-
Ha Emezughị Nkwa Ha KwereIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 24
Ha Emezughị Nkwa Ha Kwere
Jehova gwara Mosis, sị: ‘Gbagote n’ugwu ka ị bịakwute m. M ga-ede iwu m ná mbadamba nkume ma nye gị ya.’ Mosis wee gbagoro n’ugwu ahụ ma nọọ ebe ahụ ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị. Mgbe Mosis nọ n’ugwu ahụ, Jehova dere Iwu Iri ahụ ná mbadamba nkume abụọ ma were ha nye ya.
Mgbe obere oge gachara, ndị Izrel chere na Mosis ahapụla ha. Ha gwara Erọn, sị: ‘Anyị chọrọ onye ga na-edu anyị. Meere anyị chi.’ Erọn gwara ha, sị: ‘Nyenụ m ọlaedo unu.’ Ọ gbazere ọlaedo ndị ahụ ma jiri ha kpụọ ihe yiri nwa ehi. Ndị Izrel kwuru, sị: ‘Nwa ehi a bụ Chi anyị, onye dupụtara anyị n’Ijipt.’ Ha malitere ife nwa ehi ọlaedo ahụ. Ha mekwara ememme. Ihe a ha mere, ọ̀ dị njọ? Ee, ọ dị njọ maka na ha ekwela Jehova nkwa na ọ bụ naanị ya ka ha ga na-efe. Ma ugbu a, ha emezughị nkwa ahụ ha kwere.
Jehova hụrụ ihe na-emenụ ma gwa Mosis, sị: ‘Gbadaa, gakwuru ndị gị. Ha na-enupụrụ m isi ma na-efe chi ọzọ.’ Mosis si n’ugwu ahụ gbadaa, o bukwa mbadamba nkume abụọ ahụ.
Ka Mosis na-abịaru nso n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, ọ nụrụ egwú ha na-agụ. Ọ hụziri ha ka ha na-agba egwú ma na-akpọrọ nwa ehi ahụ isiala. Mosis were ezigbo iwe ma tụọ mbadamba nkume ndị ahụ n’ala, ha akụrisịa. Ọ kụriri ihe ahụ yiri nwa ehi ozugbo. Mosis jụziri Erọn, sị: ‘Gịnị ka ndị a gwara gị mere i ji mee ihe ọjọọ a?’ Erọn gwara ya, sị: ‘Ewela iwe. Ị manụ ndị a nke ọma. Ha chọrọ chi ha ga na-efe, ọ bụ ya mere m ji tụba ọlaedo ha n’ọkụ, nwa ehi a apụta.’ Erọn ekwesịghị imere ha chi ahụ. Mosis gaghachiri n’ugwu ahụ ma rịọ Jehova ka ọ gbaghara ndị Izrel.
Jehova gbaghaara ndị ji obi ha chọọ irubere ya isi. Ị̀ hụla ihe mere ndị Izrel kwesịrị iji na-eme ihe Mosis gwara ha?
“Mgbe ọ bụla i kwere Chineke nkwa, egbula oge imezu ya, n’ihi na ihe ndị nzuzu anaghị amasị ya. Mezuo nkwa i kwere.”—Ekliziastis 5:4
-
-
Ụlọikwuu A Ga-anọ Na-efe ChinekeIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 25
Ụlọikwuu A Ga-anọ Na-efe Chineke
Mgbe Mosis nọ n’Ugwu Saịnaị, Jehova gwara ya ka ọ rụọ ụlọikwuu pụrụ iche bụ́ ebe ndị Izrel ga-anọ na-efe ya. Ha ga na-ebu ụlọikwuu a aga ebe ọ bụla ha na-aga.
Jehova gwara Mosis, sị: ‘Gwa ndị Izrel ka ha weta ihe ha ga-ewetali a ga-eji rụọ ụlọikwuu ahụ.’ Ndị Izrel wetara ọlaedo, ọlaọcha, ọla kọpa, nkume dị oké ọnụ, nakwa ọla ndị ọzọ. Ha wetakwara ajị anụ, eri linin, akpụkpọ anụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ndị Izrel ji obi ha niile weta ihe ndị ahụ ruo mgbe Mosis gwara ha, sị: ‘O zuola. Unu ewetazila.’
Ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị nwere nkà so rụọ ụlọikwuu ahụ. Ọ bụ Jehova nyere ha amamihe ha ji rụọ ya. Ụfọdụ kpara owu, kwee ákwà ma ọ bụ kpaa ihe ịchọ mma n’ákwà. E nwere ndị kwụnyere nkume n’ebe ndị e kwesịrị ịkwụnye ha, nwee ndị ji ọlaọcha rụọ ọrụ, nweekwa ndị tụrụ ihe n’osisi.
Ha rụrụ ụlọikwuu ahụ otú Jehova gwara ha rụọ ya. Ha kwere ákwà mgbochi mara ezigbo mma. Ha ji ya kebie ụlọikwuu ahụ ụzọ abụọ, ya bụ, Ebe Nsọ na Ebe Kacha Nsọ. E nwere igbe ọgbụgba ndụ n’Ebe Kacha Nsọ. E ji osisi akeshịa na ọlaedo rụọ igbe ahụ. E nwekwara ihe e ji adọsa ọkụ e ji ọlaedo rụọ n’Ebe Nsọ, nweekwa tebụl, nakwa ebe ịchụàjà a na-amụ insens na ya. N’ogige ụlọikwuu ahụ, e nwere efere e ji ọla kọpa kpụọ nakwa nnukwu ebe ịchụàjà. Igbe ọgbụgba ndụ ahụ na-echetara ndị Izrel nkwa ha kwere Jehova na ha ga na-erubere ya isi. Ị̀ ma ihe ọgbụgba ndụ bụ? Ọ bụ nkwa pụrụ iche.
Jehova họọrọ Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ka ha bụrụ ndị nchụàjà ga na-arụ ọrụ n’ụlọikwuu ahụ. Ha ga na-elekọta ya ma na-achụrụ Jehova àjà n’ebe ahụ. Ọ bụ naanị Erọn, bụ́ nnukwu onye nchụàjà, ga na-abanye n’Ebe Kacha Nsọ. Ọ na-abanye na ya otu ugboro n’afọ iji chụọ àjà maka mmehie nke ya, nke ndị ezinụlọ ya, nakwa nke ndị Izrel niile.
Ndị Izrel rụchara ụlọikwuu ahụ otu afọ ha si n’Ijipt pụta. Ugbu a, ha enweela ebe ha ga-anọ na-efe Jehova.
Jehova mere ka ebube ya ju n’ụlọikwuu ahụ ma mee ka ígwé ojii kwụrụ n’elu ya. Mgbe ọ bụla ígwé ojii ahụ kwụ n’elu ụlọikwuu ahụ, ndị Izrel anaghị akwali. Ma mgbe ígwé ojii ahụ si n’ụlọikwuu ahụ kwụlie, ha amara na oge eruola ka ha kwalie. Ha na-atọtu ụlọikwuu ahụ ma soro ígwé ojii ahụ.
“M wee nụ ka otu oké olu si n’ocheeze ahụ sị: ‘Ụlọikwuu nke Chineke dị ebe ụmụ mmadụ nọ. Ha na Chineke ga-ebikwa. Ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke ga-anọnyekwara ha.’” —Mkpughe 21:3
-