ABỤ NKE 112
Jehova Bụ Chineke nke Udo
Nke E Biri Ebi
1. Jehova Chineke,
Biko, mee k’anyị nwe’udo.
Anyị n’arịọ, nyea-nyị ’mụọn-sọ,
K’anyị mịa mkpụrụ ya.
Jizọs n’eṅomi gị.
Ọ bụ ya k’anyị n’eso.
Anyị na gị dịzi nám-ma.
Jehova, nar’ekele.
2. ’Mụọn-sọ n’eduzia-nyị.
Okwu gị n’edukw’anyị.
Ụwa gbara ọchịchịrị.
M’i ji ha n’echeb’anyị.
Anyị ma n’ị g’eme
K’udo dị n’ebe niile.
Tupu y’emee, anyị n’arịọ,
‘Mee k’anyị dịrị n’udo.’
3. N’ụwa na n’el’igwe,
Ndị gị dịkwa n’otu.
I ji ’mụọ gị n’eduzia-nyị
Ikwusa Al’eze gị.
Anyị ma n’ị g’eme
Kan-sogbu kwụsị n’ụwa.
Ndị niile n’erub’isi
G’enw’udo ru’ebigh’ebi.
(Gụọkwa Ọma 4:8; Fil. 4:6, 7; 1 Tesa. 5:23.)