-
Onye Ndú Ọhụrụ na Ụmụ Nwaanyị Abụọ Katara ObiIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 32
Onye Ndú Ọhụrụ na Ụmụ Nwaanyị Abụọ Katara Obi
Mgbe Joshụa duru ndị Izrel ruo ọtụtụ afọ, ọ nwụrụ mgbe ọ dị otu narị afọ na iri (110). N’oge Joshụa nọ ndụ, ndị Izrel na-efe Jehova. Ma mgbe ọ nwụrụ, ha bidoro ikpere arụsị otú ndị Kenan na-eme. Jehova kwere ka eze ndị Kenan aha ya bụ Jebin taa ndị Izrel ahụhụ maka na ha kwụsịrị irubere Jehova isi. Ha rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka. Ọ bụ ya mere Jehova ji nye ha onye ndú ọhụrụ aha ya bụ Berak. Ọ ga-enyere ha aka ịlọghachikwute Jehova.
Debora, onye amụma nwaanyị, ziri Berak ozi ka ọ bịa. E nwere ozi Jehova ziri ya ka o zie Berak. Jehova ziri ya, sị: ‘Kpọrọ puku ụmụ nwoke iri (10,000) gaa lụso ndị agha Jebin agha n’iyi Kaịshọn. Ị ga-emeri Sisera, onyeisi ndị agha Jebin, n’ebe ahụ.’ Berak gwara Debora, sị: ‘M ga-aga ma ọ bụrụ na ị ga-eso m aga.’ Debora sịrị ya: ‘M ga-eso gị aga. Ma, mara na ọ bụghị gị ga-egbu Sisera. Jehova kwuru na ọ bụ nwaanyị ga-egbu ya.’
Debora so Berak na ndị agha ya gbagoo n’Ugwu Tebọ ka ha kwadebe maka agha. Ozugbo Sisera nụrụ ihe a, ọ kpọkọtara ndị na-agba ụgbọ ịnyịnya agha ya na ndị agha ya gaa na ndagwurugwu Kaịshọn. Debora gwara Berak, sị: ‘Taa ka Jehova ga-eme ka i merie.’ Berak na puku ụmụ nwoke iri (10,000) ahụ si n’ugwu ahụ gbadaa ka ha lụso ndị agha Sisera siri ezigbo ike agha.
Jehova mere ka iyi Kaịshọn tojuo. Ụgbọ ịnyịnya agha Sisera tọrọ n’apịtị. Sisera hapụrụ ụgbọ ịnyịnya ya gbawa ọsọ. Berak na ndị agha ya meriri ndị agha Sisera, ma Sisera gbafuru. Ọ gara zoo n’ụlọikwuu otu nwaanyị aha ya bụ Jeel. Jeel nyere ya mmiri ara ehi ka ọ ṅụọ, werezie ákwà e ji achụ oyi kpuchie ya. Ụra buuru dike a n’ihi na ike gwụchara ya. Jeel jizi nwayọọ here ehere were ntu kụnye ya n’isi, ya anwụọ.
Berak bịara na-achọ Sisera. Jeel si n’ụlọikwuu ya pụta, sị ya: ‘Bata. M ga-egosi gị nwoke ị na-achọ.’ Berak banyere n’ụlọikwuu ahụ ma hụ ozu Sisera. Berak na Debora bụrụ abụ ha ji too Jehova maka na o mere ka ndị Izrel merie ndị iro ha. Ndị Izrel biri n’udo ruo afọ iri anọ.
“Ụmụ nwaanyị ndị na-ezisa ozi ọma dị ọtụtụ.”—Abụ Ọma 68:11
-
-
Rut na NaomiIhe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
-
-
ISI NKE 33
Rut na Naomi
Mgbe nri kọrọ n’Izrel, otu onye Izrel aha ya bụ Naomi na di ya nakwa ụmụ ha nwoke abụọ kwagara Moab. Di Naomi mechara nwụọ. Ụmụ ha lụrụ Rut na Ọpa. Rut na Ọpa bụ ndị Moab. Ma, ọ dị mwute na ụmụ Naomi mechara nwụọ.
Mgbe Naomi nụrụ na nri adịkwala n’Izrel, o kpebiri ịlaghachi Izrel. Rut na Ọpa sokwa ya. Ma, mgbe ha nọ n’ụzọ na-ala, Naomi gwara ha, sị: ‘Unu hụrụ ụmụ m n’anya, hụkwa mụnwa n’anya. Achọrọ m ka unu lụgharịa di. Laghachinụ Moab.’ Rut na Ọpa gwara ya, sị: ‘Anyị hụrụ gị n’anya. Anyị achọghị ịhapụ gị.’ Ma, Naomi nọ na-agwa ha ka ha lawa. Ọpa mechara lawa, ma Rut ekweghị ala. Naomi gwara Rut, sị: ‘Ọpa alawala ka ọ lakwuru ndị ya na chi ya. Soro ya lawa, laa n’ụlọ nne gị.’ Ma Rut gwara ya, sị: ‘M gaghị ahapụ gị. Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.’ Olee otú i chere obi dị Naomi mgbe Rut gwara ya ihe a?
Rut na Naomi rutere Izrel n’oge a malitere iwe ọka bali n’ubi. Otu ụbọchị, Rut gara ka ọ tụtụọ ọka n’ubi otu nwoke aha ya bụ Boaz. Boaz bụ nwa Rehab. Ọ nụrụ na Rut bụ onye Moab nakwa na o kweghị ahapụ Naomi maka na ọ hụrụ ya n’anya. Boaz gwara ndị na-arụrụ ya ọrụ ka ha hapụtụ ọka n’ubi ka Rut tụtụọ ha.
Ná mgbede ụbọchị ahụ, Naomi jụrụ Rut, sị: ‘N’ubi ònye ka ị rụrụ ọrụ taa?’ Rut sịrị ya: ‘Ọ bụ n’ubi otu nwoke aha ya bụ Boaz.’ Naomi gwara ya, sị: ‘Boaz bụ otu n’ime ndị ikwu di m. Soro ụmụ agbọghọ ndị ọzọ na-arụ ọrụ n’ubi ya. O nweghị ihe ga-eme gị.’
Rut rụgidere ọrụ n’ubi Boaz ruo mgbe e wechara ihe ubi. Boaz hụrụ na Rut na-arụsi ọrụ ike, bụrụkwa ezigbo nwaanyị. N’oge ahụ, ọ bụrụ na nwoke anwụọ n’amụtaghị nwa nwoke, onye ikwu ya ga-alụrụ nwunye ya. Ọ bụ ya mere Boaz ji lụọ Rut. Ha mụtara nwa nwoke aha ya bụ Obed. Obed mechara bụrụ nna nna Eze Devid. Obi tọrọ ndị enyi Naomi ụtọ maka nwa a Rut mụrụ. Ha gwara Naomi, sị: ‘Jehova bu ụzọ nye gị Rut, onye hụrụ gị n’anya. Ugbu a, i nweela nwa nwa. Ka otuto dịrị Jehova.’
“E nwere enyi nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.”—Ilu 18:24
-