Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 4 p. 10-11
  • Ihe Ị Ga-eme ma Ihe Gbanweere Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ị Ga-eme ma Ihe Gbanweere Gị
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI ARA AHỤ́
  • IHE I KWESỊRỊ ỊMA
  • IHE I NWERE IKE IME
  • Àbụ M A Kwaa A Kwụrụ?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Kụziere Nwa Gị Ịna-edi Ihe
    Teta!—2019
  • 1 Ihe Nwere Ike Ịgbanwe
    Teta!—2014
  • Mụrụ Anya ma Na-anụ Ọkụ n’Obi n’Ofufe Jehova n’Oge Ihe Gbanweere Gị
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2016
g16 nke 4 p. 10-11
Foto otu nwa agbọghọ obi na-adịghị mma ka ọ nọ na-ele enyi ya nwaanyị na-akwaga ebe ọzọ

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | NDỊ NA-ETO ETO

Ihe Ị Ga-eme ma Ihe Gbanweere Gị

IHE MERE O JI ARA AHỤ́

  • Ka e were ya na unu na-aga ịkwaga ebe ọzọ n’ihi ọrụ papa gị.

  • Ezigbo enyi gị na-akwaga ebe dị anya.

  • Nwanne gị nwaanyị unu na ya bi n’ụlọ na-ala n’ụlọ di ya.

Olee ihe ị ga-eme n’ọnọdụ nke ọ bụla?

Foto osisi ifufe na-efegharị

O nwekarịghị ihe oké ifufe na-eme osisi ọ bụla na-ekwe ka ifufe na-efegharị ya. N’otu aka ahụ, i nwere ike ịmụta otú ị ga-esi anabata ọnọdụ ọ bụla ị na-agaghị agbanweli. Tupu anyị ekwuwe ihe mmadụ ga-eme ma ihe gbanweere ya, ka anyị burugodị ụzọ tụlee ihe ụfọdụ anyị kwesịrị ịma gbasara ihe ịgbanwere mmadụ.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

O nwere ike ịdabara onye ọ bụla. Baịbụl kwuru hoo haa na ‘oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị mmadụ niile.’ (Ekliziastis 9:11) Ma, ihe agbanwereghị gị taa, o nwere ike ịgbanwere gị echi. Ma, ọ bụghị ihe niile mmadụ na-atụghị anya ya bụ ihe ọjọọ. O nwedịrị ihe na-eyi ihe ọjọọ ma ọ dabara mmadụ, ka oge na-aga ya abaara onye ahụ uru. Ọtụtụ ndị na-eme nke ọma n’ihe ha na-emekarị kwa ụbọchị, ihe gbanweere ha, ọ na-akpa ha aka ọjọọ.

Ọ na-akacha akpa ndị na-eto eto aka ọjọọ. N’ihi gịnị? Otu nwa okorobịa aha ya bụ Okeziea kwuru na ọ naghị adịrị onye na-eto eto ahụ́ ya ka na-agbanwe agbanwe mfe ma ihe gbanweere ya.

Ihe ọzọ bụ na onye na-eto eto enwebeghị ihe ọ hụrụ ná ndụ. Ihe gbanweere ya, ọ gaghị ama ihe ọ ga-eme eme. Ma, ọ bụrụ onye torola eto, o nwere ike icheta ihe o mere mgbe ụdị ihe ahụ meburu ya.

Ị ga-edili ya. Mmadụ ga-edili ihe ọ bụla gbanwere ná ndụ ya. Ihe ga-eme ka ihe gbanweere mmadụ mara ya ahụ́ abụghị naanị onye ahụ idi ihe ahụ. O kwesịkwara ịgbalị chọpụta otú o nwere ike isi jiri ohere ahụ mepụta ihe bara uru. Ọ ga-ara ahụ́ onye na-eto eto ahụ́ ya nabatara ihe gbanweere ya aṅụwa ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ oké mmanya.

IHE I NWERE IKE IME

Nabata ya. O doro anya na ị chọghị ka ihe ọ bụla gbanweere gị otú ị chọrọ ka ndụ gị dịrị. Ma, ndị enyi gị nwere ike ịkwaga ebe ọzọ ma ọ bụkwanụ lụọ di ma ọ bụ nwunye. Nwanne gị nwere ike ịga biri nke ya. Ihe ụfọdụ nwere ike ime ka unu kwaga ebe ọzọ, gị ahapụ ndị enyi gị na ebe marala gị ahụ́. Ọ ka mma na ị nabatara ya otú ahụ, karịa ikwe ka ọ na-echu gị ụra.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ekliziastis 7:10.

Lekwasị anya n’ihu. Onye na-eche naanị gbasara otú ihe dịbuuru ya yiri onye na-anya ụgbọala nke anya ya dị naanị n’enyo na-egosi ya ihe ndị dị n’azụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na onye na-anya ụgbọala kwesịrị ịna-eletụ anya n’enyo ahụ, ma, o kwesịrị ịka na-ele anya n’ihu. N’otu aka ahụ, onye ihe gbanweere kwesịrị ilekwasị anya n’otú ihe ga-emecha dị n’ọdịnihu. (Ilu 4:25) O nwere ike ịjụ onwe ya, sị: Olee ihe ndị m nwere ike imepụta n’ime otu ọnwa ma ọ bụ n’ime ọnwa isii na-abịa abịa?

Lekwasị anya n’ihe ọma dị na ya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ifeoma kwuru na ihe ga-eme ka mmadụ die ihe gbanweere ya bụ otú onye ahụ si were ihe ahụ. O kwukwara na mmadụ kwesịrị ịchọpụta otú ọ ga-esi jiri ọnọdụ ọhụrụ ahụ mepụta ihe bara uru. Ì nwere ike ikwu otu ihe ị ga-ejili ụdị oge ahụ emepụta?—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ekliziastis 6:9.

Nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Ugomma kwuru ihe mere ya mgbe ndị enyi ya niile kwagara ebe ọzọ. O rubeghị afọ iri abụọ mgbe ahụ. Ọ sịrị: “Owu nọ na-ama m, ya adị m ka ya bụrụ na mụ na ha ka nọ. Ma, ọ bụ mgbe ahụ ka m ghọtawara ihe ụwa na-akọ. Ọ bịara doo m anya na ihe ga-enyere mmadụ aka ịna-amụta ihe bụ ihe ịgbanwere onye ahụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka m chọpụtara na m nwere ike imete ndị ọzọ mụ na ha ka nọ enyi.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 27:10.

Onye na-eche naanị gbasara otú ihe dịbuuru ya yiri onye na-anya ụgbọala nke anya ya dị naanị n’enyo na-egosi ya ihe ndị dị n’azụ

Na-emere ndị ọzọ ihe. Baịbụl kwuru, sị: “Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.” (Ndị Filipaị 2:4) Otu ihe ga-enyere gị aka ma ihe gbanweere gị bụ inyere ndị ọzọ aka. Otu nwa agbọghọ dị́ afọ iri na asaa aha ya bụ Njideka kwuru, sị: “Ka m na-eto, m chọpụtara na obi na-adị m ụtọ ma m nyere onye ọ dị ka ọ dị m aka, ma ọ bụkwanụ onye ọnọdụ ya ka nke m njọ.”

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • “Asịla: ‘Gịnị mere oge gara aga ji dị mma karịa oge a?’”—Ekliziastis 7:10.

  • “Iji anya hụ ihe dị mma karịa ịwagharị n’agụụ na-agụ mkpụrụ obi.”—Ekliziastis 6:9.

  • “Onye agbata obi nke nọ nso dị mma karịa nwanne nke nọ n’ebe dị anya.”—Ilu 27:10.

Foto Juan

JUAN

“Ndị na-eto eto ga-edili ihe gbanweere ha ma ha ghọta na ihe ga-agbanwerịrị mmadụ ná ndụ. Ịghọta ya otú a na ịnabata ya ga-enyere ha aka. Ọ ga-emekwa ka ha na-eme nke ọma.”

Foto Carissa

CARISSA

“M merihaala otu ihe nyere m nsogbu, anaghị m anọ na-eche gbasara ya. M na-elekwasịzi nsogbu ọzọ anya. Otu ihe m ghọtara na-eme ka mmadụ die ọnọdụ gbanweere ya bụ onye ahụ ilekwasị anya n’ihu, ọ bụghị n’azụ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya