Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g00 3/8 p. 16
  • Abụ Ọ Na-echezọghị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Abụ Ọ Na-echezọghị
  • Teta!—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbalị Ndị M Mere Iji Mee Nhọrọ Ndị Amamihe Dị na Ha
    Teta!—2000
  • Jehova Na-eme Ihe n’Iguzosi Ike n’Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Anyị Nwetara Ọrụ Ka Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Jiri Abụ Na-eto Jehova
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2000
g00 3/8 p. 16

Abụ Ọ Na-echezọghị

“N’ỤLỌ akwụkwọ agụrụ m otu abụ nke nwere okwu ndị bụ́, ‘Jehova onye ukwu, onye nọkwasịrị n’ocheeze n’ebube ya.’ Ana m ajụkarị onwe m, sị, ‘Ònye bụ Jehova a?’”

Ihe ahụ Gwen Gooch, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova nakwa onye e bipụtara akụkọ ndụ ya n’Ụlọ Nche kwuru, nwere mmetụta ma ọ dịkarịa ala n’ahụ otu onye nke gụrụ ya.a Vera, bụ́ onye si Seattle, Washington, U.S.A., na-echeta, sị, “Enwere m otu ahụmahụ ahụ mgbe m nọ na kọleji.”

Mgbe o gesịrị otu abụ, Vera, dịkwa nnọọ ka Gwen, chọsiri ike ịmata onye ọ pụrụ ịbụ ya bụ Jehova a. Vera matara ihe ọ chọrọ ịmata laa azụ na 1949 mgbe nwanne ya nwoke gwara ya na nke mbụ ya banyere Jehova, bụ́ aha aka Chineke nke dị na Bible.

Vera abụwo otu n’ime Ndịàmà Jehova kemgbe ihe dị ka ọkara narị afọ. Ma o chezọghị abụ ahụ ọ nụrụ mgbe ọ na-aga kọleji. “Ruo ọtụtụ afọ,” ka ọ na-ekwu, “agbalịwo m ịchọta ebe e si nweta ya.” N’ikpeazụ, site n’enyemaka nke otu ebe a na-ere egwú, ọ chọtara ya. Abụ ahụ sitere n’abụ Franz Schubert dere na 1825. Okwu ndị dị n’egwú ahụ na-eto Jehova n’ezie. Dị ka ihe atụ, ụfodụ n’ime ihe ndị e kwuru n’abụ ahụ bụ:

“Jehova, bụ́ Onyenwe anyị, dị ukwuu! n’ihi na Eluigwe na Ụwa na-egosi ike ya dị ukwuu. . . . Ị na-anụ ya n’ụda oké ifufe, n’ụda nke mmiri iyi na-asọsi ike . . . Ị na-anụ ya n’ụda oké ọhịa, na-ahụ ya mgbe ọka mara mma ṅagharịrị; ná mgbukepụ nke okooko osisi mara mma nke na-esi ísì ụtọ, na kpakpando ndị jupụtara n’igwe ojii nke Eluigwe . . . Égbè eluigwe Ya na ada ụda na-atụ ụjọ, ìhè sitere n’àmụ̀mà Ya na-enwusi ike n’igwe. Ma obi gị na-eti eti na-ekwupụta nnọọ ike Jehova karị, . . . Onyenwe anyị Chineke nke na-adịru ebighị ebi. Lekwasị Ya anya n’Ebe Dị Elu ma tụọ anya amara na obi ebere. . . . Jehova, bụ́ Onyenwe anyị, dị ukwuu!”

Vera na-ekwu, sị: “Ejiwo m okwu dị n’abụ a mee ihe mgbe ụfọdu iji gosi ndị mmadụ na n’afọ ndị 1800 e nwere ndị maara aha Chineke ma tookwa ya.” Nke bụ́ eziokwu bụ na malite n’oge gboo, a kpaliwo ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi iji abụ too Jehova. Ọ bụ ihe a ga-anọgide na-eme ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe ihe mere a ga-eji too Onye Okike nke eluigwe na ụwa.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee Ụlọ Nche nke March 1, 1998.

[Foto dị na peeji nke 16]

Vera

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya