ABỤ ÁKWÁ IHE NDỊ DỊ N’AKWỤKWỌ A 1 A kpọrọ Jeruselem nwaanyị isi mkpe Jeruselem tọgbọzi nkịtị, e nweghịkwa onye bi na ya (1) Mmehie Zayọn karịrị akarị (8, 9) Chineke ajụla Zayọn (12-15) E nweghị onye na-akasi Zayọn obi (17) 2 Jehova na-ewesa Jeruselem iwe Chineke emereghị Jeruselem ebere (2) Jehova dịzi ka onye iro Jeruselem (5) Jeremaya bere ákwá n’ihi Zayọn (11-13) Ndị na-agafe agafe ga na-akwa obodo maburu mma emo (15) Ndị iro Zayọn na-aṅụrị ọṅụ na e bibiela ya (17) 3 Jeremaya kwuru otú obi dị ya nakwa ihe ọ na-atụ anya ya ‘M ga-echere’ (21) Chineke na-eme ebere kwa ụtụtụ (22, 23) Chineke dị mma n’anya onye na-atụ anya ya (25) Ọ dị mma ka nwoke buru yok ya n’oge ọ bụ okorobịa (27) Chineke ji ígwé ojii gbochie ndị ya ịbịakwute ya (43, 44) 4 Ihe ndị mere Jeruselem n’oge a nọchibidoro ya Ụkọ nri (4, 5, 9) Ụmụ nwaanyị nọ na-esi ụmụ ha (10) Jehova egosila na ezigbo iwe ji ya (11) 5 Ndị Izrel kpere ekpere ka Chineke kpọghachi ha “Cheta ihe mere anyị” (1) “Anyị efuola, n’ihi na anyị emehiela!” (16) “Jehova, biko, kpọghachite anyị” (21) “Mee ka ihe dịrị anyị otú ọ dị n’oge gara aga” (21)