Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbv isiokwu 14
  • Ilu 3:5, 6—“Adaberekwala na Nghọta Gị”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ilu 3:5, 6—“Adaberekwala na Nghọta Gị”
  • Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ilu 3:5, 6 Pụtara
  • Ihe Ndị Gbara Ilu 3:5, 6 Gburugburu
  • Tụkwasị Jehova Obi!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Amamihe Chineke nke Na-eduga ná Ndụ
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Ilu 16:3—“Were Ọrụ Gị Niile Nyefee n’Aka Onyenwe Anyị”
    Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • “Jiri Obi Gị Dum Tụkwasị Jehova Obi”
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
ijwbv isiokwu 14

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Ilu 3:5, 6​—“Adaberekwala na Nghọta Gị”

“Jiri obi gị niile tụkwasị Jehova obi, atụkwasịla amamihe gị obi. N’ihe niile ị na-eme, chọpụta ihe bụ́ uche ya, ọ ga-emekwa ka ihe gaziere gị.”​—Ilu 3:5, 6, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

“Tụkwasị Jehova obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị: N’ụzọ gị niile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị niile zie ezi.”​—Ilu 3:5, 6, Baibul Nsọ (Ndezighari Ọhuru).

Ihe Ilu 3:5, 6 Pụtara

Anyị kwesịrị ikwe ka Jehovaa Chineke na-enye anyị ntụziaka kama ịna-eme mkpebi ndị dị mkpa n’onwe anyị.

“Jiri obi gị niile tụkwasị Jehova obi.” Anyị na-egosi na anyị tụkwasịrị Chineke obi ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe otú ọ chọrọ. Anyị kwesịrị ịtụkwasị ya obi kpamkpam, ya bụ, iji obi anyị niile tụkwasị ya obi. N’ọtụtụ ebe na Baịbụl, obi pụtara ihe mmadụ bụ n’ime, ya bụ, otú onye ahụ si eche echiche, otú o si ele ihe anya, ụdị àgwà ọ na-akpa, na ihe mere o ji eme ihe ọ na-eme. N’ihi ya, ọ bụghị naanị otú obi dị anyị ga-egosi ma ànyị ji obi anyị niile tụkwasị Chineke obi. Ọ bụ anyị ga-eji aka anyị kpebie ime otú ahụ maka na obi siri anyị ike na Onye kere anyị ma ihe ga-akacha eme ka ihe dịrị anyị ná mma.​—Ndị Rom 12:1.

“Atụkwasịla amamihe gị obi.” Anyị kwesịrị ịtụkwasị Chineke obi maka na anyị agaghị atụkwasịli echiche anyị na-ezughị okè obi. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị onwe anyị obi ma ọ bụ kwe ka ọ bụrụ naanị otú obi dị anyị na-ekpebi ihe anyị na-eme, anyị nwere ike ime ihe ga-adị anyị mma ná mmalite, ma ya aghọ anyị ahịa n’ikpeazụ. (Ilu 14:12; Jeremaya 17:9) Amamihe Chineke karịrị nke anyị okpukpu okpukpu. (Aịzaya 55:8, 9) Ọ bụrụ na anyị ekwe ka echiche ya na-eduzi anyị, ihe ga-agaziri anyị ná ndụ.​—Abụ Ọma 1:1-3; Ilu 2:6-9; 16:20.

“N’ihe niile ị na-eme, chọpụta ihe bụ́ uche ya.” Anyị kwesịrị ịmata ihe bụ́ echiche Chineke n’ihe ọ bụla gbara ọkpụrụkpụ anyị na-eme ná ndụ nakwa ná mkpebi ọ bụla dị mkpa anyị chọrọ ime. Otú anyị si amata ya bụ ikpe ekpere rịọ ya ka o duzie anyị, ọzọ abụrụ isoro ihe o kwuru n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl.​—Abụ Ọma 25:4; 2 Timoti 3:16, 17.

“Ọ ga-emekwa ka ihe gaziere gị.” Otú Chineke si eme ka ihe gaziere anyị bụ na ọ na-enyere anyị aka ka anyị na-eme ezi omume otú o kwuru. (Ilu 11:5) Ihe a na-eme ka anyị zere nsogbu na-enweghị isi na ọdụ, meekwa ka anyị na-enwekwu obi ụtọ.​—Abụ Ọma 19:7, 8; Aịzaya 48:17, 18.

Ihe Ndị Gbara Ilu 3:5, 6 Gburugburu

Ihe dị iche iche e kwuru n’akwụkwọ Ilu ga-enyere anyị aka ibi ndụ otú Chineke chọrọ, anyị enwee obi ụtọ, ihe agaziekwara anyị. E dere isi nke 1 ruo nke 9 ka ebe nna na-enye nwa ya ọ hụrụ n’anya ndụmọdụ. Isi nke 3 gosiri uru mmadụ ga-erite ma o soro amamihe Onye kere ya ma jiri ya kpọrọ ihe.​—Ilu 3:13-26.

a Jehova bụ aha Chineke.​—Abụ Ọma 83:18.

Gụọ Ilu isi nke 3, ya na ihe ndị a kọwara n’ala ala peeji ya nakwa amaokwu ndị e dere n’etiti peeji ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya