nke Mbụ

bụrụ eze malite n’afọ

496-486 T.O.A.)

Ataksaksis Longimanus (Ezra 7:1) malite n’afọ 475-424

T.O.A.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a E kwughị ihe banyere Xerxes n’akwụkwọ Ezra. A kpọrọ ya Ahasuerọs n’akwụkwọ Bible bụ́ Esta.

[Foto]

Ahasuerọs

[Foto dị na peeji nke 17]

Saịrọs

[Foto dị na peeji nke 17]

Ihe E Ji Ụrọ Kpụọ nke Bú Okwu Saịrọs kwuru banyere iwu o nyere ka ndị e ji eji laghachi n’ala nna ha

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ihe e ji ụrọ kpụọ: Foto e sere n’ihi ikike a natara Ebe Ndebe Ihe Ochie Britain

[Foto dị na peeji nke 20]

Ị̀ maara ihe mere Ezra ji bụrụ onye nkụzi dị irè?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya