Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w18 Nọvemba p. 28-30
  • Obiọma Bụ Àgwà A Na-egosi Ma n’Okwu Ma n’Omume

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Obiọma Bụ Àgwà A Na-egosi Ma n’Okwu Ma n’Omume
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • JEHOVA NA-EGOSI MMADỤ NIILE OBIỌMA
  • JIZỌS BỤ NWOKE OBIỌMA
  • INWE OBIỌMA PỤTARA ỊNA-EMERE NDỊ ỌZỌ IHE ỌMA
  • OTÚ ANYỊ GA-ESI MỤTA INWE OBIỌMA
  • INWE OBIỌMA NA-EME KA NDỊ ỌZỌ NA-ABỊARU ANYỊ NSO
  • URU ANYỊ NA-ERITE MA ANYỊ NA-EGOSI NDỊ MMADỤ OBIỌMA
  • Ndị Chineke Aghaghị Ịhụ Obiọma n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Mee Ihe Na-atọ Jehova Ụtọ Site n’Igosi Obi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Kwe Ka “Iwu Obiọma” Na-eduzi Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ịchụso Obiọma n’Ụwa nke Na-enweghị Omume Enyi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
w18 Nọvemba p. 28-30

Obiọma Bụ Àgwà A Na-egosi Ma n’Okwu Ma n’Omume

  • ỊHỤNANYA

  • ỌṄỤ

  • UDO

  • OGOLOGO NTACHI OBI

  • OBIỌMA

  • ỊDỊ MMA

  • OKWUKWE

  • ỊDỊ NWAYỌỌ

  • NJIDE ONWE ONYE

MMADỤ meere anyị ihe ọma, ọ na-agba anyị ume, na-emekwa ka obi na-eru anyị ala. Anyị chọpụta na mmadụ hụrụ anyị n’anya, obi na-atọ anyị ụtọ. Ebe ọ bụ na ọ na-atọ onye ọ bụla n’ime anyị ụtọ ma mmadụ meere anyị ihe ọma, olee otú anyị ga-esi mụta ọmarịcha àgwà a bụ́ obiọma?

A sị na mmadụ nwere obiọma, ọ pụtara na onye ahụ na-achọ ihe ga-abara ndị ọzọ uru. Ọ na-egosi ya ma n’okwu ọnụ ma n’omume. Ebe ọ bụ na onye nwere obiọma na-egosi ya n’omume, mmadụ ịna-akpa àgwà ọma ka ndị ọzọ hụ ya abụghị ebe okwu biri. Ihe mere mmadụ ji egosi ndị ọzọ obiọma bụ na ọ hụrụ ha n’anya nke ukwuu ma na-enwere ha ọmịiko. Ihe ọzọ bụ na obiọma so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ nke a chọrọ ka Ndị Kraịst nwee. (Gal. 5:22, 23) Anyị kwesịrị ịmụta ịna-enwe obiọma. N’ihi ya, ka anyị tụlee otú Jehova na Ọkpara ya si gosi na ha nwere obiọma, nakwa otú anyị nwere ike isi eṅomi ha.

JEHOVA NA-EGOSI MMADỤ NIILE OBIỌMA

Jehova bụ onye obiọma, ihe banyere anyị niile na-emetụkwa ya n’obi, ma “ndị na-enweghị ekele na ndị ọjọọ.” (Luk 6:35) Dị ka ihe atụ, Jehova “na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Mat. 5:45) Ndị na-ekwetaghịdị na ọ bụ Jehova kere ha ka na-erite uru n’ihe ndị a o nyere anyị, ha nwekwara ike na-enwetụ obi ụtọ.

Ihe Jehova meere Adam na Iv na-egosi na o nwere obiọma. Obere oge ha nupụchaara ya isi, ha “dụkọtara akwụkwọ osisi fig wee meere onwe ha ihe ha ga-eji kpuchie úkwù.” Ma, Jehova ma na ha kwesịrị inwe ezigbo uwe ha ga na-eyi mgbe ha pụrụ n’Iden gaa biri n’ala e ji “ogwu na uke” bụọ ọnụ. N’ihi ya, Jehova meere ha “uwe akpụkpọ anụ gbadara agbada ka ha yiri” iji gosi na o nwere obiọma.—Jen. 3:7, 17, 18, 21.

Ọ bụ eziokwu na Jehova na-egosi “ndị ọjọọ na ndị ọma” obiọma, ma ọ na-akacha egosi ndị na-efe ya obiọma. Dị ka ihe atụ, n’oge Zekaraya onye amụma, o wutere otu mmụọ ozi mgbe ọ hụrụ na ndị Izrel akwụsịla ịrụ ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem. Jehova hụrụ otú o si wute mmụọ ozi ahụ, ya agwa ya “okwu ndị dị mma, ndị na-enye nkasi obi.” (Zek. 1:12, 13) Jehova mesokwara Ịlaịja onye amụma ihe otú ahụ. Ma o nwere oge o ruru, onye amụma a adaa mbà n’obi, ya agwa Jehova ka o mee ka ọ nwụọ. Jehova ghọtara otú obi dị Ịlaịja ma ziga otu mmụọ ozi ka ọ gbaa ya ume. Chineke mesikwara ya obi ike na ọ kwụ ya n’azụ. Mgbe Ịlaịja nụchara okwu a gbara ya ume, nakwa aka Chineke nyeere ya, o mere ka o nwee ike ịna-arụ ọrụ ya. (1 Eze 19:1-18) A bịa ná ndị na-efe Chineke, ònye kacha eṅomi Jehova n’inwe obiọma?

JIZỌS BỤ NWOKE OBIỌMA

N’oge Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, a ma ya ama ka onye obiọma na onye ihe banyere mmadụ na-emetụ n’obi. Ọ bụghị onye obi ọjọọ ma ọ bụ onye na-amanye ndị mmadụ ime ihe o kwuru. N’ihi ọmịiko o nwere, o kwuru, sị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume. . . . N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu.” (Mat. 11:28-30) N’ihi ọmịiko a Jizọs nwere n’ebe ndị mmadụ nọ, ha so ya gaa ebe ọ bụla ọ na-aga. Jizọs “nwere ọmịiko” n’ebe ha nọ ma nyejuo ha afọ, gwọọ ndị ha na-arịa ọrịa, ma kụziere ha “ọtụtụ ihe” banyere Nna ya.—Mak 6:34; Mat. 14:14; 15:32-38.

Otú Jizọs si ghọta ndị mmadụ na otú o si meso ha ihe gosiri na o nwere nnọọ obiọma. Nke bụ́ eziokwu bụ na o ji “obiọma” nabata ndị niile ji obi ha niile chọọ ịhụ ya n’agbanyeghị otú ihe ahụ ha na-arịọ ya nwere ike isi siere ya ike ime. (Luk 9:10, 11) Dị ka ihe atụ, Jizọs abaraghị otu nwaanyị na-adịghị ọcha ụjọ ji mba, bụ́ onye metụrụ ọnụ ọnụ uwe ya aka n’ihi na o nwere okwukwe na ọ ga-agwọ ya ọrịa oruru ọbara ọ na-arịa. (Lev. 15:25-28) O nweere nwaanyị a ọmịiko n’ihi na ọ rịala ọrịa a afọ iri na abụọ. Ọ gwara ya, sị: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma. Laa n’udo, gbakee n’ọrịa ọjọọ nke na-arịa gị.” (Mak 5:25-34) Ihe a o mere gosiri na o nwere obiọma.

INWE OBIỌMA PỤTARA ỊNA-EMERE NDỊ ỌZỌ IHE ỌMA

Ihe atụ ndị anyị kwuru banyere ha n’elu gosiri na ihe e ji ama onye nwere obiọma bụ na ọ na-emere ndị ọzọ ihe. Jizọs ji ihe atụ gbasara onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi kụziere anyị ihe mere o ji dị mkpa ịna-emere ndị ọzọ ihe. Ọ bụ eziokwu na ndị Sameria na ndị Juu kpọrọ ibe ha asị, ma onye Sameria ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ ahụ nweere otu nwoke ọmịiko. E zuru nwoke ahụ ohi, kụọ ya ihe, ma hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma. Onye Sameria a nyeere ya aka n’ihi na o nwere obiọma. O kechiri ọnyá nwoke ahụ, wụkwasị ya mmanụ na mmanya ma buga ya n’ụlọ ndị njem. Ọ kwụrụ onye na-elekọta ụlọ ndị njem ahụ ụgwọ ka o lekọtawa nwoke ahụ merụrụ ahụ́. Ọ gwadịrị ya na ọ ga-akwụ ya ego ọ bụla o mefuru n’elu nke o nyere ya ma ọ bịaghachi.—Luk 10:29-37.

Ihe ọzọ na-egosi na mmadụ nwere obiọma bụ na ọ na-agwa ndị ọzọ okwu na-agba ha ume. Ma Baịbụl kwuru na “ọ bụ nchegbu nke dị n’obi mmadụ ga-anyịgbu ya,” kwuokwa na “okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa ọṅụ.” (Ilu 12:25) Ọ bụrụ na anyị dị obiọma ma na-emere ndị ọzọ ihe ọma, anyị ga na-agwa ha okwu na-agba ha ume. Nke a ga-emekwa ka obi na-atọkwu ha ụtọ.a Okwu ọma anyị gwara ha ga-egosi na anyị hụrụ ha n’anya. Ọ ga-emekwa ka ọ dịrị ha mfe idi ọnwụnwa ndị na-abịara ha.—Ilu 16:24.

OTÚ ANYỊ GA-ESI MỤTA INWE OBIỌMA

Mmadụ niile ga-amụtali ịna-enwe obiọma n’ihi na e kere anyị “n’onyinyo Chineke.” (Jen. 1:27) Dị ka ihe atụ, Juliọs, onyeisi ndị agha ndị Rom, bụ́ onye e nyefere Pọl onyeozi n’aka ya ka ọ kpọrọ Pọl gaa Rom, ‘ji obiọma meso ya omume, kwekwa ka ọ gakwuru ndị enyi ya ka ha wee lekọta ya,’ n’obodo Saịdọn. (Ọrụ 27:3) Mgbe obere oge gatụrụ, ndị bi na Mọlta gosiri Pọl na ndị ọzọ ya na ha nọ n’ụgbọ mmiri mgbe o kpuru “obiọma pụrụ iche.” Ha kwanyedịịrị ha ọkụ ka ahụ́ kporo ha ọkụ n’ihi oyi. (Ọrụ 28:1, 2) Ihe ahụ ha mere magburu onwe ya, ma ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwere obiọma, ọ bụghị mgbe ụfọdụ ka anyị ga-emere ndị mmadụ ihe ọma.

Ka anyị nwee ike ime ihe dị Chineke mma, anyị kwesịrị ịna-egosi ndị ọzọ obiọma mgbe niile. Ọ bụ ya mere Jehova ji gwa anyị ka anyị ‘yiri obiọma.’ (Kọl. 3:12) Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ naghị adịrị anyị mfe ịna-akpa àgwà a mgbe niile. N’ihi gịnị? O nwere ike ịbụ n’ihi ihere, obi akachaghị anyị, ndị ọzọ imegide anyị ma ọ bụkwanụ anyị emetụ ihe ga-abara naanị onwe anyị uru mgbe ụfọdụ. Ma, anyị nwere ike imeri nsogbu ndị a ma anyị kwe ka mmụọ nsọ na-eduzi anyị ma na-eṅomi obiọma Jehova.—1 Kọr. 2:12.

Ànyị nwere ike ịchọpụta ụzọ ndị anyị kwesịrị isi na-egosikwu ndị ọzọ obiọma? Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-ege ndị ọzọ ntị nke ọma ma ha kwuwe okwu? M̀ ma nsogbu ndị ọzọ nwere? Olee mgbe ikpeazụ m meere onye na-abụghị onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ ezigbo enyi m ihe ọma?’ Ihe ga-enyere anyị aka bụ ikwu ihe ndị anyị ga-eme, dị ka ịmatakwu ndị anyị na ha nọ, nke ka nke, ụmụnna anyị na ha nọ n’ọgbakọ. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị mata ọnọdụ ha na mkpa ha. Ihe ọzọ bụ na anyị kwesịrị ịgba mbọ na-egosi ndị ọzọ obiọma otú anyị chọrọ ka ha si na-egosi anyị ma ọ bụrụ na anyị nọ n’ọnọdụ ha. (Mat. 7:12) N’ikpeazụ, Jehova ga-agọzi mbọ anyị na-agba ịmụta otú anyị ga-esi na-enwe obiọma ma ọ bụrụ na anyị arịọ ya ka o nyere anyị aka.—Luk 11:13.

INWE OBIỌMA NA-EME KA NDỊ ỌZỌ NA-ABỊARU ANYỊ NSO

Mgbe Pọl onyeozi kwuru ihe e ji mata ya ka onye ozi Chineke, o kwuru na “obiọma” so n’ime ha. (2 Kọr. 6:3-6) Ihe mere ndị mmadụ ji bịa Pọl nso bụ na o nwere mmasị n’ebe ha nọ. Otú o si mee ya bụ na o meere ha ihe ọma, gwakwa ha okwu ọma. (Ọrụ 28:30, 31) Ọ bụrụ na anyị emee ka Pọl, ndị mmadụ nwere ike ịbata n’ọgbakọ n’ihi ihe ọma anyị meere ha. Anyị meere ndị mmadụ ihe ọma, ma ndị na-emegide anyị, anyị nwere ike ime ka ha kwụsịtụ iwere anyị iwe, meekwa ka ha na-emeso anyị ihe nke ọma. (Rom 12:20) Ka oge na-aga, ha nwedịrị ike igewe ntị n’ozi ọma anyị na-ezi ha.

Na Paradaịs a ga-enwe n’ụwa, obi ga na-atọgbu ọtụtụ ndị a ga-esi n’ọnwụ kpọlite atọgbu mgbe anyị meere ha ihe ọma, ikekwe, na nke mbụ ya. Ha ga-emekwara ndị ọzọ ihe ọma iji gosi na obi dị ha ụtọ. N’oge ahụ, onye ọ bụla jụrụ imere ndị ọzọ ihe ọma ma na-enyere ha aka agaghị ebi na Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ndị Chineke chọrọ ka ha dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ga-eji obiọma na ịhụnanya na-emeso ndị ọzọ ihe. (Ọma 37:9-11) Ụwa ga-amagbu onwe ya n’oge ahụ n’ihi na udo ga-adị ebe niile, o nweghịkwa ihe ga-eme ka ndị mmadụ chịrị obi n’aka. Ma tupu mgbe ahụ, olee uru anyị na-erite ma anyị na-egosi ndị ọzọ obiọma?

URU ANYỊ NA-ERITE MA ANYỊ NA-EGOSI NDỊ MMADỤ OBIỌMA

Baịbụl kwuru na “onye obiọma na-emeso mkpụrụ obi ya mmeso ọma.” (Ilu 11:17) Ndị mmadụ na-abịa onye obiọma nso, ha na-egosikwa ya obiọma. Jizọs kwuru, sị: “Ihe unu ji atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.” (Luk 6:38) N’ihi ya, ọ na-adịrị onye obiọma mfe imeta ezigbo ndị enyi, ha anaghịkwa agbasa ngwa ngwa.

Pọl onyeozi gwara ụmụnna nọ n’ọgbakọ Efesọs ka ha ‘nwee obiọma n’ebe ibe ha nọ, na-enwekwa obi ọmịiko, na-agbagharakwa ibe ha kpamkpam.’ (Efe. 4:32) Ọ bụrụ na ụmụnna niile nọ n’ọgbakọ ana-enwere ibe ha ọmịiko, na-egosi ha obiọma, na-achọkwa otú ha ga-esi na-enyere ibe ha aka, ọ ga-abara onye ọ bụla ezigbo uru. Ha agaghị echetụdị echiche ịgwa ibe ha okwu ọjọọ, ịkparị ibe ha ma ọ bụ ịkatọ ibe ha. Ha agaghịkwa eji ụmụnna ha na-agba asịrị, kama, ha ga-agbalị ka ha jiri okwu ọma na-enyere ndị ọzọ aka. (Ilu 12:18) Nke a ga-eme ka ọgbakọ sie ezigbo ike, meekwa ka ha jiri ọṅụ na-ejere Jehova ozi.

O doro anya na onye obiọma na-egosi ya ma n’okwu ma n’omume. Ọ bụrụ na anyị ana-egosi ndị ọzọ obiọma, anyị na-eṅomi àgwà Chineke anyị bụ́ Jehova, bụ́ onye na-emesapụ aka. (Efe. 5:1) Ọ ga-emekwa ka ọgbakọ sikwuo ike, meekwa ka ndị ọzọ bata n’ọgbakọ. Ka anyị gbaa mbọ ka ndị mmadụ mara anyị mgbe niile ka ndị obiọma.

a Anyị ga-atụle àgwà a bụ́ ịdị mma n’isiokwu ndị anyị ga-atụle n’ọdịnihu e ji na-akọwa àgwà ndị so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya