Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w17 Ọgọst p. 27-29
  • Ịhụnanya Bụ Àgwà Bara Ezigbo Uru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịhụnanya Bụ Àgwà Bara Ezigbo Uru
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OTÚ E SI EGOSI ỊHỤNANYA
  • OTÚ JEHOVA NA JIZỌS SI GOSI EZIGBO ỊHỤNANYA
  • ‘NA-EJE IJE N’ỊHỤNANYA’
  • IHE NDỊ GA-ENYERE ANYỊ AKA ỊNA-AHỤ NDỊ ỌZỌ N’ANYA
  • URU ANYỊ GA-ERITE MA ANYỊ HỤ NDỊ ỌZỌ N’ANYA
  • “ỊHỤNANYA NA-EWULI ELU”
  • ‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Ịhụnanya’
    Bịaruo Jehova Nso
  • Bụrụ Onye Ịhụnanya Na-ewuli Elu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • “Nke Kachasị n’Ihe Ndị A Bụ Ịhụnanya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Hụ Chineke nke Hụrụ Gị n’Anya n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
w17 Ọgọst p. 27-29

Ịhụnanya Bụ Àgwà Bara Ezigbo Uru

  • ỊHỤNANYA

  • ỌṄỤ

  • UDO

  • OGOLOGO NTACHI OBI

  • OBIỌMA

  • ỊDỊ MMA

  • OKWUKWE

  • ỊDỊ NWAYỌỌ

  • NJIDE ONWE ONYE

PỌL ONYEOZI si n’ike mmụọ nsọ dee banyere àgwà itoolu mmụọ nsọ Chineke ga-enyere mmadụ aka inwe. (Gal. 5:​22, 23) Ọ kpọrọ ọmarịcha àgwà ndị a “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.”a Mkpụrụ nke mmụọ nsọ so ná “mmadụ ọhụrụ ahụ” Ndị Kraịst kwesịrị iyiri ka uwe. (Kọl. 3:10) Otú ahụ ọ na-abụ elekọta osisi nke ọma ya amịa mkpụrụ, otú ahụ ka onye mmụọ Chineke na-edu ga-esi na-akpa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ.​—⁠Ọma 1:​1-3.

Àgwà mbụ bara ezigbo uru so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Pọl dere bụ ịhụnanya. Olee otú o si baa uru? Pọl sịrị na ‘ọ dịghị ihe ọ bụ’ ma ọ bụrụ na o nweghị ịhụnanya. (1 Kọr. 13:⁠2) Ma, gịnị ka ịhụnanya pụtara? Olee otú anyị ga-esi enwe ya, na-egosikwa ya kwa ụbọchị?

OTÚ E SI EGOSI ỊHỤNANYA

N’agbanyeghị na ọ dịghị mfe ịkọwa ihe ịhụnanya pụtara, Baịbụl kọwara otú e nwere ike isi gosi ya. Dị ka ihe atụ, Baịbụl sịrị na ịhụnanya nwere “ogologo ntachi obi na obiọma.” Ọ sịkwara na “ọ na-eso eziokwu aṅụrị ọṅụ, na-edi ihe niile, na-ekwere ihe niile, na-enwe olileanya ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile.” Mmadụ ịhụ mmadụ ibe ya n’anya pụtara na ọ gaghị eji onye ahụ egwuri egwu, ihe gbasara onye ahụ ga na-emetụ ya n’obi. Ọ pụtakwara na ha ga-adị n’ezigbo mma. Ma, onye na-ahụghị mmadụ ibe ya n’anya ga na-ekwo ekworo, na-afụli onwe ya elu, na-akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, na-achọ ọdịmma nke ya, na-agụkọ ihe ọjọọ e mere ya, ọ naghịkwa agbaghara. Kama ịna-akpa àgwà ndị a na-adịghị mma, anyị kwesịrị ịgosi ezigbo ịhụnanya, ya bụ, ụdị ịhụnanya na-anaghị “achọ ọdịmma nke ya.”​—⁠1 Kọr. 13:​4-8.

OTÚ JEHOVA NA JIZỌS SI GOSI EZIGBO ỊHỤNANYA

N’eziokwu, “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:⁠8) Ihe niile ọ na-eme gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya. Ihe ọma kachanụ Chineke meere anyị iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya bụ izite Jizọs ka ọ bịa taa ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị. Jọn onyeozi sịrị: “Ọ bụ site n’ihe a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ebe anyị nọ, n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site n’aka ya. Ịhụnanya ahụ si otú a dịrị, ọ bụghị na ọ bụ anyị hụrụ Chineke n’anya, kama na ọ bụ ya hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ àjà ime udo maka mmehie anyị.” (1 Jọn 4:​9, 10) Ịhụnanya Jehova nwere n’ebe anyị nọ mere ka ọ na-agbaghara anyị, anyị enwee olileanya, ma dịrị ndụ.

Otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya bụ na o mere ihe Chineke chọrọ, jiri ndụ ya chụọ àjà. Pọl dere, sị: “[Jizọs] sịrị: ‘Lee! Abịawo m ime uche gị.’ . . . Site ‘n’uche’ ahụ nke o kwuru okwu ya, e dowo anyị nsọ site n’àjà e ji ahụ́ Jizọs Kraịst chụọ naanị otu ugboro.” (Hib. 10:​9, 10) O nweghị onye ọ bụla nwere ụdị ịhụnanya a. Jizọs sịrị: “Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:13) Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, ànyị nwere ike iṅomi otú Jehova na Jizọs si hụ anyị n’anya? Anyị nwere ike. Ka anyị leba anya n’otú anyị ga-esi mee ya.

‘NA-EJE IJE N’ỊHỤNANYA’

Pọl gwara anyị, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya, na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara unu n’anya ma nyefee onwe ya maka unu.” (Efe. 5:​1, 2) Anyị ‘na-eje ije n’ịhụnanya’ ma anyị na-egosi ndị mmadụ na anyị hụrụ ha n’anya n’ihe ọ bụla anyị na-eme. Ọ bụghị naanị ikwu ya n’ọnụ. Ihe ndị anyị na-eme ga-egosi ya. Jọn dere, sị: “Ụmụntakịrị, ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya, ọ bụghị n’ọnụ ma ọ bụ n’ire, kama n’omume nakwa n’eziokwu.” (1 Jọn 3:18) Dị ka ihe atụ, anyị hụ Chineke na ndị ọzọ n’anya, anyị ga na-ezi ndị mmadụ ‘ozi ọma nke alaeze.’ (Mat. 24:14; Luk 10:27) Anyị ga na-ahụkwa ndị ọzọ n’anya ma anyị nwee ndidi, dịrị obiọma ma na-agbaghara ha. N’ihi ya, Baịbụl gwara anyị, sị: “Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.”​—⁠Kọl. 3:⁠13.

Ọ bụrụ na anyị nye ndị ọzọ ndụmọdụ ma ọ bụ gbazie ha, ọ pụtaghị na anyị ahụghị ha n’anya. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ nne na nna chọọ ime ka nwa ha kwụsị ibe ákwá, ha na-eme ihe ọ bụla nwa ha chọrọ. Ma nne ma ọ bụ nna hụrụ nwa ya n’anya agaghị eme ihe ọ bụla nwa ya kwuru. Otú ahụ ka ọ dị Chineke. Ọ bụ ‘onye ọ hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị.’ (Hib. 12:⁠6) Ọ bụrụ na anyị hụ mmadụ n’anya, anyị ga-adọ ya aka ná ntị mgbe kwesịrị ekwesị. (Ilu 3:​11, 12) Ma, anyị kwesịkwara icheta na anyị bụ ndị mmehie, nweekwa mgbe anyị na-anaghị egosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya. N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ebe ndị anyị kwesịrị igosikwu na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ka anyị tụlee ụzọ atọ anyị ga-esi eme ya.

IHE NDỊ GA-ENYERE ANYỊ AKA ỊNA-AHỤ NDỊ ỌZỌ N’ANYA

Nke mbụ, rịọ Chineke ka o nye gị mmụọ nsọ ya nke ga-eme ka ị hụ ndị ọzọ n’anya. Jizọs sịrị na ‘ndị na-arịọ Jehova mmụọ nsọ’ ka Jehova na-enye mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Ọ bụrụ na anyị rịọ Jehova mmụọ ya ma ‘nọgide na-eje ije site na mmụọ nsọ,’ anyị ga na-ahụkwu ndị ọzọ n’anya. (Gal. 5:16) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị bụ okenye n’ọgbakọ, i nwere ike ịrịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya ga-enyere gị aka iji ịhụnanya nye ndị ọzọ ndụmọdụ. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, i nwere ike rịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya ga-enyere gị aka ka ị ghara iji iwe dọọ nwa gị aka ná ntị, kama ka i jiri ịhụnanya mee ya.

Nke abụọ, chee echiche nke ọma gbasara otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ma mgbe ha kpasuru ya iwe. (1 Pita 2:​21, 23) A kpasuo anyị iwe ma ọ bụ megbuo anyị, anyị kwesịrị iche banyere ihe Kraịst mere. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Gịnị ka Jizọs ga-eme?’ Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Leigh chọpụtara na ịjụ onwe ya ajụjụ a nyeere ya aka iche echiche tupu ya emee ihe ọ bụla. Ọ sịrị: “E nwere mgbe onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ zigaara ndị ọrụ ibe anyị ndị ọzọ ozi na-adịghị mma gbasara m, nakwa gbasara ọrụ m na-arụ. O were m ezigbo iwe. Ma, m jụrụ onwe m, sị: ‘Olee otú m ga-esi ṅomie Jizọs?’ Mgbe m chebachaara ihe Jizọs gaara eme echiche, m kpebiri ịhapụ okwu ahụ, gharakwa ịrụwa ụka. M mechara mata na onye ahụ mụ na ya na-arụkọ ọrụ nwere ọrịa ọjọọ ya na ya na-alụ, nweekwa ọtụtụ ihe na-echegbu ya. M gwara onwe m na ọ maghị ama dee ihe ahụ o dere. Icheta otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ma mgbe a kpasuru ya iwe nyeere m aka igosi na m hụrụ onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ n’anya.” N’eziokwu, anyị ṅomie Jizọs, anyị ga na-ahụ ndị ọzọ n’anya mgbe niile.

Nke atọ, jiri obi gị niile hụ ndị ọzọ n’anya. Ọ bụ ụdị ịhụnanya a ka e ji mara ezigbo Ndị Kraịst. (Jọn 13:​34, 35) N’ihi ya, Baịbụl gwara anyị ka anyị nwee “ụdị echiche” ahụ Jizọs nwere. Otú o si gosi na “o mere onwe ya ihe efu ruo ọnwụ” bụ ịhapụ eluigwe. (Fil. 2:​5-8) Ọ bụrụ na anyị ṅomie otú o si jiri obi ya niile hụ anyị n’anya, otú anyị si eche echiche na otú obi dị anyị ga-adị ka nke ya. Anyị ga na-ebutekwa ọdịmma ndị ọzọ ụzọ. Olee uru ndị ọzọ anyị ga-erite ma anyị hụ ndị ọzọ n’anya?

URU ANYỊ GA-ERITE MA ANYỊ HỤ NDỊ ỌZỌ N’ANYA

Anyị ga-erite ọtụtụ uru ma anyị gosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya. Ka anyị tụlee abụọ n’ime ha:

Ebe ụmụnna ma ụmụaka ma ndị torola eto si agbụrụ dị iche iche na-akpakọrịta n’Nzukọ Alaeze

Olee uru anyị ga-erite ma anyị hụ ndị ọzọ n’anya?

  • ỤMỤNNA ANYỊ NỌ N’ỤWA DUM: Anyị ma na ọgbakọ ọ bụla anyị gara n’ụwa niile na ụmụnna anyị ga-eji obi ụtọ nabata anyị n’ihi na anyị hụrụ ibe anyị n’anya. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ịmata na ‘òtù ụmụnna anyị niile ndị nọ n’ụwa’ hụrụ anyị n’anya. (1 Pita 5:⁠9) Ọ bụ naanị ụmụnna anyị nwere ụdị ịhụnanya a.

  • UDO: ‘Iji ịhụnanya na-ediri ibe anyị ihe’ na-eme ka anyị dịrị n’udo. (Efe. 4:​2, 3) Anyị na-ahụ otú ụmụnna anyị si adị n’udo ma anyị gaa ọmụmụ ihe na mgbakọ. Ọ̀ bụ na i kwetaghị na ụdị udo a pụrụ iche n’ụwa a ndị mmadụ na-adịghị n’udo? (Ọma 119:165; Aịza. 54:13) Ọ bụrụ na anyị na ndị mmadụ adịrị n’udo, anyị na-egosi na anyị ji obi anyị niile hụ ha n’anya. Obi na-adịkwa Nna anyị nke eluigwe ụtọ.​—⁠Ọma 133:​1-3; Mat. 5:⁠9.

“ỊHỤNANYA NA-EWULI ELU”

Pọl dere, sị: “Ịhụnanya na-ewuli elu.” (1 Kọr. 8:⁠1) Olee otú ịhụnanya si eme ya? N’isi nke iri na atọ n’akwụkwọ mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt, ọ kọwara otú ịhụnanya si ewuli elu. Ịhụnanya na-achọ abamuru nke onye ọzọ. (1 Kọr. 10:24; 13:⁠5) Ebe ọ bụ na ịhụnanya na-eme ka mmadụ na-echebara mmadụ ibe ya echiche, nweekwa ogologo ntachi obi, ọ na-eme ka udo dịrị n’ezinụlọ, meekwa ka ọgbakọ dịrị n’otu.​—⁠Kọl. 3:⁠14.

Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ bara uru ma na-ewuli elu karịa ịhụnanya anyị nwere n’ebe mmadụ ibe anyị nọ. Ụdị ịhụnanya ahụ anyị hụrụ Jehova na-eme ka ndị si ebe dị iche iche, agbụrụ dị iche iche, na asụsụ dị iche iche dịrị n’otu, jirikwa obi ụtọ na “otu obi” na-efe Jehova. (Zef. 3:⁠9) Ka anyị kpebisie ike ịna-akpa ọmarịcha àgwà a so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ kwa ụbọchị.

a Isiokwu a bụ nke mbụ n’ime isiokwu itoolu a ga-atụle àgwà nke ọ bụla so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya