Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 77
  • Gịnị Bụ Mbilite n’Ọnwụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Mbilite n’Ọnwụ?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Nanị Ihe Ga-emeri Ọnwụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Olileanya E Ji n’Aka
    Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
  • A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ezigbo Olileanya nke Dịịrị Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 77
Ebe ndị mmadụ na-anabata ndị ikwu na ibe ha a kpọlitere n’ọnwụ n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs

Gịnị Bụ Mbilite n’Ọnwụ?

Ihe Baịbụl kwuru

Na Baịbụl, okwu Grik a sụgharịrị “mbilite n’ọnwụ” bụ a·naʹsta·sis. Okwu Grik a pụtara “ibili” ma ọ bụ “iguzoro ọtọ ọzọ.” N’ihi ya, mbilite n’ọnwụ pụtara ime ka mmadụ si n’ọnwụ bilie ma ọ bụ isi n’ọnwụ kpọlite mmadụ, ya amalitekwa ịdị ndụ otú ọ dịbu.​—1 Ndị Kọrịnt 15:12, 13.

N’agbanyeghị na okwu bụ́ “mbilite n’ọnwụ” adịghị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, nke ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ochie, ihe ndị ọzọ e kwuru na ya gosiri na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, Chineke si n’ọnụ Hosia onye amụma kwe nkwa, sị: “M ga-agbapụta ha n’aka Shiol [ya bụ, Ili]; m ga-agbapụta ha n’aka ọnwụ.”​—Hosia 13:14; Job 14:13-​15; Aịzaya 26:19; Daniel 12:​2, 13.

Ebee ka ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-anọ? Ụfọdụ n’ime ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-aga eluigwe soro Kraịst chịwa. (2 Ndị Kọrịnt 5:1; Mkpughe 5:​9, 10) Baịbụl kwuru na mbilite n’ọnwụ nke a bụ “mbilite n’ọnwụ mbụ” ma ọ bụ “mbilite n’ọnwụ bu ụzọ.” Okwu abụọ a gosiri na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ ọzọ. (Mkpughe 20:6; Ndị Filipaị 3:​11) Mbilite n’ọnwụ ọzọ a ga-abụ maka ndị ga-ebi n’ụwa. Ọ bụ n’ụwa a ka ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ a ga-akpọlite ga-anọ.​—Abụ Ọma 37:29.

Olee otú a ga-esi akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ? Chineke nyere Jizọs ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 11:25) Jizọs ga-eme ka “ndị niile nọ n’ili ncheta” sí n’ọnwụ bilie. Onye nke ọ bụla n’ime ha ga-abụ onye ọ bụbu tupu ya anwụọ, nwee àgwà ndị e ji mara ya, marakwa ihe niile ọ mabụ. (Jọn 5:​28, 29) Ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ n’eluigwe ga-enwe ahụ́ mmụọ, ma ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ n’ụwa ga-enwe ahụ́ mmadụ, ahụ́ ga-agbasikwa ha ike.​—Aịzaya 33:24; 35:​5, 6; 1 Ndị Kọrịnt 15:42-​44, 50.

Ole ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ? Baịbụl kwuru na a “gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ Ndịozi 24:15) Ndị ezi omume a bụ ndị ji obi ha niile fee Chineke, dị ka Noa, Sera, na Ebreham. (Jenesis 6:9; Ndị Hibru 11:11; Jems 2:​21) Ndị ajọ omume bụ ndị na-emeghị uche Chineke maka na a kụzighịrị ha ihe Chineke chọrọ ka ha mee.

Ma, a gaghị akpọlite ndị ime ihe ọjọọ riri ahụ́ nke na ha agaghị echegharili. Ọ bụrụ na ndị ajọ omume dị́ otú a anwụọ, ha anwụọla ọnwụ ebighị ebi. Olileanya mbilite n’ọnwụ adịkwaraghị ha.​—Matiu 23:33; Ndị Hibru 10:26, 27.

Olee mgbe a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ? Baịbụl buru amụma na ọ bụ n’oge ọnụnọ Kraịst, nke malitere n’afọ 1914, ka a ga-amalite ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ n’eluigwe. (1 Ndị Kọrịnt 15:21-​23) Ọ bụ mgbe Jizọs Kraịst ga-achị ụwa otu puku afọ, ya bụ, mgbe a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, ka a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ n’ụwa.​— Luk 23:43; Mkpughe 20:​6, 12, 13.

Gịnị mere anyị ji kwesị ikweta na a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ? Baịbụl kọrọ banyere mmadụ itoolu a kpọlitere n’ọnwụ. Ndị mmadụ hụkwara mgbe a kpọlitere ha. (1 Ndị Eze 17:17-​24; 2 Ndị Eze 4:​32-​37; 13:20, 21; Luk 7:​11-​17; 8:​40-​56; Jọn 11:38-​44; Ọrụ Ndịozi 9:​36-​42; Ọrụ Ndịozi 20:​7-​12; 1 Ndị Kọrịnt 15:​3-6) Mbilite n’ọnwụ kacha pụọ iche bụ nke Lazarọs. O ruola ụbọchị anọ ọ nwụrụ tupu Jizọs akpọlite ya. Ìgwè mmadụ nọkwa ya mgbe Jizọs kpọlitere ya n’ọnwụ. (Jọn 11:39, 42) Ndị iro Jizọs enwedịghị ọnụ ha ga-eji ekwu na a kpọliteghị Lazarọs n’ọnwụ. Ọ bụ ya mere ha ji kpaa nkata otú ha ga-esi egbu ma Jizọs ma Lazarọs.​—Jọn 11:47, 53; 12:​9-​11.

Mmadụ atọ n’ime ndị Baịbụl kwuru na a kpọlitere n’ọnwụ: nwa otu nwaanyị di ya nwụrụ anwụ, otu nwaanyị Onye Kraịst, nakwa Lazarọs enyi Jizọs

Baịbụl kwuru na Chineke nwere ikike ọ ga-eji akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ọ chọkwara ịkpọlite ha. Ọ na-echeta ihe niile gbasara onye ọ bụla ọ ga-akpọlite n’ọnwụ, o nweghịkwa ihe ọ na-enweghị ike ime. (Job 37:23; Matiu 10:30; Luk 20:37, 38) Chineke ga-akpọliteli ndị nwụrụ anwụ, ọ chọkwara ịkpọlite ha. Mgbe Baịbụl na-ekwu banyere mbilite n’ọnwụ, o kwuru na ‘agụụ ọrụ aka Chineke ga-agụsi ya ike.’​—Job 14:15.

Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu banyere mbilite n’ọnwụ

Ụgha: Mbilite n’ọnwụ bụ mkpụrụ obi na anụ ahụ́ ịbịakọta ọnụ.

Eziokwu: Baịbụl na-akụzi na mkpụrụ obi bụ mmadụ n’onwe ya, ọ bụghị ihe na-esi n’ahụ́ mmadụ pụọ mgbe onye ahụ nwụrụ. (Jenesis 2:7; Ezikiel 18:4) A kpọlite mmadụ n’ọnwụ, a naghị eweta mkpụrụ obi ya tinyeghachi ya n’ahụ́ ya; kama a na-ekegharị onye ahụ, ya abụrụ mkpụrụ obi dị́ ndụ.

Ụgha: A ga-akpọlite ụfọdụ ndị n’ọnwụ, bibiekwa ha ozugbo a kpọlitechara ha.

Eziokwu: Baịbụl kwuru na “ndị mere ajọ omume ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” (Jọn 5:​29) Ma, ọ bụ ihe ha mere mgbe a kpọlitechara ha ka a ga-eji kpee ha ikpe, ọ bụghị ihe ha mere tupu ha anwụọ. Jizọs kwuru, sị: “Ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ṅakwara ntị ga-adị ndụ.” (Jọn 5:​25) A ga-ede aha ndị ‘ṅara ntị’ ma ọ bụ ndị rubere isi n’ihe ha mụtara mgbe a kpọlitechara ha n’ọnwụ ‘n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ.’​—Mkpughe 20:12, 13.

Ugha: Ọ bu ahụ́ mmadụ nwe tupu ya anwụọ ka ọ ga-enwekwa ma a kpọlite ya n’ọnwụ.

Eziokwu: Mmadụ nwụọ, ahụ́ ya ga-ere, gbarie ma ghọọ ájá.—Ekliziastis 3:​19, 20.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya