ABỤ NKE 101
Anyị Na-arụkọ Ọrụ ma Dịrị n’Otu
Nke E Biri Ebi
1. Nsogbu dị n’ebe niile.
Ma, Chineke kpọbar’anyị
N’ọgbakọ yan-ke dị n’udo
K’anyị nọrọ na ya.
Ịdị n’otu dịm-ma.
Udo dịa-nyịm-ma.
Ọrụa-nyị g’arụ dịọ-tụtụ.
K’anyị dum gbalịa dị n’udo.
Chineke ji Kraịst n’edua-nyị.
K’anyị n’erub’isi.
2. Anyị rịọ k’anyị dị n’otu,
N’agbalị n’eme ebere,
Ọ g’eme k’e too Chineke.
Udo n’ọṅụ g’adị.
Anyị ga n’enw’ọṅụ
N’anyị dị n’otu.
Anyị h’ụmụnn’anyị n’anya,
Ọ g’eme k’anyị dị n’udo.
Chineke g’enyer’anyịa-ka.
Anyị g’adị n’otu.
(Gụọkwa Maị. 2:12; Zef. 3:9; 1 Kọr. 1:10.)