JEREMAYA
1 Ọ bụ Jeremaya* nwa Hilkaya, bụ́ otu n’ime ndị nchụàjà n’Anatọt,+ n’ala Benjamin, kwuru ihe ndị a. 2 Jehova gwara m okwu n’afọ nke iri na atọ n’ọchịchị Josaya+ nwa Emọn,+ bụ́ eze Juda. 3 Chineke gwakwara m okwu n’oge Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, na-achị. Ọ gwagidere m okwu ruo n’afọ nke iri na otu n’ọchịchị Zedekaya+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, ruokwa mgbe a dọọrọ ndị bi na Jeruselem n’agha n’ọnwa nke ise.+
4 Jehova gwara m, sị:
5 “Tupu mụ akpụọ gị n’ime afọ, ama m* gị.+
Tupu a mụọ gị,* edoro m gị nsọ.*+
Ahọpụtara m gị ka ị na-ebu amụma gbasara mba dị iche iche.”
6 Ma m sịrị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova!
Amaghị m okwu ekwu,+ n’ihi na abụ m nwata.”+
7 Jehova wee sị m:
“Asịla na ị bụ nwata.
Kama, gakwuru ndị niile m ga-ezi gị ka ị gakwuru,
Kwuokwa ihe niile m ga-asị gị kwuo.+
8 Mụnwa, bụ́ Jehova, na-agwa gị ka ị ghara ịtụ ihu ha ụjọ,+
N’ihi na anọnyeere m gị ka m napụta gị.”+
9 Jehova wee matịa aka ya metụ m n’ọnụ.+ Jehova gwakwara m, sị: “Etinyela m okwu m n’ọnụ gị.+ 10 Enyefeela m mba dị iche iche na alaeze dị iche iche n’aka gị. Ị ga na-efopụ ihe e kwesịrị ifopụ, na-akwada ihe e kwesịrị ịkwada, na-ebibi ihe e kwesịrị ibibi, na-etida ihe e kwesịrị itida, na-arụ ihe e kwesịrị ịrụ, na-akụkwa mkpụrụ e kwesịrị ịkụ.”+
11 Jehova gwakwara m okwu ọzọ, sị: “Jeremaya, gịnị ka ị na-ahụ?” Mụ asị ya: “M na-ahụ alaka osisi almọnd.”*
12 Jehova wee sị m: “Ị hụziri ya ahụzi, n’ihi na m mụ nnọọ anya iji mezuo ihe m kwuru.”
13 Jehova gwakwara m okwu nke ugboro abụọ, sị: “Gịnị ka ị na-ahụ?” Mụ asị ya: “M na-ahụ ite* nke ihe dị na ya na-agbọ agbọ,* ọnụ ya echeghịkwa ihu n’ebe ugwu.” 14 Jehova wee sị m:
“Ọdachi ga-esi n’ebe ugwu
Dakwasị ndị niile bi n’ala a.+
15 Jehova kwuru, sị, ‘M na-akpọkọta ezinụlọ niile si n’alaeze ebe ugwu.+
Ha niile ga-abịa. Eze nke ọ bụla n’ime ha ga-ebusakwa ocheeze ya
N’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem.+
Ha ga-etida mgbidi ya niile gbaa gburugburu,
Lụsokwa obodo niile dị na Juda agha.+
16 M ga-ama ndị m ikpe n’ihi ihe ọjọọ niile ha na-eme,
N’ihi na ha ahapụla m,+
Na-achụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà a na-esu ọkụ,+
Na-akpọkwara ọrụ aka ha isiala.’+
17 Ma gịnwa, jikere ime ihe i kwesịrị ime.*
Gaa gwa ha ihe niile m ga-agwa gị ka ị gwa ha.
Atụla ha ụjọ,+
Ka m ghara ime ka ụjọ jide gị n’ihu ha.
18 Taa, emeela m ka ị dị ka obodo a rụsiri ike,
Ogidi ígwè, na mgbidi ọla kọpa, ka i nwee ike kwụrụ ma kwuo ihe ga-eme ala a niile,+
Ihe ga-eme ndị eze Juda na ndị isi ya,
Nakwa ihe ga-eme ndị nchụàjà ya na ndị bi n’ala a.+
19 Ha ga-alụso gị ọgụ,
Ma ha agaghị emeri gị,
N’ihi na anọnyeere m gị+ ka m napụta gị. Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”
2 Jehova gwara m, sị: 2 “Gaa gwa ndị bi na Jeruselem, sị, ‘Jehova kwuru, sị:
“Ana m echeta nnọọ otú unu si jiri obi unu niile na-efe m* kemgbe unu bụ ụmụaka,+
Otú unu si hụ m n’anya mgbe m kwere unu nkwa na m ga-alụ unu+
Nakwa otú unu si na-eso m n’ala ịkpa,
N’ala a na-akụghị mkpụrụ ọ bụla.+
3 Ndị Izrel dị nsọ n’anya Jehova.+ Ha bụ mkpụrụ mbụ mịịrị ya.”’
‘A ga-ama onye ọ bụla ga-anwa ibibi ha ikpe.
Ọdachi ga-adakwasịkwa ya.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”+
4 Ezinụlọ Jekọb na ezinụlọ niile dị n’Izrel,
Nụrụnụ ihe Jehova kwuru.
5 Jehova kwuru, sị:
“Gịnị ka nna nna unu hà sị na m mere+
Nke mere ha ji nọrọ m n’ebe dị anya,
Na-esokwa arụsị ndị na-abaghị uru,+ hanwa aghọọkwa ndị na-abaghị uru?+
6 Ha asịghị, ‘Ka anyị chọwa Jehova,*
Onye si n’ala Ijipt kpọpụta anyị,+
Onye duuru anyị gafee ala ịkpa,
Gafee ọzara+ na olulu dị iche iche,
Gafee ala mmiri na-anaghị ezokarị+ na ala oké ọchịchịrị,
Gafee ala mmadụ na-agafetụbeghị,
Nke mmadụ na-ebitụbeghịkwa.’
Ma unu batara merụọ ala m.
Unu mekwara ka ihe m ketara bụrụ ihe rụrụ arụ.+
8 Ndị nchụàjà asịghị, ‘Ka anyị chọwa Jehova.’*+
Ndị na-akụziri ndị ọzọ Iwu m amaghị m.
Ndị ọzụzụ atụrụ nupụkwaara m isi.+
Ndị amụma buru amụma n’aha Bel,+
Sorokwa ndị na-agaghị abara ha uru ọ bụla.
9 Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụ ya mere m ga-eji na-agwa unu ihe unu mejọrọ,+
Na-agwakwa ụmụ ụmụ unu ihe ha mejọrọ.’
10 ‘Ma, gaanụ n’ala ndị dị n’ụsọ osimiri* nke ndị Kitim+ lee ihe unu ga-ahụ.
Zigakwanụ ozi na Kida+ ma cheenụ echiche nke ọma,
Ka unu mata ma ụdị ihe a ò metụla.
11 Ò nweela mba ji ihe ndị na-abụghị chi gbanwere chi ha?
Ma, ndị m ejirila ihe na-enweghị ike ịbara ha uru gbanwere mụnwa bụ́ Chineke dị ebube.+
12 Eluigwe, kporopụ anya na-ele ihe a,
Ka ezigbo ụjọ ji gị meekwa ka akpata oyi wụọ gị.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
13 ‘N’ihi na ndị m mere ihe abụọ dị njọ:
Ha ahapụla mụnwa, bụ́ isi iyi nke mmiri na-enye ndụ.+
Ha gwukwaara onwe ha olulu
Ndi gbawara agbawa na-agaghị echedoli mmiri.’
14 ‘Izrel ọ̀ bụ onye na-eje ozi ka ọ̀ bụ ohu a mụrụ n’ezinụlọ?
Gịnịzi mere e ji na-ebukọrọ ihe ya?
15 E nwere ọdụm ndị ji maka ya na-agbọ ụja.+
Ha na-agbọsi ụja ike.
Ha mere ka ala ya bụrụ ihe na-awụ akpata oyi.
Ha agbaala obodo ya niile ọkụ, nke mere na e nweghịzi onye bi na ha.
16 Ndị Nọf*+ na ndị Tapanis+ na-akwọcha gị isi.*
17 Ọ́ bụghị gị mere onwe gị ihe a,
Ebe ọ bụ na ị hapụrụ Jehova bụ́ Chineke gị+
N’oge o du gị na-eje n’ụzọ?
Gịnịkwa mere i ji aga n’ụzọ e si aga Asiria+
Ka ị ṅụọ mmiri Osimiri Yufretis?
19 I kwesịrị ịmụta ihe n’ihe ọjọọ ndị i mere.
A ga-adọ gị aka ná ntị maka isi i nupụrụ.
Marakwa na i meela ihe ọjọọ na ihe na-agbawa obi,+
N’ihi na ị hapụrụ mụnwa, bụ́ Jehova Chineke gị.
Ị tụghịkwa m ụjọ.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru ihe a.
Ma ị sịrị na ị gaghị efe m.
N’ugwu ọ bụla nakwa n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko+
Ka ị na-edina jaghee ụkwụ gị, na-agba akwụna.+
21 M kụrụ gị ka ezigbo mkpụrụ vaịn na-acha uhie uhie,+ nke na-emebighị emebi.
Oleezi otú i si gbanwee n’ihu m, ghọzie alaka mebiri emebi nke osisi vaịn ọhịa?’+
22 ‘I weregodị akanwụ na ncha hiri nne saa ahụ́,
Ị ka ga-abụ onye na-adịghị ọcha n’anya m n’ihi mmehie gị.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.
23 Gịnị mere ị ga-eji sị, ‘Emerụghị m onwe m,
Anaghịkwa m eso Bel’?
Cheta otú i si bie ndụ na ndagwurugwu.
Chetakwa ihe i mere.
Ị dị ka nne kamel dị garagara,
Nke na-agbagharị n’enweghị ebe ọ na-aga.
24 Ị dịkwa ka jakị ọhịa nke ala ịkpa maara ahụ́,
Nke na-esigharị imi na-achọ oké ga-agba ya.
Ònye ga-achụghachili ya azụ mgbe ọ chọrọ ka oké gbaa ya?
Ike ekwesịghị ịgwụ ndị na-achọ ya.
Mgbe oge* ya ruru, ha ga-achọta ya.
25 Kwụsị ịgba ọsọ, ma ọ́ bụghị ya, ị ga-agba ụkwụ ọtọ,
Akpịrị ga-akpọkwa gị nkụ.
Ma ị sịrị, ‘Ọ baghị uru!+
26 Dị ka ihere si eme onye ohi mgbe e jidere ya,
Otú ahụ ka ihere merela ndị Izrel,
Ma ha ma ndị eze ha ma ndị isi ha,
Ma ndị nchụàjà ha ma ndị amụma ha.+
Ma, ha na-agbakụta m azụ. Ha echeghị m ihu.+
Mgbe ọdachi dakwasịrị ha, ha ga-asị,
‘Bịa zọpụta anyị!’+
28 Juda, olee ebe chi ndị i meere onwe gị nọ?+
Ha bịa nyere gị aka ma ọ bụrụ na ha ga-azọpụtali gị n’oge ọdachi dakwasịrị gị.
N’ihi na chi gị dị ọtụtụ otú ahụ obodo gị dị ọtụtụ.+
29 Jehova kwuru, sị, ‘Gịnị mere unu ji na-esesa m okwu?
Gịnị mere unu niile ji nupụrụ m isi?’+
30 E nweghị uru ihe m tiri ụmụ gị bara.+
Ha anabataghị aka ná ntị m dọrọ ha.+
Mma agha unu bibiri ndị amụma unu+
Otú ọdụm si ebibi ihe.
31 Ọgbọ a, chebaranụ okwu Jehova echiche.
Àbụzi m ala ịkpa n’anya ndị Izrel,
Ka àbụzi m ala gbara oké ọchịchịrị n’anya ha?
Gịnị mere ndị a bụ́ ndị m ji sị, ‘Anyị tụsaara ahụ́ na-agagharị,
Anyị agaghịkwa abịakwute gị ọzọ’?+
32 Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ọ̀ ga-echefuli ihe o ji achọ mma?
Nwaanyị a na-alụ ọhụrụ ọ̀ ga-echefu ákwà ọ na-eke n’obi?
Ma, ọ dịla ezigbo anya ndị m chefuru m.+
33 Nwaanyị, gịnị mere i ji agbasi mbọ ike ka ụmụ nwoke hụ gị n’anya?
Ị zụọla onwe gị ịna-eme ihe ọjọọ.+
34 Ọbara ndị* ogbenye aka ha dị ọcha gbasara n’uwe mwụda gị.+
Ahụghị m ka ndị aka ha dị ọcha na-abanye n’ụlọ gị n’ike,
Ma, ọbara ha gbasachara n’uwe gị niile.+
35 Ma ị sịrị, ‘Aka m dị ọcha.
N’eziokwu, iwe Chineke na-ewesa m adajụọla.’
Ugbu a, m ga-ata gị ahụhụ
N’ihi na ị sịrị, ‘Emehieghị m.’
36 Gịnị mere i ji were na ụzọ gị na-akwụghị ọtọ bụ obere ihe?
Ha agaghị eme ka ihe gaziere gị.”
3 Ndị mmadụ na-ajụ, sị: “Ọ bụrụ na nwoke achụpụ nwunye ya, ya agaa lụọ di ọzọ, nwoke ahụ ò kwesịrị ịkpọrọ ya ọzọ?”
Ọ̀ bụ na e merụbeghị ala ahụ?+
“Gị na ọtụtụ ụmụ nwoke akwaala iko.+
Ị̀ ka kwesịrị ịlọghachikwute m?” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
2 “Lelie anya lee elu ugwu.
Olee ebe a na-anọbeghị dinaa gị n’ike?
Ị na-anọ ọdụ n’akụkụ ụzọ na-eche ụmụ nwoke,
Otú onye na-akwagharị akwagharị* na-esi akwagharị n’ala ịkpa.
I ji akwụna ị na-agba na ihe ọjọọ ị na-eme+
Na-emerụ ala a.
3 N’ihi ya, e meela ka mmiri kwụsị izo.+
E nweghịkwa ụla mmiri.
Ị dịzi ka* nwaanyị a lụ alụ na-agba akwụna ihere na-anaghị eme.
Ihere anaghị eme gị.+
5 Ị̀ ga-ebu iwe n’obi ruo mgbe ebighị ebi,
Ka ị̀ ga na-agụkọ mmehie anyị mgbe niile?’
Ihe a ka ị na-ekwu,
Ma, ị ka na-eme ihe ọjọọ niile i nwere ike ime.”+
6 N’oge Eze Josaya na-achị,+ Jehova gwara m, sị: “‘Ị̀ hụla ihe Izrel na-enupụ isi mere? Ọ na-aga n’ugwu ọ bụla dị elu nakwa n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko, ka ọ nọrọ ebe ndị ahụ na-agba akwụna.+ 7 N’agbanyeghịkwa ihe a niile o mere, m nọ na-agwa ya ka ọ lọghachikwute m,+ ma ọ lọghachikwuteghị m. Juda nọkwa na-ekiri nwanne ya nwaanyị na-aghọ aghụghọ.+ 8 Mgbe m hụrụ ihe o mere, m chụpụrụ Izrel na-enupụ isi, nye ya akwụkwọ m ji gbaa ya alụkwaghịm kpamkpam+ n’ihi iko ọ kwara.+ Ma, Juda bụ́ nwanne ya nwaanyị nke na-aghọ aghụghọ atụghị egwu. Kama, yanwa malitekwara ịga na-agba akwụna.+ 9 O weere akwụna ọ na-agba ka obere ihe. Ọ nọ na-emerụ ala a, ya na nkume na osisi ana-akwa iko.*+ 10 N’agbanyeghị ihe a niile, Juda bụ́ nwanne ya nwaanyị nke na-aghọ aghụghọ ejighị obi ya niile lọghachikwute m, kama ọ lọghachikwutere m n’ọnụ.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”
11 Jehova gwaziri m, sị: “Izrel na-enupụ isi bụ onye ezi omume karịa Juda na-aghọ aghụghọ.+ 12 Gaa n’ebe ugwu kwuo, sị:+
“‘“Jehova kwuru, sị, Izrel, onye na-enupụrụ m isi, lọghachi.”+ Jehova kwukwara, sị, ‘Agaghị m ewesa gị iwe,+ n’ihi na ana m akwụsi ike n’ihe m kwuru. Agaghị m ebu iwe n’obi ruo mgbe ebighị ebi. 13 Ma kweta na i mehiere, n’ihi na i nupụrụla Jehova bụ́ Chineke gị isi. Gị na ndị mba ọzọ* na-akwa iko n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko. I geghịkwa m ntị. Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’”
14 Jehova kwuru, sị, “Unu ụmụ na-enupụ isi, lọghachinụ, n’ihi na abụ m ezigbo nna unu ukwu.* M ga-akpọrọ unu. M ga-esi n’otu obodo kpọrọ otu onye, sikwa n’otu ezinụlọ kpọrọ mmadụ abụọ. M ga-akpọtakwa unu na Zayọn.+ 15 M ga-enye unu ndị ọzụzụ atụrụ na-eme ihe bụ́ uche m,*+ ha ga na-akụziri unu ihe, na-enyekwara unu aka ịghọta ihe. 16 Jehova kwukwara, sị, “N’oge ahụ, unu ga-amụ ọtụtụ ụmụ, ju ebe niile n’ala unu.+ Unu agaghịkwa asị, ‘Igbe ọgbụgba ndụ Jehova!’ Ọ gaghị abatakwa unu n’obi. Unu agaghịkwa echeta ya. Ọ gaghị agụ unu agụụ ịhụ ya. A gaghịkwa arụ ya ọzọ. 17 N’oge ahụ, ha ga-akpọ Jeruselem ocheeze Jehova.+ A ga-akpọkọta mba niile na Jeruselem ka ha too aha Jehova n’ebe ahụ.+ Ha agaghịzi akpọ ekwo nkụ na-eme ihe ọjọọ dị ha n’obi.”
18 “N’oge ahụ, ezinụlọ Juda na ezinụlọ Izrel ga-ejekọ ije.+ Ha ga-esokwa si n’ala dị n’ebe ugwu banye n’ala m nyere nna nna unu hà ka ọ bụrụ ihe ha ketara.+ 19 M nọ na-eche otú obi si dị m ụtọ iwere gị ka otu n’ime ụmụ m ndị nwoke ma nye gị ọmarịcha ala, ala kacha ala niile mba dị iche iche ketara mma.+ M nọkwa na-eche na ị ga na-akpọ m “Nna m” nakwa na ị gaghị akwụsị iso m. 20 ‘N’eziokwu, unu ndị Izrel ghọrọ m aghụghọ otú ahụ nwaanyị dị aghụghọ na-ahapụ di ya.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”
21 E nwere ụda a na-anụ n’elu ugwu.
Ọ bụ ụda ákwá ndị Izrel na-ebe na arịrịọ ha na-arịọ.
Otú ha si eme ihe akwụghị ọtọ.
Ha echefuola Jehova bụ́ Chineke ha.+
22 “Ụmụ na-enupụ isi, lọghachinụ.
M ga-eme ka unu kwụsị inupụ isi.”+
“Lee anyị! Anyị abịakwutela gị,
N’ihi na ọ bụ gị, Jehova, bụ Chineke anyị.+
23 N’eziokwu, anyị nọ na-eduhie onwe anyị mgbe anyị nọ na-eme mkpọtụ n’ugwu nta na n’ugwu ukwu dị iche iche.+
Nke bụ́ eziokwu bụ na nzọpụta Izrel dị n’aka Jehova Chineke anyị.+
24 Kemgbe anyị bụ ụmụaka, chi na-abaghị uru ọ bụla* na-ewekọrọ ihe nna nna anyị hà tara ahụhụ kpata,+
Ma ìgwè ewu na atụrụ ha, ma ìgwè ehi ha,
Ma ụmụ ha ndị nwoke ma ụmụ ha ndị nwaanyị.
25 Anyị kwesịrị idina ala, ihere ana-eme anyị.
Ka ihere anyị menyere onwe anyị kpuchie anyị,
N’ihi na anyị emehiela Jehova bụ́ Chineke anyị,+
Anyị na nna nna anyị hà, kemgbe anyị bụ ụmụaka ruo taa.+
Anyị emeghịkwa ihe Jehova bụ́ Chineke anyị gwara anyị mee.”
4 Jehova kwuru, sị, “Izrel, ọ bụrụ na ị lọghachi,
Ọ bụrụ na ị lọghachikwute m,
Ọ bụrụkwa na i wepụ arụsị gị dị iche iche na-asọ oyi n’ihu m,
A gaghịzi enwe ihe na-achụgharị gị.+
2 Ọ bụrụkwa na ị na-ekwu eziokwu, na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ezi omume ma na-aṅụ iyi, sị,
‘Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, ṅụọ iyi,’
Mgbe ahụ, ọ* ga-agọzi mba dị iche iche.
Ha ga-ejikwa ya na-anya isi.”+
3 N’ihi na Jehova gwara ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị:
“Kọọnụ ihe n’ala unu na-akọbeghị ihe.
Kwụsịkwanụ ịkụ mkpụrụ ebe ogwu dị.+
4 Ndị Juda na ndị bi na Jeruselem,
Debenụ onwe unu ọcha n’anya mụnwa bụ́ Jehova,
Ka iwe m ghara ịdị ọkụ
Ma ree unu, n’enweghị onye ga-emenyụ ya,
N’ihi àgwà ọjọọ unu.”+
5 Kọsaanụ ihe a na Juda, kwusaakwanụ ya na Jeruselem.
Tienụ mkpu, fụọkwanụ opi n’ala a niile.+
Tienụ ezigbo mkpu, sị: “Zukọtanụ,
Ka anyị gbaga n’obodo ndị a rụsiri ike.+
6 Gwunyenụ ihe ga-egosi ụzọ e si aga Zayọn.
Chọtanụ ebe unu ga-agbaba. Unu eguzola otu ebe,”
N’ihi na m ga-esi n’ebe ugwu mee ka e nwee ọdachi,+ nke ga-ebibi ọtụtụ ihe.
O sila n’obodo ya pụta ka o mee ka ala gị bụrụ ihe na-awụ akpata oyi.
Obodo gị niile ga-aghọ ikpo nkume. E nweghịkwa onye ga-ebi na ha.+
8 N’ihi ya, yirinụ ákwà iru uju,+
Ruwenụ uju,* bewekwanụ ákwá,
N’ihi na ezigbo iwe Jehova na-ewesa anyị adajụbeghị.
Ụjọ ga-atụ ndị nchụàjà, ihe na-emenụ ejukwa ndị amụma anya.”+
10 M kwuziri, sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! N’eziokwu, ị ghọgbuola ndị Juda na ndị bi na Jeruselem.+ Ọ fọrọ obere ka e jiri mma agha gbuo anyị,* ma, ị na-agwa anyị, sị, ‘Udo ga-adịrị unu.’”+
11 N’oge ahụ, a ga-agwa ndị Juda, gwakwa ndị bi na Jeruselem, sị:
“E nwere ifufe na-ekpo ọkụ nke si n’ugwu ndị dị n’ọzara
Fere na-aga ebe ndị m* nọ.
O feghị na-abịa ka ọ fụchaa ihe ma ọ bụ ka o mee ka ihe dị ọcha.
12 Ọ bụ m mere ka ifufe ahụ nke na-efesi ike si ebe ndị ahụ fere na-abịa.
Ugbu a, m ga-agwa ndị m ihe m kpebiri ime ha.
13 Ndị iro unu ga-abịa otú mmiri rujuru n’ígwé si ebido izo.
Ụgbọ ịnyịnya ha dịkwa ka oké ifufe.+
Ịnyịnya ha na-efe ọsọ karịa ugo.+
Anyị efuola, n’ihi na a ga-ebibi anyị!
14 Jeruselem, sachapụ ihe ọjọọ n’obi gị, ka a zọpụta gị.+
Olee mgbe ị ga-akwụsị ịna-eche ihe ọjọọ n’obi gị?
16 Gwanụ mba dị iche iche gbasara ya.
Kọsaanụ ya na Jeruselem.”
“Ndị nche* si n’ala dị anya na-abịa.
Ha ga-etikwa mkpu agha iji lụso obodo ndị dị na Juda agha.
17 Ha agbaala Jeruselem gburugburu otú ndị na-eche ubi nche si agba ubi ha na-eche nche gburugburu,+
N’ihi na ndị bi na ya enupụrụla m isi.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
18 “A ga-ata gị ahụhụ maka otú i si akpa àgwà na ihe ndị ị na-eme.+
Ọdachi nke ga-adakwasị gị ga-adị egwu,
N’ihi na isi ị na-enupụrụ m si gị n’ala ala obi.”
Obi na-egbusi m mgbu ike.
Obi na-akụ m kpum kpum.
20 A na-akọ akụkọ ọdachi ndị na-eme, otu mechaa, ibe ya esochie,
N’ihi na e bibiela ala a niile.
E bibiela ụlọikwuu m na mberede.
E bibiekwala ákwà ụlọikwuu m n’otu ntabi anya.+
Ha amaghị m.
Ha bụ ụmụ na-amaghị ihe. Ha anaghịkwa aghọta ihe.
Ụbụrụ na-aghọ ha nkọ* ma a bịa n’ime ihe ọjọọ,
Ma, ha amaghị otú e si eme ihe ọma.”
23 Mgbe m lere anya n’ala ha, ọ tọgbọ chakoo, bụrụkwa ebe e bibiri ebibi.+
Mgbe m lekwara anya n’eluigwe, ìhè ya adịghịzi.+
24 Mgbe m lere anya n’ugwu dị iche iche, ha nọ na-ama jijiji.
Ugwu nta dị iche iche nọkwa na-ama jijiji.+
25 Elere m anya, ma, e nweghị onye m hụrụ.
Nnụnụ niile efepụchaakwala.+
26 Ahụkwara m na ebe a kụrụ mkpụrụ osisi aghọọla ala ịkpa.
E bibiekwala obodo ndị dị n’ala a.+
Ọ bụ Jehova bibiri ha
N’ihi ezigbo iwe ji ya.
28 N’ihi ya, ala ahụ ga-eru uju.+
Eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị.+
Ọ bụ n’ihi na ekwuola m ya. Ekpebiela m ya.
Agaghị m agbanwe obi m.* Agaghịkwa m ahapụ ime ya.+
Ha na-agbaba n’ọhịa dị iche iche,
Ha na-agbagokwa n’elu nnukwu nkume dị iche iche.+
Ha agbapụla n’obodo niile.
E nweghịkwa onye bi na ha.”
30 Ugbu a e bibiri ihe niile i nwere, gịnị ka ị ga-eme?
Ị na-eyibu ákwà dị oké ọnụ.
Ị na-ejibu ihe e ji achọ mma e ji ọlaedo mee achọ onwe gị mma.
Ị na-etebu uri anya ka anya gị maa ezigbo mma.
Ma, ọ bụ n’efu ka ị nọ na-achọ onwe gị mma,+
N’ihi na ndị ọ na-agụ agụụ ka gị na ha kwaa iko ajụla gị.
31 N’ihi na m nụrụ olu yiri nke nwaanyị ahụ́ na-egbu mgbu,
Ya bụ, mkpu ákwá nke na-ada ka nke nwaanyị na-amụ nwa mbụ ya.
Ọ bụ olu Zayọn,* onye ọ na-esiri ike ikute ume.
Ọ gbasara ọbụ aka ya, na-asị:+
“Efuola m, maka na ike agwụla m* n’ihi ndị na-egbu mmadụ!”
5 Gagharịanụ n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem.
Legharịakwanụ anya nke ọma.
E nwee, m ga-agbaghara obodo a.
2 Ọ bụrụgodị na ha asị: “Anyị ji Jehova bụ́ Chineke dị ndụ na-aṅụ iyi!”
Ha ka ga na-aṅụ iyi ụgha.+
3 Jehova, ọ́ bụghị ndị na-erubere gị isi ka anya gị na-achọ ịhụ?+
I tiri ha ihe, ma o metụghị ha n’ahụ́.*
I bibiri ọtụtụ n’ime ha, ma ha anabataghị aka ná ntị ị dọrọ ha.+
Ha mere ka ihu ha sie ike karịa oké nkume.+
Ha jụrụ ịlọghachikwute gị.+
4 Ma m gwara onwe m, sị: “N’eziokwu, ndị a amaghị nke a na-akọ.
Ha zuzuru nzuzu, n’ihi na ha amaghị uche* Jehova,
Ya bụ, ihe Chineke ha chọrọ ka ha mee.
5 M ga-agakwuru ndị a ma ama ma gwa ha okwu,
N’ihi na hanwa amarala uche Jehova,
Ya bụ, ihe Chineke ha chọrọ ka ha mee.+
Ma, ha niile agbajiela yok ha,*
Dọbichaakwa agbụ e kere ha.”
6 Ọ bụ ya mere ọdụm ji esi n’oké ọhịa apụta na-adọri ha.
Anụ ọhịa wolf esikwa n’ọzara na-emebisị ihe ha nwere.
Agụ owuru mụkwa anya makpuru n’obodo ha dị iche iche.
Ọ na-adọgbu onye ọ bụla si n’ime ha na-apụta.
N’ihi na mmehie ha dị ọtụtụ.
Ha enupụkwala isi ọtụtụ ugboro.+
7 Olee otú m ga-esi gbaghara gị ihe a?
Ụmụ gị ahapụla m.
Ha na-ejikwa chi ndị na-abụghị Chineke aṅụ iyi.+
M na-enye ha ihe ọ bụla dị ha mkpa,
Ma ha nọ na-akwa iko.
N’ụlọ nwaanyị akwụna ka ha na-ekworo aga.
8 Ha dị ka oké ịnyịnya ọ dị ọkụ n’ahụ́ ịgba nne ịnyịnya.
Onye nke ọ bụla na-ebe ubé ka ịnyịnya wee na-achụ nwunye onye ọzọ.+
9 Jehova kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ime ka ha zaa ajụjụ maka ihe ndị a?
Ka ọ̀ bụ na mụ* ekwesịghị ịta mba dị otú a ahụhụ maka ihe ha na-eme?”+
Gbupụnụ alaka ya ndị pulitere ọhụrụ,
N’ihi na ọ bụghị Jehova nwe ha.
12 “Ha agọnahụla Jehova, na-asịkwa:
Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị anyị.
Anyị agaghị ahụ agha ma ọ bụ ụnwụ.’+
13 Ndị amụma ha dị ka ifufe.
Okwu Chineke adịghịkwa n’obi ha.
Ka ha laakwa n’iyi.”
14 Ọ bụ ya mere Jehova, bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha, ji kwuo, sị:
“Ebe ọ bụ na ndị a na-ekwu ihe a,
M ga-eme ka okwu m ghọọ ọkụ n’ọnụ gị.+
Ndị a ga-abụkwa nkụ.
Ọkụ ahụ ga-eregbukwa ha.”+
15 Jehova kwuru, sị, “Ndị Izrel, m ga-eme ka mba si ebe dị anya bịa lụso unu agha.+
Ọ bụ mba dịterela aka,
Mba dịwara kemgbe oge ochie,
Mba unu na-amaghị asụsụ ha,
Mba unu na-enweghịkwa ike ịghọta ihe ha na-ekwu.+
16 Akpa akụ́ ha dị ka ili ghere oghe.
Ha niile bụ ndị dike n’agha.
17 Ha ga-erichapụ ihe unu wetara n’ubi na ihe oriri unu.+
Ha ga-egbu ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị.
Ha ga-erichapụ ìgwè ewu na atụrụ unu na ìgwè ehi unu.
Ha ga-erichapụ osisi vaịn unu na osisi fig unu.
Ha ga-eji mma agha bibie obodo unu dị iche iche a rụsiri ike, bụ́ ndị kara unu obi.”
18 Jehova kwukwara, sị, “N’agbanyeghị ihe ndị a niile ga-eme unu n’oge ahụ, agaghị m ebibi unu kpamkpam.+ 19 Ọ bụrụkwa na ha ajụọ, sị, ‘Gịnị mere Jehova bụ́ Chineke anyị ji mee anyị ihe a niile?’ ị ga-asị ha, ‘Otú ahụ unu hapụrụ m gaa na-efe chi ndị mba ọzọ n’ala unu, otú ahụ ka unu ga na-ejere ndị mba ọzọ ozi ná mba na-abụghị nke unu.’”+
20 Kọọnụ ihe a n’ezinụlọ Jekọb,
Kọsaakwanụ na Juda, sị:
21 “Ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche, nụrụnụ ihe a:+
Unu nwere anya ma unu anaghị ahụ ụzọ.+
Unu nwere ntị ma unu anaghị anụ ihe.+
22 Jehova kwuru, sị, ‘Gịnị mere na unu anaghị asọpụrụ m?
Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị ịma jijiji n’ihi m?
Ọ bụ mụnwa ji ájá kpaara oké osimiri ókè.
Ọ ga-adịgidekwa otú ahụ. Ọ gaghị asọfeli ókè ya.
Ọ bụ eziokwu na mmiri ya ga na-amali elu, ma ọ gaghị asọfeli ókè ya.
Ọ bụ eziokwu na ọ na-eme mkpọtụ, ma ọ gaghị asọfeli ókè ya.+
23 Ma obi ndị a kpọchiri akpọchi. Ha na-enupụkwa isi.
Ha ahapụla m, na-eme ihe ọ bụla masịrị ha.+
24 Ha anaghịkwa ekwu n’obi ha, sị:
“Ka anyị tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke anyị,
Onye na-eme ka mmiri zoo n’oge ya,
Ma n’ụbịa mmiri ma n’ụla mmiri.
Ọ bụkwa ya na-ahụ na anyị nwere izu a kapịrị ọnụ anyị ga-eji wee ihe ubi anyị.”+
25 Omume ọjọọ unu emeela ka unu ghara inweta ezigbo ihe ndị a.
Mmehie unu emeela ka ihe ọma ghara iru unu aka.+
26 N’ihi na e nwere ụfọdụ n’ime ndị m bụ́ ndị ajọ omume.
Ha na-enyogharị anya, dị ka mgbe ndị na-achụ nta nnụnụ hulatara ala.
Ha na-esi ọnyà nwere ike igbu mmadụ.
Ọ bụ ndị mmadụ ka ha na-amata n’ọnyà.
Ọ bụ ya mere ha ji bụrụ ndị ukwu ma baa ọgaranya.
28 Ha ebuola ibu, ahụ́ ha ana-akwọkwa mụrụmụrụ.
Ihe ọjọọ ha na-eme karịrị akarị.
Ha anaghị ekpechite ọnụ nwa na-enweghị nna,+
Maka na ha na-achọ ka ihe na-agaziri hanwa.
Ha na-ekpekwa ndị ogbenye ikpe mkpegbu.’”+
29 Jehova kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ime ka ha zaa ajụjụ maka ihe ndị a?
Ka ọ̀ bụ na mụ* ekwesịghị ịta mba dị otú a ahụhụ maka ihe ha na-eme?
30 A kpaala arụ n’ala a, meekwa ihe jọgburu onwe ya na ya:
31 Ndị amụma na-ebu amụma ụgha.+
Ndị nchụàjà na-ejikwa ikike ha nwere emegbu ndị mmadụ.
Ọ dịkwa ndị m mma otú ahụ.+
Ma, gịnị ka unu ga-eme mgbe ihe ndị a niile ga-ebi?”
6 Ụmụ Benjamin, sinụ na Jeruselem gbapụ ka ihe ọ bụla ghara ime unu.
Mụnyenụ ọkụ na Bet-hakirem ka ọ bụrụ ihe ga-agba àmà,
N’ihi na ọdachi si n’ebe ugwu na-abịa. Ọ ga-abụ nnukwu ọdachi.+
2 Zayọn* yiri nwaanyị mara mma nke a zụtọrọ azụtọ.+
3 Ndị ọzụzụ atụrụ na ìgwè atụrụ ha ga-abịa.
Ha ga-ama ụlọikwuu ha gburugburu ya.+
Atụrụ onye nke ọ bụla n’ime ha na-ata ahịhịa dị n’ebe onye na-azụ ya nọ.+
Bilienụ ka anyị lụso ya agha n’etiti ehihie.”
“Anyị efuola, n’ihi na chi ejiwela.
Chi na-ejikwu n’ike n’ike.”*
6 N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị:
“Gbutuonụ osisi dị iche iche, jirikwanụ ájá rụọ mgbidi gburugburu mgbidi Jeruselem iji lụso ya agha.+
Ọ bụ obodo nke ga-azarịrị ajụjụ ihe o metara.
Naanị ihe a na-eme n’ime ya bụ imegbu ndị mmadụ.+
7 Otú ahụ e si ahụ mmiri jụrụ oyi n’olulu mmiri,
Ka e si ahụ ihe ọjọọ na Jeruselem.
A na-anụ mkpọtụ ndị tigbuo zọgbuo na mkpọtụ ndị na-ebibisị ihe n’ime ya.+
M na-ahụ ọrịa na ọdachi mgbe niile.
8 Jeruselem, nabata aka ná ntị m na-adọ gị, ma ọ́ bụghị ya, m* ga-agbakụta gị azụ ka ihe a na-asọ oyi.+
M ga-eme ka ị tọgbọrọ nkịtị, a gharakwa inwe mmadụ ọ bụla ga-ebi na gị.”+
9 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị:
“Ndị iro ga-akpụrụ ndị Izrel fọdụrụ, ka à ga-asị na ha bụ mkpụrụ vaịn ndị ikpeazụ a na-atụtụkọrọ.
Ndị iro ha ga-akpụrụ ha niile laa, otú ahụ onye na-aghọ mkpụrụ vaịn ndị dị n’alaka osisi vaịn si ekpokọrọ ha niile.”
10 “Ole ndị ka m ga-agwa okwu, dọọkwa aka ná ntị?
Ònye ga-ege m ntị?
Ntị ha akpọchiela.* Ọ bụ ya mere na ha enweghị ike ịṅa ntị.+
Ha ji okwu Jehova eme ihe ọchị.+
Okwu ya anaghị atọ ha ụtọ.
11 Iwe juru m obi otú o juru Jehova.
Ike agwụkwala m ịgbachi nkịtị.”+
“Gwa nwatakịrị nọ n’okporo ámá na ezigbo iwe ji m.+
Gwakwa ya ụmụ okorobịa ndị gbakọrọ otu ebe.
A ga-ejide ha niile, ma nwoke ma nwunye ya,
Ma onye mere agadi ma onye kara ezigbo nká.+
M ga-amatị aka mee ndị bi n’ala a ihe.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
13 “Onye ọ bụla n’ime ha, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu, na-eji aghụghọ achọ ihe ga-abara naanị ya uru.+
Onye ọ bụla n’ime ha na-egwu wayo, ma onye amụma ma onye nchụàjà.+
14 Ha na-achọ ịgba ndị m ọkpụkpụ, ma ha ejighị ya kpọrọ ihe. Ha na-asị,
‘Udo dị! Udo dị!’
Mgbe udo na-adịghị.+
15 Ihere ọ̀ na-eme ha na ọ bụ arụ ka ha mere?
Ihere anaghị eme ha ma otu.
Ha amaghịdị ihe bụ́ ihere ime mmadụ.+
N’ihi ya, ha ga-eso ndị dara ada daa.
Ha ga-ada mgbe m ga-ata ha ahụhụ.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
16 Jehova kwukwara, sị:
“Guzoronụ ebe ụzọ gbara mkpị lee anya,
Jụọnụ ajụjụ okporo ụzọ ndị dịwara kemgbe oge ochie.
Ma unu na-asị: “Anyị agaghị eje ije na ya.”+
Ma unu nọ na-asị: “Anyị agaghị aṅa ntị.”+
18 “N’ihi ya, mba dị iche iche, nụrụnụ.
Ununwa ndị gbakọrọnụ, marakwanụ
Ihe ga-eme ndị bi na Jeruselem.
19 Ndị bi n’ụwa, geenụ ntị!
M na-eme ka ọdachi dakwasị ndị a+
N’ihi echiche ọjọọ ha na-eche.
Ha aṅaghị ntị n’okwu m.
Ha anabataghịkwa iwu m.”*
20 “Olee nke gbasara m na unu na-eweta frankinsens si Shiba,
Na-ewetakwa okpete na-esi ísì ọma nke si n’obodo dị anya?
Àjà a na-esucha ọkụ unu na-achụ adịghị mụ mma,
Àjà ndị ọzọ unu na-achụ adịghịkwa mụ mma.”+
21 N’ihi ihe a, Jehova kwuru, sị:
“M na-edowere ndị a ihe ga-eme ka ha daa.
Ọ ga-akwadakwa ha,
Ma ndị nna ma ụmụ ha,
Mmadụ na ibe ya.
Ha niile ga-ala n’iyi.”+
22 Jehova kwuru, sị:
“E nwere ndị si n’ala dị n’ebe ugwu na-abịa.
E nwekwara nnukwu mba a ga-esi n’ime ime ụwa kpọtee.+
23 Ha ga-eji ụta na árọ̀ abịa.
Obi tara ha mmiri. Ha agaghịkwa eme ebere.
Ha ga-ebigbọ ka oké osimiri.
Ha ga-agbarakwa ịnyịnya bịa.+
Ha na-ahazi onwe ha n’usoro ịlụso Zayọn* agha ka à ga-asị na ha bụ otu onye.”
24 Anyị anụla akụkọ gbasara ya.
Ike agwụla anyị.+
Anyị nọ n’ezigbo ahụhụ.
Ahụ́ na-egbu anyị mgbu ka nwaanyị na-amụ nwa.+
Ụjọ jikwa ndị mmadụ n’ebe niile.
26 Ndị m, yirinụ ákwà iru uju.+
Tụrụọkwanụ onwe unu ná ntụ.
Ruonụ ụdị uju a na-eru ma nwa a mụrụ naanị ya nwụọ. Na-etikwanụ mkpu ka ndị obi gbawara,+
N’ihi na e nwere onye ga-abịa na mberede bibie anyị.+
27 “Ahọpụtala m gị* ka ị dị ka onye na-anụcha ọla, n’ihi na ị ga-anụcha ndị m.
Ị ga-eleru ha anya,
Chọpụta nnọọ ihe ha na-eme.
28 Ha niile dị isi ike karịa mmadụ niile.+
Ha na-agagharị na-ekwutọsị ibe ha.+
Ha dị ka ọla kọpa na ígwè.
Ha niile emebiela.
29 Mmadụ ejirila ihe e ji afụnwu ọkụ fụnwuo ọkụ ka ọ nụchaa ọla.
Ka ọ nọ na-afụnwu ya, ihe ahụ o ji afụnwu ọkụ eree ọkụ. Mbọ niile ọ gbara alaa n’iyi.+
Naanị nkume led ka o nwetara n’ọkụ ahụ.
E kewabeghị ndị ọjọọ ka ha nọrọ iche n’ebe ndị ọzọ nọ.+
7 Jehova gwara Jeremaya okwu, sị: 2 “Gaa guzoro n’ọnụ ụzọ ámá ụlọ Jehova, nọrọkwa ebe ahụ kwuo, sị, ‘Unu ndị Juda niile, ndị na-esi n’ọnụ ụzọ ámá a abanye ịga kpọọrọ Jehova isiala, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. 3 Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu emee ka àgwà unu na omume unu dị mma, m ga-ahapụ unu ka unu biri ebe a.+ 4 Unu etinyela obi n’okwu ga-eduhie unu, na-asị: ‘Ihe a bụ ụlọ nsọ Jehova. Ọ bụ ụlọ nsọ Jehova. Ọ bụ ụlọ nsọ Jehova!’+ 5 Ọ bụrụ na unu akpawa ezigbo àgwà, mewekwa omume dị mma, ọ bụrụ na unu ana-ekpe ikpe ziri ezi ma mmadụ na ibe ya nwee okwu,+ 6 ọ bụrụ na unu anaghị emegbu onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nne na nna* na nwaanyị isi mkpe,+ ọ bụrụ na unu anaghị egbu ndị aka ha dị ọcha n’ala a, ọ bụrụkwa na unu agaghị fewe chi ọzọ dị iche iche ma kpatara onwe unu nsogbu,+ 7 m ga-ahapụ unu ka unu biri n’ala a, bụ́ ala m nyere nna nna unu hà ka ha biri ruo mgbe ebighị ebi.”’”*
8 “Ma, unu tinyere obi unu n’okwu ụgha+ na-enweghị otu mkpụrụ uru ọ ga-abara unu. 9 Ùnu ga na-ezu ohi,+ na-egbu mmadụ,* na-akwa iko, na-aṅụ iyi ụgha,+ na-achụrụ Bel àjà,+ na-efekwa chi dị iche iche unu na-amaghị, 10 n’agbanyeghị arụ a niile unu na-akpa, unu abịakwa guzoro n’ihu m n’ụlọ a a na-anọ eto aha m, sị, ‘A ga-anapụta anyị?’ 11 Ụlọ a a na-anọ eto aha m ọ̀ ghọọlara unu ọgba ndị ohi?+ Ahụla m ihe unu na-eme.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
12 “‘Ma ugbu a, gaanụ n’ụlọ m dị na Shaịlo,+ bụ́ ebe m họọrọ na mbụ ka a nọrọ na-eto aha m,+ ka unu hụ ihe m mere ya n’ihi ihe ọjọọ ndị Izrel bụ́ ndị m mere.+ 13 Jehova kwuru, sị, ‘Unu nọ na-eme ihe ọjọọ ndị a niile, unu egeghịkwa mụ ntị n’agbanyeghị na m gwara unu okwu ugboro ugboro.+ M nọkwa na-akpọ unu, ma unu azaghị.+ 14 N’ihi ya, ihe m mere Shaịlo+ ka m ga-eme ụlọ a kara unu obi+ a na-anọ eto aha m,+ bụ́ ebe m nyere unu na nna nna unu hà. 15 M ga-achụpụ unu n’ihu m, otú ahụ m chụpụrụ ụmụnne unu niile, ya bụ, ụmụ Ifrem niile.’+
16 “Ma gịnwa bụ́ Jeremaya, ekpekwala ekpere maka ndị a. Ebesarala m ákwá n’ihi ha ma ọ bụ kpeere ha ekpere. Arịọkwala m arịrịọ maka ha,+ n’ihi na agaghị m ege gị ntị.+ 17 Ọ̀ bụ na ị naghị ahụ ihe ha na-eme n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem? 18 Ụmụ na-akpata nkụ, ndị nna ana-emenwu ọkụ, ndị nwunye ana-agwọ ntụ ọka ha ga-eji mee achịcha e ji achụrụ chi ha na-akpọ Eze Nwaanyị nke Eluigwe* àjà.+ Ha na-achụkwara chi ọzọ dị iche iche àjà mmanya iji kpasuo m iwe.+ 19 Jehova kwuru, sị, ‘Ọ̀ bụ m ka ha na-emebiri ihe? Ọ́ bụghị onwe ha ka ha na-emebiri ihe, na-emenyekwa ihere?’+ 20 N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘M ga-eji iwe na ọnụma mee obodo a ihe,+ ma mmadụ ma anụ ọhịa ma osisi dị n’ọhịa ma ihe ala mepụtara. Iwe m ga-ewesa ha ga-adị ka ọkụ. A gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.’+
21 “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Tawanụ anụ unu chọrọ iji achụ àjà a na-esucha ọkụ na anụ unu chọrọ iji achụ àjà ndị ọzọ.+ 22 N’ihi na agwaghị m nna nna unu hà ihe ọ bụla gbasara àjà a na-esucha ọkụ na àjà ndị ọzọ ụbọchị ahụ m si n’Ijipt kpọpụta ha.+ Enyeghịkwa m ha iwu ọ bụla gbasara ha. 23 Kama, m gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na unu erubere m isi, m ga-abụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị m.+ Ọ bụrụkwa na unu edebe iwu niile m nyere unu, ihe ga-agaziri unu.”’+ 24 Ma ha egeghị ntị. Ha atọghịkwa ntị n’ala.+ Kama, ha nọ na-eme ihe masịrị ha. Ha kpọchiri ntị na-eme ihe ọjọọ dị ha n’obi,+ na-emekwu ihe ọjọọ, kama ime ihe dị mma. 25 Otú a ka ha si na-eme malite n’ụbọchị nna nna unu hà si n’Ijipt pụta ruo taa.+ Kwa ụbọchị, m nọ na-ezigara ha ndị ohu m niile bụ́ ndị amụma ugboro ugboro.+ 26 Ma ha egeghị m ntị, ha atọghịkwa ntị n’ala,+ kama ha kpọchiri obi ha. Ha nọkwa na-eme ihe ọjọọ karịa ndị nna nna ha.
27 “Ị gwagodị ha ihe a niile,+ ha agaghị ege gị ntị. Ị kpọgodị ha òkù, ha agaghị aza gị. 28 N’ihi ya, gwa ha, sị, ‘Mba a bụ mba na-erubereghị Jehova bụ́ Chineke ha isi. Ha anabataghịkwa aka ná ntị ọ dọrọ ha. E nweghịzi onye na-erubere Chineke isi. E nweghịdị onye na-ekwute okwu irubere ya isi.+
29 “Kpụọ isi gị, chịfuokwa ntutu gị. Nọrọ n’elu ugwu ọhịa na-adịghị bụọ abụ iru uju, n’ihi na Jehova ajụla ọgbọ a kpasuru ya iwe. Ọ gbahapụkwala ha. 30 Jehova kwuru, sị, ‘Ndị Juda emeela ihe dị njọ n’anya m. Ha emerụọla ụlọ a na-anọ eto aha m n’ihi na ha dowere arụsị ha ndị na-asọ oyi na ya.+ 31 Ha arụọla ebe ndị dị elu na Tofet nke dị na Ndagwurugwu Nwa Hinọm.*+ Ha na-anọ ebe ahụ akpọ ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị ọkụ.+ Ihe a ha na-eme abatatụbeghị m n’obi.* Ọ bụghịkwa mụnwa gwara ha mewe ya.’+
32 “Jehova kwuru, sị, ‘N’ihi ya, oge na-abịa mgbe a na-agaghịzi na-akpọ ya Tofet ma ọ bụ Ndagwurugwu Nwa Hinọm,* kama, a ga na-akpọzi ya Ndagwurugwu Igbu Mmadụ. A ga na-eli ozu na Tofet ruo mgbe ebe a ga-eli ozu na-adịghịzi.+ 33 Ozu ha ga-aghọrọ nnụnụ na anụ ọhịa ihe oriri. E nweghịkwa onye ga-achụpụ ha.+ 34 M ga-eme ka ha kwụsị iti mkpu ọṅụ na mkpu ndị obi dị ụtọ ha na-eti n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem. M ga-emekwa ka a ghara ịnụ olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ.+ Ala a ga-abụzi ala e bibiri ebibi.’”+
8 Jehova kwuru, sị, “N’oge ahụ, ndị mmadụ ga-aga ebe e liri ndị eze Juda, ndị isi ya, ndị nchụàjà, ndị amụma, na ndị bi na Jeruselem, chịpụta ọkpụkpụ ha. 2 Ha ga-agbasa ọkpụkpụ ndị ahụ n’okpuru anyanwụ na ọnwa nakwa n’okpuru kpakpando niile dị n’eluigwe.* Ha ji ihe ndị a kpọrọ ihe, na-efe ha, na-achọ ka ha na-edu ha, na-akpọkwara ha isiala.+ A gaghị achịkọta ha. A gaghịkwa eli ha eli. Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala.”+
3 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, “N’ebe ọ bụla m ga-achụga ndị fọrọ n’ezinụlọ ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ịnwụ kama ịdị ndụ.”
4 “Ị ga-asịkwa ha na Jehova kwuru, sị:
‘Hà ga-ada ghara ibili ọzọ?
Ọ bụrụ na otu onye alọghachi, onye nke ọzọ ọ́ gaghị alọghachi?
5 Gịnị mere ndị a bi na Jeruselem ji kpọọ ekwo nkụ na-enupụrụ m isi?
Ha achọghị ịkwụsị ịghọ aghụghọ.
Ha ajụla ịlọghachi.+
6 Anọ m na-aṅa ntị, na-egekwa ntị n’ihe ha na-ekwu. Ma, ihe ha nọ na-ekwu adịghị mma.
E nweghị onye n’ime ha chegharịrị, hapụ ihe ọjọọ ọ na-eme, ma ọ bụ jụọ, sị, ‘Gịnị ka m mere ihe a?’+
Onye ọ bụla n’ime ha anaghị egbu oge iso ndị ọzọ na-eme ihe ha na-eme, otú ahụ ịnyịnya na-anaghị egbu oge agbaga n’ọgbọ agha.
7 Ụgbala ọcha* ma oge o kwesịrị iji fega ebe ọzọ.
Nduru, elekentịọba, na nza* na-efelata n’oge ha kwesịrị ifelata.
Ma, ndị m amaghị mgbe mụnwa bụ́ Jehova ga-ekpe ha ikpe.”+
8 ‘Gịnị mere unu ga-eji sị: “Anyị ma ihe, anyị makwa iwu* Jehova”?
N’eziokwu, naanị ihe ndị odeakwụkwọ na-eji mkpịsị akwụkwọ+ ha ede bụ ihe na-abụghị eziokwu.
Ụjọ atụwala ha. A ga-ejidekwa ha.
Ha ajụla okwu Jehova.
Olee ụdị amamihe ha nwere?
N’ihi na onye ọ bụla n’ime ha na-eji aghụghọ achọ ihe ga-abara naanị ya uru, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu.+
Onye ọ bụla n’ime ha na-egwu wayo, ma onye amụma ma onye nchụàjà.+
11 Ha na-achọ ịgba ndị m ọkpụkpụ, ma ha ejighị ya kpọrọ ihe. Ha na-asị,
“Udo dị! Udo dị!”
Mgbe udo na-adịghị.+
12 Ihere ọ̀ na-eme ha na ọ bụ arụ ka ha mere?
Ihere anaghị eme ha ma otu.
Ha amaghịdị ihe bụ́ ihere ime mmadụ.+
N’ihi ya, ha ga-eso ndị dara ada daa.
Ha ga-ada mgbe m ga-ata ha ahụhụ.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
13 Jehova kwukwara, sị, ‘Mgbe m ga-achịkọta ha, m ga-ebibi ha.
Mkpụrụ ọ bụla agaghị afọ n’osisi vaịn na n’osisi fig. Akwụkwọ ha ga-akpọnwụkwa.
Ha ga-agbara aka ihe m nyere ha.’”
14 “Gịnị ka anyị nọ ọdụ ebe a na-eme?
Ka anyị zukọta banye n’obodo a rụsiri ike,+ ma nwụọ ebe ahụ.
N’ihi na Jehova bụ́ Chineke anyị ga-ebibi anyị.
Ọ na-enye anyị mmiri e tinyere nsí ka anyị ṅụọ,+
N’ihi na anyị emehiela Jehova.
15 Anyị nọ na-atụ anya udo, ma e nweghị ihe ọma merenụ.
Anyị nọ na-atụ anya ka a gwọọ anyị, ma ezigbo ụjọ jidere anyị.+
16 A na-anụ ka ịnyịnya ndị iro na-eku ume ọkụ ọkụ na Dan.
Ubé oké ịnyịnya ndị iro na-ebe
Na-eme ka ala a niile na-ama jijiji.
Ndị iro abatala ibibi ala a na ihe niile dị na ya.
Ha abatala ibibi obodo a na ndị bi na ya.”
17 “M na-ezitere unu agwọ,
Ya bụ, agwọ ọjọọ ndị a na-agaghị aratali.
Ha ga-atakwa unu.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
18 A gaghị akwụsịli uju m na-eru.
Obi agbawaala m.
19 Ndị m nọ n’ala dị anya
Na-eti mkpu ka e nyere ha aka, sị:
“Ọ̀ bụ na Jehova anọghị na Zayọn?
Ka ọ̀ bụ na eze Zayọn anọghị n’ime ya?”
“Gịnị mere ha ji na-akpasu m iwe, na-efe arụsị ha a pịrị apị
Na chi na-abaghị uru ndị mba ọzọ na-efe?”
20 “Oge e ji ewe ihe ubi agafeela, oge ọkọchị agafeekwala,
Ma a zọpụtabeghị anyị.”
21 Ahụ́ ndị m merụrụ na-agbawa m obi.+
Ike ụwa agwụla m.
Ezigbo ụjọ ejidela m.
22 Ọ̀ bụ na mmanụ balsam* adịghị na Gilied?+
Ka ọ̀ bụ na e nweghị onye na-agwọ ọrịa na ya?+
Gịnị mere ndị m agbakebeghị?+
9 A sị nnọọ na isi m bụ mmiri,
Anya m abụrụ isi iyi nke na-agbapụta anya mmiri,+
M gaara na-ebere ndị obodo anyị e gburu egbu ákwá
Ehihie na abalị.
2 A sị nnọọ na m nwere ebe ndị njem na-arahụ n’ala ịkpa,
M gaara ahapụ ndị obodo m, si ebe ha nọ pụọ,
N’ihi na ha niile na-akwa iko.+
Ha niile na-aghọ aghụghọ.
3 Ha na-adị njikere ịgha ụgha otú onye kwere ụta na-adị njikere ịgbapụ akụ́.
Ihe juru n’obodo a bụ ụgha. E nweghị onye na-akwụwa aka ọtọ.+
Jehova kwuru, sị, “Ha na-esi n’otu ihe ọjọọ gaa n’ihe ọjọọ ọzọ.
Ha ejighịkwa m kpọrọ ihe.”+
4 “Onye ọ bụla n’ime unu kpachara anya n’ebe onye agbata obi ya nọ,
N’ihi na onye agbata obi unu nke ọ bụla bụ onye nkwutọ.+
Unu atụkwasịkwala nwanne unu ọ bụla obi,
N’ihi na nwanne unu nke ọ bụla bụ onye aghụghọ.+
5 Onye ọ bụla na-aghọ onye agbata obi ya aghụghọ.
O nweghịkwa onye na-ekwu eziokwu.
Ha akụzierela ire ha otú e si agha ụgha.+
Ha na-eji ike ha niile eme ihe ọjọọ.
6 I bi n’etiti ndị aghụghọ.
Ha na-aghọ aghụghọ, jụkwa ịmara m.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
7 N’ihi ya, Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị:
“M ga-agbaze ha, nyochaakwa ha.+
Olee ihe ọzọ m ga-emere ndị m?
8 Ire ha bụ akụ́ e ji agbagbu mmadụ. Ha jikwa ya aghọ aghụghọ.
Onye ọ bụla n’ime ha na-eji ọnụ ya agwa onye agbata obi ya na udo dị.
Ma n’obi ya, ọ na-agbakọ otú ọ ga-esi zoo chebiri ya.”
9 Jehova kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ime ka ha zaa ajụjụ maka ihe ndị a?
Ka ọ̀ bụ na mụ* ekwesịghị ịta mba dị otú a ahụhụ maka ihe ha na-eme?+
10 M ga-ebere ugwu dị iche iche ákwá, beekwara ha ákwá arịrị.
M ga-abụrụ ala anụmanụ na-ata ahịhịa ndị dị n’ala ịkpa abụ iru uju,
N’ihi na a gbaala ha ọkụ. E nweghịzi onye na-esi na ha agafe.
A naghịkwa anụ ubé anụ ụlọ na ha.
Nnụnụ na anụ ọhịa dị iche iche agbapụchaala na ha. Ha anọghịzi ebe ahụ.+
11 M ga-eme ka Jeruselem bụrụ ikpo nkume+ na ọgba nkịta ọhịa.+
M ga-emekwa ka obodo ndị dị na Juda tọgbọrọ nkịtị, n’enweghị onye bi na ha.+
12 È nwere onye ma ihe nke ga-aghọta ihe a?
È nwere onye Jehova ji ọnụ ya gwa okwu nke ga-akọ ya?
Gịnị mere ala a ji laa n’iyi?
Gịnị mere o ji kpọọ nkụ ka ala ịkpa,
Nke na e nweghị onye na-esi na ya agafe?”
13 Jehova wee sị: “Ọ bụ n’ihi na ha jụrụ iwu* m nyere ha. Ha edebeghị ya. Ha emeghịkwa ihe m kwuru. 14 Kama, ha kpọrọ ekwo nkụ na-eme ihe dị ha n’obi,+ na-esokwa Bel, otú ndị nna nna ha kụziiri ha ka ha na-eme.+ 15 N’ihi ya, Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘M ga-eme ka ndị a taa ahịhịa na-elu ilu. M ga-emekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsí.+ 16 M ga-achụga ha ná mba ndị ha na ndị nna nna ha na-amaghị.+ M ga-emekwa ka e jiri mma agha na-achụ ha ruo mgbe m bibichara ha.’+
17 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị,
‘Chebaranụ ihe na-emenụ echiche.
Kpọkọtanụ ụmụ nwaanyị na-abụ abụ iru uju.+
Ziekwanụ ụmụ nwaanyị ndị ọrụ ha bụ ibe ákwá ka ha bịa,
18 Ka ha bịa ọsọ ọsọ beere anyị ákwá arịrị.
Ka anya mmiri si anyị n’anya na-asọdata,
Ka anya mmiri sikwa ná mbubere anya anyị na-agbapụta.+
19 A nụrụ ka a na-ebe ákwá arịrị na Zayọn, sị:+
“Ewoo, nke anyị na-eme agwụla!
Ihere emegbuola anyị!
N’ihi na a chụpụla anyị n’ala anyị, kụtuokwa ụlọ anyị.”+
20 Ụmụ nwaanyị, nụrụnụ okwu Jehova.
Ka ntị unu nụrụ okwu si ya n’ọnụ.
Kụzierenụ ụmụ unu ndị nwaanyị otú e si ebe ákwá arịrị a.
Ka nwaanyị ọ bụla kụziekwara nwaanyị ibe ya abụ iru uju a.+
21 N’ihi na ọnwụ esila na windo anyị bata.
Ọ batala n’ụlọ elu anyị
Ka o gbuchapụ ụmụntakịrị anyị n’okporo ámá,
Gbuchapụkwa ụmụ okorobịa anyị n’ámá obodo.’+
22 Kwuo, sị, ‘Jehova kwuru, sị:
“Ozu ndị mmadụ ga-awụsa n’ala dị ka nsị anụ,
N’enweghị onye ga-ebukọta ha.+
Ha ga-awụsa n’ala ka ùkwù ọka onye na-ewe ihe ubi ka gbutuchara egbutu.”’”
23 Jehova kwuru, sị:
“Ka onye ma ihe ghara ịna-eme ọnụ n’ihi ihe ọ ma.+
Ka dike ghara ịna-eme ọnụ n’ihi ike ya,
Ka ọgaranya gharakwa ịna-eme ọnụ n’ihi akụnụba ya.”+
24 “Kama, onye na-eme ọnụ, ya mewe ọnụ
Maka na ọ ma m, mara ihe gbasara m nke ọma,+
Marakwa na ọ bụ mụnwa bụ Jehova, onye na-egosi ndị bi n’ụwa ịhụnanya,* onye na-ekpere ha ikpe ziri ezi, na-egosikwa ha na m bụ onye ezi omume.+
Ọ bụ ihe ndị a na-amasị m.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
25 Jehova kwuru, sị, “Oge na-abịa mgbe m ga-eme ka ndị niile e biri úgwù, ma, ha aka bụrụ ndị a na-ebighị úgwù, zaa ajụjụ ihe ha mere,+ 26 ya bụ, ndị Ijipt,+ ndị Juda,+ ndị Ịdọm,+ ndị Amọn,+ ndị Moab,+ na ndị niile na-akpụ ajị ndị dị n’akụkụ ntị ha abụọ, bụ́ ndị bi n’ala ịkpa.+ N’ihi na mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị úgwù, ndị Izrel niile bụkwa ndị a na-ebighị úgwù n’obi.”+
10 Ndị Izrel, nụrụnụ aka ná ntị Jehova na-adọ unu. 2 Jehova kwuru, sị:
“Unu emekwala omenala mba dị iche iche.+
Unu atụla ihe àmà ndị si n’eluigwe ụjọ
Maka na mba dị iche iche na-atụ ha ụjọ.+
3 N’ihi na omenala mba dị iche iche na-emegharị ndị mmadụ anya.*
Omenkà na-aga gbutuo osisi nkịtị dị n’ọhịa,
Jiri ya pịa arụsị.+
5 Arụsị ndị ọ na-apị anaghị ekwu okwu otú ahụ ihe e ji achụ anụmanụ n’ubi kukumba na-anaghị ekwu okwu.+
A na-ebu ha ebu n’ihi na ha anaghị aga ije.+
Atụla ha ụjọ n’ihi na ha agaghị emeli mmadụ ihe ọ bụla.
Ha enweghịkwa ike imere mmadụ ihe ọma ọ bụla.”+
6 Jehova, o nweghị onye dị ka gị.+
Ị bụ onye ukwu. Aha gị na-ede ude, na-egosikwa na ị dị ike.
7 Eze mba niile,+ e nweghị onye na-ekwesịghị ịtụ egwu gị, maka na e kwesịrị ịna-atụ egwu gị.
N’ihi na n’ime ndị niile ma ihe ná mba dị iche iche nakwa n’alaeze ha niile,
E nweghị otu mkpụrụ onye dị ka gị.+
8 Ha niile anaghị eche echiche. Ha bụkwa ndị nzuzu.+
Onye na-eche na osisi ga-akụziri ya ihe na-aghọgbu onwe ya.*+
9 A na-esi Tashish+ ebute ọlaọcha, na-esikwa Yufaz ebute ọlaedo.
Omenkà na onye na-eji ígwè akpụ ihe na-eji ha achọ ahụ́ arụsị ndị ahụ mma.
Ndị mmadụ na-ejikwa eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ na-acha pọpụl* eme ákwà ha.
Ọ bụ ndị nwere nkà na-arụ ha niile.
10 Ma, Jehova bụ Chineke n’eziokwu.
Ọ bụ Chineke dị ndụ,+ bụrụkwa Eze ruo mgbe ebighị ebi.+
Ụwa ga-ama jijiji n’ihi iwe ya,+
E nweghịkwa mba ga-adịgide ma o wesa ha iwe.
“Chi niile ọ na-abụghị ha kere eluigwe na ụwa
Ga-ala n’iyi. Ha agaghịzi adị n’ụwa a nakwa n’okpuru eluigwe.”+
Yanwa na-emekwa ka alụlụụ* si n’ebe niile ụwa sọtụrụ na-akwụgo elu.+
Ọ na-eme ka àmụ̀mà na-egbu mgbe mmiri na-ezo.*
Ọ na-emekwa ka ifufe si n’ebe ọ na-adị pụta.+
14 Onye ọ bụla na-akpa àgwà ka onye na-enweghị uche na onye na-amaghị ihe.
Ihere ga-eme omenkà ọ bụla n’ihi arụsị ndị ọ kpụrụ,+
N’ihi na arụsị ndị ahụ bụ ihe e ji eduhie mmadụ.
15 Ha na-emegharị mmadụ anya,* na-atọkwa ọchị.+
N’oge Chineke ga-elebara ha anya, ha ga-ala n’iyi.
Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya.+
18 N’ihi na Jehova kwuru, sị:
“N’oge a, m ga-achụpụ ndị bi n’ala a.+
M ga-eme ka ha taa ahụhụ.”
19 Ataala m ahụhụ n’ihi ọkpụkpụ m nke gbajiri agbaji.+
Ahụ́ e merụrụ m enweghị ngwọta.
M kwukwara, sị: “N’eziokwu, ihe a bụ ọrịa na-arịa m. M ga na-edikwa ya.
20 E bibiela ụlọikwuu m. E gbubiekwala ụdọ ụlọikwuu m niile.+
Ụmụ m ahapụla m pụọ. Ha anọghịzi.+
E nweghịzi onye na-agbasa ụlọikwuu m. E nweghịkwa onye na-eweli ákwà ụlọikwuu m elu.
21 N’ihi na ndị na-azụ atụrụ na-akpa àgwà ka ndị na-enweghị uche.+
Ha achọghị ịma ihe Jehova chọrọ ka e mee.+
Ọ bụ ya mere ha ji eme ka ndị na-anaghị aghọta ihe.
A chụsasịala anụmanụ ha niile.”+
22 Geenụ ntị! E nwere ihe anyị nụrụ ugbu a.
A na-anụ oké mkpọtụ n’ala dị n’ebe ugwu.+
Oké mkpọtụ a ga-eme ka obodo ndị dị na Juda tọgbọrọ nkịtị, ghọọ ọgba nkịta ọhịa.+
23 Jehova, ama m nke ọma na ọ dịghị mmadụ n’aka ikpebi ụzọ o kwesịrị iso.
Mmadụ enweghịkwa ikike iduzi nzọụkwụ ya mgbe ọ na-eje ije.+
24 Jehova, gbazie m otú dị gị mma.
Ejikwala iwe agbazi m,+ ka ị ghara ibibi m.+
N’ihi na ha na-alụso Jekọb ọgụ.+
N’eziokwu, ha na-alụso ya ọgụ, na-achọkwa ibibi ya.+
Ha emeekwala ka ala ya tọgbọrọ chakoo.+
11 Jehova gwara Jeremaya okwu, sị: 2 “Nụrụnụ ihe mụ na unu gbara ná ndụ.
“Gwa* ya ndị Juda na ndị bi na Jeruselem. 3 Sị ha, ‘Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị: “A ga-abụ onye na-emeghị ihe e kwuru n’ọgbụgba ndụ a ọnụ.+ 4 N’ọgbụgba ndụ a, m gwara nna nna unu hà n’ụbọchị m si n’oké ọkụ e ji agbaze ígwè, ya bụ, n’Ijipt, kpọpụta ha+ ma sị ha, ‘Ruberenụ m isi, meekwanụ ihe niile m nyere unu n’iwu. Unu ga-abụ ndị m, mụnwa ga-abụkwa Chineke unu,+ 5 ka m wee mezuo iyi m ṅụụrụ nna nna unu hà na m ga-enye ha ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ Ununwa bikwa n’ala ahụ ruo taa.’”’”
M wee, sị: “Amen,* Jehova.”
6 Jehova gwaziri m, sị: “Kọsaa ihe a niile n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem, sị: ‘Nụrụnụ ihe mụ na unu kwekọrịtara n’ọgbụgba ndụ a, meekwanụ ya. 7 N’ụbọchị m si n’Ijipt kpọpụta nna nna unu hà, m dụsiri ha ọdụ ike ka ha na-erubere m isi.+ M dụrụ ha ọdụ a ugboro ugboro* otú a m sikwa na-adụ unu taa.” 8 Ma ha egeghị ntị. Ha atọghịkwa ntị n’ala. Kama onye ọ bụla n’ime ha kpọrọ ekwo nkụ na-eme ihe ọjọọ dị ya n’obi.+ Ọ bụ ya mere m ji taa ha ahụhụ otú mụ na ha kwekọrịtara mgbe anyị gbara ndụ. M gwara ha ka ha na-eme ihe anyị kwekọrịtara, nke ha na-anaghị eme.’”
9 Jehova gwaziri m, sị: “Ndị Juda na ndị bi na Jeruselem agbaala izu nupụrụ m isi. 10 Ha emewela ihe ọjọọ ndị nna nna ha, ndị jụrụ irubere m isi, nọ na-eme.+ Ha esorola chi ọzọ dị iche iche, na-efekwa ha.+ Ndị Izrel na ndị Juda emebiela ọgbụgba ndụ mụ na ndị nna nna ha gbara.+ 11 N’ihi ya, Jehova kwuru, sị, ‘M ga-eme ka ọdachi dakwasị ha.+ Ha agaghịkwa egbochili ya ịdakwasị ha. Ọ bụrụ na ha akpọkuo m ka m nyere ha aka, agaghị m atụpụrụ ha ọnụ.+ 12 Ndị bi n’obodo ndị dị na Juda na ndị bi na Jeruselem ga-agakwuru chi ndị ha na-achụrụ àjà ka ha nyere ha aka,+ ma chi ndị ahụ agaghị anapụta ha mgbe ọdachi ahụ ga-adakwasị ha. 13 Ndị Juda, chi ndị unu na-efe adịla ọtụtụ ka obodo ndị dị na Juda. Unu arụọkwarala Bel, bụ́ chi na-abaghị uru ọ bụla, ọtụtụ ebe unu ga-anọ na-achụrụ ya àjà. Ha dị ọtụtụ ka okporo ámá ndị dị na Jeruselem.’+
14 “Ma gịnwa bụ́ Jeremaya, ekpekwala ekpere maka ndị a. Ebesarala m ákwá n’ihi ha ma ọ bụ kpeere ha ekpere,+ n’ihi na agaghị m ege ha ntị ma ha kpọkuwe m n’ihi ọdachi ga-adakwasị ha.
15 Ònye nyere ndị m hụrụ n’anya ikike ịbata n’ụlọ m,
Ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime ha na-eme ihe ọjọọ?
Hà ga-eji àjà ha ji anụmanụ achụ mee ka ọdachi ghara ịdakwasị ndị Juda?
Hà ga na-aṅụrị ọṅụ n’oge ahụ?
16 E nwere mgbe Jehova kpọrọ unu osisi oliv bụ́ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ,
Nke mkpụrụ ya mara ezigbo mma.
Ka a nọ na-eme oké mkpọtụ, Chineke mụnyere unu ọkụ.
Ndị iro gbajikwara alaka unu.
17 “Onye kụrụ unu,+ bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, ekwuola na ọdachi ga-adakwasị unu n’ihi ihe ọjọọ ndị Izrel na ndị Juda na-eme. Ha na-achụrụ Bel àjà iji kpasuo m iwe.”+
18 Jehova, ị gwara m ka m mara.
N’oge ahụ, i mere ka m hụ ihe ha na-eme.
19 Adị m ka nwa atụrụ dị nwayọọ a kpụtara ebe a ga-egbu ya.
Amaghị m na ha na-akpara m nkata ọjọọ, sị:+
“Ka anyị laa osisi a na mkpụrụ ya n’iyi.
Ka anyị gbuo ya,
Ka a ghara icheta aha ya ọzọ.”
20 Ma Jehova nke ụsụụ ndị agha na-ekpe ikpe ziri ezi.
Ọ na-enyocha obi na ihe dị n’ime ime obi.*+
Kwe ka m hụ otú ị ga-esi taa ndị iro gị ahụhụ ihe ha mere,
N’ihi na ọ bụ gị ka m hapụụrụ okwu m ka i kpeere m ikpe.
21 N’ihi ya, e nwere ihe Jehova kwuru gbasara ndị Anatọt+ bụ́ ndị na-achọ igbu m,* ndị na-asịkwa: “Ebula amụma n’aha Jehova,+ ka anyị ghara igbu gị.” 22 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “M ga-eme ka ha zaa ajụjụ maka ihe ha mere. A ga-eji mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha.+ Ụnwụ ga-egbukwa ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị.+ 23 N’ihi ọdachi m ga-eme ka ọ dakwasị ndị Anatọt,+ e nweghị otu onye n’ime ha ga-afọdụ n’afọ m ga-elebara ha anya.”
12 Jehova, ị bụ onye ezi omume.+ Mgbe ọ bụla m kọọrọ gị ihe na-enye m nsogbu n’obi
Nakwa mgbe ọ bụla m ji okwu ikpe bịakwute gị, ị na-ekpe ikpe ziri ezi.
Ma, gịnị mere ihe ji agaziri ndị ajọ omume?+
Gịnịkwa mere na e nweghị ihe na-echegbu ndị aghụghọ?
2 Ị kụrụ ha ka osisi. Ha agbanyekwala mgbọrọgwụ.
Ha etoola, mịakwa mkpụrụ.
Ha na-akpụ gị n’ọnụ mgbe niile, ma obi ha adịghị n’ebe ị nọ.+
3 Ma Jehova, ị ma m nke ọma.+ Ị na-ahụkwa m.
I nyochaala obi m wee hụ na obi m dị n’ebe ị nọ.+
Họpụta ha ka atụrụ a ga-egbu egbu.
Dowekwa ha iche maka ụbọchị a ga-egbu ha.
4 Olee mgbe ala a ga-akwụsị ịkpọ nkụ?
Olee mgbe ahịhịa ndụ dị n’ala a ga-akwụsị ịkpọnwụ?+
A laala anụ ọhịa na nnụnụ n’iyi
N’ihi ihe ọjọọ ndị bi n’ala a na-eme.
N’ihi na ha na-asị: “Chineke anaghị ahụ ihe ga-eme anyị.”
5 Ọ bụrụ na ike gwụrụ gị mgbe i so ndị ji ụkwụ na-agba ọsọ,
Oleezi otú ị ga-esi soro ịnyịnya gbaa ọsọ?+
Ọ bụrụgodị na obi ruru gị ala n’obodo udo dị,
Olee otú obi ga-adị gị ma ị nọrọ n’oké ọhịa dị n’akụkụ Osimiri Jọdan?
Ha na-abụ gị ọnụ.
Ọ bụrụgodị na ha agwawa gị okwu ọma,
Atụkwasịkwala ha obi.
7 “Ahapụla m ụlọ m.+ Ahapụla m ndị m ketara.+
Enyefeela m ndị m* hụrụ n’anya n’aka ndị iro ha.+
8 Ndị m ketara dịzi m ka ọdụm nọ n’oké ọhịa.
Ha na-agbọ m ụja.
Ọ bụ ya mere m jizi kpọ ha asị.
9 Ndị m ketara dị m ka nnụnụ tụrụ àgwà nke na-eri anụ.
Nnụnụ dị iche iche na-eri anụ gbara ya gburugburu ka ha rie ya.+
Anụmanụ niile nọ n’ọhịa, bịanụ, zukọtanụ.
Bịanụ ka unu rie nri.+
10 Ndị na-azụrụ m atụrụ alaala ubi vaịn m n’iyi.+
Ha azọtọọla ala m.+
Ha emeela ka ọmarịcha ala m ghọọ ala ịkpa tọgbọ nkịtị.
11 Ọ ghọọla ala na-abaghị uru.
Ọ kpọọla nkụ.*
Ọ tọgbọkwa chakoo n’ihu m.+
Ala a niile aghọọla ikpo nkume,
Ma, o nweghị onye ọ na-emetụ n’obi.+
12 Ndị na-ebibi ihe esila n’ụzọ niile* dị n’ala ịkpa bịa,
N’ihi na mma agha Jehova si n’otu nsọtụ ala a gburu ndị mmadụ na-aga na nsọtụ ya nke ọzọ.+
E nweghị onye obi ruru ala.
13 Ha kụrụ ọka wit, ma, ihe ha ghọtara bụ ogwu.+
Ha na-arụgbu onwe ha n’ọrụ, ma, e nweghị uru ọ na-abara ha.
Ihere ihe ha rụpụtara ga-eme ha,
N’ihi na Jehova na-ewe ezigbo iwe.”
14 Mụnwa bụ́ Jehova nwere ihe m kwuru gbasara ndị agbata obi m niile bụ́ ndị ọjọọ, ndị na-etinye anya n’ala m nyere ndị Izrel bụ́ ndị m ka ha biri na ya.+ M kwuru, sị: “M ga-efopụ ha n’ala ha.+ M ga-efopụkwa ndị Juda ka ha na ha ghara ịnọ. 15 Ma, m fopụchaa ha, m ga-emere ha ebere, kpọghachikwa onye nke ọ bụla n’ala ya nakwa n’ihe o ketara.”
16 “Ọ bụrụkwa na ha agbaa mbọ mụta ihe ndị m na-eme, jirikwa aha m na-aṅụ iyi, sị, ‘Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi!’ otú ha kụziiri ndị m iji Bel na-aṅụ iyi, ha ga-adịrị ndụ otú ndị m dị ndụ. 17 Ma ọ bụrụ na ha jụ irubere m isi, m ga-efopụ ha ọzọ. M ga-efopụ ha, bibiekwa ha.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.+
13 Jehova gwara m, sị: “Gaa zụta ájị̀* ákwà linin, keekwa ya n’úkwù. Ekwekwala ka mmiri mesa ya.” 2 M gara zụta ájị̀ otú ahụ Jehova kwuru, keekwa ya n’úkwù m. 3 Jehova gwakwara m okwu nke ugboro abụọ, sị: 4 “Chịrị ájị̀ ahụ ị zụrụ, nke i kere n’úkwù, bilie gaa n’Osimiri Yufretis, zookwa ya ebe gbawara agbawa ná nnukwu nkume dị ebe ahụ.” 5 M wee gaa zoo ya n’akụkụ Osimiri Yufretis, otú ahụ Jehova gwara m.
6 Ma mgbe ọtụtụ ụbọchị gara, Jehova sịrị m: “Bilie, gaa n’Osimiri Yufretis chịrị ájị̀ ahụ m gwara gị ka i zoo ebe ahụ.” 7 M gara n’Osimiri Yufretis gwuo ala ebe m zoro ájị̀ ahụ ma chịrị ya. Ma, m chọpụtara na ájị̀ ahụ emebiela. E nweghịkwa ihe a ga-eji ya eme.
8 Jehova gwakwara m, sị: 9 “Mụnwa bụ́ Jehova kwuru, sị, ‘Ihe Juda ji eme ọnụ na ihe Jeruselem ji eme ọnụ ga-ala n’iyi otú ájị̀ a si laa n’iyi.+ 10 Ndị ọjọọ a ga-adị ka ájị̀ a a na-enwekwaghị ihe a ga-eji ya eme, n’ihi na ha jụrụ irubere m isi.+ Ha kpọrọ ekwo nkụ na-eme ihe dị ha n’obi.+ Ha gara soro chi ọzọ dị iche iche, na-efe ha ofufe, na-akpọkwara ha isiala.’ 11 Jehova kwuru, sị, ‘Otú ahụ e si ekegidesi ájị̀ ike n’úkwù ka m kegidesiri ndị Izrel niile na ndị Juda niile ike n’ahụ́ m. M mere ihe a ka ha wee bụrụ ndị m,+ ndị e si n’aka ha anụ aha m,+ ndị na-eto m, nakwa ndị na-asọpụrụ m. Ma, ha erubereghị m isi.’+
12 “Gwakwa ha, sị, ‘Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị: “E kwesịrị ịgbaju nnukwu ite ọ bụla mmanya.”’ Ha ga-asịkwa gị, ‘Ọ̀ bụ na anyị amaghị na e kwesịrị ịgbaju nnukwu ite ọ bụla mmanya?’ 13 Ị ga-agwazi ha, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “M ga-eme ka ndị niile bi n’obodo a ṅụbiga mmanya ókè,+ ma ndị eze na-anọ n’ocheeze Devid ma ndị nchụàjà ma ndị amụma ma ndị niile bi na Jeruselem.” 14 Jehova kwukwara, sị, “M ga-akụpịa ha n’ahụ́ ibe ha, ma ndị bụ́ nna ma ụmụ ha.+ Agaghị m enwere ha ọmịiko. Agaghị m emere ha ebere. Ihe m ga-eme ha agaghịkwa ewute m. E nweghị ihe ga-egbochi m ịla ha n’iyi.”’+
15 Nụrụnụ, ṅaakwanụ ntị.
Unu adịla mpako, n’ihi na Jehova ekwuola okwu.
16 Toonụ Jehova bụ́ Chineke unu
Tupu ya emee ka ọchịchịrị gbaa
Nakwa tupu unu akpọbie ụkwụ n’ugwu mgbe chi jiri.
Unu ga na-atụ anya ìhè,
Ma, ọ ga-eme ka ezigbo ọchịchịrị gbaa.
Ọ ga-emekwa ka ezigbo itiri gbaa.+
M ga-ebepụta nnukwu anya mmiri, ọ ga-esikwa m n’anya na-asọdata,+
N’ihi na a dọọrọ ìgwè atụrụ Jehova+ n’agha.
18 Gwa eze na nne eze, sị,+ ‘Nọrọnụ n’ebe dị ala,
N’ihi na ọmarịcha okpueze unu kpu n’isi ga-ada n’ala.’
19 E mechiela* ọnụ ụzọ ámá obodo ndị dị n’ebe ndịda. E nweghịkwa onye ga-emeghe ha.
A dọrọla ndị Juda niile n’agha. A dọrọla ha niile n’agha.+
20 Lelie anya hụ ndị si n’ebe ugwu na-abịa.+
Olee ebe ìgwè atụrụ e nyefere gị n’aka nọ, ya bụ, ọmarịcha ìgwè atụrụ gị?+
Ọ̀ bụ na ahụ́ agaghị na-egbu gị mgbu otú ọ na-egbu nwaanyị na-amụ nwa?+
22 Ị ga-ekwuzi n’obi gị, sị, ‘Gịnị mere ihe a niile ji eme m?’+
Ọ bụ ihe ọjọọ na-enweghị atụ i mere mere e ji yipụ gị uwe mwụda gị.+
Ikiri ụkwụ gị na-egbukwa gị ezigbo mgbu.
23 Onye Kush* ọ̀ ga-agbanweli akpụkpọ ahụ́ ya?
Agụ owuru ọ̀ ga-agbanweli àgwà ọ tụrụ?+
Ọ bụrụ na ha ga-agbanweli, maranụ na ununwa bụ́ ndị aka ochie n’ime ihe ọjọọ ga-agbanweli mewe ihe dị mma.
24 N’ihi ya, m ga-achụsasị unu otú ifufe si efesasị irighiri ahịhịa n’ala ịkpa.”+
25 Jehova kwuru, sị, “Ihe a ka m kpebiri ime gị,
26 N’ihi ya, m ga-achịli uwe mwụda gị elu ka ọ wụchie gị ihu.
A ga-ahụkwa ihe ihere gị.+
27 A ga-ahụ iko ị na-akwa,+ nụ ubé ị na-ebe ka oké ịnyịnya na-achọ nne ịnyịnya ọ ga-agba,
Hụkwa akwụna jọgburu onwe ya ị na-agba.
Anọ m n’elu ugwu nta ndị dị n’ọhịa
Hụ ihe ndị na-asọ oyi ị na-eme.+
Jeruselem, ị ga-ata ahụhụ!
Olee mgbe ị ga-akwụsị ime ihe ndị a?”+
14 Jehova gwara Jeremaya banyere oge mmiri na-agaghị ezo,+ sị:
2 Ndị Juda na-eru uju.+ Ọnụ ụzọ ámá ha niile emebisiela.
Ha adaruchaala ala. Ike ụwa agwụkwala ha.
Ndị bi na Jeruselem na-ebekwa ákwá.
3 Ndị ukwu na-edunye ndị ohu* ha ka ha gaa chute mmiri.
Ha na-aga n’olulu mmiri, ma ha anaghị ahụ mmiri.
Ha na-eburu okpokoro ite ha lọta.
E menyela ha ihere, mechuokwa ha ihu.
Ha ekpuchiekwala isi ha.
4 Obi ekorola ndị ọrụ ubi n’elu. Ha ekpuchiekwala isi ha
N’ihi na ala ha agbawachaala
Maka na mmiri ezobeghị n’obodo ha.+
5 Nne ele nọ n’ọhịa na-agbahapụkwa nwa ọ mụrụ ọhụrụ
Maka na ahịhịa ndụ adịghị.
6 Jakị ọhịa dị iche iche na-eguzo n’elu ugwu ndị ọhịa na-adịghị.
Ha na-eku ume ọkụ ọkụ ka nkịta ọhịa.
Ha anaghịkwa ahụ ụzọ nke ọma n’ihi na ahịhịa ndụ adịghịzi.+
7 Jehova, ọ bụ eziokwu na mmehie ndị anyị mere na-egosi na ikpe mara anyị,
Biko, nyere anyị aka n’ihi aha gị.+
Mmehie anyị dị ọtụtụ.+
Ọ bụkwa gị ka anyị mehiere.
8 Onye ndị Izrel ji nwee olileanya, Onye zọpụtara ha+ mgbe ha na-ata ahụhụ,
Gịnị mere i ji nọrọ dị ka onye mbịarambịa n’ala a,
Dị ka onye ije nke kwụsịtụrụ n’obodo ka ọ rahụ, chi bọọ ya agawa ebe ọ na-aga?
9 Gịnị mere i ji nọrọ ka nwoke ihe juru anya,
Dị ka dike nke na-enweghị ike ịzọpụta ndị ya?
Ma Jehova, ị nọnyeere anyị.+
Ọ bụkwa aha gị ka anyị na-aza.+
Ahapụkwala anyị.
10 Jehova kwuru gbasara ndị Juda, sị: “Ngagharị na-amasị ha.+ Ụkwụ anaghị anọ ha otu ebe.+ Ọ bụ ya mere na ihe ha anaghị amasị Jehova.+ Ọ ga-echeta mmehie ndị ha mere, meekwa ka ha zaa ajụjụ maka ha.”+
11 Jehova gwakwara m, sị: “Ekpela ekpere ka ihe ọma ọ bụla meere ndị a.+ 12 Ọ bụrụ na ha ebuo ọnụ, agaghị m ege ntị n’arịrịọ ha na-arịọ m.+ Ọ bụrụkwa na ha achụọ àjà a na-esucha ọkụ na àjà ọka, ha agaghị amasị m.+ M ga-eji mma agha, ụnwụ, na ọrịa na-efe efe laa ha n’iyi.”+
13 M wee sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ndị amụma na-agwa ha, sị, ‘Unu agaghị ahụ mma agha ọ bụla. Ụnwụ agaghịkwa ada n’ala unu. Kama, Chineke ga-eme ka unu biri nnọọ n’udo ebe a.’”+
14 Jehova wee sị m: “Ọ bụ amụma ụgha ka ndị amụma ahụ na-ebu n’aha m.+ Ọ bụghị m dunyere ha. Enyeghị m ha iwu. Agwaghịkwa m ha okwu.+ Ha na-ahụ ọhụụ ụgha. Ihe ha na-agwa unu bụ ihe na-enweghị isi ha gbatara n’afa nakwa ihe ndị ha chepụtara n’onwe ha.+ 15 N’ihi ya, e nwere ihe Jehova kwuru gbasara ndị amụma ahụ na-ebu amụma n’aha ya, ndị ọ na-abụghị ya dunyere, ndị na-asị na a gaghị eji mma agha ebibi ndị obodo a nakwa na ụnwụ agaghị ada na ya. O kwuru, sị, ‘A ga-eji mma agha na ụnwụ laa ndị amụma ahụ n’iyi.+ 16 Ụnwụ na mma agha ga-egbu ndị ha na-eburu amụma. Ozu ha ga-atọgbọkwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem. O nweghị onye ga-eli ha,+ ma hanwa ma ndị nwunye ha ma ụmụ ha ndị nwoke ma ụmụ ha ndị nwaanyị. M ga-eme ka ọdachi kwesịịrị ha dakwasị ha.’+
17 “Gwa ha, sị:
‘Ka anya mmiri na-agbapụta m n’anya n’akwụsịghị akwụsị ehihie na abalị,+
N’ihi na ndị m adaala ezigbo ada, gbajie ọkpụkpụ,+
Merụọkwa ezigbo ahụ́.
Ma ndị amụma ma ndị nchụàjà na-agagharị n’ala ha na-amaghị.’”
19 Ị̀ jụla Juda kpamkpam, ka ị̀ kpọla* Zayọn asị?+
Gịnị mere i ji tie anyị ihe nke na a gaghị agwọtali anyị agwọta?+
Anyị nọ na-atụ anya udo, ma e nweghị ihe ọma merenụ.
Anyị nọ na-atụ anya ka a gwọọ anyị, ma ezigbo ụjọ jidere anyị.+
20 Jehova, anyị kwetara na anyị mere ihe ọjọọ,
Kwetakwa na nna nna anyị hà mejọrọ ihe.
N’eziokwu, anyị emehiela gị.+
21 Biko, n’ihi aha gị, ahapụla anyị.+
Elelịkwala ocheeze gị dị ebube.
Cheta ọgbụgba ndụ anyị na gị. Emebila ya.+
22 N’ime arụsị na-abaghị uru mba dị iche iche na-efe, ò nwere nke ga-emeli ka mmiri zoo,
Ka eluigwe ọ̀ ga-emeli ka mmiri zoo n’onwe ya?
Jehova bụ́ Chineke anyị, ọ́ bụghị naanị gị ga-emeli ka mmiri zoo?+
Anyị nwere olileanya n’ebe ị nọ,
N’ihi na ọ bụ naanị gị ga-emeli ihe a niile.
15 Jehova wee sị m: “Ọ bụrụgodị na Mosis na Samuel dị ndụ taa na-arịọchitere ndị a arịrịọ,+ agaghị m emere ha ebere.* Ka a chụpụ ha n’ihu m. Ka a hapụkwa ha ka ha pụọ. 2 Ọ bụrụkwa na ha ajụọ gị ihe ga-eme ha, ị ga-asị ha, ‘Jehova kwuru, sị:
“Ọrịa ga-egbu ụfọdụ n’ime unu.
A ga-eji mma agha gbuo ụfọdụ n’ime unu.+
Ụnwụ ga-egbu ụfọdụ n’ime unu.
A ga-adọrọkwa ụfọdụ n’ime unu n’agha.”’+
3 “Jehova kwukwara, sị, ‘M ga-eme ka ọdachi anọ dakwasị ha.*+ A ga-eji mma agha gbuo ha. Nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha. Nnụnụ na anụ ọhịa ga-adọri ha, laakwa ha n’iyi.+ 4 Ihe m ga-eme ha ga-eme ka ụjọ tụwa alaeze niile dị n’ụwa.+ M ga-eme ha ihe a n’ihi ihe Manase nwa Hezekaya, bụ́ eze Juda, mere na Jeruselem.+
5 Jeruselem, ònye ga-enwere gị ọmịiko?
Ònye ga-emetere gị ebere?
Ònyekwa ga-abịa jụọ gị otú i mere?’
6 Jehova kwuru, sị, ‘Ị hapụla m.+
N’ihi ya, m ga-eweli aka m mee gị ihe, laakwa gị n’iyi.+
Ike imere gị ebere agwụla m.*
7 M ga-eji fọk e ji afụcha ọka fụchaa ha n’ọnụ ụzọ ámá obodo a.
M ga-agbawa ha aka ụmụ.+
M ga-ebibi ndị m,
Ebe ọ bụ na ha ekweghị akwụsị àgwà ọjọọ ha na-akpa.+
8 Ụmụ nwaanyị isi mkpe ha ga-ehi nne karịa ájá dị n’oké osimiri.
M ga-eme ka onye na-ebibi ihe bịakwute ha n’etiti ehihie. Ọ ga-abịakwute ma ndị nne ma ụmụ okorobịa.
M ga-eme ka ụjọ tụwa ha, obi awụnyekwa ha n’afọ n’otu ntabi anya.
9 Ike agwụla nwaanyị mụrụ ụmụ asaa.
Ọ na-esiri ya* ike iku ume.
N’agbanyeghị na ugbu a bụ ehihie, ọ nọ n’ọchịchịrị.
E menyela ya ihere, mechuokwa ya ihu.’
‘M ga-enyefe mmadụ ole na ole n’ime ha fọrọ n’aka mma agha ndị iro ha.’+
Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”
10 Nne m, efuola m, maka na ị mụrụ m.+
Mụ na ndị obodo m niile na-ese okwu, na-alụkwa ọgụ oge niile.
E nweghị onye m na-agbazinye ihe, e nweghịkwa onye na-agbazinye m.
Ha niile na-abụ m ọnụ.
11 Jehova kwuru, sị: “N’eziokwu, m ga-emere gị ihe ọma.
N’eziokwu, m ga-enyere gị aka n’oge ọdachi,
Nyekwara gị aka n’oge ahụhụ ka onye iro ghara ime gị ihe ọ bụla.
12 Mmadụ ò nwere ike ịkụrisị ígwè,
Ya bụ, ígwè si n’ebe ugwu, kụrisịakwa ọla kọpa?
13 M ga-eme ka ndị iro unu* bukọrọ akụ̀ unu na ihe ndị ọzọ unu nwere.+
Ha agaghị akwụ unu ụgwọ, kama, ha ga-ebukọro ha n’ihi mmehie niile unu mere n’ala unu niile.
Ọ bụkwa unu ka m na-ewesa iwe.”+
15 Jehova, ị ma ahụhụ m na-ata.
Biko cheta m. Uche gị dịrịkwa n’ebe m nọ.
Taa ndị na-akpagbu m ahụhụ.+
Ekwela ka m laa n’iyi maka na ị naghị ewe iwe ọsọ ọsọ.
Chetakwa na ọ bụ n’ihi gị ka m ji edi mkparị niile a na-akparị m.+
16 Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, mgbe m hụrụ okwu gị, m riri ya.*+
Okwu gị meziri ka m na-aṅụrị ọṅụ, obi ana-atọkwa m ụtọ,
N’ihi na m na-aza aha gị.
17 Anaghị m eso ndị na-eme oké oriri enwe aṅụrị.+
M na-anọrọ onwe m n’ihi na ị nọnyeere m.
I meela ka iwe ju m obi n’ihi mmehie ha na-eme.+
18 Gịnị mere ahụ́ na-egbu m mgbu anaghị akwụsị akwụsị,
Ahụ́ m merụrụ ekweghịkwa ngwọta? O kweghị ala ala.
Ị̀ ga-adị ka isi iyi
Nke mmiri na-anaghị adị na ya?
19 N’ihi ya, Jehova kwuru, sị:
“Ọ bụrụ na ị lọghachi, m ga-akpọrọghachi gị.
Ị ga na-ejekwara m ozi.*
Ọ bụrụ na i mee ka ihe bara ezigbo uru dịrị iche n’ihe na-abaghị uru,
Ị ga-abụ ọnụ na-ekwuru m.
Ha ga-alọghachikwute gị,
Ma gịnwa agaghị alaghachikwuru ha.
20 Jehova kwukwara, sị: “Emeela m ka ị ghọọrọ ndị a mgbidi ọla kọpa a rụsiri ike.+
21 M ga-anapụta gị n’aka ndị ọjọọ,
Napụtakwa gị n’aka ndị obi fere azụ.”
16 Jehova gwara m okwu ọzọ, sị: 2 “Alụla nwaanyị, amụkwala ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị n’ala a. 3 E nwere ihe Jehova kwuru banyere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị a mụrụ ebe a, nakwa banyere nne na nna mụrụ ha n’ala a. O kwuru, sị: 4 ‘Ọrịa dị iche iche ga-egbu ha,+ ma e nweghị onye ga-eruru ha uju. E nweghịkwa onye ga-eli ha. Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala.+ Mma agha na ụnwụ ga-ala ha n’iyi.+ Nnụnụ na anụ ọhịa ga-ejikwa ozu ha mere nri.’
5 Jehova kwukwara, sị,
‘Abanyela n’ụlọ ebe ndị na-eru uju na-eme oriri,
Agala ibe ákwá arịrị. Asịkwala ha ndo.’+
N’ihi na Jehova sịrị, ‘Agaghịzi m ekwe ka udo dịrị ndị a.
M ga-akwụsị ịhụ ha n’anya, kwụsịkwa imere ha ebere.+
6 Ma ndị ukwu ma ndị nta ga-anwụ.
A gaghị eli ha eli.
E nweghị onye ga-eruru ha uju,
E nweghịkwa onye ga-eji maka ha bekasịa onwe ya ahụ́ ma ọ bụ kpụchaa isi, ya ana-akwọ mụrụmụrụ.*
7 E nweghị onye ga-enye ndị na-eru uju nri
Iji kasie ha obi maka ndị ha nwụrụ anwụ.
E nweghịkwa onye ga-ebunye ha iko mmanya dị
Ka ha ṅụọ iji kasie ha obi maka nna ha ma ọ bụ nne ha nwụrụ anwụ.
8 Abanyela n’ụlọ a na-eme oriri
Gaa soro ha nọrọ ọdụ na-eri, na-aṅụ.’
9 “N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘M ga-eme ka a kwụsị ịnụ olu ndị na-aṅụrị ọṅụ, olu ndị na-enwe obi ụtọ, olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ, nakwa olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ.+ M ga-eme ihe a n’obodo a, n’ihu unu nakwa mgbe unu ka dị ndụ.’
10 “Ọ bụrụ na ị gwachaa ndị a ihe a niile, ha ga-ajụ gị, sị, ‘Gịnị mere Jehova ji kwuo na nnukwu ọdachi a niile ga-adakwasị anyị? Olee otú anyị si mehie? Oleekwa iwu Jehova Chineke anyị anyị mebiri?’+ 11 Gwa ha na Jehova kwuru, sị, ‘“Nna nna unu hà hapụrụ m,+ gaa na-eso chi ọzọ dị iche iche, na-efe ha, na-akpọkwara ha isiala.+ Ha hapụrụ m. Ha edebeghịkwa iwu m.+ 12 Ununwa na-eme ihe ọjọọ karịa nna nna unu hà.+ Onye ọ bụla n’ime unu akwụsịla irubere m isi ma kpọchie ntị na-eme ihe ọjọọ dị ya n’obi.+ 13 N’ihi ya, m ga-esi n’ala a chụga unu n’ala ma ununwa ma nna nna unu hà na-amaghị.+ Unu ga na-efe chi ọzọ dị iche iche ebe ahụ, ma n’ehihie ma n’abalị,+ n’ihi na agaghị m emere unu ebere.”’
14 “Jehova kwuru, sị, ‘Oge na-abịa mgbe ha na-agaghịzi na-asị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, onye si n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel, na-aṅụ iyi.”+ 15 Kama, ha ga na-asị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, onye si n’ala dị n’ebe ugwu nakwa n’ala niile ọ chụsasịrị ndị Izrel kpọlata ha, na-aṅụ iyi.” M ga-akpọlata ha n’ala ha, nke m nyere ndị nna nna ha.’+
16 Jehova kwukwara, sị, ‘M na-ezi ozi ka ọtụtụ ndị na-akụ azụ̀ bịa.
Ha ga-akụta ndị m ka azụ̀.
E mechaakwa, m ga-ezi ozi ka ọtụtụ ndị dinta bịa.
Ha ga-achụ nta ndị m ma n’ugwu ukwu ọ bụla ma n’ugwu nta ọ bụla
Ma n’ebe ndị gbawara agbawa ná nnukwu nkume.
17 N’ihi na anya m dị n’ihe ọ bụla ha na-eme.*
E nweghị ebe ha ga-ezo mụ aghara ịhụ ha.
M jikwa anya m na-ahụ mmehie ha niile.
18 Ma, m ga-ebu ụzọ taa ha ahụhụ niile e kwesịrị ịta ha maka njehie ha na mmehie ha,+
N’ihi na ha ejirila arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi merụọ ala m.
Ha emeela ka arụsị ha rụrụ arụ jupụta n’ala m niile.’”+
19 Jehova, onye bụ́ ike m na ebe m a rụsiri ike
Nakwa ebe m na-agbaba n’oge ahụhụ,+
Ọ bụ gị ka mba dị iche iche n’ụwa ga-abịakwute.
Ha ga-asịkwa: “Nna nna anyị hà nọ na-efe arụsị dị iche iche*
Na ihe ndị na-enweghị isi nakwa ihe ndị na-abaghị uru ọ bụla.”+
20 Mmadụ ọ̀ ga-akpụli ezigbo chi?
Ihe ọ bụla mmadụ kpụrụ abụghị ezigbo chi.+
21 “Ugbu a, m ga-eme ka ha mara ike m,
Marakwa otú m siruru ike.
Ha ga-amarakwa na aha m bụ Jehova.”
17 “E ji mkpịsị akwụkwọ ígwè dee mmehie Juda.
E ji mkpịsị akwụkwọ dayamọnd kanye ya ná mbadamba nkume, ya bụ, n’obi ha.
E jikwa ya kanye ya na mpi ndị dị n’ebe ndị ha na-achụ àjà.
2 Ụmụ ha na-echetakwa ebe ndị a ha na-achụ àjà na ogwe osisi arụsị*+ ha
Ndị dị n’akụkụ nnukwu osisi na-ama pokopoko, n’elu ugwu ndị dị elu+
3 Nakwa n’ugwu ndị dị n’ọhịa.
M ga-eji maka mmehie unu na-eme n’ala unu niile mee ka e bukọrọ akụ̀ unu niile na ihe ndị ọzọ unu nwe+
Nakwa ihe unu ndị dị n’ebe ndị dị elu.+
4 Unu ji aka unu hapụ ihe m kenyere unu.+
M ga-emekwa ka unu jewere ndị iro unu ozi n’ala unu na-amaghị,+
Ọ ga na-erekwa mgbe niile.”
5 Jehova kwuru, sị:
“Onye tụkwasịrị mmadụ nkịtị obi,+
Onye ji ike mmadụ nwee nchekwube,+
Onye obi ya na-adịghịzi n’ebe Jehova nọ, a ga-abụ ya ọnụ.
6 Ọ ga-adị ka osisi naanị ya dị n’ọzara.
Ihe ọma agaghị eru ya aka.
Kama, ọ ga-ebi n’ebe kpọrọ nkụ n’ala ịkpa,
N’ala bụ́ nnu nnu nke ọ na-enweghị onye ga-ebili na ya.
8 Ọ ga-adị ka osisi a kụrụ n’akụkụ mmiri,
Nke gbanyere mgbọrọgwụ na mmiri.
Ọ gaghị ama mgbe ụbọchị na-ekpo ọkụ,
Kama akwụkwọ ya ga na-ama pokopoko.+
Ọ gaghị na-echegbu onwe ya n’afọ mmiri na-ezoghị.
Ọ gaghịkwa akwụsị ịmị mkpụrụ.
9 Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ. O sikwara ike njite.*+
Ònye ga-amatali ya?
10 Mụnwa, bụ́ Jehova, na-enyocha obi,+
Na-enyochakwa ihe mmadụ na-eche n’ime ime obi ya,*
Iji kwụọ onye ọ bụla ụgwọ otú o si kpaa àgwà,
Kwụọkwa ya ụgwọ ihe ọ rụpụtara.+
Onye ahụ ga-anwụchu ọnwụ, hapụ akụ̀ ya.
N’ikpeazụ, ọ ga-abụ onye na-amaghị ihe.”
13 Jehova, onye ndị Izrel ji nwee olileanya,
Ihere ga-eme ndị niile hapụrụ gị.
N’ájá ka a ga-ede aha ndị kwụsịrị ife gị* ofufe,+
N’ihi na ha ahapụla Jehova, bụ́ isi iyi nke mmiri na-enye ndụ.+
14 Jehova, biko, gwọọ m ka m gbakee.
Zọpụtakwa m ka ihe ọ bụla ghara ime m,+
N’ihi na ọ bụ gị ka m na-eto.
15 E nwere ndị na-asị m:
“Gịnị mere na okwu Jehova emezubeghị?+
Biko, ya mezuo.”
16 Ma, akwụsịghị m ịbụ onye ọzụzụ atụrụ. Akwụsịghịkwa m ịna-eso gị.
Anọghịkwa m na-atụ anya ka e nwee ụbọchị ọdachi ga-abịa.
Ị ma ihe egbugbere ọnụ m kwuru.
Ọ bụ n’ihu gị ka m kwuru ya.
17 Emenyekwala m ụjọ.
Ị bụ ebe m ga-agbaba n’ụbọchị ọdachi.
Ka ụjọ jide ha,
Ma ekwela ka ụjọ jide m.
Mee ka e nwee ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ha.+
Bibie ha, bibie ha kpamkpam.*
19 Jehova gwara m, sị: “Gaa guzoro n’ọnụ ụzọ ámá ụmụ ndị m, ebe ndị eze Juda na-esi abata ma na-apụ. Guzorokwa n’ọnụ ụzọ ámá niile dị na Jeruselem.+ 20 Sịkwa ha, ‘Ndị eze Juda, ndị Juda niile, na ndị niile bi na Jeruselem, ndị na-esi n’ọnụ ụzọ ámá ndị a abata, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. 21 Jehova kwuru, sị: “Lezienụ onwe unu* anya, unu ebula ihe ọ bụla n’Ụbọchị Izu Ike. Unu esikwala n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem bubata ihe.+ 22 Unu esikwala n’ụlọ unu bupụta ibu ọ bụla n’Ụbọchị Izu Ike. Unu arụkwala ọrụ ọ bụla n’ụbọchị ahụ.+ Doonụ Ụbọchị Izu Ike nsọ otú m gwara nna nna unu hà ka ha na-eme.+ 23 Ma ha egeghị ntị. Ha atọghịkwa ntị n’ala. Ha kpọrọ ekwo nkụ* jụ irube isi, jụkwa ịnabata aka ná ntị a na-adọ ha.”’+
24 “‘Jehova kwuru, sị, “Ma, ọ bụrụ na unu erubere m isi n’ihe niile, ghara isi n’ọnụ ụzọ ámá obodo a bubata ibu n’Ụbọchị Izu Ike, gharakwa ịrụ ọrụ ọ bụla n’Ụbọchị Izu Ike, si otú ahụ na-edo ya nsọ,+ 25 ọ ga-eme ka ndị eze na ndị isi, bụ́ ndị nọ n’ocheeze Devid,+ si n’ọnụ ụzọ ámá obodo a na-abata. Ha na ndị ha ji mere ndị isi nakwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem ga-agbara ụgbọ ịnyịnya ha na ịnyịnya ha bịa.+ Ndị mmadụ ga na-ebikwa n’obodo a mgbe niile. 26 Ndị mmadụ ga-esi n’obodo ndị dị na Juda, sikwa na gburugburu Jeruselem nakwa n’ala Benjamin+ nakwa n’ala dị larịị+ nakwa n’ebe bụ́ ugwu ugwu nakwa na Negeb* na-eweta àjà a na-esucha ọkụ,+ àjà ọka,+ frankinsens, àjà ekele, na àjà ndị ọzọ+ n’ụlọ Jehova.+
27 “‘“Ma ọ bụrụ na unu enupụrụ m isi ghara ido Ụbọchị Izu Ike nsọ, na-ebu ibu, buru ya na-abata n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem n’Ụbọchị Izu Ike, m ga-esunye ọnụ ụzọ ámá ya niile ọkụ. Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu ndị a rụsiri ike dị na Jeruselem.+ A gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.”’”+
18 Jehova gwara Jeremaya okwu, sị: 2 “Bịa gaa n’ụlọ ọkpụite.+ I ruo, m ga-agwa gị okwu ebe ahụ.”
3 M wee gawa n’ụlọ ọkpụite, rute, ya abụrụ na o ji wiil e ji akpụ ite na-akpụ ite. 4 Ma, aka ọkpụite ahụ mebiri arịa o ji ụrọ na-akpụ. N’ihi ya, o ji ya kpụọ ụdị arịa ọzọ otú dị ya mma n’anya.*
5 Jehova gwaziri m, sị: 6 “‘Ndị Izrel, ọ̀ bụ na mụ enweghị ike ime unu ihe ọkpụite a mere? Otú ahụ ụrọ dị n’aka ọkpụite ka ununwa, bụ́ ndị Izrel, dị n’aka m.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 7 ‘Mgbe ọ bụla m kwuru na m ga-efopụ mba ọ bụla ma ọ bụ alaeze ọ bụla, kwuokwa na m ga-akwatu ya ma bibie ya,+ 8 mba ahụ wee hapụ ihe ha na-eme nke m kwuru na ọ dịghị mma, m ga-agbanwe obi m gbasara ọdachi ahụ m bu n’obi ime ka ọ dakwasị ha.+ 9 Ma, mgbe ọ bụla m kwuru na m ga-akụ mba ma ọ bụ alaeze ka osisi, meekwa ka ọ kwụsie ike, 10 ha abịa mee ihe dị njọ n’anya m, nupụkwara m isi, m ga-agbanwe obi m gbasara ihe ọma m bu n’obi imere ha.’
11 “Ugbu a, biko, gwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “M na-akwadebere unu ọdachi, na-echekwa echiche ihe m ga-eme unu. Biko, ka onye ọ bụla n’ime unu hapụ ihe ọjọọ ọ na-eme. Mewenụ ihe dị mma, na-akpakwanụ àgwà ọma.”’”+
12 Ma ha sịrị: “Ọ baghị uru!+ N’ihi na anyị ga na-eme uche anyị. Onye ọ bụla n’ime anyị ga-akpọ ekwo nkụ na-eme ihe ọjọọ dị ya n’obi.”+
13 Jehova ji maka ihe a kwuo, sị:
“Biko, jirinụ ọnụ unu jụọ mba dị iche iche ajụjụ.
Ònye nụtụrụla ụdị ihe a?
Ndị Izrel* emeela ihe jọgburu onwe ya.+
14 Snoo nke na-ada na Lebanọn ọ̀ ga-akwụsị ịdị n’elu oké nkume ndị dị n’ebe ndị kpọdara akpọda?
Ka mmiri jụrụ oyi, nke na-asọ asọ, si na Lebanọn ọ̀ ga-ata?
Ha na-achụrụ chi dị iche iche na-abaghị uru àjà.+
Ha na-emekwa ka ndị mmadụ na-ada ka ha na-aga n’ụzọ ha, bụ́ ụzọ dịwara kemgbe oge ochie.+
Ha na-eme ihe a ka ndị ahụ soro okporo ụzọ ọzọ na-adịghị larịị.*
16 Ndị m na-eme ihe a ka ala ha na-emenye ndị ga-ahụ ya ụjọ,+
Ha ana-afụkwa mkpọrọhịhị ruo mgbe ebighị ebi.+
Onye ọ bụla nke si na ya na-agafe ga-ekporopụ anya na-ele ya, fufeekwa n’isi.+
17 M ga-achụsasị ha n’ihu ndị iro ha otú ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ si efesasị ihe.
M ga-agbakụta ha azụ. Agaghị m eche ha ihu n’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ha.”+
18 Ma ha sịrị: “Bịanụ ka anyị chepụta ihe anyị ga-eme Jeremaya,+ n’ihi na ọ bụ ndị nchụàjà anyị ga na-agwa anyị ihe iwu kwuru.* Ọ bụ ndị ma ihe ga na-adụ anyị ọdụ. Ọ bụkwa ndị amụma ga na-agwa anyị ihe Chineke kwuru. Bịanụ ka anyị kwuo okwu ọjọọ gbasara Jeremaya,* ka anyị gharakwa ịṅa ntị n’ihe ọ bụla ọ na-ekwu.”
19 Jehova, biko, ṅaa m ntị,
Nụrụkwa ihe ndị na-emegide m na-ekwu.
20 È kwesịrị iji ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma?
N’ihi na ha egwuorola m* olulu ka m daba nwụọ.+
Cheta otú m si guzoro n’ihu gị kwuo ihe ọma banyere ha,
Iji mee ka ị kwụsị iwesa ha iwe.
21 N’ihi ihe a ha mere, hapụ ụmụ ha ka agụụ gụgbuo ha.
Hapụkwa ha na ụmụ ha ka e jiri mma agha gbuo ha.+
Ka ndị nwunye ha gbara aka ụmụ, ghọọkwa ụmụ nwaanyị isi mkpe.+
Ka ajọ ọrịa gbuo ụmụ nwoke ha.
Ka e jirikwa mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha n’agha.+
22 Ka a nụ mkpu ákwá n’ụlọ ha
Mgbe ị ga-eme ka ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga bịakwute ha na mberede.
N’ihi na ha egwuola olulu ka ha jide m,
Siekwa ọnyà ka ọ ma m n’ụkwụ.+
Agbagharala ha njehie ha.
Ehichapụkwala mmehie ha.
19 Jehova kwuru, sị: “Gaa zụta ite ụrọ n’aka ọkpụite.+ Kpọrọ ụfọdụ ndị a ma ama n’ime ndị m na ụfọdụ ndị a ma ama n’ime ndị nchụàjà 2 gaa na Ndagwurugwu Nwa Hinọm,+ nke dị n’ụzọ e si abanye n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ọkpụite. Nọrọ ebe ahụ kwusaa ihe a m na-aga ịgwa gị. 3 Kwuo, sị, ‘Ndị eze Juda na ndị bi na Jeruselem, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, sịrị:
“‘“M ga-eme ka ọdachi dakwasị obodo a, nke na ntị ọ bụla nụrụ ya ga-azụ wuruwuru. 4 M ga-eme ha ihe a maka na ha ahapụla m,+ meekwa ka a ghara ịmatazi ebe a.+ Ha na-anọ ebe a achụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà, bụ́ chi ndị ha na ndị nna nna ha na ndị eze Juda na-amaghị. Ha emeekwala ka ọbara ndị aka ha dị ọcha ju ebe a.+ 5 Ha rụkwaara Bel ebe ndị dị elu ka ha nọrọ na ha na-eji ụmụ ha ndị nwoke achụrụ Bel àjà a na-esucha ọkụ.+ Ọ bụghị mụnwa gwara ha mewe ihe a. Agwaghị m ha gbasara ya. Ọ batatụbeghịkwa m n’obi.”’*+
6 “‘Jehova kwuru, sị: “N’ihi ya, oge na-abịa mgbe a na-agaghịzi na-akpọ ebe a Tofet ma ọ bụ Ndagwurugwu Nwa Hinọm, kama, a ga na-akpọzi ya Ndagwurugwu Igbu Mmadụ.+ 7 M ga-anọ ebe a kụghasịa atụmatụ ndị Juda na ndị bi na Jeruselem. M ga-emekwa ka ndị iro ha jiri mma agha gbuo ha, meekwa ka ndị na-achọ igbu ha* gbuo ha. M ga-enye nnụnụ na anụ ọhịa ozu ha ka ha rie.+ 8 M ga-eme obodo a ihe otú ọ ga-abụ, mmadụ hụ ya, ya eju ya anya, ya afụọkwa mkpọrọhịhị. Onye ọ bụla na-agafe na ya ga-ekporopụ anya na-ele ya ma fụọ mkpọrọhịhị n’ihi ahụhụ a tara ndị bi na ya.+ 9 M ga-eme ka ha na-eri anụ ụmụ ha ndị nwoke na nke ụmụ ha ndị nwaanyị. Mgbe ndị iro ha na ndị na-achọ igbu ha* ga-anọchibido ha, ihe ga-esiri ha ike. Ha agaghịkwa ahụ ihe ha ga-eri. N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime ha ga na-eri anụ mmadụ ibe ya.”’+
10 “I kwuchaa ihe a, kụwaa ite ahụ n’ihu ndị ahụ so gị gaa. 11 Gwakwa ha, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “M ga-akụ obodo a na ndị bi na ya righirighi otú ahụ mmadụ si akụri ite ọkpụite kpụrụ nke na a gaghị emezili ya. A ga na-elikwa ozu ndị mmadụ na Tofet ruo mgbe a na-agaghịzi enwe ebe a ga-eli ha.”’+
12 “Jehova kwuru, sị, ‘Ihe ahụ ka m ga-eme ebe a na ndị bi na ya, ka obodo a dịrị ka Tofet. 13 Ụlọ ndị dị na Jeruselem na ụlọ ndị eze Juda ga-adị ka Tofet+ na-adịghị ọcha, ya bụ, ụlọ niile dị n’elu ụlọ, ebe ha na-achụrụ ihe ndị dị n’eluigwe àjà+ na ebe ha na-achụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà mmanya.’”+
14 Mgbe Jeremaya si Tofet, bụ́ ebe Jehova ziri ya ka ọ gaa buo amụma, lọta, ọ gara guzoro n’ogige ụlọ Jehova gwa mmadụ niile, sị: 15 “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘M ga-eme ka ọdachi niile m kwuru okwu ya dakwasị obodo a na obodo niile gbara ya gburugburu, n’ihi na ha kpọrọ ekwo nkụ* jụ irubere m isi.’”+
20 Pash-họ nwa Ịma, bụ́ onye nchụàjà na onyeisi ndị na-elekọta ọrụ n’ụlọ Jehova, nọ na-ege Jeremaya ntị mgbe ọ na-ebu ihe ndị a n’amụma. 2 Pash-họ wee tie Jeremaya onye amụma ihe ma tinye ya n’ọtọsị+ dị n’Ọnụ Ụzọ Ámá Mgbago nke Benjamin, nke dị n’ụlọ Jehova. 3 Ma n’echi ya, mgbe Pash-họ hapụrụ Jeremaya, Jeremaya gwara ya, sị:
“Aha Jehova gụrụ gị ugbu a bụ Ụjọ Dị Ebe Niile,+ ọ bụghị Pash-họ. 4 N’ihi na Jehova kwuru, sị, ‘Ihe m ga-eme gị ga-emenye gị na ndị enyi gị niile ụjọ. Ndị iro ha ga-ejikwa mma agha gbuo ha n’ihu gị.+ M ga-enyefe Juda niile n’aka eze Babịlọn. Ọ ga-adọrọkwa ha n’agha laa Babịlọn ma jiri mma agha gbuo ha.+ 5 M ga-enye ndị iro ha akụnụba niile dị n’obodo a na ihe niile ha nwere na ihe niile bara ezigbo uru dị na ya nakwa akụ̀ niile ndị eze Juda nwere.+ Ha ga-akwakọrọ ha, burukwa ha laa Babịlọn.+ 6 A ga-adọrọkwa gịnwa, bụ́ Pash-họ, n’agha, gị na ndị niile bi n’ụlọ gị. Ị ga-aga Babịlọn, nwụọkwa ebe ahụ. Ọ bụkwa ebe ahụ ka a ga-eli gị na ndị enyi gị niile, n’ihi na i buuru ha amụma ụgha.’”+
7 Jehova, i meela ihe tụrụ m n’anya. N’eziokwu, ọ tụrụ m n’anya.
I gosila na ị ka m ike, wee merie m.+
Abụzi m onye e ji eme ihe ọchị ụbọchị niile.
Onye ọ bụla na-akwa m emo.+
8 Mgbe ọ bụla m na-ekwu okwu, m na-eti mkpu, na-asị,
“E nwere ndị tigbuo zọgbuo na ndị na-ebibi ihe.”
Okwu Jehova na-eme ka a na-akwa m emo, na-akparịkwa m ụbọchị niile.+
9 M kwuziri, sị: “Agaghị m ekwu okwu banyere ya.
Agaghịkwa m ekwu okwu n’aha ya ọzọ.”+
Ma n’ime obi m, ọ dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro ụzọ n’ime ọkpụkpụ m.
Enweghịzi m ike ịgbachi nkịtị.
Enweghịkwa m ike imechi ọnụ.+
10 N’ihi na anụrụ m akụkọ ọjọọ ọtụtụ ndị na-akọ.
Ihe na-emenye m ụjọ gbara m gburugburu.+
Ha na-asị, “Kọsaanụ na ọ bụ onye ọjọọ, ka anyị na-akọsa ya.”
Onye ọ bụla nke na-asị ka udo dịrị m na-ele anya ka m daa.+ Ha na-asị:
“Ikekwe, ọ ga-eme ezigbo mmehie,
Anyị emerie ya ma megwara ya ihe o mere anyị.”
11 Ma Jehova, bụ́ dike n’agha, nọnyeere m.+
Ọ bụ ya mere ndị na-akpagbu m ga-eji daa wee ghara imeri m.+
Ezigbo ihere ga-eme ha, n’ihi na ihe ha na-achọ ime m agaghị enwe isi.
A gaghị echefu ihere a ga-emenye ha ruo mgbe ebighị ebi.+
12 Ma gịnwa, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, na-enyocha onye ezi omume.
Ị na-ahụ obi ndị mmadụ na ihe dị n’ime ime obi*+ ha.
Kwe ka m hụ otú ị ga-esi taa ndị iro gị ahụhụ ihe ha mere,+
N’ihi na ọ bụ gị ka m hapụụrụ okwu m ka i kpeere m ikpe.+
13 Bụkuonụ Jehova abụ! Toonụ Jehova!
N’ihi na ọ napụtala onye* ọ na-enweghị ka ọ hà ya n’aka ndị na-eme ihe ọjọọ.
14 Ka a bụọ ụbọchị a mụrụ m ọnụ!
Ka a ghara ịgọzi ụbọchị nne m mụrụ m!+
15 Ka a bụọ nwoke bịara zie nna m ozi ọma ọnụ, onye bịara zie ya, sị:
“A mụọrọla gị nwa nwoke!”
Nke mere ka o nwee ezigbo aṅụrị.
16 Ka nwoke ahụ dịrị ka obodo dị iche iche Jehova kwaturu n’akwaghị mmakwaara.
Ka ọ nụ mkpu ákwá n’ụtụtụ, nụkwa mkpu agha n’etiti ehihie.
18 Gịnị mere m ji si n’afọ nne m pụta
Bịa na-ahụ nsogbu na ihe na-agbawa obi,
Ihere ana-emekwa m ná ndụ m niile?+
21 Jehova gwara Jeremaya okwu mgbe Eze Zedekaya+ ziri Pash-họ+ nwa Malkaịja na Zefanaya+ nwa Measaya, bụ́ onye nchụàjà, ka ha gakwuru ya ma rịọ ya, sị: 2 “Biko, jụọrọ anyị Jehova ase, n’ihi na Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn na-achọ ịlụso anyị agha.+ Ikekwe, Jehova ga-arụrụ anyị otu n’ime ọrụ ya dị ebube, nke ga-eme ka Nebukadneza hapụ anyị.”+
3 Jeremaya wee sị ha: “Gwanụ Zedekaya, sị, 4 ‘Jehova bụ́ Chineke Izrel sịrị: “M ga-eme ka ngwá agha unu tụgharịa mee unu ihe, ya bụ, ngwá agha unu ji na-achọ ịlụso eze Babịlọn+ na ndị Kaldia agha, bụ́ ndị nọchibidoro unu n’azụ mgbidi unu. M ga-achịkọtakwa ngwá agha unu* n’etiti obodo a. 5 M ga-eji aka m siri ike na ike m, jirikwa iwe na ọnụma na oké iwe+ lụso unu agha.+ 6 M ga-egbu ndị bi n’obodo a, ma mmadụ ma anụmanụ. Ọrịa na-efe efe ga-egbu ha.”’+
7 “‘Jehova kwuru, sị, “Nke a gachaa, m ga-akpọrọ Zedekaya bụ́ eze Juda na ndị na-ejere ya ozi na ndị obodo a, ndị nke ọrịa na-efe efe na mma agha na ụnwụ gbufọrọ, nyefee n’aka Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn nakwa n’aka ndị iro ha nakwa n’aka ndị na-achọ igbu ha.*+ Nebukadneza ga-ejikwa mma agha gbuo ha. Ọ gaghị emere ha ebere. Ọ gaghịkwa enwere ha ọmịiko ma ọ bụ metere ha ebere.”’+
8 “Ị ga-agwakwa ndị a, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Họrọnụ otu n’ụzọ ihe abụọ a: ọnwụ na ndụ. 9 “Mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-egbu onye nọgidere n’obodo a. Ma onye pụrụ gaa chịliere ndị Kaldia nọchibidoro unu aka elu ga-adị ndụ, zọọ onwe ya ndụ,* ya abụrụ ụgwọ ọrụ ya.”’*+
10 “‘Jehova kwuru, sị, “Agbakụtala m obodo a azụ ka ọdachi dakwasị ya, ka ihe ọma ghara ime na ya.+ A ga-enyefe ya n’aka eze Babịlọn.+ Ọ ga-agbakwa ya ọkụ.”+
11 “‘Ezinụlọ eze Juda, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. 12 Ezinụlọ Devid, Jehova kwuru, sị:
“Na-ekpenụ ikpe ziri ezi kwa ụtụtụ.
Napụtakwanụ onye a na-emegbu emegbu n’aka onye na-emegbu ya,+
Ka ọnụma m ghara ịdị ọkụ+
Wee ree unu n’enweghị onye ga-emenyụ ya
N’ihi omume ọjọọ unu.”’+
13 Jehova kwuru, sị, ‘Ndị bi na ndagwurugwu
Na ndị bi n’obodo dị n’oké nkume nke dị n’ala dị larịị,’ m ga-eme unu ihe.
‘Ununwa ndị na-asị: “Ònye ga-agbadata lụso anyị agha?
Ònyekwa ga-eji ike bata ebe anyị bi?”
14 M ga-eme ka unu zaa ajụjụ ihe unu mere.+
M ga-esunye oké ọhịa unu ọkụ.
Ọ ga-erepịakwa ihe niile gbara ya gburugburu.’+
Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”
22 Jehova kwuru, sị: “Gaa n’ụlọ* eze Juda, kwuo ihe a m na-aga ịgwa gị. 2 Kwuo, sị, “Eze Juda, onye nọ n’ocheeze Devid, gị na ndị na-ejere gị ozi nakwa ndị gị, bụ́ ndị na-esi n’ọnụ ụzọ ámá ndị a abata, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. 3 Jehova sịrị: “Kpeenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ezi omume. Napụtanụ onye a na-emegbu emegbu n’aka onye na-emegbu ya. Unu emekpala onye mbịarambịa ọ bụla ahụ́. Unu emesikwala nwa na-enweghị nna* na nwaanyị isi mkpe ike.+ Unu egbukwala* onye aka ya dị ọcha.+ 4 Ọ bụrụ na unu elezie anya mee ihe a m kwuru, ndị eze, bụ́ ndị na-anọchi Devid n’ocheeze ya,+ na ndị na-ejere ha ozi, nakwa ndị obodo ha ga na-esi n’ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ a na-abata. Ha ga-agbara ma ụgbọ ịnyịnya ma ịnyịnya ha na-abata.”’+
5 “Jehova kwukwara, sị, ‘Ma, ọ bụrụ na unu emeghị ihe a m kwuru, eji m onwe m na-aṅụ iyi na a ga-ala ụlọ a n’iyi.’+
6 “Jehova kwuru banyere ezinụlọ eze Juda, sị:
‘N’anya m, unu dị ka Gilied
Nakwa ọnụ ọnụ ugwu Lebanọn.
Ma, m ga-eme ka unu bụrụ ala ịkpa.
Ọ dịghị obodo ọ bụla n’ime obodo unu niile mmadụ ga-ebi.+
7 M ga-ahọpụta ndị ga-ebibi unu.*
Onye nke ọ bụla ga-eji ngwá agha ya.+
Ha ga-egbutu osisi sida unu ndị kacha mma,
Meekwa ka ha daba n’ọkụ.+
8 “‘Ọtụtụ ndị si mba dị iche iche ga na-ajụ ibe ha ma ha na-agafe obodo a, sị: “Gịnị mere Jehova ji mee obodo ukwu a ihe a?”+ 9 Ha ga-azakwa ha, sị: “Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ ọgbụgba ndụ ha na Jehova bụ́ Chineke ha gbara gaa na-akpọrọ chi ọzọ dị iche iche isiala, na-efekwa ha.”’+
10 Unu eberela onye nwụrụ anwụ ákwá.
Unu erukwarala ya uju.
Kama, besierenụ onye a dọọrọ n’agha ákwá ike,
N’ihi na ọ gaghị alọta ọzọ. Ọ gaghịkwa ahụ ala a mụrụ ya anya ọzọ.
11 “E nwere ihe Jehova kwuru banyere Shalọm,*+ bụ́ eze Juda, onye si n’ala a pụọ, onye bụ́kwa nwa Josaya, nke nọchiri Josaya+ nna ya. Ọ sịrị, ‘Ọ gaghị alọta n’ala a ọzọ. 12 N’ihi na n’obodo a dọọrọ ya n’agha laa ka ọ ga-anwụ. Ọ gaghịkwa ahụ ala a anya ọzọ.’+
13 A ga-ata mmadụ ahụhụ ma ọ bụrụ na ọ na-arụ ụlọ ya n’akwụwaghị aka ọtọ,
Jiri mmegbu na-arụ ọnụ ụlọ dị iche iche n’elu ụlọ ya,
Na-eme ka mmadụ ibe ya na-arụrụ ya ọrụ n’efu,
Ya rụchaara ya ọrụ, ya ajụ ịkwụ ya ụgwọ,+
14 Onye na-asịkwa, ‘M ga-arụrụ onwe m nnukwute ụlọ,
Nke ọnụ ụlọ ndị dị n’elu ya ga-asakwa mbara.
M ga-etinye ha windo.
M ga-eji osisi sida machie ahụ́ ya, teekwa ya ágbá na-acha uhie uhie.*
15 Ì chere na ị ga na-achị n’ihi na i ji osisi sida na-egosi na ị ka ndị ọzọ?
Nna gị riri nri, ṅụọkwa mmanya,
Ma, o kpere ikpe ziri ezi, meekwa ezi omume.+
Ihe gazikwaara ya.
16 O kpechitere ma ọnụ onye nọ n’ahụhụ ma ọnụ ogbenye.
Ihe gazikwaara ha.
Jehova kwuru, sị, ‘Ihe a o mere ó gosighị na ọ ma m?
17 Anya gị na obi gị dị n’iji aghụghọ achọ ihe ga-abara naanị gị uru,
Dịrịkwa n’igbu* onye aka ya dị ọcha,
Nakwa n’irigbu ndị mmadụ na ịnapụ ha ihe ha nwere.’
18 “Ọ bụ ihe a mere Jehova ji kwuo gbasara Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, sị,
‘Ha agaghị eruru ya uju, na-asị:
“Ewoo, ị dị ka nwanne m nwoke! Ewoo, ị dị ka nwanne m nwaanyị!”
Ha agaghịkwa eruru ya uju, sị:
“Ewoo, nna anyị ukwu! Ewoo, onye dị ebube!”
19 Ya nwụọ, a ga-eme ya ihe a na-eme jakị nwụrụ anwụ.+
A ga-akpụrụ ya n’ala gaa tụfuo
Ná mpụga ọnụ ụzọ ámá Jeruselem.’+
20 Gaa Lebanọn tie mkpu ákwá.
Besie ákwá ike na Beshan,
Nọrọkwa n’Abarim tie mkpu ákwá,+
N’ihi na e bibiela ndị niile gị na ha na-eme enyi.+
21 M dụrụ gị ọdụ n’oge ị na-enweghị ihe na-echegbu gị.
Ma, ị sịrị na ị gaghị ege m ntị.+
Otú a ka i si eme kemgbe ị bụ nwata.
Ị naghị ege m ntị.+
22 Ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile.+
A ga-adọrọkwa ndị gị na ha na-eme enyi n’agha.
Ọdachi niile ga-adakwasị gị ga-emenye gị ihere, mechuokwa gị ihu.
23 Ọ bụ eziokwu na ọ dị ka ì bi na Lebanọn,+
N’ụlọ e ji osisi sida rụọ,+
Ị ga na-asụ ude mgbe ahụ́ ga na-egbu gị mgbu
Otú o si egbu nwaanyị na-amụ nwa.”+
24 “Jehova kwuru, sị, ‘Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, ọ bụrụgodị na gịnwa bụ́ Konaya*+ nwa Jehoyakim,+ bụ́ eze Juda, bụ mgbaaka e ji aka ihe akara m gba n’aka nri, m ga-agbapụ gị n’ebe ahụ. 25 M ga-enyefe gị n’aka ndị na-achọ igbu gị* nakwa n’aka ndị ị na-atụ egwu nakwa n’aka Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn nakwa n’aka ndị Kaldia.+ 26 M ga-achụga gị na nne mụrụ gị n’obodo ọzọ na-abụghị ebe a mụrụ unu. Unu ga-anwụkwa ebe ahụ. 27 E nweghịkwa ihe ga-eme ka unu lọghachi n’ala a na-agụ unu* agụụ ka unu nọrọ na ya.+
28 Nwoke a bụ́ Konaya ọ̀ bụ ite e ledara anya, nke a kụriri akụri,
Ka ọ̀ bụ ite na-enweghị onye chọrọ ya?
Gịnị mere a ga-eji chụpụ ya na ụmụ ya,
Chụga ha n’obodo ha na-amaghị?’+
29 Ndị bi n’ụwa, nụrụnụ ihe Jehova kwuru.
30 Jehova kwuru, sị:
‘Deenụ n’akwụkwọ na nwoke a amụtaghị nwa.
Deekwanụ na ihe agaghị agaziri ya n’oge* niile ọ dị ndụ,
N’ihi na e nweghị otu n’ime ụmụ ya
Ga-anọ n’ocheeze Devid chịa ọzọ na Juda.’”+
23 Jehova kwuru, sị, “Ndị ọzụzụ atụrụ, ndị na-egbu atụrụ ndị m na-azụ, na-achụsasịkwa ha, ga-ata ahụhụ.”+
2 E nwekwara ihe ọzọ Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru gbasara ndị ọzụzụ atụrụ na-azụ ndị ya. O kwuru, sị: “Unu achụsasịala atụrụ m. Unu na-eme ka ha na-agbasasị. Unu anaghịkwa elekọta ha.”+
Jehova kwukwara, sị, “N’ihi ya, m ga-ata unu ahụhụ maka ihe ọjọọ unu na-eme.”
3 “M ga-esi n’ala niile m chụsasịrị atụrụ m kpọkọta ndị fọdụrụ n’ime ha.+ M ga-akpọghachi ha n’ala ha na-anọ ata ahịhịa.+ Ha ga-amụ ụmụ, mụbaakwa.+ 4 M ga-ahọpụtara ha ndị ọzụzụ atụrụ ga na-azụ ha nke ọma.+ Ha agaghịzi atụ egwu. Ụjọ agaghịkwa atụ ha. E nweghịkwa nke ga-efu efu n’ime ha.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
5 Jehova kwukwara, sị, “Oge na-abịa mgbe m ga-eme ka e nwee eze, bụ́ onye ezi omume, nke ga-esi n’ezinụlọ* Devid.+ Ọ ga na-achị,+ na-egosi na ọ na-aghọta ihe, na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ezi omume n’ala a.+ 6 N’oge ọ ga na-achị, a ga-azọpụta Juda.+ Obi ga-erukwa ndị Izrel ala n’ebe ha bi.+ Aha a ga na-akpọ ya bụ: Jehova Mere Ka Anyị Bụrụ Ndị Ezi Omume.”+
7 Jehova kwukwara, sị, “Oge na-abịa mgbe ha na-agaghịzi na-asị, ‘Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, onye si n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel, na-aṅụ iyi.’+ 8 Kama ha ga na-asị, ‘Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, onye si n’ala dị n’ebe ugwu nakwa n’ala niile ọ chụsasịrị ndị Izrel kpọlata ha, na-aṅụ iyi.’ Ha ga-ebikwa n’ala nke ha.”+
9 M na-agwa ndị amụma, sị:
Obi agbawaala m.
Ọkpụkpụ m niile na-ama jijiji.
Mgbe m nụrụ okwu dị nsọ Jehova kwuru,
Adị m ka onye mmanya na-egbu,
Dịkwa ka onye ṅụrọrọ anya.
10 N’ihi na ndị na-akwa iko juru n’ala a.+
Ala a na-eru uju n’ihi ọnụ a bụrụ ya.+
Ahịhịa ndị dị n’ala ịkpa akpọnwụọkwala.+
Omume ha adịghị mma. Ha dịkwa aka ike.
11 Jehova kwuru, sị, “Ma onye amụma ma onye nchụàjà emebiela.*+
Ahụkwala m ihe ọjọọ ha na-eme n’ụlọ m.”+
12 Jehova kwukwara, sị, “N’ihi ihe a ha na-eme, ụzọ ha na-aga na ya ga na-amị amị, gbaakwa ọchịchịrị.+
A ga-enu ha aka, ha adaa.
M ga-eme ka ọdachi dakwasị ha
N’afọ ha ga-aza ajụjụ ihe ha mere.”
13 “Ahụkwala m ihe na-asọ oyi ndị amụma nọ na Sameria+ na-eme.
Ha na-ebu amụma n’aha Bel,
Na-edufukwa ndị Izrel bụ́ ndị m.
14 Ahụkwala m ihe jọgburu onwe ya ndị amụma nọ na Jeruselem na-eme.
Ha na-akwa iko,+ na-aghagbukwa onwe ha n’ụgha.+
Ha na-akwado ndị na-eme ihe ọjọọ.*
Ha anaghịkwa akwụsị ihe ọjọọ ha na-eme.
N’anya m, ha niile dị ka ndị Sọdọm.+
Ndị bi na Jeruselem dịkwa ka ndị Gọmọra.”+
15 N’ihi ya, Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru ihe ọ ga-eme ndị amụma ahụ. Ọ sịrị:
“M ga-eme ka ha taa ahịhịa na-elu ilu.
M ga-enyekwa ha mmiri e tinyere nsí ka ha ṅụọ.+
N’ihi na ndị amụma nọ na Jeruselem emeela ka a kwụsị ife m fewe chi ọzọ n’ala a niile.”
16 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị:
“Unu egela ntị n’ihe ndị amụma, ndị na-eburu unu amụma, na-ekwu.+
Ha na-eduhie unu.*
Ọ bụ ha na-echepụta ihe ha sị na ha hụrụ n’ọhụụ.+
Ọ bụghị mụnwa bụ́ Jehova na-agwa ha ya.+
Ha na-agwakwa ndị niile kpọchiri obi ha na-eme ihe ọjọọ, sị,
‘Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị unu.’+
18 Ònye guzo ebe ndị ha na Jehova dị ná mma guzo
Ka ọ nụ okwu ya, ghọtakwa ya?
Ònye ṅara ntị n’ihe ọ na-ekwu ka o nwee ike nụ ya?
19 Jehova ga-amalite iwe iwe otú oké ifufe si amalite ife.
Otú ahụ oké ifufe si efesi ike ka ọ ga-esi wesa ndị ajọ omume iwe.+
20 Iwe Jehova agaghị adajụ
Ruo mgbe o mere ihe dị ya n’obi.
Unu ga-aghọta ihe a nke ọma n’oge ikpeazụ.
21 Ezighị m ndị amụma ahụ ka ha gaa ebe ọ bụla, ma ha gbaara ọsọ gawa.
Agwaghị m ha ihe ọ bụla, ma ha buru amụma.+
22 Ma, a sị na ha guzo ebe ndị mụ na ha dị ná mma guzo,
Ha gaara eme ka ndị m nụ okwu m.
Ha gaara emekwa ka ha hapụ ụzọ ọjọọ ha na omume ọjọọ ha.”+
23 Jehova kwuru, sị, “Àbụ m Chineke naanị mgbe m nọ nso, ma ghara ịbụ Chineke mgbe m nọ ebe dị anya?”
24 Jehova sịkwara, “È nwere onye ga-ezo ebe m na-agaghị enwe ike ịhụ ya?”+
Jehova kwukwara, sị, “È nwere ihe ga-eme n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa mụ aghara ịma?”+
25 “Anụla m ka ndị amụma, ndị na-ebu amụma ụgha n’aha m, na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’+ 26 Olee mgbe ibu amụma ụgha ga-apụ ndị amụma a n’obi? Ha bụ ndị amụma na-eji obi ha ekwu ihe ha ji aghọgbu ndị mmadụ.+ 27 Mkpa ha bụ iji nrọ ha na-akọrọ ibe ha mee ka ndị m chefuo aha m, otú ahụ ndị nna nna ha ji maka Bel+ chefuo aha m. 28 Onye amụma rọọ nrọ, ya kọọ nrọ ọ rọrọ. Ka onye nụrụ okwu m kwuokwa ihe ọ nụrụ n’aghaghị ụgha.”
Jehova kwuru, sị: “Gịnị jikọrọ okporo ọka na mkpụrụ ọka?”
29 Jehova kwukwara, sị, “Ọ̀ bụ na okwu m adịghị ka ọkụ,+ dịrịkwa ka hama e ji akpụ ụ́zụ́, nke na-akụri nnukwu nkume?”+
30 Jehova sịkwara, “M ga-ata ndị amụma ahụhụ maka na ha na-agwa ndị mmadụ ihe masịrị ha, na-asị na ọ bụ ihe m kwuru.”+
31 Jehova kwukwara, sị, “M ga-ata ndị amụma ahụhụ maka na ha na-eji ire ha ekwu, sị, ‘Ọ bụ ya kwuru ihe a!’”+
32 Jehova sịkwara, “M ga-ata ndị amụma ahụhụ maka na ha na-akọ nrọ ha na-arọghị. Ha na-akọ ya, na-eme ka ndị m kpafuo n’ihi ụgha ha na-agha na ọnụ ha na-etu.”+
“Ma ọ bụghị m ziri ha, ọ bụghịkwa m gwara ha ihe ha na-ekwu. N’ihi ya, ha agaghị abara ndị a uru ọ bụla.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
33 “Ọ bụrụ na ndị a ma ọ bụ ndị amụma ma ọ bụ ndị nchụàjà asị gị, ‘Ozi a si n’aka Jehova bụ ibu arọ,’* gwa ha, sị, ‘“Ọ bụ unu bụ ibu arọ! M ga-achụpụkwa unu.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’ 34 Onye amụma ma ọ bụ onye nchụàjà ma ọ bụ onye nkịtị nke na-asị, ‘Ozi si n’aka Jehova bụ ibu arọ,’ m ga-ata onye ahụ na ezinụlọ ya ahụhụ. 35 Onye ọ bụla n’ime unu na-ajụ ibe ya, na-ajụkwa nwanne ya, sị, ‘Gịnị ka Jehova zara? Gịnịkwa ka Jehova kwuru?’ 36 Kwụsịnụ ikwu na ozi Jehova bụ ibu arọ. Ọ bụ ihe onye ọ bụla n’ime unu na-ekwu bụ ibu arọ, n’ihi na unu na-ekwu ihe unu chere. Unu agbanweekwala okwu Chineke anyị dị ndụ, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha.
37 “Jụọ onye amụma ahụ, sị: ‘Gịnị ka Jehova zara gị? Gịnịkwa ka Jehova kwuru? 38 Ebe ọ bụ na unu nọgidere na-asị, “Ozi Jehova bụ ibu arọ,” Jehova kwuru, sị: “N’ihi na unu ka na-asị, ‘Ozi Jehova bụ ibu arọ,’ mgbe m gwachara unu ka unu kwụsị ịsị: “Ozi Jehova bụ ibu arọ,”’ 39 m ga-ebuli unu elu, tụfuo ma unu ma obodo m nyere unu na nna nna unu hà. 40 M ga-emenye unu ihere ruo mgbe ebighị ebi. A gaghịkwa echefu ihere m ga-emenye unu echefu.”’”+
24 Jehova gosiri m nkata abụọ a dọsara n’ihu ụlọ nsọ Jehova. Mkpụrụ fig dịkwa n’ime ha. O gosiri m ha mgbe Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn si na Jeruselem dọrọ Jekonaya*+ nwa Jehoyakim+ bụ́ eze Juda n’agha laa Babịlọn, ya na ndị isi Juda, ndị omenkà, na ndị na-akpụ ụ́zụ́.*+ 2 Mkpụrụ fig ndị dị n’otu nkata dị ezigbo mma. Ha dị ka mkpụrụ fig ndị bu ibe ha ụzọ mịa. Ma, mkpụrụ fig ndị dị na nkata nke ọzọ mebiri ezigbo mmebi, nke na e nweghị onye nwere ike ịta ha.
3 Jehova jụkwara m, sị: “Jeremaya, gịnị ka ị na-ahụ?” Mụ asị ya: “Ana m ahụ mkpụrụ fig. Mkpụrụ fig ndị nke dị mma dị ezigbo mma. Ma mkpụrụ fig ndị nke mebiri emebi, mebiri ezigbo mmebi, nke na e nweghị onye nwere ike ịta ha.”+
4 Jehova gwaziri m, sị: 5 “Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị, ‘M ga-ele ndị a e si na Juda dọrọ n’agha, ndị m si ebe a chụga ala ndị Kaldia, anya ọma. M ga-ele ha anya ọma otú m lere mkpụrụ fig ndị a dị mma. 6 M ga na-elekọta ha, meekwa ka ha lọghachi n’ala a.+ M ga-eme ka ihe gaziere ha. Agaghị m ebibi ha. M ga-akụ ha ka osisi. Agaghịkwa m efopụ ha.+ 7 M ga-eme ka ha jiri obi ha chọọ ịmata m nke ọma, ka ha mata na m bụ Jehova.+ Ha ga-abụ ndị m, mụnwa ga-abụkwa Chineke ha,+ n’ihi na ha ga-eji obi ha niile lọghachikwute m.+
8 “‘Ma, a bịa n’ihe gbasara mkpụrụ fig ndị ahụ mebiri emebi, nke na e nweghị onye nwere ike ịta ha,+ Jehova kwuru, sị: “Otú ahụ ka m ga-esi were Zedekaya+ bụ́ eze Juda, ndị o mere ndị isi nakwa ndị fọdụrụ na Jeruselem, ma hà nọ na Juda ma hà nọ n’Ijipt.+ 9 M ga-eme ka ọdachi dakwasị ha, ụdị nke ga-eme ka ụjọ tụwa alaeze niile dị n’ụwa.+ Ha ga na-akọcha ha, jiri ha na-ama atụ otú ọdachi na-adị, na-akwakwa ha emo. A ga-abụkwa ha ọnụ+ n’ebe niile m ga-achụga ha.+ 10 M ga-eji mma agha,+ ụnwụ, na ọrịa na-efe efe na-eme ha ihe,+ ruo mgbe ha nwụchapụrụ n’ala m nyere ha na ndị nna nna ha.”’”
25 Chineke gwara Jeremaya okwu gbasara ndị Juda niile n’afọ nke anọ n’ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya bụ́ eze Juda. Afọ ahụ bụkwa afọ nke mbụ n’ọchịchị Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn. 2 Jeremaya onye amụma kwuru gbasara* ndị Juda niile na ndị niile bi na Jeruselem, sị:
3 “Jehova na-agwa m okwu, mụ ana-agwa unu ihe ọ na-agwa m ugboro ugboro,* ma unu anaghị ege ntị.+ Ihe a na-eme kemgbe afọ iri abụọ na atọ, malite n’afọ nke iri na atọ n’ọchịchị Josaya+ nwa Emọn, bụ́ eze Juda. 4 Jehova nọkwa na-ezitere unu ndị ohu ya niile, bụ́ ndị amụma, ugboro ugboro,* ma unu anaghị ege ha ntị. Unu anaghịkwa atọ ntị n’ala ịnụ ihe ha na-agwa unu.+ 5 Ha na-asị, ‘Biko, ka onye ọ bụla n’ime unu hapụ ụzọ ọjọọ ya na omume ọjọọ ya,+ ka unu wee bitee aka n’ala Jehova nyere unu na nna nna unu hà kemgbe ọtụtụ afọ. 6 Unu esokwala chi ọzọ dị iche iche, unu efekwala ha, unu akpọkwarala ha isiala, ka unu wee ghara iji ọrụ aka unu kpasuo Chineke iwe. N’ihi na ịkpasu ya iwe ga-eme ka o mee ka ọdachi dakwasị unu.’
7 “Jehova kwuru, sị: ‘Ma, unu anaghị ege m ntị. Kama, unu na-eji ọrụ aka unu akpasu m iwe. Ọdachi ga-adakwasị unu n’ihi ihe a unu na-eme.’+
8 “N’ihi ya, Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: ‘“Ebe ọ bụ na unu anaghị eme ihe m kwuru, 9 m ga-ezi ozi ka a kpọta ezinụlọ niile si n’ebe ugwu.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. O kwukwara, sị, “M ga-agwa Nebukadneza* eze Babịlọn, bụ́ ohu m,+ ka ha bịa lụso obodo a+ na ndị bi na ya na mba ndị a niile gbara ya gburugburu agha.+ M ga-ebibi ha, ha abụrụ ihe na-awụ akpata oyi na ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị. M ga-ala ha n’iyi. Ha agaghịkwa adịzi. 10 M ga-eme ka ha kwụsị iti mkpu ọṅụ na mkpu ndị obi dị ụtọ ha na-eti,+ meekwa ka a ghara ịnụ olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ+ na ụda nkume e ji egwe nri. M ga-emekwa ka a gharazie ịna-ahụ ìhè ọkụ.* 11 Ala a niile ga-abụzi ala e bibiri ebibi na ihe na-awụ akpata oyi. Mba ndị a ga-ejekwara eze Babịlọn ozi ruo afọ iri asaa.”’+
12 “Jehova kwuru, sị, ‘Ma, afọ iri asaa gachaa,+ m ga-eme ka eze Babịlọn na mba ahụ, ya bụ, ndị Kaldia, zaa ajụjụ* maka mmehie ha.+ Ala ha ga-atọgbọrọkwa nkịtị ruo mgbe ebighị ebi.+ 13 M ga-eme ka ihe niile m kwuru na m ga-eme ala ahụ mezuo n’isi ya, ya bụ, ihe niile e dere n’akwụkwọ a, nke Jeremaya buru amụma na a ga-eme mba dị iche iche. 14 Ọtụtụ mba na ndị eze ukwu+ ga-eji ha mere ndị ohu.+ M ga-akwụ ha ụgwọ ihe ha mere, kwụọkwa ha ụgwọ ọrụ aka ha.’”+
15 Jehova bụ́ Chineke Izrel gwara m, sị: “Nara m iko mmanya a nke iwe m dị ọkụ, meekwa ka mba niile m ga-eziga gị ṅụọ ihe dị n’ime ya. 16 Ha ga-aṅụ ya, na-adagharị, na-emekwa ka ndị ara n’ihi agha m ga-eme ka a lụso ha.”+
17 M wee nara Jehova iko ahụ, meekwa ka mba niile Jehova zigara m ṅụọ mmanya dị na ya.+ 18 Ndị mbụ ṅụrụ ya bụ Jeruselem na obodo ndị dị na Juda,+ ma ndị eze ha ma ndị isi ha. Mmanya a ha ṅụrụ ga-eme ka ha laa n’iyi, bụrụ ihe na-awụ akpata oyi na ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị nakwa ihe a bụrụ ọnụ.+ Ihe a ga-emezukwa n’egbughị oge. 19 Ndị ọzọ ṅụrụ ya bụ Fero bụ́ eze Ijipt, ndị na-ejere ya ozi, ndị o mere ndị isi, na ndị obodo ya niile.+ 20 Ndị ọzọkwa bụ ndị niile si esi bịa biri n’Ijipt, ndị eze niile na-achị Ọz, ndị eze niile na-achị ndị Filistia,+ ya bụ, ndị Ashkelọn,+ ndị Gaza, ndị Ekrọn, na ndị fọdụrụ n’Ashdọd. 21 Ndị ọzọ bụ ndị Ịdọm,+ ndị Moab,+ na ndị Amọn.+ 22 Ndị ọzọkwa bụ ndị eze niile na-achị Taya, ndị eze niile na-achị Saịdọn,+ na ndị eze na-achị ndị bi n’agwaetiti dị n’akụkụ oké osimiri. 23 Ndị ọzọ bụ ndị Didan,+ ndị Tima, ndị Bọz, na ndị niile na-akpụ ajị ndị dị n’akụkụ ntị ha abụọ.+ 24 Ndị ọzọkwa bụ ndị eze niile na-achị ndị Arab+ na ndị eze niile na-achị ndị si ebe dị iche iche bi n’ala ịkpa. 25 Ndị ọzọ bụ ndị eze niile na-achị ndị Zimraị, ndị eze niile na-achị ndị Ịlam,+ na ndị eze niile na-achị ndị Midia.+ 26 Ndị ọzọkwa bụ ndị eze niile na-achị ebe ugwu, ma ndị nọ nso ma ndị nọ ebe dị anya, n’otu n’otu, na alaeze niile ọzọ dị n’ụwa. Eze na-achị Shishak*+ ga-aṅụkwa mmanya ahụ mgbe ndị ọzọ a niile ṅụchara.
27 “Gwakwa ha, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “Ṅụọnụ mmanya a, ṅụfeenụ ya ókè, gbọọnụ agbọ, daakwanụ n’ala ka unu ghara inwe ike ibili+ n’ihi agha m ga-eme ka a lụso unu.”’ 28 Ọ bụrụkwa na ha ajụ ịnara gị iko ahụ, jụkwa ịṅụ mmanya dị n’ime ya, sị ha, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “Unu ga-aṅụrịrị ya. 29 Ebe ọ bụ na obodo m ga-ebu ụzọ mee ka ọdachi dakwasị bụ obodo a na-anọ eto aha m,+ m̀ ga-ahapụ ịta unu ahụhụ?”’+
“Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị ‘Agaghị m ahapụ ịta unu ahụhụ, n’ihi na e nwere mma agha m na-akpọ ka ọ bịa gbuo ndị niile bi n’ụwa.’
30 “Buokwara ndị a amụma, sị ha,
‘Jehova ga-esi n’elu bigbọọ.
Ọ ga-esi n’ebe dị nsọ o bi mee ka a nụ olu ya.
Ọ ga-ebigbọ maka iwe ọ na-ewesa ụlọ ya dị n’ụwa.
Ọ ga-eji oké olu bụọ abụ yiri nke ndị na-azọchapụta mmanya
Iji gosi na o meriela ndị niile bi n’ụwa.’
31 Jehova kwukwara, sị, ‘Mkpọtụ a ga-eme ga-eru ebe ụwa sọtụrụ,
N’ihi na Jehova na mba niile nwere okwu.
Ọ ga-eji aka ya kpee mmadụ niile* ikpe.+
Ọ ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ndị ajọ omume.’
32 Jehova nke ụsụụ ndị agha sịrị:
‘Ọdachi ga-esi n’otu mba ruo mba ọzọ.+
A ga-esikwa n’ebe ndị dị n’ime ime ụwa mee ka oké ifufe fewe.+
33 N’ụbọchị ahụ, ndị Jehova gburu ga-atọgbọrọ malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa. A gaghị eruru ha uju. A gaghịkwa achịkọta ha ma ọ bụ lie ha. Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala.’
34 Ndị ọzụzụ atụrụ, beenụ ákwá, tiekwanụ mkpu ákwá.
Ndị a ma ama, bụ́ ndị so n’ìgwè atụrụ, tụrụọnụ onwe unu n’ala,
N’ihi na ụbọchị a ga-egbu unu na ụbọchị a ga-achụsasị unu eruola,
Unu ga-ada n’ala ka arịa dị oké ọnụ.
35 Ndị ọzụzụ atụrụ enweghị ebe ha ga-agbaba.
Ndị a ma ama, bụ́ ndị so n’ìgwè atụrụ, agaghịkwa agbapụli.
36 Geenụ ntị! Ndị ọzụzụ atụrụ na-eti mkpu,
Ndị a ma ama, bụ́ ndị so n’ìgwè atụrụ, na-etikwa mkpu ákwá,
N’ihi na Jehova na-ala ebe atụrụ na-ata ahịhịa n’iyi.
37 N’ihi ezigbo iwe Jehova na-ewe,
A gaghịzi enwe ihe dị ndụ n’ebe dị iche iche ahụ́ na-eru ndị mmadụ ala.
38 Ọ pụtala ka ọdụm nke si n’ọgba ya pụta,+
Ala ha aghọọ ihe na-awụ akpata oyi
N’ihi na o ji mma agha mesie ha ike.
O wesakwara ha ezigbo iwe.
26 Ná mmalite ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, Jehova gwara Jeremaya okwu. 2 Jeremaya kwuziri, sị: “Jehova gwara m, sị, ‘Gaa guzoro n’ogige ụlọ Jehova kwuo ihe niile m ga-agwa gị ka i kwuo gbasara* ndị niile bi n’obodo dị iche iche dị na Juda, ndị na-abịa n’ụlọ Jehova ife ya.* Gwa ha ihe niile m na-aga ịgwa gị. Ya enwekwala nke ị ga-ahapụ ịgwa ha. 3 Ikekwe, ha ga-ege gị ntị, onye ọ bụla n’ime ha ahapụ ihe ọjọọ ọ na-eme, mụ agbanweekwa obi m gbasara ọdachi m bu n’obi ime ka ọ dakwasị ha maka ihe ọjọọ ha na-eme.+ 4 Gwa ha, sị: “Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụrụ na unu edebeghị iwu* m nyere unu, wee hapụ ige m ntị, 5 ọ bụrụkwa na unu ahapụ ige ntị n’ihe ndị ohu m bụ́ ndị amụma na-ekwu, ndị m na-ezitere unu ugboro ugboro,*+ 6 m ga-eme ka ụlọ a dị ka Shaịlo.+ M ga-emekwa ka obodo a bụrụ ihe mba niile ga-eji na-abụ ọnụ.’”’”+
7 Ndị nchụàjà na ndị amụma na mmadụ niile nụkwara ka Jeremaya na-ekwu ihe ndị a n’ụlọ Jehova.+ 8 Mgbe Jeremaya kwuchara ihe niile Jehova gwara ya ka ọ gwa mmadụ niile, ndị nchụàjà na ndị amụma na mmadụ niile jidere ya, sị: “Ị ga-anwụrịrị. 9 Gịnị mere i ji buo amụma n’aha Jehova, sị, ‘Ụlọ a ga-adị ka Shaịlo, a ga-ebibikwa obodo a ka a ghara inwe onye ga-ebi na ya’?” Mmadụ niile wee gbaa Jeremaya gburugburu n’ụlọ Jehova.
10 Mgbe ndị isi Juda nụrụ ihe a, ha si n’ụlọ* eze bịa n’ụlọ Jehova ma nọrọ ọdụ n’ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá a rụrụ ọhụrụ n’ụlọ Jehova.+ 11 Ndị nchụàjà na ndị amụma wee gwa ndị isi ahụ na mmadụ niile, sị: “E kwesịrị igbu nwoke a,+ n’ihi na o buru amụma ihe ga-eme obodo a. Unu jikwa ntị unu nụ ya.”+
12 Jeremaya gwaziri ndị isi niile na mmadụ niile, sị: “Ọ bụ Jehova zitere m ka m buo amụma a unu nụrụ gbasara ihe ga-eme ụlọ a na obodo a.+ 13 Ma ugbu a, ọ bụrụ na unu emee ka àgwà unu na omume unu dị mma, rubekwara Jehova bụ́ Chineke unu isi, Jehova ga-agbanwe obi ya ka ọdachi ahụ o kwuru okwu ya ghara ịdakwasị unu.+ 14 Ma, mụnwa nọ unu n’aka. Meenụ m ihe ọ bụla dị unu mma na ihe ọ bụla masịrị unu. 15 Ma, maranụ na ọ bụrụ na unu egbuo m, ọbara onye aka ya dị ọcha ga-adị n’isi unu na n’isi obodo a nakwa n’isi ndị bi na ya, n’ihi na n’eziokwu, ọ bụ Jehova ziri m ka m bịa gwa unu ihe a niile.”
16 Ndị isi na mmadụ niile wee gwa ndị nchụàjà na ndị amụma, sị: “E kwesịghị igbu nwoke a, n’ihi na ọ bụ aha Jehova bụ́ Chineke anyị ka o ji gwa anyị okwu.”
17 Ụfọdụ n’ime ndị okenye obodo ahụ malitekwara ịgwa ìgwè mmadụ ahụ niile, sị: 18 “Maịka+ onye Moreshet nọ na-ebu amụma n’oge Hezekaya+ bụ eze Juda, na-agwa ndị Juda niile, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị:
“A ga-akọ Zayọn ka ubi.
Jeruselem ga-abụzi obodo e bibiri ebibi.+
Oké ọhịa ga-etochikwa ugwu nke ụlọ nsọ dị n’elu ya.”’+
19 “Hezekaya bụ́ eze Juda na ndị Juda niile hà gburu ya? Ọ̀ bụ na Hezekaya atụghị egwu Jehova, ma rịọ Jehova ka o meere ha ebere,* nke mere na Jehova gbanwere obi ya gbasara ọdachi o kwuru ga-adakwasị ha?+ N’eziokwu, anyị na-achọ ịkpatara onwe anyị* nnukwu ọdachi.
20 “Nwoke ọzọ nke nọkwa na-ebu amụma n’aha Jehova bụ Yuraịja nwa Shemaya onye Kiriat-jierim.+ Ọ nọ na-ebu ụdị amụma a Jeremaya na-ebu, na-ekwu ihe ga-eme obodo a na ala a. 21 Eze Jehoyakim+ na ndị dike ya niile nakwa ndị niile o mere ndị isi nụrụ ihe ọ nọ na-ekwu, eze achọwa igbu ya.+ Ozugbo Yuraịja nụrụ ya, ụjọ tụwara ya, ya agbaga Ijipt. 22 Eze Jehoyakim zikwara Elnetan+ nwa Akbọ na ndị ọzọ ka ha gaa Ijipt. 23 Ha gakwara kpọpụta Yuraịja n’Ijipt, kpọrọ ya kpọtara Eze Jehoyakim, ya ejiri mma agha gbuo ya,+ e liekwa ya n’ebe a na-eli ndị nkịtị.”
24 Ma, Ahaịkam+ nwa Shefan+ chebere Jeremaya, nke mere na e nyefeghị Jeremaya n’aka ndị mmadụ ka ha gbuo ya.+
27 Ná mmalite ọchịchị Jehoyakim nwa Josaya, bụ́ eze Juda, Jehova gwara Jeremaya okwu. 2 Jeremaya kwuziri, sị: “Jehova gwara m, sị, ‘Tụhịa eriri n’osisi yok dị iche iche, nyarakwa ha n’olu. 3 Were ha nye ndị ozi bịara Jeruselem ịhụ Zedekaya bụ́ eze Juda ka hanwa gaa nye ha eze Ịdọm,+ eze Moab,+ eze ndị Amọn,+ eze Taya,+ na eze Saịdọn.+ 4 Gwa ha ka ha gwa ndị eze ha, sị:
“‘“E nwere ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru. Gwanụ ndị eze unu na o kwuru, sị, 5 ‘Ọ bụ mụnwa ji ike m na-enweghị atụ na aka m siri ike kee ụwa, keekwa mmadụ na anụmanụ ndị bi na ya. Enyekwala m ya onye ọ masịrị m inye ya.*+ 6 Ugbu a, enyela m ohu m bụ́ Nebukadneza,+ eze Babịlọn, ala a niile. Enyekwala m ya anụ ọhịa dị iche iche ka ha na-ejere ya ozi. 7 Mba niile ga na-ejere ya na nwa ya na nwa nwa ya ozi ruo mgbe alaeze ya na-agaghịzi adị,+ mgbe ọtụtụ mba na ndị eze ukwu ga-eji ya mere ohu.’+
8 “‘“Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụrụkwa na mba ma ọ bụ alaeze ọ bụla ajụ ijere Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn ozi, jụkwa ịnyara yok eze Babịlọn n’olu, m ga-eji mma agha,+ ụnwụ, na ọrịa na-efe efe taa mba ahụ ahụhụ. M ga-esi n’aka Nebukadneza tagide ha ahụhụ ruo mgbe ha gwụchara.’
9 “‘“‘N’ihi ya, unu egela ndị amụma unu ntị, ha na ndị na-agbara unu afa na ndị na-akọwara unu nrọ na ndị na-emere unu anwansi* nakwa ndị dibịa afa unu, bụ́ ndị na-agwa unu, sị: “Unu agaghị ejere eze Babịlọn ozi.” 10 Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu, ọ bụrụkwa na unu egee ha ntị, a ga-esi n’ala unu kpọga unu ebe dị anya. M ga-achụsasị unu, unu alaakwa n’iyi.
11 “‘“Jehova kwuru, sị, ‘Ma mba nke ga-anyara yok eze Babịlọn n’olu wee na-ejere ya ozi, m ga-eme ka ọ nọgide* n’ala ya, na-akọ ihe na ya, birikwa na ya.’”’”
12 M gwakwara Zedekaya+ bụ́ eze Juda ihe a niile, sị: “Nyaranụ yok eze Babịlọn n’olu, na-ejekwaranụ ya na ndị ya ozi ka unu wee dịrị ndụ.+ 13 Gịnị mere gị na ndị gị ga-eji kwe ka mma agha,+ ụnwụ,+ na ọrịa na-efe efe+ gbuo unu otú Jehova kwuru na ha ga-egbu mba na-ejereghị eze Babịlọn ozi? 14 Unu egela ndị na-eburu unu amụma ntị. Ha na-asị unu, ‘Unu agaghị ejere eze Babịlọn ozi.’+ Ma, ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.+
15 “Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụghị m gwara ha ihe ha na-agwa unu. Ha na-ebu amụma ụgha n’aha m. Ọ bụrụkwa na unu egee ha ntị, m ga-achụsasị unu, unu alaakwa n’iyi, ma unu ma ndị amụma na-eburu unu amụma.’”+
16 M gwara ndị nchụàjà na ndị a niile, sị: “Jehova kwuru, sị, ‘Unu egela ntị n’ihe ndị amụma na-eburu unu amụma na-ekwu, sị: “N’oge na-adịghị anya, a ga-esi Babịlọn bulata arịa ndị na-adị n’ụlọ Jehova.”+ Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.+ 17 Unu egela ha ntị. Na-ejerenụ eze Babịlọn ozi ka unu wee dịrị ndụ.+ Ma unu jụ ijere ya ozi, obodo a ga-abụzi ebe e bibiri ebibi. 18 Ma ọ bụrụ na ha bụ ndị amụma, ọ bụrụkwa na Jehova na-agwa ha okwu, biko, ka ha rịọ Jehova nke ụsụụ ndị agha ka a ghara iburu arịa ndị fọrọ n’ụlọ Jehova nakwa n’ụlọ* eze Juda nakwa na Jeruselem buga Babịlọn.’
19 “E nwere ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru gbasara ogidi ndị dị n’ụlọ ahụ+ na nnukwu ite a na-akpọ Oké Osimiri*+ na ihe ndị e ji ebu ihe+ na arịa ndị ọzọ fọrọ n’obodo a, 20 bụ́ ndị Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn na-eburughị mgbe o si Jeruselem dọrọ Jekonaya nwa Jehoyakim, bụ́ eze Juda, n’agha laa Babịlọn, ya na ndị niile a ma ama na Juda nakwa na Jeruselem.+ 21 N’eziokwu, e nwere ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru gbasara arịa ndị fọrọ n’ụlọ Jehova nakwa n’ụlọ* eze Juda nakwa na Jeruselem. O kwuru, sị: 22 ‘“A ga-eburu ha laa Babịlọn.+ Ebe ahụkwa ka ha ga-adị ruo mgbe m ga-ebulata ha ebe a.”*+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’”
28 N’otu afọ ahụkwa, ná mmalite ọchịchị Zedekaya+ bụ́ eze Juda, n’ọnwa nke ise, n’afọ nke anọ n’ọchịchị ya, Hananaya onye amụma, bụ́ nwa Azọ, onye Gibiọn,+ gwara m n’ụlọ Jehova n’ihu ndị nchụàjà nakwa n’ihu mmadụ niile, sị: 2 “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘M ga-agbaji yok eze Babịlọn.+ 3 Tupu afọ abụọ agaa, m ga-ebulata arịa niile na-adị n’ụlọ Jehova ebe a, ya bụ, arịa ndị Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn si ebe a buga Babịlọn.’”+ 4 “Jehova kwukwara, sị, ‘M ga-akpọlata Jekonaya+ nwa Jehoyakim,+ bụ́ eze Juda, ya na ndị niile e si na Juda dọrọ n’agha laa Babịlọn,+ n’ihi na m ga-agbaji yok eze Babịlọn.’”
5 Jeremaya onye amụma gwaziri Hananaya onye amụma okwu n’ihu ndị nchụàjà nakwa n’ihu ndị niile guzo n’ụlọ Jehova. 6 Jeremaya onye amụma sịrị: “Amen!* Ka Jehova mee ihe a i kwuru! Ka Jehova mezuo ihe i buru n’amụma. Ka o bulata arịa ụlọ Jehova. Ka o sikwa Babịlọn kpọlata ndị niile a dọọrọ n’agha otú i kwuru. 7 Ma, biko, nụrụ ihe a m na-agwa gị na ndị a niile. 8 N’oge ochie, ndị amụma ndị bu m ụzọ na ndị bu gị ụzọ buru amụma gbasara ọtụtụ obodo na ọtụtụ alaeze ukwu ndị a ga-alụso agha, ndị ọdachi ga-adakwasị, na ndị ọrịa na-efe efe ga-eme ihe. 9 Ọ bụrụkwa na onye amụma ọzọ ebuo amụma na udo ga-adị n’ebe ndị ahụ, a ga-ama n’eziokwu na ọ bụ Jehova zitere ya ma ihe o kwuru mezuo.”
10 N’ihi ihe a Jeremaya kwuru, Hananaya onye amụma weere yok ahụ Jeremaya onye amụma nya n’olu gbajie.+ 11 Hananaya nọkwa n’ihu mmadụ niile ahụ kwuo, sị: “Jehova kwuru, sị, ‘Tupu afọ abụọ agaa, otú a ka m ga-esi gbajie yok Nebukadneza eze Babịlọn, bụ́ nke mba niile nya n’olu.’”+ Jeremaya onye amụma wee gawara onwe ya.
12 Mgbe Hananaya onye amụma gbajichara yok ahụ Jeremaya onye amụma nya n’olu, Jehova gwara Jeremaya, sị: 13 “Gaa gwa Hananaya, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Ọ bụ yok osisi ka ị gbajiri,+ ma a ga-eji yok ígwè dochie ya.” 14 N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “M ga-eme ka mba a niile nyara yok ígwè n’olu, iji jeere Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn ozi. Ha ga na-ejere ya ozi.+ M ga-enyekwa ya anụ ọhịa dị iche iche.”’”+
15 Jeremaya onye amụma gwaziri Hananaya+ onye amụma, sị: “Hananaya, biko, gee ntị. Ọ bụghị Jehova zitere gị, ma i meela ka ndị a kwere okwu ụgha.+ 16 N’ihi ihe a i mere, Jehova kwuru, sị, ‘M ga-eme ka ị nwụọ. Ị ga-anwụ n’afọ a, n’ihi na i mere ka ndị mmadụ nupụrụ Jehova isi.’”+
17 Hananaya onye amụma wee nwụọ n’ọnwa nke asaa n’afọ ahụ.
29 Ihe ndị a bụ ihe dị n’akwụkwọ ozi Jeremaya onye amụma si Jeruselem zigara ndị okenye fọdụrụ n’ime ndị a dọọrọ n’agha, ndị nchụàjà, ndị amụma, na mmadụ niile, bụ́ ndị Nebukadneza si na Jeruselem dọrọ n’agha laa Babịlọn. 2 O zigara ya mgbe Jekonaya+ bụ́ eze si na Jeruselem pụọ,+ ya na nne eze+ na ndị na-eje ozi n’obí eze, ndị isi Juda na Jeruselem, nakwa ndị omenkà na ndị na-akpụ ụ́zụ́.* 3 Ndị o nyere akwụkwọ ozi ahụ ka ha ziga bụ Elesa nwa Shefan+ na Gemaraya nwa Hilkaya, bụ́ ndị Zedekaya+ eze Juda ziri ka ha gaa Babịlọn hụ Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn. Ihe e dere n’akwụkwọ ozi ahụ bụ:
4 “E nwere ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, gwara ndị niile a dọọrọ n’agha, ndị o mere ka e si na Jeruselem dọrọ n’agha laa Babịlọn. Ọ gwara ha, sị, 5 ‘Rụọnụ ụlọ, birikwanụ na ya. Kọọnụ ubi, riekwanụ ihe si na ya. 6 Lụọnụ nwaanyị, mụọkwanụ ụmụ ndị nwoke na ụmụ ndị nwaanyị. Lụtakwaranụ ụmụ unu ndị nwoke nwaanyị, keekwanụ ụmụ unu ndị nwaanyị di, ka hanwa wee mụọkwa ụmụ ndị nwoke na ụmụ ndị nwaanyị. Mụbaanụ n’ebe ahụ, unu adịkwala ntakịrị. 7 Gbaakwanụ mbọ ka udo dịrị n’obodo ahụ m mere ka a dọrọ unu n’agha laa na ya. Rịọkwanụ Jehova arịrịọ n’isi ya, n’ihi na ọ bụrụ na udo adị na ya, udo ga-adịkwara ununwa.+ 8 Mụnwa bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “Unu ekwela ka ndị amụma unu na ndị na-agbara unu afa duhie unu.+ Unu egekwala ntị ná nrọ ndị ha na-akọrọ unu na ha rọrọ. 9 N’ihi na ‘ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu n’aha m. Ọ bụghị m gwara ha ihe ha na-ekwu.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”’”
10 “Jehova kwukwara, sị, ‘Ọ bụrụ na unu anọzuo afọ iri asaa na Babịlọn, m ga-emere unu ihe ọma,+ kpọlata unu ebe a otú m kwere unu ná nkwa.’+
11 “Jehova kwuru, sị, ‘Ama m nnọọ ihe m na-echere unu. Ọ bụ ka udo dịrị unu, ọ bụghị ka ọdachi dakwasị unu.+ M chọrọ ka ihe dịrị unu ná mma n’ọdịnihu nakwa ka unu nwee olileanya.+ 12 Unu ga-akpọku m, bịakwa rịọ m arịrịọ. M ga-egekwa unu ntị.’+
13 “‘Unu ga-achọ m wee chọta m,+ n’ihi na unu ga-eji obi unu niile na-achọ m.+ 14 M ga-ekwe ka unu chọta m.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. Jehova kwukwara, sị: ‘M ga-akpọkọta ndị obodo unu a dọọrọ n’agha. M ga-esikwa ná mba niile na ebe niile m chụsasịrị unu kpọkọta unu.+ M ga-akpọlatakwa unu n’ebe m mere ka e si dọrọ unu n’agha.’+
15 “Ma, unu na-asị, ‘Jehova emeela ka anyị nwee ndị amụma na Babịlọn.’
16 “E nwere ihe Jehova gwara eze nọ n’ocheeze Devid+ nakwa ndị niile bi n’obodo a, ya bụ, ụmụnne unu ndị na-ekweghị ka a dọrọ ha n’agha otú a dọọrọ unu. 17 ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “M ga-eji mma agha, ụnwụ, na ọrịa na-efe efe na-eme ha ihe.+ M ga-emekwa ka ha dị ka mkpụrụ osisi fig rere ere* nke na e nweghị onye nwere ike ịta ya n’ihi otú o si mebie.”’+
18 “‘M ga-eji mma agha,+ ụnwụ, na ọrịa na-efe efe na-achụ ha ọsọ. M ga-emekwa ka alaeze niile dị n’ụwa tụwa ụjọ n’ihi ihe mere ha,+ ha aghọọ ndị a bụrụ ọnụ, dịrị ka ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ́ na ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị.+ Mba niile m ga-achụga ha ga na-akọchakwa ha.’+ 19 Jehova kwukwara, sị, ‘M ga-eme ha ihe ndị a n’ihi na m nọ na-ezitere ha ndị ohu m bụ́ ndị amụma m ugboro ugboro,*+ ma ha anaghị ege ha ntị mgbe ha na-agwa ha ihe m kwuru.’
“Jehova gwara ha, sị, ‘Unu egeghị ntị.’+
20 “N’ihi ihe a, unu niile ndị a dọọrọ n’agha, ndị Jehova si Jeruselem chụga Babịlọn, nụrụnụ ihe m kwuru. 21 E nwere ihe mụnwa bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru gbasara Ehab nwa Kolaya na Zedekaya nwa Measaya, bụ́ ndị na-eburu unu amụma ụgha n’aha m.+ M sịrị, ‘M ga-enyefe ha n’aka Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn. Ọ ga-egbukwa ha n’ihu unu. 22 Ndị niile e si na Juda dọrọ n’agha laa Babịlọn ga-eji ha na-abụ ọnụ, sị: “Ka Jehova mee ka ị dị ka Zedekaya na Ehab, bụ́ ndị eze Babịlọn gbara ọkụ!” 23 A ga-eme ha ihe a n’ihi na ha kpara àgwà ka ndị nzuzu n’Izrel.+ Ha na nwunye ndị agbata obi ha na-akwa iko. Ha na-ekwukwa okwu ụgha n’aha m, na-ekwu ihe m na-asịghị ha kwuo.+
“‘“Ama m ihe a, abụkwa m onye akaebe n’okwu a.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’”
24 “Gwa Shemaya+ onye Nehelam, sị, 25 ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “I zigaara ndị niile nọ na Jeruselem nakwa Zefanaya+ nwa Measaya, bụ́ onye nchụàjà, na ndị nchụàjà niile akwụkwọ ozi n’aha gị, sị, 26 ‘Jehova emeela gịnwa, bụ́ Zefanaya onye nchụàjà, ka ị nọchie Jehoyada onye nchụàjà, ka ị na-elekọta ụlọ Jehova, nakwa ka i jide nwoke ọ bụla ara na-agba nke na-eme ka onye amụma, tinyekwa ya n’ọtọsị.+ 27 Gịnịzi mere na ị babereghị Jeremaya onye Anatọt+ mba, onye na-eme ka onye amụma n’ihu unu?+ 28 O zitedịịrị anyị ozi na Babịlọn, sị: “Unu ka ga-ebite ebe a aka. Rụọnụ ụlọ, biri n’ime ya. Kọọnụ ubi, riekwa ihe si na ya,+—”’”’”
29 Mgbe Zefanaya+ onye nchụàjà gụụrụ Jeremaya onye amụma akwụkwọ ozi a, 30 Jehova gwara Jeremaya, sị: 31 “Zigara ndị niile a dọọrọ n’agha ozi, sị, ‘E nwere ihe Jehova kwuru gbasara Shemaya onye Nehelam. Ọ sịrị: “Ebe ọ bụ na Shemaya ebuorola unu amụma m na-ezighị ya buo, gbalịakwa ime ka unu kwere okwu ụgha,+ 32 Jehova kwuru, sị, ‘M ga-ata Shemaya onye Nehelam na ụmụ ya ahụhụ. E nweghị onye si n’ezinụlọ ya ga-adị ndụ. Ọ gaghị ahụ ihe ọma m ga-emere ndị m, n’ihi na o mere ka ndị mmadụ nupụrụ Jehova isi.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”’”
30 Jehova gwara Jeremaya, sị: 2 “Mụnwa bụ́ Jehova Chineke Izrel kwuru, sị, ‘Dee ihe niile m na-agwa gị n’akwụkwọ. 3 Jehova kwukwara, sị, “Oge na-abịa mgbe m ga-achịkọta ndị m a dọọrọ n’agha, bụ́ ndị Izrel na ndị Juda.+ M ga-akpọlata ha n’ala m nyere ndị nna nna ha. Ha ga-ebirikwa na ya ọzọ.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’”
4 Ihe ndị a ka Jehova gwara ndị Izrel na ndị Juda.
5 Jehova kwuru, sị:
“Anyị anụla mkpọtụ ndị na-ama jijiji.
Ụjọ na-atụ ndị mmadụ, udo adịghịkwa.
6 Biko, chọpụtanụ ma nwoke ọ̀ na-amụ nwa.
Gịnị mere ihu onye ọ bụla ji gbarụọ?
7 Ewoo! Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị dị egwu.*+
E nweghị ụbọchị ọzọ dị ka ya.
Ọ bụkwa oge Jekọb ga-ata ahụhụ.
Ma m ga-azọpụta ya.”
8 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, “N’ụbọchị ahụ, m ga-agbaji yok ha nya n’olu, dọbiekwa agbụ e kere ha ụzọ abụọ. Ndị ala ọzọ agaghịzi eji ha mere ndị ohu. 9 Ha ga na-efe Jehova bụ́ Chineke ha ofufe, na-ejekwara Devid, bụ́ onye m ga-ahọpụta ka ọ bụrụ eze ha, ozi.”+
10 Jehova kwukwara, sị, “Ohu m Jekọb, atụla ụjọ.
Izrel, atụkwala egwu.+
N’ihi na m ga-esi ebe dị anya zọpụta gị,
Zọpụtakwa ụmụ gị n’ala a dọọrọ ha n’agha laa.+
Jekọb ga-alọta, ahụ́ ga-erukwa ya ala. E nweghị ihe ga-enye ya nsogbu.
E nweghịkwa onye ga-emenye ya ụjọ.”+
11 Jehova kwuru, sị, “M nọnyeere gị, ka m wee zọpụta gị.
Ma, m ga-ebibi mba niile m chụgara gị n’ala ha.+
Ma, agaghị m ebibi gị.+
Kama, m ga-adọ gị aka ná ntị* otú kwesịrị ekwesị.
M ga-atarịrị gị ahụhụ.”+
12 Jehova kwuru, sị:
“Ọkpụkpụ gị nke gbajiri agbaji enweghị ngwọta.+
Ahụ́ i merụrụ agaghị ala ala.
13 E nweghị onye na-arịọ ka a gwọọ ọnyá gị.
E nweghị otú a ga-esi gwọọ gị.
E nweghịkwa ike ịgwọta gị.
14 Ndị niile gị na ha na-eme enyi echefuola gị.+
Ha anaghịzi achọ gị.
N’ihi na apịala m gị ụtarị otú mmadụ si apịa onye iro ya.+
Ataala m gị ahụhụ otú onye obi tara mmiri si ata mmadụ ahụhụ,
N’ihi na njehie gị hiri nne, mmehie gị dịkwa ọtụtụ.+
15 Gịnị mere i ji eti mkpu maka ọkpụkpụ gị gbajiri agbaji?
Ahụ́ na-egbu gị mgbu agaghị akwụsị
N’ihi na njehie gị hiri nne, mmehie gị dịkwa ọtụtụ.+
Ọ bụ mụnwa mere gị ihe a.
16 N’ihi ya, a ga-ebibi ndị niile chọrọ ibibi gị.+
A ga-adọrọkwa ndị iro gị niile n’agha.+
A ga-akwakọrọ ihe ndị na-akwakọrọ ihe gị.
M ga-enyefe ndị na-ebukọrọ ihe gị n’aka ndị ga-ebukọrọ ihe ha.”+
17 Jehova kwuru, sị, “M ga-eme ka ị gbakee. M ga-agwọkwa ọnyá gị,+
N’agbanyeghị na ha niile jụrụ gị, na-asịkwa:
‘Lee Zayọn, nke ọ na-enweghị onye na-achọ ya.’”+
18 Jehova kwukwara, sị:
“M ga-akpọkọta ndị e si n’ụlọikwuu Jekọb dọrọ n’agha.+
M ga-emetere ụlọikwuu ya dị nsọ ebere.
A ga-arụghachi obodo ya n’ala ya dị mkputamkpu.+
Ụlọ elu ya ga-adịkwa n’ebe o kwesịrị ịdị.
19 Ha ga na-abụ abụ ekele, na-achịkwa ọchị.+
M ga-eme ka ha mụbaa. Ha agaghịkwa adị ntakịrị.+
20 Ụmụ Jekọb ga-adị otú ha dị n’oge gboo.
M ga-eme ka ha kwụrụ chịm n’ihu m.+
M ga-ata ndị niile na-emegbu Jekọb ahụhụ.+
21 Jehova kwuru, sị, “Otu n’ime ndị ya ga-abụ onye ukwu.
Otu n’ime ụmụ ya ga-abụkwa onye ọchịchị.
M ga-akpọ onye ukwu ahụ ka ọ bịa nso. Ọ ga-abịakwutekwa m.
N’ihi na ònye ga-anwa anwa bịakwute m ma ọ́ bụghị onye m kpọrọ ka ọ bịa?”
22 “Unu ga-abụ ndị m.+ Mụnwa ga-abụkwa Chineke unu.”+
23 Jehova ga-amalite iwe iwe otú oké ifufe si amalite ife.+
Otú ahụ oké ifufe si efesi ike ka ọ ga-esi wesa ndị ajọ omume iwe.
Unu ga-aghọta ihe a n’oge ikpeazụ.+
31 Jehova kwuru, sị, “N’oge ahụ, m ga-abụrụ ezinụlọ niile dị n’Izrel Chineke, hanwa abụrụ ndị m.”+
2 Jehova kwukwara, sị:
“Mgbe ndị Izrel nọ na-aga ka ha nweta ebe ha ga-ezu ike,
Chineke meere ndị mma agha na-egbughị amara n’ala ịkpa.”
3 Jehova si ebe dị anya bịakwute m, sị:
“M ga-ahụ gị n’anya ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ bụ otú a m si hụ gị n’anya mere m ji dọta gị ebe m nọ.*+
4 Ndị Izrel,* m ga-arụghachi unu otú e si arụghachi ụlọ.+
Unu ga-ewere obere ịgbà unu ọzọ
Gaa na-agba egwú, na-enwekwa aṅụrị.+
5 Unu ga-akọ ubi vaịn ọzọ n’ugwu Sameria.+
Ndị ga-akọ ya ga-atakwa mkpụrụ ya.+
6 Otu ụbọchị, ndị nche na-anọ n’ugwu ndị dị n’Ifrem ga-eti mkpu, sị:
‘Bịanụ ka anyị gaa Zayọn, gakwuru Jehova bụ́ Chineke anyị.’”+
7 N’ihi na Jehova kwuru, sị:
“Jirinụ ọṅụ bụọrọ Jekọb abụ.
Tienụ mkpu ọṅụ maka na unu bụ ndị ndú mba dị iche iche.+
Kọsaanụ ya. Toonụ Chineke, sịkwanụ,
‘Jehova, biko, zọpụta ndị gị, bụ́ ndị fọrọ n’Izrel.’+
8 M ga-esi n’ala dị n’ebe ugwu kpọlata ha.+
M ga-esi n’ime ime ụwa kpọkọta ha.+
M ga-akpọkọta ma ndị ìsì ma ndị ngwọrọ+
Ma ụmụ nwaanyị dị ime ma ụmụ nwaanyị ime na-eme.
Ha ga-adị ọtụtụ mgbe ha ga-alọta.+
M ga-akpọlata ha mgbe ha na-arịọ m ka m meere ha amara.
M ga-eduga ha n’iyi dị iche iche,+
Dugakwa ha n’ala dị larịị nke ha na-agaghị ada ada na ya.
N’ihi na abụ m Nna Izrel, Ifrem bụkwa ọkpara m.”+
“Onye chụsasịrị ndị Izrel ga-akpọkọta ha.
Ọ ga-echebekwa ha otú onye ọzụzụ atụrụ si echebe ìgwè atụrụ ya.+
12 Ha ga-abịa ebe dị elu na Zayọn na-eti mkpu ọṅụ.+
Ihu ha ga na-egbukekwa egbuke n’ihi ịdị mma* Jehova,
N’ihi ọka na mmanya ọhụrụ+ na mmanụ,
Nakwa n’ihi ụmụ ewu na ụmụ atụrụ na ụmụ ehi ha.+
Ha* ga-adịkwa ka ubi mmiri na-ede nke ọma.+
Ha agaghịkwa ahụsi anya ọzọ.”+
M ga-eme ka uju ha na-eru bụrụzie ịṅụrị ọṅụ.+
M ga-akasi ha obi, meekwa ka ha kwụsị iru uju ma ṅụrịwa ọṅụ.+
14 M ga-enye ndị nchụàjà* nri karịrị akarị.
Ndị m ga na-enwekwa obi ụtọ n’ihi ihe ọma ndị m ga-emere ha.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
15 “Jehova kwuru, sị:
‘A na-anụ olu ndị na-ebe ákwá arịrị na olu ndị obi jọrọ njọ, ha ana-ebe ákwá na Rema:+
Rechel na-ebe ákwá maka ụmụ ya.+
O kweghị ka a kasie ya obi n’ákwá ọ na-ebe maka ụmụ ya,
N’ihi na ha anọghịzi.’”+
16 Jehova kwukwara, sị:
“‘Ebezila ákwá. Hichaa anya mmiri,
N’ihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ ị rụrụ.
Ụmụ gị ga-esi n’ala ndị iro ha lọta.+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’
17 ‘Olileanya dị na ihe ga-adịrị gị mma n’ọdịnihu.+
Ụmụ gị ga-alọta n’ala ha.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”
18 “Anụla m ka Ifrem na-ebe ákwá arịrị, na-asị,
‘Adị m ka nwa ehi a na-azụghị azụ.
Ma, ị gbaziela m. Amụtakwala m ihe na ya.
Kpọghachite m, m ga-alọghachikwa,
N’ihi na ị bụ Jehova bụ́ Chineke m.
Mgbe e mere ka m ghọta ihe m mere, o wutere m nnọọ na m mere ya.*
N’ihi ihe ndị m mere n’oge m bụ okorobịa,
Ihere nọ na-eme m, obi m nọkwa na-ama m ikpe.’”+
20 Jehova kwukwara, sị, “Ọ̀ kwa Ifrem bụ nwa m hụrụ n’anya na nwa dị m n’obi?+
Ugboro ole m baara ya mba bụkwa ugboro ole m ga-echeta ya.
Ọ bụ ya mere m* ji na-achọsi ya ike.+
M ga-emetekwara ya ebere.”+
21 “Gwunye ihe ị ga-eji ahụwa ụzọ ama.
Dowekwa ihe a ga-eji amata ụzọ.+
Uche gị dịrị n’okporo ụzọ ị ga-esi aga ebe ị na-aga.+
Ndị Izrel,* lọtanụ. Lọtanụ n’obodo unu dị iche iche.
22 Nwaanyị* na-agba n’èzí, ole mgbe ị ga-akwụsị ịgba n’èzí?
Jehova emeela ka ihe ọhụrụ na-eme n’ụwa:
Nwaanyị ga-eji ike ya niile na-achọ nwoke.”
23 Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “Mgbe m ga-akpọkọta ndị Juda a dọọrọ n’agha, ha ga-anọ n’obodo ndị dị na Juda, sị: ‘Ugwu dị nsọ,+ nke bụ́ ebe a na-anọ eme ezi omume,+ ka Jehova gọzie gị.’ 24 Ndị bi n’obodo niile dị na Juda ga-ebikọ ọnụ, ma ndị ọrụ ubi ma ndị na-azụ atụrụ.+ 25 N’ihi na m ga-eme ka onye* ike gwụrụ nwee ume, meekwa ka afọ ju onye* ọ bụla ike gwụrụ.”+
26 N’oge a, m tetara meghee anya m. Ụra m rahụrụ tọkwara m ụtọ.
27 Jehova kwuru, sị, “Oge na-abịa mgbe m ga-eme ka ndị Izrel na ndị Juda mụbaa. M ga-emekwa ka anụ ụlọ ha mụbaa.”+
28 Jehova kwukwara, sị, “Otú ahụ m kpachaara anya na-achọ otú m ga-esi fopụ ha, kwatuo ha, tida ha, mee ha ihe, laakwa ha n’iyi,+ otú ahụkwa ka m ga-akpachara anya na-achọ otú m ga-esi rụlite ha ka ụlọ, kụọkwa ha ka mkpụrụ.”+ 29 “N’oge ahụ, ha agaghịzi na-asị, ‘Ọ bụ nna nna anyị hà rachara mkpụrụ vaịn na-achaghị acha, ma, ọ bụ ụmụ ha ka ezé na-eri izizi.’+ 30 Onye ọ bụla ga na-anwụzi n’ihi mmehie nke ya. Ọ bụzi onye rachara mkpụrụ vaịn na-achaghị acha ka ezé ga-eri izizi.”
31 Jehova kwuru, sị, “Oge na-abịa mgbe mụ na ndị Izrel na ndị Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ.+ 32 Ọ gaghị adị ka ọgbụgba ndụ ahụ mụ na ndị nna nna ha gbara n’ụbọchị m seere ha n’aka si n’Ijipt kpọpụta ha,+ ‘ya bụ, ọgbụgba ndụ m hanwa mebiri,+ n’agbanyeghị na ọ bụ naanị m bụ onyenwe ha.’* Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”
33 Jehova kwukwara, sị, “Ọgbụgba ndụ mụ na ndị Izrel ga-agba mgbe oge ahụ gachara* bụ na m ga-etinye iwu m n’ime ha,+ deekwa ya n’obi ha.+ M ga-abụ Chineke ha. Ha ga-abụkwa ndị m.”+
34 Jehova sịkwara, “A gaghịzi enwe onye ga-akụziri onye agbata obi ya na nwanne ya, sị, ‘Mara Jehova.’+ N’ihi na ha niile ga-ama m, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu.+ N’ihi na m ga-agbaghara ha ajọ omume ha. Agaghịzi m echeta mmehie ha.”+
35 E nwere ihe Jehova kwuru.
Ọ bụ yanwa kere anyanwụ ka ọ na-enye ìhè n’ehihie,
Tiekwa iwu ka ọnwa na kpakpando na-enye ìhè n’abalị.
Ọ bụ ya na-eme ka oké osimiri na-eme mkpọtụ, na-emekwa ka ọ na-amali elu.
Aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha.+ O kwuru, sị:
36 “‘Ebe ọ bụ na e nweghị mgbe iwu e nyere ihe ndị a na-agaghịzi enwe isi,
E nweghịkwa mgbe ndị Izrel ga-akwụsị ịbụ mba n’anya m.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”
37 Jehova kwukwara, sị: “‘Otú ahụ a na-agaghị atụli eluigwe atụ̀, otú ahụkwa a na-agaghị achọpụtali ntọala ụwa, ka mụnwa na-agaghị ajụ ndị Izrel niile n’agbanyeghị ihe niile ha mere.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”+
38 Jehova kwukwara, sị, “Oge na-abịa mgbe a ga-arụrụ Jehova obodo+ malite n’Ụlọ Elu Hananel+ ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Dị n’Ebe Mgbidi Sụkọtara Isi.+ 39 A ga-agbatị eriri e ji atụ̀ ihe,+ ya eruo n’ugwu Gereb, tụgharịakwa ruo Goa. 40 Ebe ndị a ga-adị nsọ n’anya Jehova:+ Ndagwurugwu ebe a na-ebusa ozu na ebe a na-awụnye ntụ* nakwa ala niile dị ruo Ndagwurugwu Kidrọn,+ ruokwa n’akụkụ Ọnụ Ụzọ Ámá Ịnyịnya+ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. E nweghị ihe ga-eme ka e fopụ ndagwurugwu a ma ọ bụ bibie ya ọzọ.”
32 Ihe a ka Jehova gwara Jeremaya n’afọ nke iri n’ọchịchị Zedekaya bụ́ eze Juda. Afọ ahụ bụkwa afọ nke iri na asatọ n’ọchịchị Nebukadneza.*+ 2 N’oge ahụ, ndị agha eze Babịlọn nọchibidoro Jeruselem, e jikwa Jeremaya onye amụma eji n’Ogige Ndị Nche+ nke dị n’ụlọ* eze Juda. 3 Ọ bụ Zedekaya eze Juda jichiri ya,+ sị: “Gịnị mere i ji na-ebu ụdị ihe a n’amụma? Ị na-asị, ‘Jehova kwuru, sị: “M ga-enyefe obodo a n’aka eze Babịlọn. Ọ ga-ewegharakwa ya.+ 4 Zedekaya eze Juda agaghị agbapụ n’aka ndị Kaldia, n’ihi na a ga-enyeferịrị ya n’aka eze Babịlọn. Ha abụọ ga-ahụ ibe ha, kwuokwa okwu ihu na ihu.”’+ 5 Jehova kwuru, sị, ‘Eze Babịlọn ga-akpụrụ Zedekaya laa Babịlọn, n’ebe ahụkwa ka ọ ga-anọ ruo mgbe m ga-ekpebi ihe m ga-eme ya. Ọ bụ eziokwu na unu na-alụso ndị Kaldia agha, unu agaghị emeri ha.’”+
6 Jeremaya kwuru, sị: “Jehova gwara m, sị, 7 ‘Hanamel nwa Shalọm, bụ́ nwanne nna gị, ga-abịakwute gị, sị: “Zụrụ ala m dị n’Anatọt,+ n’ihi na ọ bụ gị bụ onye mbụ nwere ikike ịgbara ya.”’”+
8 Hanamel nwa nwanne nna m bịakwutekwara m otú Jehova kwuru, bata n’Ogige Ndị Nche, wee sị m: “Biko, zụrụ ala m dị n’Anatọt, nke dị n’ala Benjamin, n’ihi na ọ bụ gị nwe ikike iketa ihe m. Ọ bụkwa gị nwe ikike ịgbara ya. Zụrụ ya.” Mgbe ahụ ka m ji mara na ọ bụ ihe Jehova chọrọ ka m mee.
9 M wee kwụọ Hanamel nwa nwanne nna m ụgwọ ala ahụ dị n’Anatọt. M tụrụ ego m ji kwụọ ya ụgwọ ahụ atụ̀.+ Ọ dị shekel* asaa na mkpụrụ ọlaọcha iri. 10 M dekwara ihe anyị kwekọrịtara n’akwụkwọ,+ pịakọta ya, kaakwa ya akara. M kpọkwara ndị akaebe,+ tụọkwa ego ahụ atụ̀. 11 M weere akwụkwọ ahụ m ji zụọ ya, ma nke a pịakọtara kaa akara otú iwu kwuru ka e mee ma a zụọ ala, ma nke a na-apịakọtaghị apịakọta, 12 nye Barọk+ nwa Neraya+ nwa Masaya. Ndị nọ mgbe m nyere ya akwụkwọ ndị ahụ bụ Hanamel nwa nwanne nna m, ndị akaebe ahụ bịanyere aka n’akwụkwọ ahụ m ji zụọ ala, na ndị Juu niile nọ ọdụ n’Ogige Ndị Nche ahụ.+
13 M nọkwa n’ihu ha gwa Barọk, sị: 14 “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Were akwụkwọ ndị a m ji zụọ ala tinye n’ite ụrọ, ka ha wee dịtee aka, ma akwụkwọ nke a pịakọtara kaa akara ma nke a na-apịakọtaghị apịakọta.’ 15 N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘A ga-emecha na-azụ ụlọ na ala na ubi vaịn n’obodo a.’”+
16 Mgbe m nyechara Barọk nwa Neraya akwụkwọ ahụ m ji zụọ ala, m kpere ekpere gwa Jehova, sị: 17 “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ọ bụ gị ji ike gị na-enweghị atụ+ na aka gị siri ike kee eluigwe na ụwa. E nweghị ihe nyịrị gị ime. 18 Ị na-egosi ọtụtụ puku mmadụ ịhụnanya,* ma ị na-akwụ ndị bụ́ ụmụ ụgwọ mmehie ndị nna ha mere.+ Ị bụ ezi Chineke, Onye ukwu, na Dike. Aha gị bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha. 19 Nzube gị dị ebube. Ị na-arụkwa nnukwu ọrụ.+ I ji anya gị ahụ ihe niile ụmụ mmadụ na-eme,+ iji kwụọ onye ọ bụla ụgwọ otú o si kpaa àgwà.+ 20 I mere ihe àmà, rụọkwa ọrụ ebube dị iche iche n’Ijipt, nke ndị mmadụ ma ruo taa. I si otú ahụ mee ka ndị Izrel na ndị ọzọ niile mara aha gị+ otú a ma ya taa. 21 I ji ihe àmà, ọrụ ebube, ike gị na aka gị siri ike nakwa ihe ndị na-emenye ezigbo ụjọ si n’Ijipt kpọpụta ndị gị bụ́ ndị Izrel.+
22 “Ka oge na-aga, i nyere ha ala a ị ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi na ị ga-enye ha.+ Ala a bụ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ 23 Ha batara n’ala a nweta ya, ma ha emeghị ihe i kwuru. Ha edebeghịkwa iwu gị. Ha emeghịkwa ihe niile i nyere ha iwu ka ha mee, i wee mee ka ọdachi a niile dakwasị ha.+ 24 Ndị mmadụ abịala jiri ájá rụọ mgbidi gburugburu obodo anyị, ka ha weghara ya.+ Ndị Kaldia, ndị nọ na-alụso anyị agha, ga-ewegharakwa obodo anyị n’ihi mma agha,+ ụnwụ, na ọrịa na-efe efe+ na-akpa anyị aka ọjọọ. Ihe ị na-ahụ na-eme anyị na-egosi na ihe niile i kwuru na ha ga-eme emezuola. 25 Ma, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ị gwara m ka m gaa zụọ ala, ka m nọrọkwa n’ihu ndị akaebe kwụọ ụgwọ ya ebe ị makwa na a ga-enyefe obodo a n’aka ndị Kaldia.”
26 Jehova wee gwa Jeremaya, sị: 27 “Abụ m Jehova, Chineke mmadụ niile.* È nwere ihe nyịrị m? 28 Mụnwa bụ́ Jehova kwuru, sị: ‘M ga-enyefe obodo a n’aka ndị Kaldia nakwa n’aka Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn. Ọ ga-ewegharakwa ya.+ 29 Ndị Kaldia, ndị nọ na-alụso obodo a agha, ga-abata mụnye ya ọkụ, ya agbaa ọkụ.+ Ebe ndị ọzọ ha ga-agba ọkụ bụ ụlọ ndị obodo a na-anọ n’elu ha achụrụ Bel àjà, na-achụkwara chi ọzọ dị iche iche àjà mmanya. Àjà ndị a ha na-achụ na-akpasu m iwe.’+
30 “Jehova kwuru, sị, ‘Ndị Izrel na ndị Juda na-eme naanị ihe dị njọ n’anya m, malite mgbe ha bụ ụmụaka.+ Ndị Izrel ji ọrụ aka ha na-akpasu m iwe. 31 Obodo a na-akpasu m iwe, na-emekwa ka ọnụma ju m obi malite n’ụbọchị ọ ghọrọ obodo ruo taa.+ Ọ bụ ihe mere m ga-eji ewepụ ya n’ihu m.+ 32 M ga-ewepụkwa ya n’ihi ihe ọjọọ niile ndị Izrel na ndị Juda mere, nke ha ji akpasu m iwe, ha na ndị eze ha,+ ndị isi ha,+ ndị nchụàjà ha, ndị amụma ha,+ nakwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem. 33 Ha nọ na-agbakụta m azụ. Ha echeghị ihu n’ebe m nọ.+ N’agbanyeghị na m nọ na-ezi ha ihe ugboro ugboro,* e nweghị onye n’ime ha nabatara aka ná ntị m na-adọ ha.+ 34 Ha dowekwara arụsị ha na-asọ oyi n’ụlọ ahụ a na-anọ eto aha m, si otú ahụ merụọ ya.+ 35 Ha rụkwaara Bel ebe dị elu na Ndagwurugwu Nwa Hinọm.*+ Ha na-anọ ebe ahụ akpọ ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị ọkụ iji chụọrọ Molek àjà.+ Ihe a ha na-eme abatatụbeghị m n’obi.* Ọ bụghịkwa mụnwa gwara ha+ kpawa arụ a, nke mere ka Juda mehie.’
36 “N’ihi ya, e nwere ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru gbasara obodo a unu na-ekwu na a ga-eji mma agha, ụnwụ, na ọrịa na-efe efe nyefee n’aka eze Babịlọn. Ọ sịrị, 37 ‘M ga-esi n’obodo niile m ji iwe na ọnụma na oké iwe chụga ha kpọkọta ha.+ M ga-akpọlata ha ebe a, meekwa ka ha biri na ya, obi eruokwa ha ala.+ 38 Ha ga-abụ ndị m, mụnwa ga-abụkwa Chineke ha.+ 39 M ga-eme ka ha nwee otu obi,+ na-akpakwa otu ụdị àgwà, ka ha wee na-atụ egwu m mgbe niile, ka ihe wee dịrị ha na ụmụ ha ná mma.+ 40 Mụ na ha ga-agba ndụ na agaghị m akwụsị imere ha ihe ọma.+ Ọgbụgba ndụ a ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi.+ M ga-emekwa ka ịtụ m egwu dịrị ha n’obi, ka ha ghara ịgbakụta m azụ.+ 41 M ga na-enwe aṅụrị imere ha ihe ọma.+ M ga-eji obi m niile na mkpụrụ obi* m niile mee ka ha bigide n’ala a.’”+
42 “Jehova kwuru, sị, ‘Otú ahụ m mere ka nnukwu ọdachi a niile dakwasị ndị a, ka m ga-emekwara ha ihe ọma niile m kwere ha ná nkwa.+ 43 A ga-ebidokwa ọzọ ịna-azụ ala n’ala a,+ n’agbanyeghị na unu na-asị: “Ọ tọgbọzi nkịtị. Mmadụ na anụ ụlọ anọghịzi na ya. E nyefeekwala ya n’aka ndị Kaldia.”’
44 “Jehova kwukwara, sị, ‘Ndị mmadụ ga-eji ego na-azụ ala, na-edekwa akwụkwọ ndị e ji kwekọrịta na a zụọla ha, na-apịachi ha, na-akakwa ha akara, na-akpọkwa ndị akaebe. Ihe a ga na-eme n’ala Benjamin+ nakwa n’ebe niile gbara Jeruselem gburugburu nakwa n’obodo ndị dị na Juda+ nakwa n’obodo ndị dị n’ala bụ́ ugwu ugwu nakwa n’obodo ndị dị n’ala dị larịị+ nakwa n’obodo ndị dị n’ebe ndịda. Ihe a ga-eme n’ihi na m ga-akpọlata ndị ha a dọọrọ n’agha.’”+
33 Mgbe Jeremaya ka nọ ebe a kpọchiri ya n’Ogige Ndị Nche,+ Jehova gwara ya okwu nke ugboro abụọ, sị: 2 “E nwere ihe mụnwa bụ́ Jehova, Onye kere ụwa, Jehova, Onye kpụrụ ya ka o sie ezigbo ike, na-ekwu. Jehova bụ aha m. M na-agwa gị, sị, 3 ‘Kpọkuo m. M ga-aza gị. M ga-eji obi m niile gwa gị ihe ndị dị ebube a na-enweghị ike ịghọta aghọta, ndị ị na-amaghịkwa.’”+
4 “E nwere ihe mụnwa bụ́ Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru gbasara ụlọ ndị dị n’obodo a na ụlọ ndị eze Juda bụ́ ndị a kwaturu ka ndị iro ghara iji mma agha si ná mgbidi ha ji ájá rụọ bịa lụso ha agha.+ 5 M kwukwara ihe ahụ gbasara ndị na-abịa ịlụso ndị Kaldia agha nakwa gbasara ebe dị iche iche ozu ndị m ji iwe na ọnụma gbuo juru, ya bụ, ozu ndị ihe ọjọọ ha na-eme mere m ji jụ obodo a. 6 M kwuru gbasara obodo ahụ, sị, ‘M ga-eme ka ọ gbakee, ka ahụ́ dị ya mma.+ M ga-agwọkwa ndị bi na ya, mee ka udo dịrị ha, ahụ́ eruokwa ha nnọọ ala.+ 7 M ga-akpọlata ma ndị Juda ma ndị Izrel a dọọrọ n’agha.+ M ga-emekwa ka ha dị ike otú ha dị na mbụ.+ 8 M ga-asachapụ mmehie ha niile,+ gbagharakwa ha mmehie ha niile nakwa iwu m ha mebiri.+ 9 Ịnụ aha obodo a ga-eme ka m na-enwe aṅụrị. M ga-emekwa ka mba niile n’ụwa, ndị ga-anụ gbasara ihe ọma niile m na-emere ndị m,+ too m ma sọpụrụ m. Ha ga-atụ ụjọ, maakwa jijiji+ n’ihi ihe ọma niile m ga-emere ndị bi na ya na udo m ga-eme ka ọ dịrị na ya.’”+
10 “Jehova kwuru, sị, ‘Unu ga-asị na ebe a abaghịzi uru, na mmadụ na anụ ụlọ anọghị na ya, nakwa na obodo ndị dị na Juda nakwa okporo ámá ndị dị na Jeruselem tọgbọzi nkịtị, na mmadụ anọghị na ha, na e nweghị onye bi na ha, na anụ ụlọ anọghịkwa na ha. Ma, a ga-emecha nụwa 11 mkpu ọṅụ na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ,+ olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ, olu ndị na-asị: “Keleenụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, n’ihi na Jehova dị mma.+ Ịhụnanya ya* na-adịru mgbe ebighị ebi!”’+
“Jehova kwuru, sị, ‘Ha ga na-eweta àjà ekele n’ụlọ Jehova,+ n’ihi na m ga-akpọlata ndị ala a a dọọrọ n’agha ka ha dịrịkwa otú ha dị na mbụ.’”
12 “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwukwara, sị, ‘N’ala a na-abaghịzi uru, nke mmadụ na anụ ụlọ na-anọghị, nakwa n’obodo niile dị na ya, a ga-emecha nwee ala anụmanụ na-ata ahịhịa, ebe ndị ọzụzụ atụrụ ga-eduru atụrụ ha na-aga.’+
13 “Jehova kwuru, sị, ‘Ndị ọzụzụ atụrụ ga-emecha na-agụ atụrụ ha ọnụ n’obodo ndị dị n’ebe bụ́ ugwu ugwu, n’obodo ndị dị n’ala dị larịị, nakwa n’obodo ndị dị n’ebe ndịda nakwa n’ala Benjamin nakwa n’ebe niile gbara Jeruselem gburugburu+ nakwa n’obodo ndị dị na Juda.’”+
14 “Jehova kwukwara, sị, ‘Oge na-abịa mgbe m ga-emezu ọmarịcha nkwa m kwere ndị Izrel na ndị Juda.+ 15 N’oge ahụ, m ga-eme ka onye* ezi omume si n’ezinụlọ Devid pụta.+ Ọ ga na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ezi omume n’ala a.+ 16 N’oge ahụ, a ga-azọpụta ndị Juda.+ Obi ga-erukwa ndị bi na Jeruselem ala.+ Aha a ga na-akpọ onye ahụ bụ: Jehova Mere Ka Anyị Bụrụ Ndị Ezi Omume.’”+
17 “Jehova kwuru, sị, ‘Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye si n’ezinụlọ Devid ga-anọ n’ocheeze Izrel.+ 18 Ọ dịghịkwa mgbe a na-agaghị enwe nwoke bụ́ otu n’ime ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, nke na-eguzo n’ihu m ka ọ chụọ àjà a na-esucha ọkụ, àjà ọka, na àjà ndị ọzọ.’”
19 Jehova gwakwara Jeremaya ọzọ, sị: 20 “Mụnwa bụ́ Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụrụ na unu nwere ike imebi ọgbụgba ndụ m nke na-achị ehihie na ọgbụgba ndụ m nke na-achị abalị, ka a ghara inwe ehihie na abalị n’oge ha,+ 21 maranụ na e nwekwara ike imebi ọgbụgba ndụ mụ na Devid bụ́ ohu m,+ a gharazie inwe nwa ya ga-anọ n’ocheeze ya na-achị,+ nweekwa ike imebi ọgbụgba ndụ mụ na ndị Livaị bụ́ ndị nchụàjà, ndị na-ejere m ozi.+ 22 Otú ahụ a na-enweghị ike ịgụta kpakpando ndị dị n’eluigwe* ọnụ, otú ahụkwa a na-enweghị ike ịtụ ájá dị n’oké osimiri atụ̀, ka m ga-eme ka ụmụ* Devid bụ́ ohu m na ndị Livaị na-ejere m ozi mụbaa.’”
23 Jehova gwakwara Jeremaya ọzọ, sị: 24 “Ị́ nụbeghị ihe ndị a na-ekwu? Ha na-asị, ‘Jehova ga-ajụ ezinụlọ abụọ ahụ ọ họọrọ.’ Ha na-elelị ndị m. Ha anaghịzi ewere ha ka mba.
25 “Jehova kwukwara, sị, ‘Otú ahụ m mere ka e nwee ọgbụgba ndụ m nke na-achị ehihie na abalị,+ meekwa ka e nwee iwu* ndị na-achị eluigwe na ụwa,+ 26 otú ahụ ka m na-enweghị ike ịjụ nwa* Jekọb na nwa* Devid ohu m, agaghịkwa m ahapụ isi n’ụmụ* ya họpụta ndị ga na-achị ndị si n’ezinụlọ* Ebreham, Aịzik, na Jekọb. N’ihi na m ga-akpọkọta ndị ha a dọọrọ n’agha.+ M ga-emetekwara ha ebere.’”+
34 Mgbe Nebukadneza* eze Babịlọn na ndị agha ya niile na alaeze niile dị n’ụwa, bụ́ ndị nọ n’okpuru ya, nakwa ndị niile ọ na-achị, nọ na-alụso Jeruselem na obodo ya niile agha,+ Jehova gwara Jeremaya, sị:
2 “Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị, ‘Gaa gwa Zedekaya+ eze Juda, sị: “Jehova sịrị, ‘M ga-enyefe obodo a n’aka eze Babịlọn. Ọ ga-agbakwa ya ọkụ.+ 3 Ị gaghị agbapụ n’aka ya, n’ihi na a ga-ejiderịrị gị, nyefeekwa gị n’aka ya.+ Gị na eze Babịlọn ga-ahụ ihu na ihu. Ọ ga-agwa gị okwu ihu na ihu. Ị ga-agakwa Babịlọn.’+ 4 Ma, Zedekaya eze Juda, gee ntị n’ihe Jehova kwuru, ‘Jehova kwuru gbasara gị, sị: “A gaghị eji mma agha gbuo gị. 5 Ị ga-anwụ n’udo.+ Ndị gị ga-amụrụ gị insens* otú ha mụụrụ nna nna gị hà, bụ́ ndị eze bu gị ụzọ. Ha ga-erukwara gị uju, sị, ‘Ewoo, nna anyị ukwu!’ n’ihi na ‘ekwuola m ya.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”’”’”
6 Jeremaya onye amụma gwara Zedekaya eze Juda ihe a niile na Jeruselem, 7 mgbe ndị agha eze Babịlọn nọ na-alụso Jeruselem na obodo niile fọrọ na Juda agha,+ ya bụ, Lekish+ na Azika.+ Ọ bụ naanị obodo abụọ a fọrọ n’ime obodo niile a rụsiri ike na Juda.
8 E nwere ihe Jehova gwara Jeremaya mgbe Eze Zedekaya na ndị niile nọ na Jeruselem gbachara ndụ ka a hapụ ndị ohu ka ha nwere onwe ha.+ 9 Ha gbara ndụ ka onye ọ bụla hapụ ohu ya, bụ́ onye Hibru, ka ọ laa, ma ohu ya nwoke ma ohu ya nwaanyị, ka onye ọ bụla ghara iji onye Juu ibe ya mere ohu. 10 Ndị isi niile na mmadụ niile wee rube isi. Ha gbara ndụ na onye ọ bụla n’ime ha ga-ahapụ ohu ya nwoke na ohu ya nwaanyị ka ọ laa, ka ha gharazie iji ha mere ohu. Ha mere ihe a ha kwekọrịtara ma hapụ ndị ohu ha ka ha laa. 11 Ma, ha mechara kpọrọghachi ndị ohu ha ndị nwoke na ndị ohu ha ndị nwaanyị, bụ́ ndị ha hapụburu ka ha laa. Ha kpọọrọ ha ka ha gbawara ha ohu ọzọ. 12 Jehova gwaziri Jeremaya okwu ọzọ. Jehova gwara ya, sị:
13 “Jehova bụ́ Chineke Izrel sịrị, ‘Mụ na nna nna unu hà gbara ndụ+ n’ụbọchị m si n’ala Ijipt, ebe ha nọ na-agba ohu, kpọpụta ha.+ M gwara ha, sị: 14 “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu nwere onye Hibru, bụ́ nwanne ya, onye e resịrị ya ka ọ gbawara ya ohu, ya abụrụkwa na ohu ahụ ejeerela ya ozi afọ isii, ọ ga-ahapụ ya ka ọ laa n’afọ nke asaa. Ọ ga-ahapụ ya ka o nwere onwe ya.”+ Ma nna nna unu hà egeghị m ntị. Ha atọghịkwa ntị ha n’ala. 15 Ma, n’oge na-adịbeghị anya,* ununwa gbanwere, mee ihe dị mma n’anya m. Onye ọ bụla n’ime unu hapụrụ nwanne ya na-agbara ya ohu ka ọ laa. Unu nọkwa n’ụlọ a a na-anọ eto aha m gbaa ndụ n’ihu m. 16 Ma unu gbanwere ọzọ, mebie aha m.+ Unu gara kpọrọghachi ndị ohu unu ndị nwoke na ndị nke nwaanyị, ndị obi dị ụtọ na unu hapụrụ ha ka ha nwere onwe ha. Unu kpọọrọ ha ka ha gbawara unu ohu ọzọ.’
17 “N’ihi ya, Jehova kwuru, sị: ‘Unu emeghị ihe m gwara unu. Unu ahapụghị ụmụnne unu na-agbara unu ohu ka ha nwere onwe ha.’+ Jehova kwukwara, sị, ‘N’ihi ihe a unu mere, m ga-eme ka mma agha, ọrịa na-efe efe, na ụnwụ gbuo unu.+ Ọ bụ otú m ga-esi mee ka unu nwere onwe unu. Ihe m ga-eme unu ga-eme ka ụjọ tụwa alaeze niile dị n’ụwa.+ 18 M ga-enyefe ndị mebiri ọgbụgba ndụ m n’aka ndị iro ha, n’ihi na ha emeghị ihe mụ na ha kwekọrịtara mgbe anyị ji nwa ehi gbaa ndụ. Anyị gbara ndụ a mgbe ha bọwara nwa ehi ahụ ụzọ abụọ si n’etiti ya gafere.*+ 19 Ndị mụ na ha gbara ndụ a bụ ndị isi Juda, ndị isi Jeruselem, ndị na-eje ozi n’obí eze, ndị nchụàjà, na ndị obodo a niile, ndị si n’etiti nwa ehi ahụ a bọwara abọwa gafere. 20 M ga-enyefe ha n’aka ndị iro ha nakwa n’aka ndị na-achọ igbu ha.* Ozu ha ga-abụrụ nnụnụ na anụ ọhịa ihe oriri.+ 21 M ga-enyefe Zedekaya bụ́ eze Juda na ndị o mere ndị isi n’aka ndị iro ha nakwa n’aka ndị na-achọ igbu ha* nakwa n’aka ndị agha eze Babịlọn,+ ndị hapụrụ ịlụso ha agha.’+
22 “Jehova kwuru, sị, ‘M ga-enye iwu, meekwa ka ha lọghachi n’obodo a. Ha ga-alụso ya agha, weghara ya ma gbaa ya ọkụ.+ M ga-emekwa ka obodo niile dị na Juda tọgbọrọ nkịtị n’enweghị onye ga-ebi na ha.’”+
35 N’oge Jehoyakim+ nwa Josaya bụ eze Juda, Jehova gwara mụnwa bụ́ Jeremaya, sị: 2 “Gaa hụ ezinụlọ ndị Rikab.+ Gwa ha okwu. Kpọbata ha n’ụlọ Jehova, n’otu n’ime ụlọ a na-anọ eri ihe. Ha bata, bunye ha mmanya ka ha ṅụọ.”
3 M wee kpọrọ Jeazanaya nwa Jeremaya nwa Habazinaya, kpọrọkwa ụmụnne ya na ụmụ ya niile nakwa ezinụlọ ndị Rikab niile, 4 bata n’ụlọ Jehova. M kpọbara ha n’ụlọ ụmụ Henan nwa Igdalaya, bụ́ onye nke ezi Chineke, na-anọ eri ihe. Ụlọ a dị n’akụkụ ụlọ ndị isi na-anọ eri ihe, nke dị n’elu ụlọ Measaya nwa Shalọm, bụ́ onye nche ọnụ ụzọ, na-anọ eri ihe. 5 M dọsakwara nnukwu iko dị iche iche mmanya juru, chịsakwa obere iko, n’ihu ezinụlọ ndị Rikab ma sị ha: “Ṅụọnụ mmanya.”
6 Ma ha sịrị: “Anyị agaghị aṅụ mmanya, n’ihi na Jehonadab*+ nwa Rikab, bụ́ nna nna anyị, nyere anyị iwu, sị, ‘Unu emekatakwala ṅụọ mmanya, ma unu ma ụmụ unu. 7 Unu arụla ụlọ. Unu aghakwala mkpụrụ. Unu akọla ubi vaịn. Unu enwekwala ubi vaịn. Kama, na-ebinụ n’ụlọikwuu n’oge niile unu dị ndụ, ka unu wee bie ogologo ndụ n’ala a unu bụ ndị mbịarambịa.’ 8 Anyị na-edebekwa iwu niile Jehonadab nwa Rikab bụ́ nna nna anyị nyere anyị. Anyị aṅụtụbeghị mmanya ọ bụla, ma anyị ma ndị nwunye anyị ma ụmụ anyị ndị nwoke ma ụmụ anyị ndị nwaanyị. 9 Anyị anaghị arụ ụlọ, nke anyị ji ebi n’ụlọ. Anyị enweghị ubi vaịn. Anyị enweghị ala. Anyị enweghịkwa mkpụrụ ọ bụla. 10 Anyị bi n’ụlọikwuu, na-emekwa ihe niile Jehonadab* nna nna anyị nyere anyị n’iwu. 11 Ma, mgbe Nebukadneza* eze Babịlọn bịara ịlụso obodo a agha,+ anyị sịrị, ‘Bịanụ ka anyị banye Jeruselem ka ndị agha Kaldia na ndị agha Siria ghara ịkpara anyị aka.’ Ugbu a, anyị bizi na Jeruselem.”
12 Jehova wee gwa Jeremaya, sị: 13 “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Gaa gwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị: “Ọ̀ bụ na a nọghị na-agba unu ume ka unu mee ihe m kwuru?”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 14 “Jehonadab nwa Rikab nyere ụmụ ya iwu ka ha ghara ịṅụ mmanya. Ha aṅụbeghịkwa mmanya ọ bụla ruo taa, n’ihi na ha na-edebe iwu nna nna ha nyere ha.+ Ma, mụnwa agwala unu okwu ugboro ugboro,* ma unu erubereghị m isi.+ 15 Anọ m na-ezitere unu ndị ohu m niile, bụ́ ndị amụma. M na-ezite ha ugboro ugboro,*+ ha ana-asị unu, ‘Biko, ka onye ọ bụla n’ime unu hapụ ihe ọjọọ ọ na-eme,+ mewe ihe ọma. Unu esokwala chi ọzọ dị iche iche, unu efekwala ha ofufe, ka unu wee biri n’ala m nyere unu na nna nna unu hà.’+ Ma unu atọghị ntị n’ala. Unu egeghịkwa m ntị. 16 Ụmụ Jehonadab nwa Rikab debere iwu nna nna ha nyere ha,+ ma ndị a egeghị m ntị.”’”
17 “N’ihi ya, Jehova, Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: ‘M ga-eme ka ọdachi niile m kwuru na ọ ga-adakwasị ndị Juda na ndị niile bi na Jeruselem dakwasị ha,+ n’ihi na m gwara ha okwu ma ha egeghị m ntị. M nọkwa na-akpọ ha ma ha azaghị m.’”+
18 Ma, Jeremaya gwara ezinụlọ ndị Rikab, sị: “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Ebe ọ bụ na unu rubeere Jehonadab, bụ́ nna nna unu, isi, na-edebe iwu niile o nyere unu, na-emekwa nnọọ ihe ọ gwara unu mee, 19 Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, sịrị: “Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye si n’ezinụlọ Jehonadab* nwa Rikab ga na-ejere m ozi.”’”
36 N’afọ nke anọ n’ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya bụ́ eze Juda, Jehova gwara Jeremaya, sị: 2 “Were akwụkwọ mpịakọta dee ihe niile m gwara gị na m ga-eme ndị Izrel na ndị Juda+ na mba niile,+ ya bụ, ihe niile m gwara gị malite n’ụbọchị mbụ m gwara gị okwu n’oge Josaya nọ ndụ ruo taa.+ 3 Ikekwe, ndị Juda nụ gbasara ọdachi niile m bu n’obi ime ka ọ dakwasị ha, ha nwere ike hapụ ihe ọjọọ ndị ha na-eme, mụ agbagharakwa ha njehie ha na mmehie ha.”+
4 Jeremaya kpọziri Barọk+ nwa Neraya gwa ya ihe niile Jehova gwara yanwa bụ́ Jeremaya, Barọk edee ha n’akwụkwọ mpịakọta.+ 5 Jeremaya wee gwa Barọk, sị: “A naghịzi ekwe m banye n’ụlọ Jehova. 6 N’ihi ya, banye ebe ahụ gụpụta okwu Jehova m gwara gị ka i dee n’akwụkwọ mpịakọta. Gụpụta ya ka ndị nọ n’ụlọ Jehova n’ụbọchị a na-ebu ọnụ nụ ya. Gụọkwara ya ndị Juda niile si n’obodo ha dị iche iche na-abata. 7 Ikekwe, Jehova ga-anụ arịrịọ ha ga-arịọ ka o meere ha amara, hanwa ahapụkwa ihe ọjọọ ha na-eme, n’ihi na Jehova kwuru na ọ ga-eji iwe na ọnụma dị egwu mee ha ihe.”
8 Barọk nwa Neraya wee mee ihe niile Jeremaya onye amụma gwara ya. Ọ gara n’ụlọ Jehova gụpụta ihe Jehova kwuru nke dị n’akwụkwọ mpịakọta ahụ.+
9 N’ọnwa nke itoolu n’afọ nke ise n’ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya bụ́ eze Juda, ndị niile bi na Jeruselem nakwa ndị niile si n’obodo ndị dị na Juda na-abata Jeruselem malitere ibu ọnụ n’ihu Jehova.+ 10 Barọk gụpụtakwaara mmadụ niile ihe Jeremaya kwuru nke dị n’akwụkwọ mpịakọta ahụ. Ebe ọ nọ gụpụta ya bụ n’ụlọ Jehova, n’ụlọ Gemaraya+ nwa Shefan+ bụ́ odeakwụkwọ* na-anọ eri ihe, n’ogige nke dị ná mgbago, n’ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá ọhụrụ dị n’ụlọ Jehova.+
11 Mgbe Mịkaya nwa Gemaraya nwa Shefan nụrụ ihe niile Jehova kwuru, ndị a gụpụtara n’akwụkwọ mpịakọta ahụ, 12 ọ gara n’ụlọ* eze, n’ụlọ odeakwụkwọ na-anọ eri ihe. Ndị isi niile* nọ ọdụ n’ebe ahụ, ma Elishama+ bụ́ odeakwụkwọ ma Deleya nwa Shemaya ma Elnetan+ nwa Akbọ+ ma Gemaraya nwa Shefan ma Zedekaya nwa Hananaya ma ndị ọzọ niile bụ́ ndị isi. 13 Mịkaya gwara ha ihe niile ọ nụrụ mgbe Barọk gụpụtaara ndị mmadụ ihe dị n’akwụkwọ mpịakọta ahụ.
14 Ndị isi ahụ niile wee zie Jehudaị nwa Netanaya nwa Shelemaya nwa Kọshaị ka ọ gaa gwa Barọk, sị: “Were akwụkwọ mpịakọta ahụ ị gụpụtaara ndị mmadụ bịa.” Barọk nwa Neraya wee were akwụkwọ mpịakọta ahụ gakwuru ha. 15 Ha wee sị ya: “Biko, nọdụ ala, gụpụtara anyị ya.” Barọk wee gụpụtara ha ya.
16 Ozugbo ha nụrụ okwu ahụ niile, ezigbo ụjọ jidere ha, ha elerịta ibe ha anya ma gwa Barọk, sị: “Anyị ga-agwarịrị eze ihe a niile ị gụpụtara.” 17 Ha jụkwara Barọk, sị: “Biko, ọ̀ bụ Jeremaya gwara gị dee ihe a niile?” 18 Barọk asị ha: “Ọ bụ ya kwuru ihe a niile, mụnwa ejiri ịnk dee ha n’akwụkwọ mpịakọta a.” 19 Ndị isi ahụ gwaziri Barọk, sị: “Gị na Jeremaya gaa zoo. Unu agwakwala onye ọ bụla ebe unu nọ.”+
20 Ndị isi ahụ dowere akwụkwọ mpịakọta ahụ n’ụlọ Elishama bụ́ odeakwụkwọ na-anọ eri ihe, gakwuru eze ebe ọ nọ n’ogige dị n’ụlọ ya ma gwa ya ihe niile ha nụrụ.
21 Eze wee zie Jehudaị+ ka ọ gaa weta akwụkwọ mpịakọta ahụ, ya agaa n’ụlọ Elishama bụ́ odeakwụkwọ na-anọ eri ihe weta ya, bidokwa ịgụpụtara ya eze na ndị isi niile guzo n’akụkụ eze. 22 Ihe a na-eme n’ọnwa nke itoolu,* eze nọkwa ọdụ n’ụlọ ọ na-anọ n’oge oyi, na-anya ọkụ a kwanyere n’ite ọkụ dị ebe ahụ. 23 Mgbe ọ bụla Jehudaị gụrụ nkebi atọ ma ọ bụ anọ n’akwụkwọ ahụ, eze ejiri mma odeakwụkwọ chabie ya ma tụba ya n’ọkụ na-enwu n’ite ọkụ ahụ. O megidere ihe a ruo mgbe ọkụ ahụ rechapụrụ akwụkwọ mpịakọta ahụ niile. 24 Ha atụghị ụjọ ọ bụla. Ma eze ma ndị niile na-ejere ya ozi, bụ́ ndị nụrụ okwu a niile, adọwaghị uwe ha. 25 Elnetan,+ Deleya,+ na Gemaraya+ nọ na-arịọ eze ka ọ ghara ịgba akwụkwọ mpịakọta ahụ ọkụ, ma o geghị ha ntị. 26 Eze gwakwara Jeramiel bụ́ nwa eze na Seraya nwa Azriel na Shelemaya nwa Abdiel ka ha gaa kpụta Barọk bụ́ odeakwụkwọ na Jeremaya onye amụma. Ma Jehova zoro ha.+
27 Mgbe eze gbachara akwụkwọ mpịakọta ahụ Barọk dere ihe Jeremaya kwuru ọkụ,+ Jehova gwara Jeremaya ọzọ, sị: 28 “Were akwụkwọ mpịakọta ọzọ dee ihe ahụ niile e dere n’akwụkwọ mpịakọta mbụ ahụ Jehoyakim eze Juda gbara ọkụ.+ 29 Kwuokwa ihe ga-eme Jehoyakim eze Juda. Kwuo, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Ọ̀ kwa ị gbaala akwụkwọ mpịakọta a ọkụ, sị, ‘Gịnị mere i ji dee na eze Babịlọn ga-abịarịrị bibie ala a na ndị mmadụ nakwa anụmanụ?’+ 30 N’ihi ihe a Jehoyakim eze Juda mere, mụnwa bụ́ Jehova ekwuola ihe ga-eme ya. M sịrị, ‘E nweghị nwa ya ọ bụla ga-anọchi ya n’ocheeze Devid.+ Ozu ya ga-atọgbọ n’ala n’ehihie anwụ na-acha, tọgbọrọkwa n’abalị ezigbo oyi na-atụ.+ 31 M ga-eme ka ya na ụmụ* ya na ndị na-ejere ya ozi zaa ajụjụ maka mmehie ha. M ga-emekwa ka ọdachi niile m kwuru ga-adakwasị ha na ndị bi na Jeruselem na ndị Juda dakwasị ha,+ maka na ha egeghị m ntị.’”’”+
32 Jeremaya weere akwụkwọ mpịakọta ọzọ nye Barọk nwa Neraya, bụ́ odeakwụkwọ.+ Jeremaya nọkwa na-agwa ya ihe ọ ga-ede, ya ana-ede. O dere ihe niile dị n’akwụkwọ mpịakọta ahụ Jehoyakim eze Juda gbara ọkụ.+ A gbakwụnyekwara ya ọtụtụ ihe ọzọ yiri ndị mbụ ahụ.
37 Nebukadneza* eze Babịlọn chiri Zedekaya+ nwa Josaya eze ka ọ chịwa Juda.+ N’ihi ya, Zedekaya nọchiri Konaya*+ nwa Jehoyakim malite ịchị. 2 Ma, ya na ndị na-ejere ya ozi na ndị obodo ahụ emeghị ihe Jehova si n’ọnụ Jeremaya onye amụma gwa ha.
3 Eze Zedekaya wee zie Jehukal+ nwa Shelemaya na Zefanaya+ nwa Measaya onye nchụàjà ka ha gaa gwa Jeremaya onye amụma, sị: “Biko, rịọrọ anyị Jehova bụ́ Chineke anyị arịrịọ.” 4 Jeremaya nọkwa na-aga ebe ọ bụla ọ chọrọ ịga n’obodo ahụ, n’ihi na ha akpọchibeghị ya n’ụlọ mkpọrọ.+ 5 Mgbe ndị Kaldia nọchibidoro Jeruselem ma nụ na ndị agha Fero si Ijipt na-abịa,+ ha laghachiri, hapụzie ịlụso Jeruselem agha.+ 6 N’oge ahụ, Jehova gwara Jeremaya onye amụma, sị: 7 “Mụnwa bụ́ Jehova, bụ́ Chineke Izrel, sịrị, ‘Gakwurunụ eze Juda, onye ziri unu ka unu bịa jụọ m ase, gwakwanụ ya, sị: “Ndị agha Fero, ndị na-abịa inyere unu aka, ga-alaghachi n’obodo ha, bụ́ Ijipt.+ 8 Ndị Kaldia ga-abịaghachi lụso obodo a agha, weghara ya ma gbaa ya ọkụ.”+ 9 Jehova kwukwara, sị: “Unu aghọgbula onwe unu,* na-asị, ‘Ndị Kaldia ga-alarịrị. Ha agaghị alụso anyị agha.’ Unu ekwula otú ahụ n’ihi na ha agaghị ala. 10 Ọ bụrụgodị na unu egbuo ndị agha ndị Kaldia niile na-alụso unu agha, ya abụrụkwa na ndị fọdụrụ n’ime ha bụ naanị ndị e merụrụ ahụ́, ha ga-esikwa n’ụlọikwuu ha pụta gbaa obodo a ọkụ.”’”+
11 Mgbe ndị agha Kaldia hapụrụ Jeruselem n’ihi ndị agha Fero,+ 12 Jeremaya si Jeruselem gawa n’ala Benjamin+ ka e kenye ya ala n’ala ahụ bụ́ ala ndị obodo ha. 13 Ma, mgbe o ruru n’Ọnụ Ụzọ Ámá Benjamin, onyeisi ndị na-eche nche ebe ahụ jichiri ya. Aha ya bụ Iraịja. Ọ bụ nwa Shelemaya nwa Hananaya. Ọ gwakwara Jeremaya onye amụma, sị: “Ị chọrọ ịgbakwuru ndị Kaldia.” 14 Ma Jeremaya sịrị: “Ọ bụghị eziokwu. Anaghị m agbakwuru ndị Kaldia.” Ma, Iraịja egeghị ya ntị. Kama, ọ kpụụrụ Jeremaya kpụgara ndị isi. 15 Ndị isi ahụ wesokwara Jeremaya iwe,+ tie ya ihe, ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ,+ n’ụlọ Jehonatan bụ́ odeakwụkwọ, ebe e jizi mere ụlọ mkpọrọ. 16 A tụbara Jeremaya n’otu n’ime ọnụ ụlọ ndị dị n’ụlọ mkpọrọ dị n’ime ala. Ọ nọtekwara aka ebe ahụ.
17 Eze Zedekaya mechara zie ozi, a kpọtara ya Jeremaya, ya ajụọ ya ajụjụ n’ụlọ* ya na nzuzo.+ Ọ jụrụ ya, sị: “Ò nwere ihe Jehova kwuru?” Jeremaya asị ya: “O nwere. A ga-enyefe gị n’aka eze Babịlọn.”+
18 Jeremaya gwakwara Eze Zedekaya, sị: “Olee ihe ọjọọ m mere gị na ndị na-ejere gị ozi na ndị obodo a, nke mere unu ji tụba m n’ụlọ mkpọrọ? 19 Oleezi ebe ndị amụma unu nọ, ndị buuru unu amụma, sị, ‘Eze Babịlọn agaghị alụso unu na ndị obodo a agha’?+ 20 Ugbu a, onyenwe m eze, biko, gee ntị. Biko, nụrụ arịrịọ m na-arịọ. Akpọghachila m n’ụlọ Jehonatan+ bụ́ odeakwụkwọ, ka m ghara ịnwụ ebe ahụ.”+ 21 N’ihi ya, Eze Zedekaya kwuziri ka a tụba Jeremaya n’ụlọ mkpọrọ dị n’Ogige Ndị Nche.+ A na-esikwa n’okporo ámá ndị na-eme achịcha+ ewetara ya otu ogbe achịcha kwa ụbọchị, ruo mgbe achịcha gwụrụ n’obodo ahụ.+ Jeremaya nọgidekwara n’Ogige Ndị Nche ahụ.
38 Shefataya nwa Matan na Gedalaya nwa Pash-họ na Jukal+ nwa Shelemaya na Pash-họ+ nwa Malkaịja nụrụ ihe Jeremaya nọ na-agwa mmadụ niile. Ọ nọ na-agwa ha, sị: 2 “Jehova kwuru, sị, ‘Mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-egbu onye nọgidere n’obodo a.+ Ma onye chịliiri ndị Kaldia aka elu* ga-adị ndụ, sikwa otú ahụ zọọ onwe ya ndụ,* ya abụrụ ụgwọ ọrụ ya.’*+ 3 Jehova kwuru, sị, ‘A ga-enyeferịrị obodo a n’aka ndị agha eze Babịlọn. Eze Babịlọn ga-ewegharakwa ya.’”+
4 Ndị isi wee gwa eze, sị: “Biko, ka e gbuo nwoke a,+ n’ihi na o ji ihe ndị a ọ na-ekwu na-akụda ndị agha fọdụrụ n’obodo a na mmadụ niile aka. N’ihi na ọ chọghị ka udo dịrị ha, kama ọ chọrọ ka ọdachi dakwasị ha.” 5 Eze Zedekaya asị ha: “Ọ nọ unu n’aka. Agaghị m egbochi unu ime ya ihe ọ bụla unu chọrọ.”
6 Ha kpụụrụ Jeremaya tụba n’olulu Malkaịja nwa eze, nke dị n’Ogige Ndị Nche.+ Ha ji ụdọ seda ya n’olulu ahụ. Mmiri adịghị n’olulu ahụ. Naanị apịtị dị na ya. Jeremaya mikpukwara n’apịtị ahụ.
7 Ibed-melek+ onye Etiopia, bụ́ ọnaozi* nke bi n’ụlọ* eze, nụrụ na ha atụbala Jeremaya n’olulu. N’oge ahụ, eze nọ ọdụ n’Ọnụ Ụzọ Ámá Benjamin.+ 8 Ibed-melek wee si n’ụlọ* eze gaa ebe ahụ eze nọ ma gwa ya, sị: 9 “Onyenwe m eze, ihe a ndị a mere Jeremaya onye amụma jọgburu onwe ya. Ha tụbara ya n’olulu ka agụụ gụgbuo ya ebe ahụ, n’ihi na nri adịghịzi n’obodo a.”+
10 Eze gwaziri Ibed-melek onye Etiopia, sị: “Kpọrọ mmadụ iri atọ ebe a, gaa kpọpụta Jeremaya onye amụma n’olulu ahụ ka ọ ghara ịnwụ ebe ahụ.” 11 Ibed-melek wee kpọrọ ndị ahụ banye n’ụlọ* eze, ha agaa n’okpuru ebe a na-edowe akụ̀,+ chịrị nkịrịka ákwà na iberibe ákwà ndị kara nkà ebe ahụ ma kegide ha n’ụdọ sedatara ya Jeremaya n’olulu ahụ. 12 Ibed-melek onye Etiopia wee gwa Jeremaya, sị: “Biko, tinye nkịrịka ákwà ndị a na iberibe ákwà ndị a e kegidere n’ụdọ a na mkpaabụ gị abụọ.” Jeremaya mekwara otú ahụ. 13 Ha jikwa ụdọ ahụ dọpụta Jeremaya n’olulu ahụ. Jeremaya nọgidekwara n’Ogige Ndị Nche.+
14 Eze Zedekaya ziri ozi, a kpọtara ya Jeremaya onye amụma ebe a na-akpọ ụzọ mbanye nke atọ, nke dị n’ụlọ Jehova, eze agwa Jeremaya, sị: “E nwere ihe m chọrọ ịjụ gị. Ezorola m ihe ọ bụla.” 15 Jeremaya asị Zedekaya: “Ọ bụrụ na mụ agwa gị, ị ga-egbu m. Ọ bụrụkwa na mụ enye gị ndụmọdụ, ị gaghị ege m ntị.” 16 Eze Zedekaya wee ṅụọrọ Jeremaya iyi na nzuzo, sị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, onye nyere anyị ndụ a anyị dị, na-aṅụ iyi na agaghị m egbu gị. Agaghịkwa m enyefe gị n’aka ndị a na-achọ igbu gị.”*
17 Jeremaya gwaziri Zedekaya, sị: “Jehova, Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Ọ bụrụ na ị chịliere ndị ahụ eze Babịlọn mere ndị isi aka elu,* ị* ga-adịrị ndụ na-aga. A gaghị agba obodo a ọkụ. E nweghịkwa ihe ga-eme gị na ezinụlọ gị.+ 18 Ma, ọ bụrụ na ị chịlirighị ndị ahụ eze Babịlọn mere ndị isi aka elu,* a ga-enyefe obodo a n’aka ndị Kaldia. Ha ga-agba ya ọkụ.+ Ị gaghịkwa agbapụ n’aka ha.’”+
19 Eze Zedekaya wee gwa Jeremaya, sị: “M na-atụ ndị Juu gbakwuuru ndị Kaldia ụjọ, n’ihi na ọ bụrụ na e nyefee m n’aka ha, ha nwere ike imenyụ m anya.” 20 Ma Jeremaya sịrị: “A gaghị enyefe gị n’aka ha. Biko, mee ihe a m na-agwa gị Jehova kwuru. I mee ya, ihe ga-agaziri gị. Ị* ga-adịrịkwa ndụ na-aga. 21 Ma ị jụ ịchịliri ha aka elu,* ihe a Jehova gosiri m n’ọhụụ ga-eme: 22 A ga-akpọrọ ụmụ nwaanyị niile fọrọ n’ụlọ* eze Juda kpọtara ndị eze Babịlọn mere ndị isi,+ ụmụ nwaanyị ahụ ana-asịkwa,
Ha emeela ka ụkwụ gị mikpuo n’apịtị.
Ha agbaghachikwala azụ.’
23 Ha ga-akpọnye ndị Kaldia ndị nwunye gị niile na ụmụ gị. Ị gaghị agbapụnahụ ha, kama, eze Babịlọn ga-akpara gị aka.+ A ga-agbakwa obodo a ọkụ n’ihi gị.”+
24 Zedekaya gwaziri Jeremaya, sị: “Agwakwala onye ọ bụla ihe ndị a, ka ị ghara ịnwụ. 25 Ọ bụrụ na ndị isi anụ na mụ na gị kwurịtara okwu, ha abịa sị gị, ‘Biko, gwa anyị ihe ị gwara eze. Ezorola anyị ihe ọ bụla. Anyị agaghị egbu gị.+ Gịnị ka eze gwara gị?’ 26 Sị ha, ‘M nọ na-arịọ eze ka ọ ghara ịkpọghachi m n’ụlọ Jehonatan ka m ghara ịnwụ ebe ahụ.’”+
27 Mgbe e mechara, ndị isi niile bịakwutere Jeremaya ma jụwa ya ajụjụ. Ya agwa ha ihe niile eze gwara ya kwuo. N’ihi ya, ha agwaghị ya ihe ọ bụla, maka na e nweghị onye n’ime ha nụrụ ihe ya na eze kwurịtara. 28 Jeremaya bigidere n’Ogige Ndị Nche+ ruo ụbọchị e weghaara Jeruselem. Ọ nọ ebe ahụ e weghara Jeruselem.+
39 N’ọnwa iri n’afọ nke itoolu n’ọchịchị Zedekaya bụ́ eze Juda, Nebukadneza* eze Babịlọn na ndị agha ya niile bịara Jeruselem ma nọchibido ya.+
2 N’abalị itoolu n’ọnwa anọ n’afọ nke iri na otu n’ọchịchị Zedekaya, a kwaturu mgbidi Jeruselem.+ 3 Ndị niile eze Babịlọn mere ndị isi banyere n’obodo ahụ nọdụ ala n’Ọnụ Ụzọ Ámá Etiti.+ Ndị isi ahụ bụ, Negal-shariza bụ́ Samga,* Nibo-sasekim bụ́ Rabsaris,* Negal-shariza bụ́ Rabmag,* na ndị ọzọ niile eze Babịlọn mere ndị isi.
4 Mgbe Zedekaya eze Juda na ndị agha niile hụrụ ha, ha si ụzọ e si aga n’ubi eze gbaa ọsọ+ n’abalị. Ha si n’ọnụ ụzọ ámá a rụnyere n’agbata mgbidi abụọ gbapụ, tinye isi n’ụzọ gara Araba.+ 5 Ndị agha Kaldia chụwara ha, chụkwutekwa Zedekaya n’ọzara Jeriko.+ Ha kpụụrụ ya kpụgara Nebukadneza* eze Babịlọn ebe ọ nọ na Ribla+ dị na Hemat.+ Ebe ahụ ka ọ nọ kpee ya ikpe. 6 Eze Babịlọn nọkwa na Ribla gbuo ụmụ Zedekaya n’ihu ya. O gbukwara ndị Juda niile a ma ama.+ 7 Ọ rụkpọsịrị Zedekaya anya, tụọkwa ya ịga e ji ọla kọpa mee, ka a kpụga ya Babịlọn.+
8 Ndị Kaldia gbaziri ụlọ* eze na ụlọ ndị mmadụ ọkụ,+ kwatuokwa mgbidi Jeruselem.+ 9 Nebuzaradan+ onyeisi ndị nche dọọrọ ndị fọdụrụ n’obodo ahụ n’agha laa Babịlọn, dọrọ ndị chịliiri ya aka elu ma na-akwadozi ya, dọrọkwa ndị ọzọ fọrọ ebe ahụ.
10 Ma Nebuzaradan onyeisi ndị nche hapụrụ ụfọdụ n’ime ha na Juda. Ndị ahụ ọ hapụrụ bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ndị na-enweghị ihe ọ bụla. N’ụbọchị ahụ, o nyere ha ubi vaịn na ebe ndị ha ga na-arụ ọrụ.*+
11 Nebukadneza* eze Babịlọn gwara Nebuzaradan, bụ́ onyeisi ndị nche, ihe ọ ga-emere Jeremaya. Ọ gwara ya, sị: 12 “Gaa kpọrọ ya, lekọtakwa ya anya nke ọma. Emekwala ya ihe ọjọọ ọ bụla. Meere ya ihe ọ bụla ọ rịọrọ gị.”+
13 Nebuzaradan onyeisi ndị nche na Nebushazban bụ́ Rabsaris,* na Negal-shariza bụ́ Rabmag* nakwa ndị nwoke niile a ma ama n’ọchịchị eze Babịlọn wee zie ozi, 14 a kpọpụta Jeremaya n’Ogige Ndị Nche,+ nyefee ya n’aka Gedalaya+ nwa Ahaịkam+ nwa Shefan,+ ka ọ kpọrọ ya laa n’ụlọ ya. Otú a ka Jeremaya si biri ebe ndị obodo ya bi.
15 N’oge ahụ a kpọchiri Jeremaya n’Ogige Ndị Nche,+ Jehova gwara ya, sị: 16 “Gaa gwa Ibed-melek+ onye Etiopia, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “M ga-eme ka ihe m kwuru gbasara obodo a mezuo. Ọdachi ga-adakwasị ya. Ihe ọma agaghị eme na ya. Ị ga-ahụkwa ya n’ụbọchị ọ ga-eme.”’
17 “Jehova kwuru, sị, ‘M ga-anapụta gị n’ụbọchị ahụ. A gaghịkwa enyefe gị n’aka ndị ị na-atụ egwu.’
18 “Jehova kwukwara, sị, ‘M ga-anapụtarịrị gị. A gaghị egbu gị.*+ Ị* ga-adịrị ndụ na-aga, ya abụrụ ihe ị kwatara, n’ihi na ị tụkwasịrị m obi.’”+
40 Jehova gwara Jeremaya okwu mgbe Nebuzaradan+ bụ́ onyeisi ndị nche hapụrụ Jeremaya na Rema ka ọ lawa.+ N’oge ahụ, Jeremaya so ná ndị bi na Jeruselem nakwa na Juda a dọọrọ n’agha na-ala Babịlọn, a tụkwara ya ịga. 2 Onyeisi ndị nche ahụ kpọkwaara Jeremaya, sị ya: “Ọ bụ Jehova Chineke gị kwuru na ọdachi a ga-adakwasị obodo a. 3 Jehova emezuola ihe o kwuru, n’ihi na unu mehiere Jehova. Unu emeghịkwa ihe o kwuru. Ọ bụ ya mere ihe a ji na-eme unu.+ 4 M na-atọpụ gị ịga a tụrụ gị n’aka taa. Ọ bụrụ na ị chọrọ iso m laa Babịlọn, bịa soro m. M ga na-elekọtakwa gị. Ma ọ bụrụ na ị chọghị iso m, nsogbu adịghị. Lekwa obodo a niile, i nwere ike ịga ebe ọ bụla masịrị gị.”+
5 Ma tupu Jeremaya ekpebie ma ọ̀ ga-alaghachi, Nebuzaradan sịrị ya: “Laghachikwuru Gedalaya+ nwa Ahaịkam+ nwa Shefan,+ onye eze Babịlọn mere onyeisi obodo ndị dị na Juda. Gị na ya biri n’obodo unu. Ma ọ bụkwanụ, gị agawa ebe ọ bụla ọzọ dị gị mma.”
Onyeisi ndị nche ahụ nyekwara ya nri ọ ga na-eri, nyekwa ya onyinye ma hapụ ya ka ọ lawa. 6 Jeremaya wee gakwuru Gedalaya nwa Ahaịkam ebe ọ nọ na Mizpa,+ ya na ya na ndị fọrọ ebe ahụ ebiri na Juda.
7 Ka oge na-aga, ndị ọchịagha niile nọ n’obodo ahụ na ndị agha ha nụrụ na eze Babịlọn emeela Gedalaya nwa Ahaịkam onyeisi ala ha nakwa na o meela ya onyeisi ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nakwa ụmụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha nọ n’obodo ahụ, bụ́ ndị a na-adọrọghị n’agha laa Babịlọn.+ 8 Ha wee bịakwute Gedalaya ebe ọ nọ na Mizpa.+ Ndị bịakwutere ya bụ: Ishmel+ nwa Netanaya, Johenan+ na Jonatan bụ́ ụmụ Kariya, Seraya nwa Tanhumet, ụmụ Ifaị onye Netofa, na Jezanaya+ nwa onye Meakat, ha na ndị agha ha. 9 Gedalaya nwa Ahaịkam nwa Shefan ṅụkwaara ha na ndị agha ha iyi, sị: “Unu atụla egwu ijere ndị Kaldia ozi. Birinụ n’ala a jewere eze Babịlọn ozi. Ihe ga-agazikwara unu.+ 10 Mụnwa ga-ebi na Mizpa ebe a na-anọchite anya unu mgbe ọ bụla ndị Kaldia bịara ịhụ anyị. Ma, na-ebukọtanụ mmanya, mkpụrụ osisi dị iche iche na mmanụ. Hapụkwanụ ha n’ime ite unu na-eji echekwa ihe. Birikwanụ n’obodo ndị unu weghaara.”+
11 Ndị Juu niile nọ na Moab, Amọn, na Ịdọm nakwa ndị nke nọ n’obodo ndị ọzọ niile nụkwara na e nwere ndị eze Babịlọn hapụrụ ka ha biri na Juda nakwa na o mere Gedalaya nwa Ahaịkam nwa Shefan onyeisi ha. 12 N’ihi ya, ha niile si n’ebe niile a chụsasịrị ha na-alọta. Ha batara na Juda, gakwurukwa Gedalaya ebe ọ nọ na Mizpa. Ha bukọtakwara mmanya na mkpụrụ osisi hiri ezigbo nne.
13 Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile nọ n’obodo ahụ bịakwutere Gedalaya ebe ọ nọ na Mizpa. 14 Ha wee sị ya: “Ị̀ ma na Bealis, bụ́ eze ụmụ Amọn,+ zitere Ishmel nwa Netanaya ka o gbuo gị?”*+ Ma Gedalaya nwa Ahaịkam ekwetaghị ihe a ha kwuru.
15 Johenan nwa Kariya nọkwa na Mizpa gwa Gedalaya na nzuzo, sị: “Achọrọ m ịga gbuo Ishmel nwa Netanaya. E nweghị onye ga-ama ma m gbuo ya. Gịnị mere ọ ga-eji gbuo gị?* Gịnịkwa mere ndị Juda niile bụ́ ndị na-alọghachikwute gị ga-eji gbasasịa, ndị fọrọ na Juda alaakwa n’iyi?” 16 Ma Gedalaya+ nwa Ahaịkam gwara Johenan nwa Kariya, sị: “Emela ihe a i kwuru. Ị na-aghagide Ishmel ụgha.”
41 N’ọnwa nke asaa, Ishmel+ nwa Netanaya nwa Elishama, onye si n’ezinụlọ eze, onye bụ́kwa otu n’ime ndị isi na-ejere eze ozi, du mmadụ iri ọzọ bịakwute Gedalaya nwa Ahaịkam ebe ọ nọ na Mizpa.+ Ka ha nọ na-eri nri na Mizpa, 2 Ishmel nwa Netanaya na mmadụ iri ahụ ya na ha so biliri jiri mma agha gbuo Gedalaya nwa Ahaịkam nwa Shefan. Otú a ka ha si gbuo onye eze Babịlọn mere onyeisi ala. 3 Ishmel gbukwara ndị Juu niile ha na Gedalaya nọ na Mizpa, gbuokwa ndị agha Kaldia nọ ebe ahụ.
4 N’ụbọchị nke abụọ mgbe e gbuchara Gedalaya, tupu onye ọ bụla amata na e gbuola ya, 5 e nwere ụmụ nwoke iri asatọ si Shikem,+ Shaịlo,+ na Sameria+ bịa ebe ahụ. Ha kpụchara afụ ọnụ ha, dọwaa uwe mwụda ha,+ bekasịakwa onwe ha ahụ́. Ha jikwa àjà ọka na frankinsens+ bịa n’ụlọ Jehova. 6 Ishmel nwa Netanaya wee si na Mizpa bere ákwá gawa ịhụ ha. Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha: “Bịanụ ka unu hụ Gedalaya nwa Ahaịkam.” 7 Ma mgbe ha batara n’ime obodo ahụ, Ishmel nwa Netanaya na ndị agha ya gburu ha, tụba ha n’olulu mmiri.
8 Ma, e nwere ụmụ nwoke iri n’ime ha ndị gwara Ishmel, sị: “Egbula anyị, n’ihi na e nwere ọka wit, ọka bali, mmanụ, na mmanụ aṅụ anyị zoro n’ọhịa.” N’ihi ihe a ha kwuru, o gbughị ha otú o gburu ụmụnne ha. 9 Olulu mmiri ahụ Ishmel tụbara ozu ndị ahụ niile o gburu bụ nnukwu olulu. Ọ bụ nke ahụ Eze Esa gwuru oge ọ na-alụso Beasha eze Izrel agha.+ Ọ bụ olulu mmiri a ka Ishmel nwa Netanaya tụjuru ozu ndị ahụ o gburu.
10 Ishmel dọọrọ ndị niile fọrọ na Mizpa n’agha,+ ma ụmụ nwaanyị eze mụrụ ma ndị ọzọ niile fọrọ na Mizpa, ndị Nebuzaradan bụ́ onyeisi ndị nche nyefere n’aka Gedalaya+ nwa Ahaịkam ka o lekọtawa. Ishmel nwa Netanaya dọọrọ ha n’agha gawa ka ọ gakwuru ndị Amọn.+
11 Mgbe Johenan+ nwa Kariya na ndị ọchịagha niile ya na ha nọ nụrụ arụ niile Ishmel nwa Netanaya kpara, 12 ha kpọọrọ ụmụ nwoke niile nọ ebe ahụ gawa ịlụso Ishmel nwa Netanaya agha. Ha hụkwara ya n’ebe e nwere nnukwu mmiri* na Gibiọn.
13 Mgbe ndị ahụ niile Ishmel dọọrọ n’agha hụrụ Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile ya na ha so, ha ṅụrịwara ọṅụ. 14 Ndị niile ahụ Ishmel dọọrọ n’agha na Mizpa+ hapụkwara ya ma gakwuru Johenan nwa Kariya. 15 Ma Ishmel nwa Netanaya na ụmụ nwoke asatọ n’ime ndị ya na ha so gbanahụrụ Johenan, gbakwuru ndị Amọn.
16 Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile ahụ ya na ha nọ kpọọrọ ndị ọzọ niile si Mizpa, bụ́ ndị ha napụtara n’aka Ishmel nwa Netanaya mgbe o gbuchara Gedalaya+ nwa Ahaịkam. Ha kpọghachiri ha Gibiọn, ma ndị dimkpa ma ndị agha ma ụmụ nwaanyị ma ụmụntakịrị ma ndị na-eje ozi n’obí eze. 17 Ha gakwara nọrọ n’ụlọ Kimham nke dị n’akụkụ Betlehem.+ Ha bu n’obi isi ebe ahụ banye Ijipt,+ 18 n’ihi na egwu tụwara ha maka ndị Kaldia, ebe ọ bụ na Ishmel nwa Netanaya gburu Gedalaya nwa Ahaịkam, onye eze Babịlọn mere onyeisi ala ahụ.+
42 Ndị ọchịagha niile ahụ na Johenan+ nwa Kariya na Jezanaya nwa Hoshaya na ndị ọzọ niile, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu, bịara 2 gwa Jeremaya onye amụma, sị: “Biko, nụrụ arịrịọ anyị na-arịọ ka i kpee ekpere gwa Jehova bụ́ Chineke gị ka o nyere anyị niile fọrọnụ aka. N’ihi na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime anyị fọrọ,+ otú i ji anya gị na-ahụ. 3 Ka Jehova bụ́ Chineke gị gwa anyị otú anyị kwesịrị isi na-akpa àgwà na ihe anyị kwesịrị ịna-eme.”
4 Jeremaya onye amụma wee sị ha: “Anụla m ihe unu kwuru. M ga-arịọ Jehova bụ́ Chineke unu ihe niile unu gwara m rịọ ya. M ga-agwakwa unu ihe ọ bụla Jehova sị m gwa unu. E nweghị nke ọ bụla n’ihe niile ọ ga-ekwu m ga-ahapụ ịgwa unu.”
5 Ha wee sị Jeremaya: “Ọ bụrụ na anyị emeghị kpọmkwem ihe Jehova bụ́ Chineke gị ziri gị ka i zie anyị, ka Jehova bụrụ onye akaebe e kwesịrị ịtụkwasị obi, ka ọ taakwa anyị ahụhụ. 6 Ma, ihe Jehova bụ́ Chineke anyị kwuru ọ̀ dị anyị mma ma ọ́ dịghị anyị mma, anyị ga-eme ya, ka ihe wee gaziere anyị n’ihi na anyị mere ihe Jehova bụ́ Chineke anyị kwuru, onye anyị na-ezi gị ka ị gakwuru.”
7 Mgbe ụbọchị iri gachara, Jehova gwara Jeremaya okwu. 8 N’ihi ya, ọ kpọkọrọ mmadụ niile, ma Johenan nwa Kariya ma ndị ọchịagha niile ya na ha nọ, ma onye ukwu ma onye nta.+ 9 Ọ gwara ha, sị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel, onye unu ziri m ka m gwa arịrịọ unu na-arịọ ka o meere unu amara, kwuru, sị: 10 ‘Ọ bụrụ na unu ebiri n’ala a, m ga-arụlite unu ka ụlọ. Agaghị m etida unu. M ga-akụkwa unu ka mkpụrụ. Agaghị m efopụ unu, n’ihi na m ga-agbanwe obi m gbasara ọdachi m mere ka ọ dakwasị unu.+ 11 Unu atụla egwu n’ihi eze Babịlọn, bụ́ onye unu na-atụ egwu.’+
“Jehova kwuru, sị, ‘Unu atụla eze Babịlọn egwu, n’ihi na m nọnyeere unu. M ga-azọpụta unu, napụtakwa unu n’aka ya. 12 M ga-emere unu ebere.+ Ọ ga-emekwara unu ebere, meekwa ka unu laghachi n’ala unu.
13 “‘Ma ọ bụrụ na unu asị: “Mba, anyị agaghị ebi n’ala a,” ọ bụrụkwa na unu aghara ime ihe Jehova bụ́ Chineke unu kwuru, 14 ma na-asị: “Mba, kama anyị ga-aga Ijipt biri,+ ebe anyị na-agaghị ahụ agha, ebe anyị na-agaghịkwa anụ ụda opi e ji akpọkọta ndị agha, ebe agụụ na-agaghịkwa agụ anyị, ebe ahụ ka anyị ga-ebi,” 15 ununwa bụ́ ndị Juda fọrọnụ, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu esie ọnwụ na unu ga-aga Ijipt, ọ bụrụkwa na unu agaa biri na ya,* 16 ndị iro unu ga-eji mma agha unu na-atụ ụjọ ya bịa lụso unu agha n’Ijipt. Ụnwụ unu na-atụ ụjọ ya ga-eso unu n’azụ banye Ijipt. Unu ga-anwụkwa ebe ahụ.+ 17 Mma agha, ụnwụ, na ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị niile siri ọnwụ na ha ga-aga biri n’Ijipt. E nweghị onye n’ime ha ga-agbanahụ ọdachi m ga-eme ka ọ dakwasị ha. E nweghịkwa onye nke ọ na-agaghị egbu.”’
18 “N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Ọ bụrụ na unu agaa Ijipt, m ga-eji iwe na ọnụma mee unu ihe otú m mere ndị bi na Jeruselem.+ Ihe m ga-eme unu ga-eme ka ụjọ tụwa ndị ọzọ. A ga-ejizi unu na-abụ mmadụ ọnụ. A ga na-eleda unu anya, na-akwakwa unu emo.+ Unu agaghịkwa ahụ ebe a anya ọzọ.’
19 “Ndị fọrọ na Juda, Jehova agwala unu okwu. Unu agala Ijipt. Unu mara taa na mụ adọọla unu aka ná ntị 20 na mmehie unu ga-akpatara unu* ọnwụ. N’ihi na unu ziri m ka m gakwuru Jehova bụ́ Chineke unu. Unu sịrị, ‘Gwara anyị Jehova bụ́ Chineke anyị okwu n’ekpere, gwakwa anyị ihe ọ bụla Jehova bụ́ Chineke anyị kwuru. Anyị ga-eme ya.’+ 21 M na-agwakwa unu ihe Jehova bụ́ Chineke unu kwuru taa, ma unu agaghị ege ya ntị. Unu agaghịkwa eme ihe ọ bụla o ziri m ka m zie unu.+ 22 N’ihi ya, maranụ na mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-egbu unu ebe ahụ unu chọrọ ịga biri.”+
43 Jeremaya gwara mmadụ niile ahụ ihe Jehova bụ́ Chineke ha gwara ya ka ọ gwa ha. O nweghị nke ọ na-agwaghị ha. Mgbe ọ gwachara ha ihe Jehova bụ́ Chineke ha kwuru, 2 Azaraya nwa Hoshaya, Johenan+ nwa Kariya, na ụmụ nwoke niile onwe ha na-ebu isi sịrị Jeremaya: “Ọ bụ ụgha ka ị na-agha. Jehova bụ́ Chineke anyị agwaghị gị ka ị gwa anyị ka anyị ghara ịga biri n’Ijipt. 3 Kama, ọ bụ Barọk+ nwa Neraya na-aranye gị ikwu ihe ị na-ekwu n’ihi na ọ chọrọ ka ndị Kaldia kpara anyị aka, ka ha wee gbuo anyị ma ọ bụkwanụ dọrọ anyị n’agha laa Babịlọn.”+
4 Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile nakwa ndị ahụ niile erubereghị Jehova isi. Ha jụrụ ịnọrọ na Juda. 5 Kama ịnọrọ na Juda, Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile ahụ kpọọrọ ndị Juda niile fọdụrụ gbapụ. Ndị a ha kpọọrọ bụ ndị si ná mba niile a chụsasịrị ha lọta ka ha biri na Juda.+ 6 Ha kpọọrọ ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, ụmụntakịrị, ụmụ nwaanyị eze mụrụ, nakwa onye* ọ bụla Nebuzaradan+ bụ́ onyeisi ndị nche hapụrụ ka ya na Gedalaya+ nwa Ahaịkam+ nwa Shefan+ nọrọ. Ha kpọkwaara ma Jeremaya onye amụma ma Barọk nwa Neraya. 7 Ha kpọ ha bata Ijipt, si otú a nupụrụ Jehova isi. Ha gagidere ruo Tapanhis.+
8 Ka ha ruru Tapanhis, Jehova gwara Jeremaya, sị: 9 “Buru nkume ndị buru ibu, nọrọ n’ihu ndị Juu zoo ha n’ụrọ dị n’ebe e doro brik, n’ebe e si abanye n’ụlọ Fero dị na Tapanhis. 10 I zochaa ya, gwazie ha, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “M ga-akpọ Nebukadneza* eze Babịlọn, bụ́ ohu m.+ M ga-adọsa ocheeze ya n’elu nkume ndị a m zoro. Ọ ga-amakwa ụlọikwuu ya n’elu ha.+ 11 Ọ ga-abịakwa lụso ndị Ijipt agha.+ Ọrịa ga-egbu ụfọdụ n’ime unu. A ga-adọrọ ụfọdụ n’ime unu n’agha. A ga-ejikwa mma agha gbuo ụfọdụ n’ime unu.+ 12 M ga-amụnye ụlọ dị iche iche a na-anọ efe chi ndị Ijipt ọkụ.+ Eze ahụ ga-agbakwa ụlọ ndị ahụ ọkụ ma buru chi ndị ahụ laa. Otú ahụ ọ na-adịrị onye ọzụzụ atụrụ mfe iyiri uwe mwụda ya, ka ọ ga-adịrị ya mfe imeri ndị Ijipt niile. Ọ ga-esikwa n’Ijipt laa n’udo.* 13 Ọ ga-akụrisị ogidi niile dị na Bet-shimesh,* nke dị n’Ijipt. Ọ ga-agbakwa ụlọ dị iche iche a na-anọ efe chi ndị Ijipt ọkụ.”’”
44 E nwere ihe Jeremaya kwuru gbasara ndị Juu niile bi n’Ijipt,+ ya bụ, gbasara ndị bi na Migdọl,+ Tapanhis,+ Nọf*+ nakwa Patrọs.+ Ọ sịrị: 2 “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Unu ahụlanụ ọdachi niile m mere ka ọ dakwasị Jeruselem+ na obodo niile dị na Juda. Unu ahụla taa na a laala ha n’iyi. E nweghịkwa onye bi na ha.+ 3 M mere ha ihe a n’ihi ihe ọjọọ ndị ha mere, nke kpasuru m iwe. Ha gara na-achụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà,+ na-efekwa ha ofufe. Ha amaghị chi ndị ahụ. Unu na nna nna unu hà amaghịkwa ha.+ 4 M nọ na-ezitere unu ndị ohu m niile bụ́ ndị amụma. M nọ na-ezite ha ugboro ugboro,* na-asị: “Biko, unu akpala ụdị arụ a m kpọrọ asị.”+ 5 Ma, ha egeghị ntị, ha atọghịkwa ntị n’ala. Ha ahapụghị ihe ọjọọ ha na-eme. Ha akwụsịghịkwa ịchụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà.+ 6 M wee jiri iwe na ọnụma mee obodo ndị dị na Juda nakwa okporo ámá ndị dị na Jeruselem ihe, na-atakwa ha ahụhụ ruo mgbe a lara ha n’iyi. Ha atọgbọrọkwa nkịtị otú ha dị taa.’+
7 “Ugbu a, Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Gịnị mere unu ji na-akpatara onwe unu* nnukwu ọdachi nke ga-eme ka a laa onye ọ bụla nọ na Juda n’iyi, ma nwoke ma nwaanyị ma nwatakịrị ma nwa na-aṅụ ara, nke na e nweghịzi onye ga-afọrọ unu? 8 Gịnị mere unu ji achụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà n’Ijipt, bụ́ ebe unu gara biri, si otú ahụ na-akpasu m iwe? A ga-ala unu n’iyi. Mba niile dị n’ụwa ga na-eji unu eme ihe ọchị, jirikwa unu na-abụ mmadụ ọnụ.+ 9 Ùnu echefuola ihe ọjọọ nna nna unu hà mere na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem, nakwa ihe ọjọọ ndị eze Juda+ na ndị nwunye ha+ mere ebe ahụ, nakwa nke ununwa na ndị nwunye unu+ mere ebe ahụ? 10 Kemgbe ahụ, unu* echegharịbeghị* ruo taa. Unu anaghị atụ egwu ime ihe ọjọọ.+ Unu anaghị edebe iwu m. Unu anaghịkwa eso ntụziaka m nyere unu na nna nna unu hà.’+
11 “N’ihi ya, Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘M ga-eme ka ọdachi dakwasị unu, iji laa ndị Juda niile n’iyi. 12 M ga-eme ka ndị fọrọ na Juda, ndị siri ọnwụ na ha ga-aga biri n’Ijipt, laa n’iyi ebe ahụ.+ Mma agha na ụnwụ ga-egbu ha. Mma agha na ụnwụ ga-egbu malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu. Ihe m ga-eme ha ga-eme ka ụjọ tụwa ndị ọzọ. A ga-eji ha na-abụ mmadụ ọnụ. A ga na-eleda ha anya, na-akwakwa ha emo.+ 13 M ga-eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe taa ndị bi n’Ijipt ahụhụ otú ahụ m tara ndị bi na Jeruselem.+ 14 Ihe a ga-emerịrị ndị ahụ fọrọ na Juda, bụ́ ndị gara biri n’Ijipt. Ha agaghịkwa adị ndụ laghachi Juda. Ọ ga-agụsi ha agụụ ike ka ha laghachi birikwa ebe ahụ, ma ha agaghị alaghachili. Ọ gwụla naanị mmadụ ole na ole n’ime ha ga-alaghachi.’”
15 Ụmụ nwoke niile ndị ma na ndị nwunye ha na-achụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà nakwa ụmụ nwaanyị niile a lụ alụ nọ ebe ahụ karịrị akarị. Ha na ndị niile bi n’Ijipt,+ ya bụ, na Patrọs,+ gwara Jeremaya, sị: 16 “Anyị agaghị ege ntị n’ihe ị gwara anyị n’aha Jehova. 17 Kama anyị ga-eme ihe niile anyị ji ọnụ anyị kwuo. Anyị ga na-achụrụ Eze Nwaanyị nke Eluigwe* àjà mmanya na àjà ndị ọzọ+ otú anyị na nna nna anyị hà na ndị eze anyị na ndị isi anyị mere n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem. N’oge ahụ, anyị nọ na-eriju afọ. Ihe dịkwaara anyị mma. Anyị enweghịkwa nsogbu ọ bụla. 18 Ma, kemgbe anyị kwụsịrị ịchụrụ Eze Nwaanyị nke Eluigwe* àjà mmanya na àjà ndị ọzọ, ihe niile akọla anyị. Mma agha na ụnwụ na-egbukwa anyị.”
19 Ụmụ nwaanyị kwukwara, sị: “Ndị di anyị kwere ka anyị na-achụrụ Eze Nwaanyị nke Eluigwe* àjà mmanya na àjà ndị ọzọ, na-emekwa keeki e ji achụrụ ya àjà. Anyị na-akpụ keeki ndị ahụ otú ha ga-eyi eze nwaanyị ahụ.”
20 Jeremaya gwaziri mmadụ niile okwu, ma ndị nwoke ma ndị nwunye ha ma ndị niile nọ na-agwa ya okwu. Ọ gwara ha, sị: 21 “Jehova chetara àjà dị iche iche unu na nna nna unu hà, ndị eze unu, ndị isi unu, na ndị ala unu nọ n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem na-achụ.+ O chefughị ha. 22 N’ikpeazụ, ihe ọjọọ unu na-eme nakwa arụ unu na-akpa gwụrụ Jehova ike, nke mere e ji laa ala unu n’iyi, ya abụrụ ihe na-asọ oyi na ihe e ji abụ mmadụ ọnụ. E nweghịkwa onye bi na ya ruo taa.+ 23 Ọdachi a dakwasịrị unu taa n’ihi àjà ndị a unu chụrụ nakwa n’ihi otú unu si mehie Jehova, na-enupụrụ Jehova isi, ghara ịna-edebe iwu ya, gharakwa ịna-eso ntụziaka ya na ịna-eme ihe ndị ọ na-echetara unu.”+
24 Jeremaya gwakwara ụmụ nwaanyị niile na mmadụ niile, sị: “Ndị Juda niile nọ n’Ijipt, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. 25 Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Unu na ndị nwunye unu kwere nkwa, mezuokwa ya. Unu sịrị: “Anyị ga-emezurịrị nkwa anyị kwere na anyị ga-achụrụ Eze Nwaanyị nke Eluigwe* àjà mmanya na àjà ndị ọzọ.”+ Unu na ndị nwunye unu ga-emezurịrị nkwa unu kwere.’
26 “N’ihi ya, ndị Juda niile bi n’Ijipt, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. Jehova kwuru, sị: ‘“M ji aha m dị ebube na-aṅụ iyi na e nweghị onye Juda ọ bụla+ ga-akpọ aha m ọzọ n’Ijipt niile ma ọ ṅụwa iyi, sị, ‘Eji m Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova dị ndụ, na-aṅụ iyi.’+ 27 Ugbu a, ekpebiela m ime ka ọdachi dakwasị ndị Juda niile fọdụrụ n’Ijipt, ọ bụghị imere ha ihe ọma.+ Mma agha na ụnwụ ga na-egbu ha, ruo mgbe ha nwụchara.+ 28 Naanị mmadụ ole na ole n’ime ha ga-agbanahụ mma agha, si Ijipt laghachi Juda.+ Ndị Juda niile fọdụrụ, ndị gara biri n’Ijipt, ga-amata onye ihe o kwuru ga-emezu, ma ọ̀ bụ nke m kwuru ka ọ̀ bụ nke ha kwuru.”’”
29 “Jehova kwuru, sị, ‘M ga-eme ihe ga-egosi unu na m ga-ata unu ahụhụ ebe a. Unu ga-amarakwa na ọdachi m kwuru na ọ ga-adakwasị unu ga-adakwasịrịrị unu. 30 Jehova kwukwara, sị: “M ga-enyefe Fero Họfra, bụ́ eze Ijipt, n’aka ndị iro ya nakwa n’aka ndị na-achọ igbu ya,* otú ahụ m nyefere Zedekaya eze Juda n’aka Nebukadneza* eze Babịlọn, bụ́ onye iro ya na onye na-achọ igbu ya.”’”*+
45 E nwere ihe Jeremaya onye amụma gwara Barọk,+ nwa Neraya, n’afọ nke anọ n’ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya bụ́ eze Juda. Jeremaya gwara ya ihe a n’oge Barọk ji akwụkwọ na-ede ihe ọ na-agwa ya.+ Ọ gwara ya, sị:
2 “Barọk, Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru banyere gị, sị, 3 ‘Ị sịrị: “Efuola m, n’ihi na e nwere ihe na-echegbu m, Jehova abịakwa mee ka m na-eru uju. Ike agwụla m n’ihi ude m na-asụ. Enweghịkwa m ebe m ga-ezu ike.”’
4 “Gwa Barọk, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “M ga-akwatu ihe m rụrụ. M ga-efopụkwa ihe m kụrụ. M ga-eme ihe a n’ala a niile.+ 5 Ma, ị na-achọrọ onwe gị* ihe ukwu. Kwụsị ịchọ ya.”’
“Jehova kwuru, sị, ‘N’oge na-adịghị anya, m ga-eme ka ọdachi dakwasị mmadụ niile.*+ Ma, n’ebe ọ bụla ị ga-aga, m ga-echebe gị ndụ, ya abụrụ ụgwọ ọrụ gị.’”*+
46 E nwere ihe Jehova gwara Jeremaya onye amụma banyere mba dị iche iche.+ 2 Ihe a ka o kwuru gbasara Ijipt,+ ya bụ, gbasara ndị agha Fero+ Niko bụ́ eze Ijipt, onye Nebukadneza* eze Babịlọn meriri na Kakemish, n’akụkụ Osimiri Yufretis, n’afọ nke anọ n’ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda:
3 “Hazienụ obere ọta unu na ọta ukwu unu.
Pụtakwanụ maka ịlụ agha.
4 Ndị na-agba ịnyịnya, kwadebenụ ịnyịnya unu, nọrọkwanụ n’elu ha.
Kpurunụ okpu agha unu ma jikere ịlụ agha.
Meenụ ka ube unu na-egbu maramara, yirikwanụ uwe agha.
5 Jehova kwuru, sị, ‘Gịnị mere m ji ahụ ka ezigbo ụjọ ji ha?
Ha na-alaghachi azụ, a na-emerikwa ndị dike ha.
Ha agbaala ọsọ n’ihi ụjọ, ndị dike ha anaghịkwa ele anya n’azụ.
Ụjọ jikwa mmadụ niile.
6 Ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị agbapụli. Ndị dike agaghịkwa erili mbọmbọ.
Ike agwụla ha. Ha adaakwala n’ebe ugwu,
N’akụkụ Osimiri Yufretis.’+
7 Ònye bụ onye a nke na-eto ka Osimiri Naịl,
Na-etokwa ka osimiri ndị mmiri ha na-amali elu?
Ọ na-asị, ‘M ga-eto kpuchie ụwa.
M ga-ebibi obodo na ndị bi na ya.’
9 Ịnyịnya dị iche iche, gbagoonụ.
Ụgbọ ịnyịnya dị iche iche, gbawanụ ara ara.
Ka ndị dike n’agha pụta.
Ka ndị Kush na ndị Pọt, bụ́ ndị na-eji ọta, pụtakwa.+
Ka ndị Ludim,+ bụ́ ndị na-ekwe ụta ma na-agba ya,+ pụtakwa.
10 “Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha. Ọ bụ ụbọchị ọ ga-egbu ndị iro ya n’ihi ihe ha mere. Mma agha ga-eri ha rijuo afọ, ṅụjuokwa ọbara ha afọ, n’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, weere ozu ndị a ka àjà a chụụrụ ya n’ebe ugwu, n’akụkụ Osimiri Yufretis.+
11 Ndị Ijipt,* gaanụ Gilied nweta mmanụ balsam.+
12 Mba dị iche iche anụla otú e si menye unu ihere.+
A na-anụkwa mkpu unu na-eti n’obodo a niile.
Otu dike na-adagide dike ọzọ.
Ha abụọ na-adarukwa ala.”
13 Jehova gwara Jeremaya onye amụma gbasara mgbe Nebukadneza* eze Babịlọn ga-abịa ịlụso ndị Ijipt agha.+ Ọ gwara ya, sị:
14 “Kọọnụ ya n’Ijipt, kwusaanụ ya na Migdọl.+
Kwusaakwanụ ya na Nọf* nakwa na Tapanhis.+
Sịnụ, ‘Nọrọnụ ebe unu kwesịrị ịnọ, jikerekwanụ,
N’ihi na a ga-eji mma agha gbuo ndị niile gbara unu gburugburu.
15 Gịnị mere e ji kpochapụ ndị agha unu dị ike?
Ha enweghị ike ịkwụrụ n’ụkwụ ha,
N’ihi na Jehova akwatuola ha.
16 Ha na-akpọ ụkwụ n’ihe, na-adakwa n’ìgwè n’ìgwè.
Ha na-agwakwa ibe ha, sị:
“Bilienụ, ka anyị laghachikwuru ndị obodo anyị na ndị ikwu anyị
N’ihi mma agha e ji na-egbu anyị n’eleghị anya n’azụ.”’
17 Ndị agha unu ahụ dị ike kwusara ebe ahụ, sị,
‘Ọ bụ naanị mkpọtụ ka Fero eze Ijipt na-eme.
Ọ hapụla ohere* ọ gaara eji mee ihe, ya agafee.’+
18 Eze, onye aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru, sị,
‘Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, ọ* ga-abata, dịrị otú ugwu Tebọ+ dị n’etiti ugwu ndị ọzọ,
Dịrịkwa otú ugwu Kamel+ dị n’akụkụ oké osimiri.
19 Ndị bi n’Ijipt,
Kwakọtanụ ngwongwo unu ga-ebu mgbe a ga-adọrọ unu n’agha.
N’ihi na Nọf* ga-aghọ ihe na-awụ akpata oyi.
A ga-agba ya ọkụ.* E nweghịkwa onye ga-ebi na ya.+
20 Ijipt yiri nwa ehi ahụ́ dị mma.
Ma, anwụnta ga-esi n’ebe ugwu bịa taa ya.
21 Ndị agha o goro ọrụ, bụ́ ndị nọ n’ime ya, yikwara ụmụ ehi gbara agba.
Ma ha niile atụgharịala gbaa ọsọ.
22 ‘Ọ na-eti mkpu, olu ya ana-ada ka agwọ na-agba ọsọ,
N’ihi na ha ji anyụike bịakwute ya n’ike,
Dị ka ndị na-egbutu osisi.’*
23 Jehova kwuru, sị, ‘Ha ga-asụ oké ọhịa ya, n’agbanyeghị na o yiri ebe a na-agaghị abanyeli abanye.
Ha dị ọtụtụ karịa igurube. E nweghịkwa ike ịgụta ha ọnụ.
24 A ga-emenye ndị bi n’Ijipt* ihere.
A ga-enyefe ha n’aka ndị si n’ebe ugwu.’+
25 “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, sịrị: ‘Ugbu a, m ga-ata Emọn+ bụ́ chi ndị Noo* ahụhụ,+ taakwa Fero, ndị Ijipt, chi ha dị iche iche,+ na ndị eze ha. M ga-ata Fero na ndị niile tụkwasịrị ya obi ahụhụ.’+
26 “Jehova kwuru, sị, ‘M ga-enyefe ha n’aka ndị na-achọ igbu ha,* ya bụ, n’aka Nebukadneza* eze Babịlọn+ na ndị na-ejere ya ozi. Ma, ndị mmadụ ga-emecha biri n’Ijipt otú ha bi ya n’oge gara aga.’+
27 ‘Ma gịnwa bụ́ Jekọb ohu m, atụla egwu.
Izrel, atụkwala ụjọ.+
Jekọb ga-alọta. Ahụ́ ga-erukwa ya ala. E nweghị ihe ga-enye ya nsogbu.
E nweghịkwa onye ga-emenye ya ụjọ.’+
28 Jehova kwuru, sị, ‘Jekọb ohu m, atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.
M ga-ebibi mba niile m chụgara gị n’ala ha.+
Ma agaghị m ebibi gị.+
Kama, m ga-adọ gị aka ná ntị* otú kwesịrị ekwesị.+
M ga-atarịrị gị ahụhụ.’”
47 Jehova gwara Jeremaya onye amụma okwu gbasara ndị Filistia+ tupu Fero emerie Gaza. 2 Jehova kwuru, sị:
“Mmiri si n’ebe ugwu sọrọ na-abịa.
Ọ ga-aghọ iyi tofere ókè.
Ọ ga-erikpukwa ala a na ihe niile dị na ya,
Rikpuokwa obodo a na ndị bi na ya.
Ndị nwoke ga-ebe ákwá.
Ndị niile bi n’ala a ga-ebekwa ákwá arịrị.
3 Mgbe ha ga-anụ ụda ụkwụ oké ịnyịnya onye iro,
Nụkwa mkpọtụ ụgbọ ịnyịnya agha ya,
Nakwa oké ụzụ nke ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ya na-eme,
Ndị nna ga-agba ọsọ n’eleghị anya n’azụ
Maka na obi agaghị aka ha ịnapụta ụmụ ha.
4 Ụbọchị a ga-ebibi ndị Filistia niile eruwela.+
N’ụbọchị ahụ, a ga-ebibi onye ọ bụla fọdụrụ nke na-enyere Taya+ na Saịdọn+ aka.
E bibiela Ashkelọn.+
Ndị fọdụrụ na ndagwurugwu ha,
Olee mgbe unu ga-akwụsị ịna-ebekasị onwe unu ahụ́?+
Banye n’ọbọ gị.
Zuru ike, nọrọkwa jii.
7 Olee otú ọ ga-esi nọrọ jii
Ebe ọ bụ na Jehova agwala ya ihe ọ ga-eme?
Ọ gwara ya ka ọ lụso Ashkelọn na ụsọ oké osimiri agha.+
Ebe ndị a ka ọ gwara ya gaa.”
48 Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru banyere Moab,+ sị:
“Nibo+ ga-ata ahụhụ, n’ihi na e bibiela ya.
E wegharala Kiriateyim,+ menyekwa ndị bi na ya ihere.
E menyela ndị bi n’ebe a rụsiri ike ihere, meekwa ka ezigbo ụjọ jide ha.+
2 Ndị mmadụ anaghịzi eto Moab.
Ndị iro nọ na Heshbọn+ kpaa nkata otú ha ga-esi bibie ya, na-asị:
‘Bịanụ ka anyị laa ya n’iyi ka ọ gharazie ịbụ mba.’
“Gịnwa kwa, Madmen, mechie ọnụ,
N’ihi na mma agha na-eso gị n’azụ.
4 E bibiela Moab.
Ụmụntakịrị ndị nọ na ya na-eti mkpu ákwá.
5 Ndị mmadụ beere ákwá na-agbago ụzọ e si aga Luhit.
Ka ha sikwa Họroneyim na-agbada, ha nụrụ ka ndị mmadụ na-ebe ákwá n’ihi mkpamkpa ahụ kparanụ.+
6 Gbaanụ ọsọ. Gbapụnụ maka ndụ* unu.
Unu ga-adịkwa ka osisi junipa dị n’ala ịkpa.
7 Ndị Moab, ebe ọ bụ na unu tụkwasịrị ọrụ unu na akụ̀ unu obi,
A ga-eweghara obodo unu.
A ga-adọrọkwa Kimọsh+
Na ndị nchụàjà ya na ndị isi ndị na-efe ya n’agha.
8 Onye na-ebibi ihe ga-abịa n’obodo gị niile.
E nweghị obodo nke ọ ga-ahapụ.+
Ndagwurugwu ga-ala n’iyi.
A ga-alakwa ala dị larịị n’iyi otú Jehova kwuru.
9 Meerenụ Moab ihe e ji ahụwa ụzọ ama,
N’ihi na ọ ga-abụzi ebe e bibiri ebibi, ndị bi na ya agbapụchaa,
Obodo ya dị iche iche abụrụ ihe na-awụ akpata oyi,
N’enweghị onye bi na ha.+
10 Ọ bụrụ na e nwee onye na-ejighị ozi ọ na-ejere Jehova kpọrọ ihe, a ga-abụ ya ọnụ.
Ọ bụrụkwa na e nwee onye na-achọghị iji mma agha ya gbuo mmadụ,* a ga-abụ ya ọnụ.
11 Ndị Moab tụsaara ahụ́ kemgbe ha bụ ụmụaka.
Ha nọ jii ka ikè mmanya.
E sitụbeghị n’otu ite wụnye ha n’ite ọzọ.
A dọrọtụbeghịkwa ha n’agha.
Ọ bụ ya mere ha ka ji atọ otú ha na-atọ kemgbe.
Ísìsì ha agbanwebeghịkwa.
12 “Jehova kwuru, sị, ‘Oge na-abịa mgbe m ga-eziga ndị ga-awụfu ha. Ha ga-awụfu ha na ihe niile dị n’ite ha. Ha ga-akụrikwa nnukwu ite ha niile. 13 Ihere Kimọsh bụ́ chi ndị Moab ga-eme ha, otú ahụ ihere mechara mewe ndị Izrel maka na ha tụkwasịrị arụsị dị na Betel obi.+
14 Olee ihe mere unu ji sị: “Anyị bụ ndị dike n’agha, anyị dịkwa njikere ịlụ agha”?’+
A lụsola obodo ya dị iche iche agha.+
E gbuokwala ụmụ okorobịa ha ndị kacha mma.’+
16 Ọdachi ga-adakwasị ndị Moab n’oge na-adịghị anya.
Oge a ga-ebibi ha dị ezigbo nso.+
Gwanụ ha, sị: ‘A gbajiela mkpanaka siri ike, ya bụ, mkpara mara mma.’
18 Ndị bi na Daịbọn, hapụnụ ọkwá unu dị ebube.
Ọ ga-alakwa ebe unu niile a rụsiri ike n’iyi.+
19 Ndị bi n’Aroa,+ guzoronụ n’akụkụ ụzọ lewe ihe na-eme.
Jụọnụ nwoke na-agba ọsọ na nwaanyị na-agbapụ agbapụ ihe na-eme.
20 E menyere ndị Moab ihere, meekwa ka ezigbo ụjọ jide ha.
Beenụ ákwá, tiekwanụ mkpu ákwá.
Kọọnụ n’Anọn+ na e bibiela Moab.
21 “Chineke ekpeela ndị bi n’ala dị larịị ikpe,+ ya bụ, Holọn, Jehaz,+ Mefat,+ 22 Daịbọn,+ Nibo,+ Bet-diblateyim, 23 Kiriateyim,+ Bet-gemọl, Bet-mion+ 24 Kiriọt,+ Bọzra, na obodo niile dị na Moab, ma ndị dị nso ma ndị dị anya.
25 Jehova kwuru, sị, ‘A napụla Moab ike ya.*
A gbajiekwala aka ya dị ike.
26 Meenụ ka ọ ṅụọ mmanya ṅụrọọ anya,+ n’ihi na o buliela onwe ya elu, si otú ahụ mehie Jehova.+
Moab atụrụọla onwe ya n’agbọ ọ gbọrọ.
A na-achịzi ya ọchị.
27 Ọ̀ kwa ị nọ na-akwa Izrel emo?+
Ị̀ hụrụ ya ebe ya na ndị ohi nọ,
Nke mere i ji na-efufe isi ma na-ekwu okwu ọjọọ gbasara ya?
28 Ndị bi na Moab, hapụnụ obodo unu gaa biri ná nnukwu nkume,
Dịrịkwanụ ka nduru nke na-akpa akwụ́ n’akụkụ ndagwurugwu.’”
29 “Anyị anụla banyere nganga Moab, na ọ dị ezigbo mpako.
Anyị anụla na ọ na-ebuli onwe ya elu, na-akpa nganga, na-aka anya, onwe ya na-ebukwa ya isi.”+
30 “Jehova kwuru, sị, ‘Ama m na ọ na-ewe oké iwe.
Ma, ọnụ ọ na-etu abaghị uru ọ bụla.
E nweghị ihe ndị Moab ga-emeli.
31 Ọ bụ ya mere m ga-eji beere Moab ákwá arịrị.
M ga-ebekwara Moab niile ákwá,
Beekwara ndị Kia-hires ákwá.+
Alaka gị ndị na-awasa nke ọma awasaala gafee oké osimiri.
Ha awasaala ruo n’oké osimiri, ruokwa Jeza.
Onye na-ebibi ihe abịala
Ibibi mkpụrụ mịịrị gị n’ọkọchị nakwa mkpụrụ vaịn ị ghọtara.+
33 E meela ka a gharazie ịna-enwe obi ụtọ na ọṅụ n’ebe a kụrụ mkpụrụ osisi dị iche iche
Nakwa n’ala Moab.+
Emeela m ka mmanya kwụsị ịna-agbapụta n’ebe a na-azọchapụta mmanya.
O nweghị onye ga na-eti mkpu ọṅụ ka ọ na-azọcha mkpụrụ.
Mkpu a ga na-eti agaghị abụ mkpu ọṅụ.’”+
34 “‘Ha na-eti mkpu ákwá na Heshbọn,+ a na-anụ ya n’Iliele.+
Ha na-etikwa ya, a na-anụ ya na Jehaz.+
Ha na-etikwa mkpu ákwá na Zoa, a na-anụ ya na Họroneyim,+ na-anụkwa ya n’Eglat-shelaịshiya.
Mmiri Nimrim ga-atakwa kpamkpam.+
35 M ga-eme ka a gharazie inwe onye na-eweta onyinye n’ebe dị elu
Nakwa onye na-achụrụ chi ya àjà na Moab.’
Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
36 ‘Ọ bụ ya mere obi m ga-eji na-eme mkpọtụ ka ọjà* n’ihi Moab.+
Obi m ga na-adakwa ka ọjà* n’ihi ndị Kia-hires.
Ọ bụ ya mere akụnụba ya ga-eji laa n’iyi.
37 N’ihi na isi ha niile akwọchaala.+
A kpụkwara afụ ọnụ ha niile akpụ.
Aka ha niile bucha ọnyá.+
Ha kekwara ákwà iru uju n’úkwù.’”+
38 “Jehova kwuru, sị, ‘A nọ n’elu ụlọ niile dị na Moab
Nakwa n’ámá ya niile
Na-eti sọ mkpu ákwá.
N’ihi na akụọla m Moab righirighi
Ka ite na-abaghị uru.
39 Ụjọ ejidela ya. Tienụ mkpu ákwá.
Moab agbaala ọsọ. Ihere na-emezi ya.
A na-achịzi ya ọchị.
Otú ọ dịzi na-emenyekwa ndị niile gbara ya gburugburu ụjọ.’”
40 “Jehova kwuru, sị:
41 A ga-eweghara obodo niile dị na Moab,
Wegharakwa ebe ndị a rụsiri ike na ya.
N’ụbọchị ahụ, obi ga na-akụ ndị agha Moab kpum kpum
Otú o si akụ nwaanyị ime na-eme.’”
42 “‘A ga-ebibikwa Moab ka ọ gharazie ịbụ mba,+
N’ihi na o buliri onwe ya elu, si otú ahụ mehie Jehova.+
43 Onye bi na Moab, ụjọ ga-atụ gị.
Ị ga-adaba n’olulu, ọnyà ga-amakwa gị.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
44 ‘Onye ọ bụla nke na-agba ọsọ n’ihi ụjọ ga-adaba n’olulu.
Ọnyà ga-amakwa onye ọ bụla nke si n’olulu ahụ na-apụta.’
‘N’ihi na a ga-enwe afọ m ga-ata ndị Moab ahụhụ.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
45 ‘Ndị na-agba ọsọ guzo na ndò Heshbọn. Ike gwụrukwara ha n’ọkpụkpụ.
N’ihi na ọkụ ga-esi na Heshbọn rere pụta.
Ire ọkụ ga-esikwa na Saịhọn pụta.+
Ọ ga-erepịa egedege ihu Moab,
Repịakwa isi ụmụ na-akpa aghara.’+
46 ‘Moab, ị ga-ata ahụhụ.
Ndị na-efe Kimọsh+ alaala n’iyi.
N’ihi na a kpụrụla ụmụ nwoke ndị Moab laa obodo ọzọ,
Dọrọkwa ụmụ nwaanyị ha n’agha.+
47 Ma n’oge ikpeazụ, m ga-akpọkọta ndị e si na Moab dọrọ n’agha.
Ebe a ka ikpe e kpere Moab gwụrụ.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”
49 Jehova kwuru gbasara ndị Amọn,+ sị:
“Ọ̀ bụ na Izrel amụghị ụmụ?
Ka ọ̀ bụ na o nweghị onye ga-eketa ihe ya?
Gịnị mere Malkam+ ji weghara ala Gad?+
Gịnịkwa mere ndị na-efe ya ji biri n’obodo ndị dị n’Izrel?”
2 “Jehova kwuru, sị, ‘Oge na-abịa
Mgbe m ga-eme ka a nụ ụda opi agha* ndị na-alụso Raba+ bụ́ obodo ndị Amọn+ agha.
Obodo ahụ ga-aghọ ebe e bibiri ebibi,
A ga-agbakwa ime obodo ndị dị ya nso* ọkụ.’
Jehova kwukwara, sị, ‘Izrel ga-eweghara ala a napụrụ ya.’+
3 ‘Heshbọn, besiwe ákwá ike, n’ihi na e bibiela E-aị.
Ime obodo ndị dị Raba nso, tienụ mkpu ákwá.
Yirinụ ákwà iru uju.
Besienụ ákwá ike. Wagharịanụ n’ogige anụ ụlọ ndị e ji nkume gbaa,*
N’ihi na a ga-adọrọ Malkam n’agha,
Ya na ndị nchụàjà ya na ndị isi na-efe ya.+
4 Obodo ndị bi na ya na-anaghị erube isi,
Gịnị mere unu ji jiri ndagwurugwu unu ndị mmiri na-asọ na-etu ọnụ?
Unu tụkwasịrị akụ̀ unu obi,
Na-asị, “Ònye ga-abịa lụso anyị agha?”’”
5 “Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru, sị,
‘M ga-eme ka ndị niile gbara unu gburugburu mee unu ihe dị egwu.
A ga-achụsasị unu.
E nweghịkwa onye ga-akpọkọta ndị gbara ọsọ.’”
6 “Jehova kwukwara, sị, ‘Ma e mechaa, m ga-akpọkọta ndị Amọn a dọọrọ n’agha.’”
7 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru banyere Ịdọm, sị:
“Ọ̀ bụ na amamihe adịghịzi na Timan?+
Ezigbo ndụmọdụ ọ̀ kọla ụkọ n’ọnụ ndị na-aghọta ihe?
Amamihe ha ọ́ baghịzi uru?
8 Ndị bi na Didan,+ gbaanụ ọsọ, gbapụnụ.
Gbaganụ ebe dị n’ime ime zoo,
N’ihi na m ga-eme ka ọdachi dakwasị Ịsọ
N’oge m ga-ata ya ahụhụ.
9 Ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịn abata n’ime gị,
Ọ̀ bụ na ha agaghị aghọfọ mkpụrụ?
Ọ bụrụ na ndị ohi abịa n’abalị,
Ha ga-ewere naanị ihe ndị ha chọrọ.+
10 Ma m ga-agba Ịsọ ọtọ.
M ga-eme ka a mara ebe niile ọ na-ezo,
Ka ọ ghara inwe ebe ọ ga-ezo.
A ga-egbu ụmụ ya na ụmụnne ya na ndị agbata obi ya.+
Ha agaghịzi adị.+
11 Hapụrụ m ụmụaka gị na-enweghị nna.
M ga-echebe ha ndụ.
Ụmụ nwaanyị isi mkpe nọ n’ime gị ga-atụkwasịkwa m obi.”
12 N’ihi na Jehova kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ndị a na-amaghị ikpe ga-aṅụrịrị ihe dị n’iko na-egosi na iwe ji m, è kwesịrị ịhapụ gịnwa kpamkpam n’ataghị gị ahụhụ? A gaghị ahapụ gị n’ataghị gị ahụhụ, n’ihi na ị ga-aṅụrịrị ihe dị n’iko ahụ.”+
13 Jehova sịrị, “Ejirila m onwe m ṅụọ iyi na a ga-akọcha Bọzra, laa ya n’iyi, jiri ya na-abụ ọnụ. Ihe a a ga-eme ya ga-ejukwa ndị mmadụ anya.+ A ga-alakwa obodo ya niile n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.”+
14 E nwere ozi m nụrụ Jehova ziri.
E nwekwara onye ozi e zigara ná mba dị iche iche, ya ana-asị:
“Zukọtanụ, lụso Ịdọm agha.
Jikerenụ ịlụso ya agha.”+
15 “Lee, emeela m ka ị ghara ịbụ ihe ọ bụla n’anya mba dị iche iche,
Meekwa ka ndị mmadụ na-eleda gị anya.+
16 Onye bi n’ebe mgbaba nke dị na nkume dị elu,
Onye bi n’elu elu ugwu,
Ụjọ i mere ka a na-atụ gị
Na mpako nke juru gị obi eduhiela gị.
Ọ bụ eziokwu na ị kpara akwụ́ gị n’ebe dị elu ka ugo,
M ga-akwatu gị ebe ahụ.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
17 “Ihe a ga-eme Ịdọm ga-eju ndị mmadụ anya.+ Onye ọ bụla nke na-agafe n’obodo a ga-ekporopụ anya na-ele ya, na-afụkwa mkpọrọhịhị n’ihi ahụhụ niile a tara ya. 18 Otú ahụ a na-enweghị onye bi na Sọdọm na Gọmọra na obodo ndị dị ha nso+ mgbe e bibichara ha, ka a na-agaghị enwe onye ọbịa ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ ga-ebi n’Ịdọm.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
19 “Otú ahụ ọdụm si esi n’oké ọhịa dị n’akụkụ Osimiri Jọdan apụta,+ ka a ga-enwe onye ga-abịa ibibi ebe a rụsiri ike anụmanụ na-ata ahịhịa n’Ịdọm. Ma, m ga-eme ka onye ahụ si ebe ahụ gbaa ọsọ n’otu ntabi anya. M ga-ahọpụtakwa onye ga na-achị ya. Ònye dị ka m? Ònye ga-amakwa m aka? Olee onye ọzụzụ atụrụ ga-emeli ka m ghara ime ihe m chọrọ ime?+ 20 N’ihi ya, nụrụnụ ihe Jehova kpebiri ime Ịdọm na ihe o bu n’obi ime ndị bi na Timan:+
N’eziokwu, a ga na-akpụrụ ụmụ atụrụ si n’ìgwè atụrụ ha.
Ọ ga-eme ka ebe ha na-ata ahịhịa tọgbọrọ nkịtị n’ihi ihe ndị bi na ha mere.+
21 Mgbe ha ga-ada, ụwa ga-ama jijiji n’ihi ụda ọdịda ha.
A ga-eti mkpu ákwá.
Ụda ya ga-eruchadị n’Oké Osimiri Uhie.+
22 Onye iro ga-efeli ma fedata n’ike buru ihe otú ugo si eburu.+
Ọ ga-agbasakwa nku ya ka o buru Bọzra.+
N’ụbọchị ahụ, obi ga na-akụ ndị agha Ịdọm kpum kpum
Otú ọ na-akụ nwaanyị ime na-eme.”
23 Ihe a ka e kwuru banyere Damaskọs:+
“Ihere emeela Hemat+ na Apad,
N’ihi na ha anụla akụkọ ọjọọ.
Obi awụnyela ha n’afọ.
Oké osimiri na-eme mkpọtụ. O nweghịkwa ike ịda jii.
24 Obi esighịzi Damaskọs ike.
Ọ tụgharịala ka ọ gbalaga. Ezigbo ụjọ ejidela ya.
Ọ nọ n’ahụhụ. Ahụ́ na-egbukwa ya mgbu
Otú ọ na-egbu nwaanyị na-amụ nwa.
25 Gịnị mere na ndị mmadụ agbapụbeghị n’obodo a na-aja mma,
Bụ́ obodo ndị bi na ya na-enwe aṅụrị?
26 Ụmụ okorobịa ya ga-ada n’ámá ya dị iche iche.
A ga-egbukwa ndị agha ya niile n’ụbọchị ahụ.” Ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru ihe a.
27 “M ga-esunye mgbidi Damaskọs ọkụ.
Ọkụ ahụ ga-erepịakwa ụlọ elu Ben-hedad.”+
28 E nwere ihe Jehova kwuru banyere Kida+ na alaeze Hezọ, bụ́ ndị Nebukadneza* eze Babịlọn meriri. Ọ sịrị:
“Bilienụ gaa Kida.
Gbuokwanụ ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ.
29 A ga-anara ha ụlọikwuu ha, ìgwè ewu na atụrụ ha,
Ákwà ụlọikwuu ha na ngwongwo ha niile.
A ga-anapụkwa ha kamel ha.
Ndị mmadụ ga na-etikwa mkpu, sị, ‘Ụjọ dị ebe niile!’”
30 Jehova kwuru, sị, “Ndị bi na Hezọ,
Gbaanụ ọsọ. Gbaganụ ebe dị anya. Gbaganụ ebe dị n’ime ime.
N’ihi na Nebukadneza* eze Babịlọn akpaala nkata ihe ọ ga-eme unu.
O chepụtakwala ihe ọ ga-eme unu.”
31 Jehova kwukwara, sị, “Bilienụ lụso mba bi n’udo,
Ndị obi rukwara ala, agha.”
Ha enweghị ibo ụzọ na ihe e ji atụchi ụzọ. Ha bi naanị ha.
32 A ga-achịkọrọ kamel ha,
Chịkọrọkwa ìgwè anụ ụlọ ha.
M ga-achụsasị ha ebe niile,
Ya bụ, ndị kpụrụ ajị ndị dị n’akụkụ ntị ha abụọ akpụ.+
M ga-emekwa ka ọdachi si ebe niile dakwasị ha.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
33 “Hezọ ga-aghọ ọgba nkịta ọhịa.
Ọ ga-atọgbọrọkwa nkịtị ruo mgbe ebighị ebi.
A gaghị enwe onye ọbịa ga-ebi na ya.
A gaghịkwa enwe onye ọ bụla ọzọ ga-ebi na ya.”
34 E nwere ihe Jehova gwara Jeremaya onye amụma gbasara Ịlam+ n’oge Zedekaya malitere ịchị+ Juda. Ọ sịrị: 35 “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘M ga-agbaji ụta ndị Ịlam,+ bụ́ ebe ike ha dị.* 36 M ga-eme ka ifufe si n’akụkụ anọ nke ụwa fee* n’Ịlam. M ga-ejikwa ifufe ndị a chụsasịa ha. Ọ dịghị mba ndị Ịlam a chụsasịrị achụsasị na-agaghị aga.’”
37 Jehova kwukwara, sị, “M ga-eme ka ụjọ jide ndị Ịlam n’ihu ndị iro ha nakwa n’ihu ndị na-achọ igbu ha.* M ga-ewesa ha ezigbo iwe, mee ka ọdachi dakwasị ha. M ga-emekwa ka mma agha na-achụ ha ruo mgbe m bibichara ha.”
38 Jehova sịrị, “M ga-ebusa ocheeze m n’Ịlam.+ M ga-egbukwa eze ya na ndị isi ya.”
39 “Ma n’oge ikpeazụ, m ga-akpọkọta ndị Ịlam a dọọrọ n’agha.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
50 E nwere ihe Jehova si n’ọnụ Jeremaya onye amụma kwuo banyere Babịlọn,+ ya bụ, ndị Kaldia. Ọ sịrị:
2 “Kọọnụ ya ná mba dị iche iche, kọsaakwanụ ya.
Gwunyenụ ihe ndị mmadụ ga-ahụ gbakọta. Kọsaakwanụ ya.
Unu ezola ihe ọ bụla ezo.
Sịnụ, ‘E wegharala Babịlọn.+
E menyela Bel ihere.+
Ụjọ ejidela Merodak.
E menyela arụsị niile dị na Babịlọn ihere.
Ụjọ ejidekwala arụsị ya niile na-asọ oyi.’*
3 N’ihi na otu mba esila n’ebe ugwu bịa lụso ya agha.+
Mba ahụ mere ala ya ihe na-eju ndị mmadụ anya.
E nweghịzi onye bi na ya.
Ma mmadụ ma anụ ụlọ agbapụchaala.
Ha agbafuola.”
4 Jehova kwuru, sị, “N’oge ahụ, ndị Izrel na ndị Juda ga-abụ otu.+ Ha ga-ebere ákwá na-aga.+ Ha ga-ejikọkwa aka na-arịọ Jehova bụ́ Chineke ha ka ọ na-edu ha.+ 5 Ha ga na-ajụ ajụjụ ụzọ e si aga Zayọn. Ha ga-eche ihu n’ụzọ ahụ,+ na-asị, ‘Bịanụ ka anyị na Jehova gbaa ndụ nke ga-adịru mgbe ebighị ebi, nke a na-agaghịkwa echefu echefu.’+ 6 Ndị m aghọọla ìgwè atụrụ furu efu.+ Ndị na-azụ ha mere ka ha kpafuo.+ Ha du ha na-agagharị n’ugwu dị iche iche. Ha si n’otu ugwu ha agaa n’ugwu ọzọ. Ha echefuola ebe ha na-anọ ezu ike. 7 Mgbe ndị iro ha hụrụ ha, ha bibiri ha,+ kwuokwa, sị, ‘Ikpe amaghị anyị, n’ihi na ha emehiela Jehova, onye ezi omume si n’aka ya, ya bụ, Jehova, onye ndị nna nna ha ji nwee olileanya.’”
Dịrịnụ ka mkpi ma ọ bụ ebule nke na-ebutere ìgwè ewu ma ọ bụ ìgwè atụrụ ụzọ.
Ha ga-ahazi onwe ha n’usoro lụso ya agha.
Ha ga-esi ebe ahụ weghara ya.
Akụ́ ha yiri nke onye agha
Nke na-agbawa ndị mụrụ ụmụ aka ụmụ,+
Nke na-anaghị alọta n’emeghị ihe ọ gara.
10 Kaldia ga-abụ ihe a kwatara n’agha.+
Afọ ga-eju ndị niile ga-akwakọrọ ihe dị n’ime ya.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
N’ihi na unu nọ na-awụgharị ka nwa ehi nke nọ n’ebe ahịhịa dị.
Unu nọkwa na-ebe ubé ka oké ịnyịnya.
E mechuru nwaanyị mụrụ unu ihu.
Mba niile kacha ya.
Ọ bụ ala ịkpa mmiri na-adịghị, bụrụkwa ọzara.+
13 Mmadụ agaghị ebi n’ime ya n’ihi iwe Jehova.+
Ọ ga-atọgbọrọ nkịtị.+
Onye ọ bụla na-agafe Babịlọn ga-ekporopụ anya na-ele ya
Ma fụọ mkpọrọhịhị n’ihi ọdachi niile dakwasịrị ya.+
14 Ndị niile na-ekwe ụta,
Hazienụ onwe unu n’usoro, si n’akụkụ niile lụso Babịlọn agha.
15 Sinụ n’akụkụ niile tie mkpu agha ka a lụso ya agha.
Ọ chịliela aka elu.
Ogidi ya niile adaala. A kwatuola mgbidi ya niile.+
Ọ bụ otú Jehova si kwụọ ya ụgwọ ihe o mere.+
Megwaranụ ya.
Meenụ ya ihe o mere ndị ọzọ.+
Onye ọ bụla ga-alakwuru ndị ya, onye ọ bụla ga-agbalakwa n’ala ya,
N’ihi na onye iro ji mma agha na-egbu ndị mmadụ n’emeghị ebere.+
17 “Ndị Izrel bụ ìgwè atụrụ a chụsasịrị achụsasị.+ Ọ bụ ọdụm chụsasịrị ha.+ Eze Asiria bu ụzọ rie anụ ha,+ Nebukadneza* eze Babịlọn atazie ọkpụkpụ ha.+ 18 N’ihi ya, Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: ‘M ga-emesi eze Babịlọn na ndị obodo ya ike, otú ahụ m mere eze Asiria.+ 19 M ga-akpọghachite Izrel n’ala ya ebe anụmanụ na-ata ahịhịa.+ Izrel ga-atakwa ahịhịa n’ugwu Kamel nakwa na Beshan.+ Afọ ga-ejukwa ya* n’ugwu ndị dị n’Ifrem+ nakwa n’ugwu ndị dị na Gilied.’”+
A gaghịkwa ahụ ebe Juda si mehie,
N’ihi na m ga-agbaghara ndị m hapụrụ ka ha dịrị ndụ.”+
21 Jehova kwuru, sị, “Lụso ndị bi na Merateyim na ndị bi na Pikọd agha.+
Ka e gbuchapụ ha, laakwa ha n’iyi.
Mee ihe niile m gwara gị mee.
22 A na-anụ mkpọtụ agha n’ala a,
Ya bụ, mkpọtụ ọdachi dị egwu.
23 A gbajiela hama na-akụri mba dị iche iche n’ụwa, laakwa ya n’iyi.+
Ihe e mere Babịlọn na-eju mba dị iche iche anya.+
24 Babịlọn, m siiri gị ọnyà, ya ama gị.
Ma ị maghị.
A chọtara gị ma jide gị,+
N’ihi na ọ bụ Jehova ka ị lụsoro ọgụ.
25 Jehova emegheela ebe ọ na-akwasa ngwá agha.
O bupụtakwala ngwá agha o ji egosi na iwe ji ya.+
N’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha,
Nwere ọrụ ọ ga-arụ n’ala ndị Kaldia.
26 Sinụ ebe dị anya bịa lụso ya agha.+
Megheenụ ebe ọ na-echekwa mkpụrụ.+
Chịkọtanụ ihe ya ndị unu chịịrị otú e si achịkọta ọka.
Bibienụ ya kpamkpam.+
Ya enwekwala onye ga-afọdụ n’obodo ya.
Ka e gbuo ha niile.
Ha ga-ata ahụhụ n’ihi na ụbọchị ha ga-aza ajụjụ eruola,
Ya bụ, oge a ga-elebara ha anya.
28 A na-anụ mkpọtụ ndị na-agba ọsọ,
Ya bụ, ndị si n’ala Babịlọn na-agbapụ,
Na-agbaga Zayọn ka ha kọsaa na Jehova bụ́ Chineke anyị atawala ndị iro ya ahụhụ.
Ọ na-ata ha ahụhụ n’ihi ụlọ nsọ ya.+
Maanụ ụlọikwuu gburugburu ya. Unu ekwekwala ka onye ọ bụla si na ya gbapụ.
Kwụọnụ ya ụgwọ ihe o mere.+
Meenụ ya ihe niile o mere ndị ọzọ.+
N’ihi na ọ bụ Jehova, bụ́ Onye Nsọ Izrel,
Ka ọ na-egosi na ya dị mpako.+
30 N’ụbọchị ahụ, ụmụ okorobịa ya ga-ada n’ámá ya dị iche iche.+
A ga-egbukwa ndị agha ya niile.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
31 Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwukwara, sị, “Onye mpako,+ m ga-ata gị ahụhụ,+
N’ihi na ụbọchị m ga-elebara gị anya ga-abịa, ya bụ, oge m ga-eme ka ị zaa ajụjụ ihe i metara.
32 Onye mpako, ị ga-ada, daruo ala.
E nweghịkwa onye ga-ekulite gị.+
M ga-esunye obodo gị ọkụ.
Ọ ga-erepịakwa obodo niile ị na-achị.”
33 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị:
“A na-emegbu ndị Izrel na ndị Juda.
Ndị niile dọọrọ ha n’agha ekweghị ahapụ ha.+
Ha ekweghị ahapụ ha ka ha laa.+
34 Ma, Onye Mgbapụta ha dị ike.+
Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya.+
35 Jehova kwukwara, sị, “A ga-eji mma agha gbuo ndị Kaldia
Na ndị bi na Babịlọn, ndị isi ha, na ndị ha ma ihe.+
36 A ga-eji mma agha gbuo ndị na-etu ọnụ.* Ha agaghịkwa ama ihe ha na-eme eme.
A ga-eji mma agha gbuo ndị agha Babịlọn, ụjọ ga-ejidekwa ha.+
37 A ga-eji mma agha gbuo ịnyịnya ha, bibiekwa ụgbọ ịnyịnya agha ha,
Gbuokwa ndị niile si ebe dị iche iche nọ n’ime ya.
Ha ga-adịkwa ka ụmụ nwaanyị.+
A ga-eji mma agha bibie akụ̀ ya, bukọrọkwa ya.+
38 A ga-ala mmiri niile dị na Babịlọn n’iyi, ha ataa.+
N’ihi na ọ bụ ala arụsị a pịrị apị juru.+
Ha na-emekwa ara ara n’ihi ọhụụ na-emenye ụjọ ha na-ahụ.
39 N’ihi ya, anụ ọhịa ndị na-ebi n’ọzara na anụ ndị na-agbọ ụja ga-ebikọ.
Enyí nnụnụ ga-ebikwa na Babịlọn.+
Mmadụ agaghịzi ebi na ya.
Ọ gaghịkwa abụ ebe a ga-ebi ebi n’ọgbọ niile.”+
40 Jehova kwuru, sị, “Otú ahụ a na-enweghị onye bi na Sọdọm na Gọmọra+ na obodo ndị dị ha nso+ mgbe e bibichara ha, ka a na-agaghị enwe onye ọbịa ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ ga-ebi na Babịlọn.+
41 E nwere ndị si n’ebe ugwu na-abịa.
42 Ha ma otú e si agba ụta na otú e si atụ árọ̀.+
Obi tara ha mmiri. Ha agaghịkwa eme ebere.+
Ha gbara ịnyịnya ha na-aga,
Ha na-eme mkpọtụ ka ebili mmiri na-eme n’oké osimiri.+
Babịlọn,* ha agbakọọla aka, haziekwa onwe ha n’usoro ịlụso gị agha.+
Ezigbo ụjọ ejidela ya.
Ahụ́ na-egbukwa ya mgbu ka nwaanyị na-amụ nwa.
44 “Otú ahụ ọdụm si esi n’oké ọhịa dị n’akụkụ Osimiri Jọdan apụta, ka a ga-enwe onye ga-abịa ibibi ebe a rụsiri ike anụmanụ na-ata ahịhịa na Babịlọn. Ma, m ga-eme ka onye ahụ si ebe ahụ gbaa ọsọ n’otu ntabi anya. M ga-ahọpụtakwa onye ga na-achị ya.+ Ònye dị ka m? Ònye ga-amakwa m aka? Olee onye ọzụzụ atụrụ ga-emeli ka m ghara ime ihe m chọrọ ime?+ 45 N’ihi ya, nụrụnụ ihe Jehova kpebiri ime Babịlọn,+ na ihe o bu n’obi ime ala ndị Kaldia.
N’eziokwu, a ga na-akpụrụ ụmụ atụrụ si n’ìgwè atụrụ ha.
Ọ ga-eme ka ebe ha na-ata ahịhịa tọgbọrọ nkịtị n’ihi ihe ndị bi na ha mere.+
46 Mgbe a ga-eweghara Babịlọn, ụwa ga-ama jijiji.
A ga na-anụkwa mkpu ákwá ndị mmadụ na-eti ná mba dị iche iche.”+
51 Jehova kwuru, sị:
2 M ga-ezi ndị na-afụcha ihe ka ha gaa Babịlọn.
Ha ga-afụcha ya, meekwa ka ala ya tọgbọrọ nkịtị.
Ha ga-esi ebe niile lụso ya agha n’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ya.+
3 Ndị na-agba ụta na Babịlọn agaghị agba ụta ha.
Ndị agha ha agaghịkwa eji ngwá agha ha bilie ọtọ.
Unu emerela ụmụ okorobịa ha ebere.+
Bibienụ ndị agha ha niile.
4 A ga-egbu ha n’ala ndị Kaldia.
A ga-emerụkwa ha ezigbo ahụ́ n’okporo ámá ha dị iche iche.+
5 N’ihi na ndị Izrel na ndị Juda adịghị ka nwaanyị isi mkpe. Jehova nke ụsụụ ndị agha ahapụbeghị ha.+
Ma n’anya Onye Nsọ Izrel, ikpe mara ndị Kaldia.*
6 Sinụ na Babịlọn gbapụ.
Ka a ghara igbu unu n’ihi mmehie Babịlọn.
N’ihi na ọ bụ oge Jehova ga-emegwara ya ihe o mere ndị ọzọ.
Ọ ga-akwụ ya ụgwọ ihe o mere.+
7 Babịlọn bụ iko ọlaedo Jehova bu n’aka.
Ọ na-eme ka mmanya gbuwe mba niile.
Mba dị iche iche aṅụọla mmanya dị n’ime ya.+
Ọ bụ ya mere ha ji na-eme ara ara.+
8 Babịlọn adaala na mberede, kụọ righirighi.+
Besierenụ ya ákwá ike.+
Werenụ mmanụ balsam a ga-ete ya maka ahụ́ na-egbu ya mgbu. Ikekwe, a ga-agwọta ya.”
9 “Anyị gbara mbọ ka anyị gwọọ Babịlọn, ma o kweghị ngwọta.
Hapụnụ ya, ka onye ọ bụla n’ime anyị lawa n’ala ya.+
N’ihi na mmehie a ga-eji ekpe ya ikpe eruola eluigwe.
O ruola n’ígwé ojii.+
10 Jehova ekpeerela anyị ikpe ziri ezi.+
Bịanụ ka anyị gaa na Zayọn kọọ gbasara ihe Jehova bụ́ Chineke anyị rụrụ.”+
11 “Pịanụ akụ́ unu.+ Burunụ ọta unu dị okirikiri.
Jehova emeela ka ịga agha dịrị n’obi ndị eze ndị Midia,+
N’ihi na o bu n’obi ibibi Babịlọn.
Otú a ka Jehova chọrọ isi taa ndị iro ya ahụhụ n’ihi ụlọ nsọ ya.
12 Gwunyenụ ihe ndị agha ga-eji amata ebe ha ga-agbakọ+ kwatuo mgbidi Babịlọn.
Chesienụ nche ike. Dowenụ ndị nche.
Meenụ ka e nwee ndị ga-ezoro ezoro lụso Babịlọn agha.
Jehova echepụtala ihe ọ ga-eme ya.
Ọ ga-emekwa ndị bi na Babịlọn ihe o kwuru ọ ga-eme ha.”+
13 “Nwaanyị nke bi n’ọtụtụ mmiri,+
Nke nwekwara akụ̀ hiri nne,+
Nke gị agwụla. Ị gaghịzi enweta uru ị na-enweta.+
14 Jehova nke ụsụụ ndị agha ejirila onwe ya* ṅụọ iyi, sị,
‘M ga-eme ka ndị mmadụ ju n’ime gị ka igurube.
Ha ga-eti mkpu, na-enwe aṅụrị na ha emeriela gị.’+
16 Olu ya na-eme
Ka mmiri dị n’eluigwe mee mkpatụ.
Yanwa na-emekwa ka alụlụụ* si n’ebe niile ụwa sọtụrụ na-akwụgo elu.
Ọ na-eme ka àmụ̀mà na-egbu mgbe mmiri na-ezo.*
Ọ na-emekwa ka ifufe si n’ebe ọ na-adị pụta.+
17 Onye ọ bụla na-akpa àgwà ka onye na-enweghị uche nakwa ka onye na-amaghị ihe.
Ihere ga-eme omenkà ọ bụla n’ihi arụsị ndị ọ kpụrụ,+
N’ihi na arụsị ndị ahụ bụ ihe e ji eduhie mmadụ.
18 Ha na-emegharị mmadụ anya,*+ na-atọkwa ọchị.
N’oge Chineke ga-elebara ha anya, ha ga-ala n’iyi.
Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya.”+
20 “Ị bụ okpiri m ji alụ agha,
N’ihi na m ga-eji gị kụrie mba dị iche iche.
M ga-ejikwa gị laa alaeze dị iche iche n’iyi.
21 M ga-eji gị kụrie ịnyịnya na onye na-agba ya.
M ga-eji gị kụrie ụgbọ ịnyịnya e ji alụ agha na onye na-agba ya.
22 M ga-eji gị kụrie nwoke na nwaanyị.
M ga-eji gị kụrie agadi nwoke na nwatakịrị nwoke.
M ga-eji gị kụrie nwa okorobịa na nwa agbọghọ.
23 M ga-eji gị kụrie onye na-azụ atụrụ na ìgwè atụrụ ya.
M ga-eji gị kụrie onye ọrụ ubi na anụ ndị o ji akọ ihe.
M ga-eji gị kụrie ndị gọvanọ na ndị osote onye na-achị achị.
24 M ga-anọ n’ihu unu kwụọ Babịlọn na ndị niile bi na Kaldia
Ụgwọ ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
M ga-eweli aka m taa gị ahụhụ. M ga-esi n’elu nkume dị elu kwapụ gị,
Meekwa ka ị dị ka ugwu gbara ọkụ.”
26 “Ndị mmadụ agaghịzi na-eji nkume e si na gị wapụta mere nkume ji ụlọ ma ọ bụ nkume e ji atọ ntọala,
N’ihi na ị ga-atọgbọ nkịtị ruo mgbe ebighị ebi.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
27 “Gwunyenụ ihe ndị mmadụ ga-ahụ gbakọta.+
Fụọrọnụ mba dị iche iche opi.
Gwanụ mba dị iche iche* ka ha lụso ya* agha.
Kpọkọtanụ alaeze Ararat,+ alaeze Minaị na nke Ashkenaz+ ka ha lụso ya agha.
Họpụtanụ ọchịagha ga-alụso ya agha.
Meenụ ka ịnyịnya ju ebe niile ka ìgwè igurube.
28 Gwanụ mba dị iche iche* ka ha lụso ya agha,
Ma ndị eze Midia+ ma ndị gọvanọ ya ma ndị niile na-esote onye na-achị achị na Midia
Ma obodo niile ha na-achị.
29 Ụwa ga-ama jijiji
N’ihi na Jehova ga-eme ihe o bu n’obi ime Babịlọn.
O bu n’obi ime Babịlọn ihe ga-eju ndị mmadụ anya, ka a gharakwa inwe onye ga-ebi na ya.+
30 Ndị agha Babịlọn akwụsịla ịlụ agha.
Ha nọ ọdụ n’ebe ndị ha rụsiri ike.
Ike agwụla ha.+
Ha dịzi ka ụmụ nwaanyị.+
A gbaala ụlọ niile dị na Babịlọn ọkụ.
A gbajisiela ihe ndị e ji atụchi ọnụ ụzọ ámá ya.+
31 Otu onye ozi na-agbakwuru onye ozi ibe ya.
Ndị na-akọ ihe merenụ gbakwa ọsọ na-aga,
Ka ha kọọrọ eze Babịlọn na e sila n’akụkụ niile weghara obodo ya,+
32 Nakwa na e wegharala ebe ndị a na-eji ụkwụ agafe mmiri ya,+
Gbaakwa ụgbọ mmiri ya niile e ji ahịhịa papaịrọs rụọ ọkụ,
Nakwa na ụjọ ejidela ndị agha ya.”
33 N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị:
“Babịlọn* dị ka ebe a na-azọcha ọka.
Oge eruola ka a zọsie ya ụkwụ ike.
Oge a ga-ewe ya otú e si ewe ihe ubi eruola eruo.”
34 “Nebukadneza* eze Babịlọn adọriela m.+
O meela m ka m ghara ịma ihe m na-eme eme.
O meela ka m dịrị ka okpokoro ite.
O loola m otú nnukwu agwọ si elo ihe.+
O riela ihe ndị dị mma m nwere, rijuokwa afọ.
Ọ ṅachapụla m.
35 Onye bi na Zayọn na-ekwu, sị, ‘Ka ahụ́ e merụrụ m dịrị n’isi Babịlọn.’+
Jeruselem na-ekwukwa, sị, ‘Ka ọbara m dịrị n’isi ndị bi na Kaldia.’”
36 N’ihi ya, Jehova kwuru, sị:
“M ga-ekpechite ọnụ gị.+
M ga-emegwara onye iro gị ihe o mere gị.+
M ga-eme ka oké osimiri ya na olulu mmiri ya taa.+
A gaghịkwa enwe onye ga-ebi na ya.+
38 Ha niile ga-agbọ ụja ka ọdụm.
Ha ga-abakwa mba ka ụmụ ọdụm.”
39 Jehova kwuru, sị, “Mgbe obi dị ha ụtọ, m ga-emere ha oriri, meekwa ka mmanya gbuwe ha,
Ka ha wee na-aṅụrị ọṅụ.+
Ha ga-arahụ ụra ha na-agaghị eteta eteta.
Ha agaghị eteta ruo mgbe ebighị ebi.”+
40 “M ga-akpụrụ ha otú e si akpụrụ nwa atụrụ aga ebe a ga-egbu ya,
Nakwa otú e si akpụrụ ebule na ewu aga ebe a ga-egbu ha.”
E wegharala obodo ụwa niile na-eto.+
Otú Babịlọn dịzi na-eju mba niile anya.
42 Oké osimiri erikpuola Babịlọn.
Ebili mmiri nke na-eme na ya ekpuchiela ya.
43 Mmiri adịghịzi n’obodo ya dị iche iche. Ha bụzi ọzara. Otú ha dị na-ejukwa ndị mmadụ anya.
Mmadụ agaghị ebi na ha. E nweghịkwa onye ga-esi na ha na-agafe.+
44 M ga-elebara Bel a na-efe na Babịlọn anya.+
M ga-esi n’ọnụ ya wepụta ihe o loro.+
Mba dị iche iche agaghịzi na-enubata na Babịlọn ife Bel.
Mgbidi Babịlọn ga-adakwa.+
45 Ndị m, sinụ na Babịlọn pụta,+
Gbapụnụ+ ka Jehova ghara iji iwe ya dị ọkụ gbuo unu.*+
46 Obi amapụla unu, unu atụkwala ụjọ n’ihi akụkọ unu ga-anụ n’ala a.
Unu ga-anụ otu akụkọ n’afọ a,
N’afọ ọzọ, unu anụ akụkọ ọzọ.
Akụkọ ahụ bụ gbasara tigbuo zọgbuo dị n’ala a nakwa gbasara otú otu onye na-achị achị si alụso onye ọzọ na-achị achị agha.
47 N’ihi ya, oge na-abịa mgbe m ga-elebara arụsị a pịrị apị
Ndị dị na Babịlọn anya.
A ga-emenye ala ya niile ihere.
Ndị ya niile e gburu egbu ga-atọgbọrọkwa ebe niile na Babịlọn.+
48 Eluigwe na ụwa na ihe niile dị n’ime ha
Ga-eti mkpu ọṅụ n’ihi ọdịda Babịlọn,+
N’ihi na ndị na-ebibi ihe ga-esi n’ebe ugwu bata na ya.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
49 “Ọ bụghị naanị na ọ bụ Babịlọn mere ka e gbuo ndị Izrel,+
Kamakwa, ọ bụ na Babịlọn ka a nọ gbuo ndị niile e gburu egbu n’ụwa.
50 Ndị gbanahụrụ mma agha, na-aganụ. Unu eguzola otu ebe.+
Nọrọnụ ebe dị anya cheta Jehova.
Ka Jeruselem batakwa unu n’obi.”+
51 E menyere anyị ihere, n’ihi na anyị anụla mkparị a kparịrị anyị.
52 Jehova kwuru, sị, “N’ihi ya, oge na-abịa mgbe m ga-elebara
Arụsị ya a pịrị apị anya.
Ndị e merụrụ ahụ́ ga na-asụkwa ude n’ala ya niile.”+
53 “Ọ bụrụgodị na Babịlọn arịgoo n’eluigwe,+
Ọ bụrụgodị na ọ rụsie ụlọ elu ya dị iche iche ike,
M ga-edunye ndị ga-aga bibie ya.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
54 “Geenụ ntị. A na-eti mkpu ákwá na Babịlọn.+
Ọ ga-akwụsị mkpọtụ ọ na-eme.
Ụzụ ndị iro ya na-eme ga-adị ka ebili mmiri.
A ga na-anụkwa ụda olu ha.
56 N’ihi na onye na-ebibi ihe ga-alụso Babịlọn agha.+
A ga-ejide ndị agha Babịlọn,+
Gbajisiekwa ụta ha,
N’ihi na Jehova bụ Chineke nke na-akwụ onye ọ bụla ụgwọ kwesịịrị ya.+
Ọ ga-akwụrịrị onye ọ bụla ụgwọ ihe o mere.+
57 M ga-eme ka mmanya gbuwe ma ndị isi ya ma ndị ya ma ihe,+
Ma ndị gọvanọ ya ma ndị ya na-esote onye na-achị achị ma ndị agha ya.
Ha ga-arahụ ụra ha na-agaghị eteta eteta.
Ha agaghị eteta ruo mgbe ebighị ebi.”+ Ọ bụ Eze, onye aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru ihe a.
58 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwukwara, sị:
“A ga-akwada mgbidi Babịlọn n’agbanyeghị na ọ dị igbidi.+
A ga-agbakwa ọnụ ụzọ ámá ya ọkụ n’agbanyeghị na ọ dị elu.
Ndị dị iche iche ga-arụgbu onwe ha n’ọrụ na nkịtị.
Ọkụ ga-agbakwa ihe mba dị iche iche ji maka ya rụgbuo onwe ha n’ọrụ.”+
59 E nwere ihe Jeremaya onye amụma gwara Seraya nwa Neraya nwa Masaya ka o mee.+ Ọ gwara ya ihe a mgbe Seraya so Zedekaya bụ́ eze Juda gaa Babịlọn n’afọ nke anọ n’ọchịchị Zedekaya. N’oge ahụ, ọ bụ Seraya na-elekọta ihe niile eze nwe. 60 Jeremaya dere ọdachi niile ga-adakwasị Babịlọn n’otu akwụkwọ. Ihe niile o dere bụ ihe ga-eme Babịlọn. 61 Jeremaya gwakwara Seraya, sị: “I ruo Babịlọn, gụpụtara ha ihe a niile. 62 Kwuokwa, sị, ‘Jehova, i kwuru na a ga-ebibi obodo a ka mmadụ ma ọ bụ anụmanụ gharazie ibi na ya. I kwukwara na ọ ga-atọgbọ nkịtị ruo mgbe ebighị ebi.’+ 63 Ị gụpụtachaara ha ihe dị n’akwụkwọ a, kegide ya na nkume, tụbakwa ya n’etiti Osimiri Yufretis. 64 Kwuzie, sị, ‘Otú a ka Babịlọn ga-esi mie ala. Ọ gaghịkwa apụta ọzọ+ n’ihi ọdachi Chineke ga-eme ka ọ dakwasị ya. Ike ga-agwụkwa ndị bi na ya.’”+
Ebe a ka ihe Jeremaya kwuru gwụrụ.
52 Zedekaya+ dị afọ iri abụọ na otu mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jeruselem. Aha nne ya bụ Hamutal+ nwa Jeremaya onye Libna. 2 Ọ nọ na-eme ihe dị njọ n’anya Jehova otú Jehoyakim mere.+ 3 Ihe mere ihe ndị a ji mee ndị bi na Jeruselem na ndị Juda bụ maka na ha nọ na-akpasu Jehova iwe ruo mgbe ọ chụpụrụ ha n’ihu ya.+ Zedekaya mechakwara nupụrụ eze Babịlọn isi.+ 4 N’abalị iri n’ọnwa iri, n’afọ nke itoolu n’ọchịchị Zedekaya, Nebukadneza* eze Babịlọn na ndị agha ya niile bịara ịlụso Jeruselem agha. Ha mara ụlọikwuu ha ga-anọ lụso ya agha, rụọkwa mgbidi gburugburu ya ka ha nwee ike nọchibido ya.+ 5 Ha nọchibidokwara Jeruselem ruo n’afọ nke iri na otu n’ọchịchị Zedekaya.
6 N’abalị itoolu n’ọnwa anọ n’afọ ahụ,+ ụnwụ bịara ka njọ na Jeruselem. Ndị mmadụ ahụghịkwa nri ha ga-eri.+ 7 Ndị Kaldia mechara kwatuo mgbidi Jeruselem. Ka ha gbakwara obodo ahụ gburugburu ịlụso ya agha, ndị agha niile nọ na ya ji abalị si n’ọnụ ụzọ ámá dị n’agbata mgbidi abụọ gbaa ọsọ. Ọnụ ụzọ ámá ahụ dị n’akụkụ ubi eze. Ha gbakwaara tinye isi n’ụzọ gara Araba.+ 8 Ma ndị agha Kaldia chụwara Zedekaya, chụkwute ya+ n’ọzara Jeriko. Ndị agha ya niile hapụkwara ya rie mbọmbọ. 9 Ndị Kaldia jidere ya, kpụrụ ya kpụgara eze Babịlọn ebe ọ nọ na Ribla nke dị na Hemat. Ọ makwara ya ikpe. 10 Eze Babịlọn nọ na Ribla gbuo ụmụ Zedekaya ndị nwoke n’ihu ya, gbuokwa ndị niile bụ́ ndị isi ndị Juda. 11 Ọ rụkpọsịkwara Zedekaya anya,+ tụọ ya ịga abụọ e ji ọla kọpa mee, kpụrụkwa ya laa Babịlọn ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ. Ọ nọkwa mkpọrọ ruo ụbọchị ọ nwụrụ.
12 N’abalị iri n’ọnwa ise, n’afọ nke iri na itoolu n’ọchịchị Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn, Nebuzaradan onyeisi ndị nche, onye na-ejere eze Babịlọn ozi, bịara Jeruselem.+ 13 Ọ gbara ụlọ niile dị na Jeruselem ọkụ,+ ma ụlọ Jehova ma ụlọ* eze ma ụlọ onye ọ bụla a ma ama. 14 Ndị agha Kaldia niile ha na onyeisi ndị nche ahụ so bịa kwaturu mgbidi gbara Jeruselem gburugburu.+
15 Nebuzaradan onyeisi ndị nche dọọrọ ụfọdụ n’ime ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha n’agha, dọrọkwa ndị ọzọ fọdụrụ na Jeruselem nakwa ndị chịliiri ndị agha eze Babịlọn aka elu ma na-akwadozi ya. Ndị ọzọ ọ dọọrọ n’agha bụ ndị bụ́ ọkaibe n’ime nkà.+ 16 Ma, Nebuzaradan hapụrụ ụfọdụ ndị ogbenye ọnụ ntụ ka ha na-arụ ọrụ n’ubi vaịn nakwa n’ubi ọ bụla ọzọ a manyere ha ịrụ ọrụ.+
17 Ndị Kaldia kụrisịrị ogidi ọla kọpa+ ndị dị n’ụlọ Jehova, gbukasịakwa ihe ndị e ji ebu ihe+ dị n’ụlọ Jehova nakwa otu nnukwu ite e ji ọla kọpa rụọ+ a na-akpọ Oké Osimiri. Ha bukwaara ọla kọpa niile e ji rụọ ihe ndị a laa Babịlọn.+ 18 Ha bukọkwaara ite,+ shọvel,+ ihe ndị e ji emenyụ ọkụ, ọkwá, iko, na arịa niile e ji ọla kọpa rụọ, ndị e ji arụ ọrụ n’ụlọ nsọ. 19 Onyeisi ndị nche ahụ bukọkwaara efere,+ ihe ndị e ji agụrụ ọkụ, ọkwá dị iche iche, ite, ihe e ji adọsa ọkụ,*+ iko, na ọkwá ndị e ji ezigbo ọlaedo na ezigbo ọlaọcha rụọ.+ 20 A bịa n’ihe gbasara arịa niile Eze Solomọn rụrụ n’ụlọ Jehova, ma ogidi abụọ ma nnukwu ite a na-akpọ Oké Osimiri ma oké ehi iri na abụọ+ dị n’okpuru ya, bụ́ ndị e ji ọla kọpa kpụọ, ma ihe ndị e ji ebu ihe, a gaghị atụli ọla kọpa o ji rụọ ha atụ̀, n’ihi na ha karịrị akarị.
21 Ogo nke ọ bụla n’ime ogidi abụọ ahụ dị kubit* iri na asatọ. E jirikwa eriri e ji atụ̀ ihe tụọ nke ọ bụla n’ime ha gburugburu, ọ dị kubit iri na abụọ.+ Igbidi ya dị uhiè mkpịsị aka anọ.* Ime ya ghekwa oghe. 22 E jikwa ọla kọpa kpụọ ihe a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ. Ogo otu n’ime ihe ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ dị kubit ise.+ E ji naanị ọla kọpa kpụọ ihe a kpara akpa nakwa ihe yiri mkpụrụ pomigranet ndị e ji gbaa ihe a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ gburugburu. Otú ogidi nke mbụ dị ka nke abụọ dịkwa. Otú ahụ ihe ndị ahụ yiri mkpụrụ pomigranet dị n’ogidi nke mbụ ka ha dịkwa n’ogidi nke abụọ. 23 Ihe ahụ niile yiri mkpụrụ pomigranet ndị dị gburugburu ihe ahụ a kpara akpa dị otu narị (100).+ Ma, ndị nke a na-ahụ anya dị iri itoolu na isii.
24 Onyeisi ndị nche kpụkwaara Seraya+ bụ́ onyeisi nchụàjà na Zefanaya+ onye nchụàjà na-esote ya nakwa mmadụ atọ na-eche ọnụ ụzọ nche.+ 25 Ndị ọzọ ọ kpụụrụ n’obodo ahụ bụ otu onye na-eje ozi n’obí eze, bụrụkwa onyeisi ndị agha, mmadụ asaa nọ n’obodo ahụ, bụ́ ndị ndụmọdụ eze, odeakwụkwọ onyeisi ndị agha, bụ́ onye na-akpọkọta ndị obodo ma a chọọ ịga agha, nakwa ụmụ nwoke iri isii ndị obodo ahụ, bụ́ ndị nkịtị fọrọ n’obodo. 26 Nebuzaradan onyeisi ndị nche kpụụrụ ha kpụtara eze Babịlọn ebe ọ nọ na Ribla. 27 Eze Babịlọn wee gbuo ha na Ribla+ nke dị na Hemat. Otú a ka e si dọrọ ndị Juda n’agha pụọ n’obodo ha.+
28 N’afọ nke asaa n’ọchịchị Nebukadneza,* ndị Juu ọ dọọrọ n’agha dị puku atọ na iri abụọ na atọ (3,023).+
29 N’afọ nke iri na asatọ n’ọchịchị Nebukadneza,*+ ndị* o si na Jeruselem dọrọ n’agha dị narị asatọ na iri atọ na abụọ (832).
30 N’afọ nke iri abụọ na atọ n’ọchịchị Nebukadneza,* Nebuzaradan onyeisi ndị nche dọọrọ ndị Juu dị narị mmadụ* asaa na iri anọ na ise (745) n’agha.+
Ndị* niile a dọọrọ n’agha dị puku anọ na narị isii (4,600).
31 N’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa nke iri na abụọ, n’afọ nke iri atọ na asaa a dọọrọ Jehoyakin+ eze Juda n’agha, Ivil-merodak eze Babịlọn si n’ụlọ mkpọrọ kpọpụta Jehoyakin eze Juda. Ọ bụ n’afọ ahụ ka Ivil-merodak malitere ịchị.+ 32 O medara obi gwa Jehoyakin okwu, buliekwa ya n’ọkwá, ya akara ndị eze ndị ọzọ ya na ha nọ na Babịlọn. 33 Jehoyakin wee yipụ uwe ndị mkpọrọ o yi. Ya na eze rikọwara nri na tebụl oge niile ọ dị ndụ. 34 Eze Babịlọn na-enyekwa ya nri ọ na-eri kwa ụbọchị oge niile ọ dị ndụ.
O nwere ike ịbụ na Jeremaya pụtara “Jehova Na-ebuli Mmadụ Elu.”
Ma ọ bụ “ahọọrọ m.”
Na Hibru, “Tupu i si n’akpa nwa pụta.”
Ma ọ bụ “edoro m gị iche.”
Na Hibru, “onye tetara eteta.”
Ma ọ bụ “ite e ji esi nri nke nwere ọnụ obosara.”
Ma ọ bụ “nke a fụnwuru ọkụ n’okpuru ya.”
Na Hibru, “kee ájị̀ n’úkwù.”
Ma ọ bụ “na-egosi m ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “Olee ebe Jehova nọ?”
Na Hibru, “Olee ebe Jehova nọ?”
Ma ọ bụ “n’agwaetiti.”
Ma ọ bụ “Memfis.”
Ma ọ bụ “na-eri opu isi gị.”
Ya bụ, otu n’ime iyi ndị na-asọba n’Osimiri Naịl.
Na Hibru, “ọnwa.”
Ma ọ bụ “chi ndị mba ọzọ.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ndị.”
Na Hibru, “onye Arebia.”
Na Hibru, “Egedege ihu gị dịzi ka nke.”
Ya bụ, ọ nọ na-efe nkume na osisi.
Ma ọ bụ “chi ndị mba ọzọ.”
O nwere ike ịbụ, “di unu.”
Na Hibru, “obi m.”
Ma ọ bụ “ihe ihere.”
Ya bụ, Jehova.
Na Hibru, “Bienụ onwe unu úgwù maka Jehova, biekwanụ obi unu úgwù.”
Ma ọ bụ “Tiwenụ aka n’obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
Na Hibru, “ada bụ́ ndị m.”
Ya bụ, ndị na-eleru obodo anya ka ha mara mgbe ha ga-aga lụso ya agha.
Na Hibru, “Eriri afọ m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m anụla.”
O nwere ike ịbụ, “ndị na-eti mkpu agha.”
Ma ọ bụ “Ha ma ihe.”
Ma ọ bụ “akwa mmakwaara.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “ike agwụghị ha.”
Na Hibru, “ụzọ.”
Yok a pụtara ịnọ n’okpuru Chineke.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ dịghị adị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Zayọn.”
Ma ọ bụ “Doonụ onwe unu nsọ maka.”
Na Hibru, “Onyinyo mgbede na-adịkwu ogologo.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “E bighị ntị ha úgwù.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “ntụziaka m.”
Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”
Ya bụ, Jeremaya.
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nna.”
Ma ọ bụ “malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
Ma ọ bụ “na-egbu ọchụ.”
Ọ bụ aha a na-etu chi ndị Izrel kwụsịrị ife Chineke na-efe. O nwere ike ịbụ chi nwaanyị ha weere ka chi na-enye nwa.
Gụọ Nkọwa Okwu, “Gehena.”
Ma ọ bụ “agbatatụbeghị m n’uche.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Gehena.”
Na Hibru, “ihe ndị dị n’eluigwe.”
Ma ọ bụ “Shekeleke.”
O nwere ike ịbụ, “okwolo.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
Ma ọ bụ “mmanụ na-agwọ ọrịa.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “enweghị isi.”
Ma ọ bụ “na-eche ihe na-enweghị isi.”
Ma ọ bụ “ajị anụ e sijiri ka ọ chawa pọpụl.”
Ọ bụ asụsụ Arameik ka e ji dee amaokwu a mgbe mbụ e dere ya.
Ma ọ bụ “nghọta.”
Ma ọ bụ “ígwé ojii.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ na-emeghekwara mmiri ozuzo ụzọ.”
Ma ọ bụ “Ha adịghịkwa ndụ.”
Ma ọ bụ “Ha enweghị isi.”
Na Hibru, “Òkè.”
Na Hibru, “mkpara o ketara.”
Na Hibru, “Nwaanyị.”
Ọ ga-abụ Jeremaya ka a na-ezi ozi a.
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ.”
Na Hibru, “M na-ebili n’isi ụtụtụ adụ ha ọdụ.”
Na Hibru, “akụrụ.”
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ na-eru uju.”
Ma ọ bụ “n’ụzọ niile na-adịghị mma.”
Ya bụ, belt.
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “A nọchibidola.”
Ma ọ bụ “Onye Etiopia.”
Ma ọ bụ “ndị nta.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị ọ̀ kpọla.”
Ma ọ bụ “obi m agaghị adị n’ebe ha nọ.”
O nwere ike ịbụ, “M ga-ekpe ha ụzọ ikpe anọ.” Na Hibru, “M ga-ahọpụtara ha ezinụlọ anọ.”
O nwere ike ịbụ, “Ị na-ala azụ azụ.”
Ma ọ bụ “Ike ịgbanwe obi m agwụla m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Ya bụ, ndị Juda.
Ma ọ bụ “m nụrụ okwu gị, m buuru ya n’obi.”
Na Hibru, “Ị ga na-eguzokwa n’ihu m.”
Ọ bụ otú ndị na-ekpere arụsị si eru uju onye nwụrụ anwụ. Ọ ga-abụ ihe ndị Izrel kwụsịrị ife Chineke nọ na-eme.
Na Hibru, “dị n’ụzọ ha niile.”
Na Hibru, “ketara ụgha.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ, “N’ihi na iwe m amụnyela unu ọkụ.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ naghịkwa ekwe ngwọta.”
Na Hibru, “Na-enyochakwa akụrụ.”
Na Hibru, “ife m,” ọ ga-abụrịrị Jehova ka ha kwụsịrị ife.
Ma ọ bụ “bibie ha okpukpu abụọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Na Hibru, “Ha kwesiri olu ike.”
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
Na Hibru, “otú dị mma n’anya ọkpụite ahụ isi kpụọ ya.”
Na Hibru, “Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Izrel.”
Ma ọ bụ “a na-awụghị ájá.”
Ma ọ bụ “ga na-enye anyị ntụziaka.”
Na Hibru, “jiri ire anyị mee ya ihe.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “ọ gbatatụbeghịkwa m n’uche.”
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi ha.”
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi ha.”
Na Hibru, “kwesiri olu ike.”
Na Hibru, “na akụrụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
O nwere ike ịbụ, “M ga-akpọkọtakwa ha.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “igbu mkpụrụ obi ha.”
Ma ọ bụ “zọọ mkpụrụ obi ya ndụ.”
Na Hibru, “ihe ọ kwatara.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Na Hibru, “awụfukwala ọbara.”
Na Hibru, “ga-edo ndị ga-ebibi gị nsọ.”
A na-akpọkwa ya Jehoahaz.
Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”
Na Hibru, “n’ịwụfu ọbara.”
A na-akpọkwa ya Jehoyakin na Jekonaya.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “n’ụbọchị.”
Na Hibru, “m ga-eme ka ome ezi omume puoro.”
Ma ọ bụ “akwụsịla ife Chineke.”
Na Hibru, “Ha na-eme ka aka ndị ọjọọ dị ike.”
Ma ọ bụ “na-emegharị unu anya.”
Ụzọ ihe abụọ okwu Hibru a sụgharịrị “ibu arọ” nwere ike ịpụta bụ: “ozi gbara ọkpụrụkpụ Chineke ziri” ma ọ bụkwanụ “ihe dị arọ.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
A na-akpọkwa ya Jehoyakin na Konaya.
O nwere ike ịbụ, “ndị na-arụ mgbidi siri ike.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “Jeremaya onye amụma gwara.”
Na Hibru, “mụ ana-ebili n’isi ụtụtụ na-agwa unu ya.”
Na Hibru, “na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezitere unu ndị ohu ya niile, bụ́ ndị amụma.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “mpanaka; oriọna.”
Ma ọ bụ “taa ahụhụ.”
O yiri ka Shishak bụ aha a na-akpọ Babel (ya bụ, Babịlọn) ma a chọọ imegharị mmadụ anya.
Na Hibru, “anụ ahụ́ niile.”
Ma ọ bụ “ka ị gwa.”
Ma ọ bụ “ịkpọrọ ya isiala.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
Na Hibru, “ndị m na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezitere unu.
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “gbalịa ime ka obi Jehova jụrụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
Na Hibru, “onye dị mma n’anya m inye ya.”
Ma ọ bụ “majik.”
Na Hibru, “o zuru ike.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
E ji ọla kọpa kpụọ efere a dị n’ụlọ nsọ.
Ma ọ bụ “n’obí.”
O nwere ike ịbụ, “ruo mgbe m ga-echeta ha.”
Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ.”
O nwere ike ịbụ, “ndị na-arụ mgbidi siri ike.”
O nwere ike ịbụ, “gbawara agbawa.”
Na Hibru, “m na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezitere ha ndị ohu m, bụ́ ndị amụma.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “gbanyere aka n’úkwù.”
Na Hibru, “oké ụbọchị.”
Ma ọ bụ “m ga-agbazi gị.”
O nwere ike ịbụ, “ka a na-akwanyere ha ùgwù.”
Ma ọ bụ “Ọ bụ ya mere m ji ghara ịkwụsị ịna-egosi gị ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Izrel.”
Ma ọ bụ “n’ihi ihe ọma ndị si n’aka.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ha.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ndị nchụàjà.”
Ma ọ bụ “etiri m aka n’apata ụkwụ m ná mwute.”
Na Hibru, “eriri afọ m.”
Na Hibru, “Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Izrel.”
Ya bụ, ndị Izrel.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
O nwere ike ịbụ, “di nwe ha.”
Ya bụ, mgbe ọgbụgba ndụ nke mbụ gachara.
Ma ọ bụ “ntụ ya na abụba gwakọtara,” ya bụ, ntụ a gwakọtara ya na abụba e ji chụọ àjà.
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “n’obí.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Na Hibru, “anụ ahụ́ niile.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezi ha ihe.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Gehena.”
Ma ọ bụ “agbatatụbeghị m n’uche.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ome.”
Na Hibru, “ihe ndị dị n’eluigwe.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “ná mkpụrụ.”
Na Hibru, “ná mkpụrụ.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Na Hibru, “taa.”
Otú ahụ ka ndị oge ochie si egosi na ha agbaala ndụ.
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi ha.”
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi ha.”
Na Hibru, “Jonadab.” Ọ bụ mkpọbiri aha Jehonadab.
Na Hibru, “Jonadab.” Ọ bụ mkpọbiri aha Jehonadab.
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “m na-ebili n’isi ụtụtụ na-agwa unu okwu.”
Na Hibru, “M na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezite ha.”
Na Hibru, “Jonadab.” Ọ bụ mkpọbiri aha Jehonadab.
Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “Ndị niile na-eje ozi n’obí eze.”
Ọnwa nke itoolu a bụ malite mgbe ọnwa Nọvemba gara ọkara ruo mgbe ọnwa Disemba gara ọkara. Gụọ B15.
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
A na-akpọkwa ya Jehoyakin na Jekonaya.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Na Hibru, “onye gakwuuru ndị Kaldia.”
Ma ọ bụ “zọọ mkpụrụ obi ya ndụ.”
Na Hibru, “ihe ọ kwatara.”
Ma ọ bụ “onye na-eje ozi n’obí eze.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi gị.”
Na Hibru, “Ọ bụrụ na ị gakwuru ndị ahụ eze Babịlọn mere ndị isi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Na Hibru, “Ma, ọ bụrụ na ị gakwurughị ndị ahụ eze Babịlọn mere ndị isi.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi gị.”
Na Hibru, “ị jụ ịgakwuru ha.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Na Hibru, “Ndị gị na ha dị ná mma.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Samga nwere ike ịbụ aha a na-etu mmadụ, ma ihe ọ pụtara edochaghị anya.
N’Akwụkwọ Nsọ Hibru dị iche na nke e si sụgharịa amaokwu a, otú e si dee ya bụ, “Negal-shariza, Samga-nibo, Sasekim, Rabsaris.”
Ma ọ bụ “onyeisi ndị na-eme majik (onye na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu).”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “obí.”
O nwere ike ịbụ, “ọrụ ọ manyere ha ka ha na-arụ.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze.”
Ma ọ bụ “onyeisi ndị na-eme majik (onye na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu).”
Ma ọ bụ “A gaghị eji mma agha gbuo gị.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi gị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
O nwere ike ịbụ, “nnukwu ọdọ mmiri.”
Ma ọ bụ “unu agaa bitụ ebe ahụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “Ọkọ agaghị akọ ya ya esi n’Ijipt laa.”
Ma ọ bụ “Ụlọ Chi Anyanwụ,” ya bụ, Heliopolis.
Ma ọ bụ “Memfis.”
Na Hibru, “m na-ebili n’isi ụtụtụ ezite ha.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Na Hibru, “ha.”
Ma ọ bụ “o wuteghị unu.”
Ọ bụ aha a na-etu chi ndị Izrel kwụsịrị ife Chineke na-efe. O nwere ike ịbụ chi nwaanyị ha weere ka chi na-enye nwa.
Ọ bụ aha a na-etu chi ndị Izrel kwụsịrị ife Chineke na-efe. O nwere ike ịbụ chi nwaanyị ha weere ka chi na-enye nwa.
Ọ bụ aha a na-etu chi ndị Izrel kwụsịrị ife Chineke na-efe. O nwere ike ịbụ chi nwaanyị ha weere ka chi na-enye nwa.
Ọ bụ aha a na-etu chi ndị Izrel kwụsịrị ife Chineke na-efe. O nwere ike ịbụ chi nwaanyị ha weere ka chi na-enye nwa.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Ma ọ bụ “ị na-atụ anya.”
Na Hibru, “anụ ahụ́ niile.”
Na Hibru, “ga-enye gị mkpụrụ obi gị ka ọ bụrụ ihe ị kwatara.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “Ada na-amaghị nwoke bụ́ Ijipt.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “Memfis.”
Na Hibru, “oge a kara aka.”
Ya bụ, onye ga-emeri Ijipt.
Ma ọ bụ “Memfis.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ ga-abụ ala na-abaghị uru.”
Ma ọ bụ “ndị na-akpa nkụ.”
Na Hibru, “ada bụ́ Ijipt.”
Ya bụ, Tibs.
Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi ha.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “m ga-agbazi gị.”
Ya bụ, Krit.
Ya bụ, ha ga-akpụchasị isi ha n’ihi uju ha na-eru na ihere na-eme ha.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “wụfuo ọbara.”
Na Hibru, “ndị niile ma aha ha.”
O nwere ike ịbụ, “Nọdụnụ ala n’ala kpọrọ nkụ.”
Na Hibru, “A gbajiela mpi Moab.”
Ya bụ, ọjà a na-afụ n’oge a na-ebe ákwá ma e liwe mmadụ.
Ya bụ, ọjà a na-afụ n’oge a na-ebe ákwá ma e liwe mmadụ.
O nwere ike ịbụ, “olu ákwá ndị agha.”
Ma ọ bụ “obodo ndị gbara ya gburugburu.”
Ma ọ bụ “n’ogige atụrụ.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “malitere.”
Na Hibru, “M ga-eme ka ifufe anọ ndị si na nsọtụ anọ nke eluigwe fee.”
Ma ọ bụ “ndị na-achọ mkpụrụ obi ha.”
Ọ ga-abụ na ihe a kpọrọ arụsị ndị ahụ n’asụsụ Hibru bụ nwanne okwu Hibru ọzọ nke pụtara “nsị.” E ji ya egosi na ihe na-asọ oyi.
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Ma ọ bụ “ndị amụma ụgha.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Babịlọn.”
O yiri ka Leb-kemaị bụ aha a na-akpọ Kaldia ma a chọọ imegharị mmadụ anya.
Na Hibru, “ikpe mara ala ha.”
Ma ọ bụ “Zọọnụ mkpụrụ obi unu ndụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Ma ọ bụ “nghọta.”
Ma ọ bụ “ígwé ojii.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ na-emeghekwara mmiri ozuzo ụzọ.”
Ma ọ bụ “Ha adịghịkwa ndụ.”
Ma ọ bụ “Ha enweghị isi.”
Na Hibru, “Òkè.”
Na Hibru, “mkpara o ketara.”
Na Hibru, “Doonụ mba dị iche iche nsọ.”
Ya bụ, Babịlọn.
Na Hibru, “Doonụ mba dị iche iche nsọ.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Babịlọn.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
O yiri ka Shishak bụ aha a na-akpọ Babel (ya bụ, Babịlọn) ma a chọọ imegharị mmadụ anya.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “ndị si esi bịa.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “obí.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.
Uhiè otu mkpịsị aka bụ ihe dị ka sentimita 2 (ihe dị ka otu inch). Gụọ B14.
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”