Akụkọ Okwukwe Sitere n’Ụlọ Mkpọrọ Mere Ihe Akụkọ
N’ụwa nile, ndị ọrụ afọ ofufo n’etiti Ndịàmà Jehova na-aga n’ụlọ mkpọrọ dị iche iche iji nyere ndị mkpọrọ aka bụ́ ndị chọrọ n’ezie ịbịaru Chineke nso. Ruo ihe karịrị afọ 20, anyị enwewo ihe ịga nke ọma n’iduzi usoro nkụzi Bible dị otú ahụ n’ụlọ mkpọrọ gọọmenti etiti dị n’Atlanta, Georgia, U.S.A. Ịmụ Bible n’ụlọ mkpọrọ na-eweta ihe ịma aka. Dị ka ndị ozi afọ ofufo, anyị ezutewo ndị ohi ụlọ akụ̀, ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị ogbu mmadụ, ndị ahịa ọgwụ ọjọọ, ndị nghọrị, na ndị mere mpụ metụtara mmekọahụ. Olee otú e si na-enyere ndị dị otú ahụ aka?
NKE mbụ, ọ pụrụ ịmasị gị ịmata mgbe mbụ Ndịàmà Jehova banyere n’ụlọ mkpọrọ a nakwa otú ha si banye. Ọ bụ na July 4, 1918. E duuru otu ìgwè ndị Kraịst bụ́ ndị ozi a ma ama gbagoo steepụ 15 e ji okwute rụọ nke ụlọ mkpọrọ gọọmenti etiti a. Ọ bụrụ na e mere ihe otú e si eme mgbe ahụ, a tụrụ ha ịgà n’aka ma jikọta ya ‘n’ịgà afọ,’ tụọkwa ha ịgà n’ụkwụ. Ndị ahụ batara ọhụrụ bụ ndị ikom ruru eru n’ụzọ ime mmụọ bụ́ ndị na-edu ndú n’etiti Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. Ndị ikom ahụ apụghị ichewo na ọ ga-ewe ihe na-erughị otu afọ ịchọpụta na mkpọrọ a tụrụ ha bụ ajọ ọdịda nke ụlọikpe dara n’ikpe ikpe ziri ezi. Na March 1919, ndị ozi asatọ ahụ bụ́ Ndịàmà gbadatara otu steepụ ndị ahụ dị n’ụlọ mkpọrọ ahụ, n’enweghị ịgà ọ bụla a tụrụ ha ma bụrụ ndị nweere onwe ha. E mesịrị kwuo na aka ha dị ọcha mgbe ndị ọchịchị kpebiri ịkagbu ebubo ndị ahụ e boro ha.a
Mgbe a tụrụ ha mkpọrọ n’Atlanta, ndị ikom ahụ bụ́ ndị Kraịst duziri klas ọmụmụ Bible dị iche iche. Otu n’ime ndị mkpọrọ ahụ, bụ́ A. H. Macmillan, mesịrị kọọ na osote onyeisi nlekọta nke ụlọ mkpọrọ ahụ mesoro ha n’ụzọ obi ọjọọ na mbụ ma bụrụ onye a kpaliri n’ikpeazụ ikwu, sị: “Ihe ọmụmụ ndị ahụ unu na [ndị mkpọrọ ahụ] na-enwe n’ebe ahụ magburu onwe ya!”
Taa, ihe karịrị afọ 80 mgbe nke ahụ gasịrị, klas ọmụmụ Bible anọgidewo na-enwe mmetụta na-adịgide adịgide n’ahụ ndị mmadụ n’otu ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọtụtụ mgbe, ndị isi ụlọ mkpọrọ ahọrọwo ndị nọ n’ìgwè anyị maka inye ha ekele pụrụ iche na ihe nrite ndị e ji akwanyere mmadụ ùgwù. E dewo banyere ịdị irè nke usoro izi ihe nke Ndịàmà Jehova na Volunteer Today, bụ́ obere akwụkwọ akụkọ mba nke Ngalaba Okwu Ikpe nke United States, Ụlọ Ọrụ Na-elekọta Ụlọ Mkpọrọ Gọọmenti Etiti, na-ebipụta.
Otu n’ime abamuru nke usoro ọmụmụ Bible ahụ e duziiri ndị mkpọrọ ahụ bụ mgbanwe dị ịrịba ama ha nwere n’àgwà ha. N’ihi ya, a tọhapụwo ụfọdụ ndị n’ụlọ mkpọrọ tupu oge ha eruo. Ndị nkatọ na-ekiri ihe na-emenụ pụrụ iche na ndị a mara ikpe na-eso anyị amụ Bible nanị maka ihe dị otú ahụ. Ọ bụ ezie na nke ahụ abụwo eziokwu n’ọnọdụ ole na ole, ahụmahụ ndị anyị nwetara egosiwo ọtụtụ mgbe na ọ dịghị otú ahụ. Anyị na-enwekarị obi ụtọ ịnụ na ndị anyị mụụrụ Bible ka na-akpa ezi àgwà dị ka ndị Kraịst ọtụtụ afọ mgbe a tọhapụsịrị ha n’ụlọ mkpọrọ. Ihe ndị na-esonụ bụ ole na ole n’ime ọtụtụ ahụmahụ anyị nwetaworo n’ime ụlọ mkpọrọ a mere ihe akụkọ bụ́ nke nwere mgbidi ndị dị oké elu.
Ndị Mkpọrọ Bụ́ Ndị Mba Ọzọ Enweta Olileanya
Ná mmalite afọ ndị 1980, anyị bụ́ ndị na-eme nkwusa n’ụlọ mkpọrọ dị n’Atlanta nwere ihe ùgwù nke inyere ọtụtụ ndị mkpọrọ bụ́ ndị mba ọzọ aka. Mgbanwe ụfọdụ ha mere dị nnọọ ukwuu.
Raoulb malitere dị ka onye mkpọrọ dị oké ize ndụ. Ya na enyi ya bụ ndị omempụ a zụrụ azụ bụ́ ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi igbu ọchụ. Ha na-eme nnọọ ihe ike, dị ka ndị okenye nyeere ha aka kwuru. Raoul nwere ndị iro ọ na-apụghị ịgbaghara agbaghara. Otu nwoke ṅụrụ iyi na ya ga-egbu Raoul, Raoul ṅụkwara iyi na ya ga-eme ya otu ihe ahụ. Raoul tụrụ egwu mgbe a kpọfetara onye iro ya bụ́ isi n’Atlanta. O yiri ka mmadụ abụọ a bụworo ndị iro ruo ogologo oge hà ga-ezute otu ụbọchị n’ogige ahụ, na kafiteria, ma ọ bụ n’ógbè ụlọ mkpọrọ ahụ. Otú ọ dị, mgbe o sosịịrị Ndịàmà Jehova mụọ Bible, Raoul mere mgbanwe ndị dị ịrịba ama n’echiche, n’àgwà, na n’otú ọ dị n’ile anya. Mgbe ụmụ nwoke abụọ ahụ mesịrị gaferịta onwe ha n’ogige ụlọ mkpọrọ ahụ, onye iro bụ́ isi nke Raoul amatakwadịghị ya! Nzute nke gaara akpata mwụfu ọbara bụ́ nke yiri ihe a na-apụghị izere ezere ewereghị ọnọdụ ma ọlị.
Mgbe Raoul kpebiri igosipụta nrara ọ raara onwe ya nye Chineke site na baptism, a ghaghị ịchọta arịa mmiri kwesịrị ekwesị. Onye ụkọ na-eje ozi n’ụlọ mkpọrọ ahụ nyere aka ma weta otu igbe ozu ojii dị ka nnukwu gbamgbam mmiri maka baptism. A gbajuru igbe ozu ahụ mmiri. Ma Raoul buru ibu karịa igbe ozu ahụ. N’ihi ya ndị okenye abụọ aghaghị itinye aka iji hụ na e mikpuru Raoul kpam kpam n’ime mmiri, dị ka Bible chọrọ. (Luk 3:21, ihe odide ala ala peeji nke NW) Taa Raoul bụ onye nweere onwe ya ma nọgide na-eje ozi dị ka onye Kraịst na-anụ ọkụ n’obi.
Na 1987, otu mkpebi ụlọikpe mere ịgbara ọtụtụ ndị mkpọrọ bụ́ ndị mba ọzọ ụgbọ nwa mkpi kpatara ajọ ọgba aghara bibiri ihe n’ụlọ mkpọrọ ahụ bụ́ nke gbara n’akụkọ ná mba nile. E jichiri ndị mmadụ. Otú ọ dị, ọ bụ mmadụ ole na ole maara akụkọ banyere ndị mkpọrọ bụ́ ndị mba ọzọ bụ́ ndị nwere obi ike ma tinye ndụ ha n’ihe ize ndụ site n’ịjụ isonye n’ajọ nnupụisi ime ihe ike ahụ. Ha bụ ndị a na-amụrụ Bible na klas ọmụmụ Bible anyị. Ndị ikom a, ndị na-adịbu ngwa ịlụ ọgụ ruo mgbe mmadụ nwụrụ, nọpụrụ iche—n’ekereghị òkè n’ime ihe ike nakwa n’imebisi ihe ndị ahụ. Lee akaebe doro anya nke a na-agba nye ike Bible nwere ịgbanwe ọbụna ndị omempụ dị obi ọjọọ ịghọ ndị Kraịst hụrụ udo n’anya!—Ndị Hibru 4:12.
Inweta Mgbaghara
Ahụmahụ ọzọ kwesịrị ncheta bụ nke James. Ọ bụbu otu n’ime Ndịàmà Jehova ma kwere ịghọ onye na-adịkwaghị ike n’ụzọ ime mmụọ. Ọ dabara n’ọnwụnwa ma gwuo ụlọ akụ̀ wayo. A chụpụrụ ya n’ọgbakọ ndị kraịst ma tụọ ya mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ gọọmenti etiti dị n’Atlanta. O mesịrị gwa anyị, sị: “Ọ bụ oge m kasị nọrọ n’ọnọdụ kwesịrị imere ọmịiko ná ndụ m.”
Ndụ n’ụlọ mkpọrọ siri ike. “Enwere m mmetụta ọjọọ nke ịbụ onye e kewapụrụ iche na obi nkoropụ,” ka James na-echeta. Otú ọ dị, ntụba a tụbara ya n’ụlọ nga dị mkpagide mere ka o nyochaa onwe ya. O si otú a kọwaa ya: “Ihe kasị wute m n’ụlọ mkpọrọ abụghị ọnụnọ m nọrọ n’ọnọdụ na-adịghị mma kama ọ bụ ụzọ m siworo mechuo Nna m nke eluigwe ihu.” Mgbe ọtụtụ ọnwa gasịrị, otu n’ime ndị mkpọrọ ahụ nke so ndị ọrụ afọ ofufo ahụ bụ́ Ndịàmà na-amụ Bible gakwuuru James ma kpọọ ya ịbịa klas ọmụmụ Bible ahụ. N’ihere, James jụru na mbụ. Ma nwa okorobịa ahụ nọgidere na-agakwuru ya, n’ikpeazụkwa, James gara nzukọ nke a na-enwe na Sunday.
A kpaliri ya nke ukwuu ịhụ mmetụta ịhụnanya nke Ndịàmà na-eduzi klas ahụ nwere n’ebe ndị ahụ a na-amụrụ ihe nọ. Mgbe e mesịrị, ihe ọzọ kpaliri mmasị ya. N’ihi ahụmahụ o nweburu tupu mgbe ahụ, James cheburu na a na-akwụ ndị ọrụ afọ ofufo okpukpe nile ezigbo ụgwọ maka aka ha na-enyere ndị mkpọrọ. Ma n’ịbụrụ ya ihe ijuanya, ọ matara na Ndịàmà ahụ adịghị enye akwụkwọ a na-edepụta ọrụ a rụrụ na ego a ga-akwụ, ha adịghịkwa ana ego maka ozi ndị ha na-eje.—Matiu 10:8.
James malitere ịtụsi anya nzukọ ndị ahụ ike. Ọ chọpụtara na ụmụnna na-eduzi nzukọ ndị ahụ nwere obiọma ma na-agba ume. O nwere mmasị karịsịa n’ebe otu okenye nọ. “Ụbọchị ọzọ ọ ga-abịa na-ete m nnọọ aka,” ka James na-echeta, “n’ihi na ọ na-eme ka eziokwu nke Okwu Chineke na-adọrọ mmasị; iguzosi ike n’ihe ya feere m. O mere ka m ghọta mkpa ọ dị ịgụ Bible site n’inyocha akụkụ ya dị iche iche iji ghọta echiche dị n’ozi ya n’ezie—iji mee ka ọ bụrụ nke m n’ezie na, nke ka mkpa, iji nwee uche nke Kraịst.”
O siiri James ike ikweta na Chineke pụrụ ịgbaghara ya mmejọ ya. Gịnị nyeere ya aka? “Mgbaghara Chineke pụtara ìhè n’otú ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi ma na-achụ onwe ha n’àjà si mesoo anyị.c Otu ihe bịara doo nnọọ anya: N’agbanyeghị ajọ mmehie m, ọ dịtụdịghị mgbe ọ bụla ụmụnna ndị ahụ mere ihe na-egosi na Chineke apụghị ịgbaghara m. Ọ dịghị mgbe Jehova gbahapụrụ m. Ọ hụrụ nchegharị m sitere n’obi nakwa ọjụjụ m jụrụ omume nzuzu na nke aghụghọ dị otú ahụ; ọ gọziwokwa m n’ụba.” N’ezie, a nabatara James n’ọgbakọ ndị Kraịst. N’ịbụ onye a tọhapụrụ n’ụlọ mkpọrọ n’ihe dị ka afọ iri gara aga, ọ nọgidewo na-arụsi ọrụ ike ma na-anụ ọkụ n’obi. N’ịbụrụ nwunye ya na ezinụlọ ya ihe obi ụtọ, ọ bụzi ohu na-eje ozi, o kwukwara okwu ihu ọha mbụ ya n’oge na-adịbeghị anya.
Ịchọta Ụzọ Ahụ
Anyị zutere Johnny ná mmalite afọ ndị 1990. E nwere ụfọdụ n’ime ndị òtù ezinụlọ ya na-eso Ndịàmà Jehova akpakọrịta, ma ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha siri ike n’ụzọ ime mmụọ n’oge Johnny na-etolite, bụ́ mgbe nduzi ime mmụọ na nke ụkpụrụ omume dị ya mkpa. Johnny dabara n’ime mpụ. A mara ya ikpe ịnọ n’ogige ụlọ mkpọrọ gọọmenti etiti dịdebere ụlọ mkpọrọ Atlanta. N’oge ọ nọ n’ogige ahụ, ọ nụrụ banyere klas ọmụmụ Bible anyị ma kpebie ịbịa ya.
Na mbụ, Johnny amachaghị agụ ihe. Otú ọ dị, ọ gụsiri ya agụụ ike inwetakwu ihe ọmụma banyere Jehova na Jisọs Kraịst nke na o kpebiri ịmụ ịgụ ihe nke ọma. (Jọn 17:3) Klas ọmụmụ ihe anyị na-enyere ndị mkpọrọ aka mgbe nile n’ihe banyere nke a, karịsịa mgbe a bịara n’ihe banyere ịmụ ịgụ ihe ma ghọta ya nakwa ịgụ ihe n’ihu ọha. Johnny rụsiri nnọọ ọrụ ike n’ịmụ ihe ya nke na ndị ibe ya a na-amụrụ ihe malitere iwere ya dị ka ihe atụ nke otú onye ji ịdị uchu amụ Bible kwesịrị ịdị.
Ka ọtụtụ ọnwa gasịrị, a kpọfere Johnny n’ihe owuwu gọọmenti etiti dị na Talladega, Alabama, ịga otu n’ime usoro izi ihe a na-enwe n’ebe ahụ banyere ọgwụ ọjọọ. Mgbe o ruru, ọ malitere ozugbo ịga nzukọ ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova a na-enwe n’ebe ahụ. Ọ nọgidere na-ekerechi òkè anya ruo mgbe a tọhapụrụ ya n’ikpeazụ. Mgbe ụbọchị obi ụtọ ahụ rukwara, Johnny egbughị oge n’ịkpọtụrụ Ndịàmà nọ n’obodo nta ha. A nabatara ya n’ụzọ na-ekpo ọkụ, ọ nọgidekwara na-amụ ihe ma na-enwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ.
Ịnụ ọkụ n’obi na ịhụnanya Johnny nwere n’ebe eziokwu Bible dị akpaliwokwa nne ya ikerekwu òkè n’ihe omume ọgbakọ. Ọ bụ n’aka ya ka nne ya na-esi enweta ume na enyemaka dị irè. N’oge na-adịbeghị anya, e mere Johnny baptism ná ngosipụta nke nrara ọ raara onwe ya nye Jehova Chineke, ọ nọgidewokwa na-ekerechi òkè anya n’ozi ndị Kraịst.
Owuwe Ihe Ubi nke Bara Ụba
N’ime iri afọ abụọ gara aga, e nyeworo ihe karịrị ndị mkpọrọ 40 nọ n’ụlọ mkpọrọ Atlanta aka ịghọ ndị ozi e mere baptism nke Ndịàmà Jehova; ihe karịrị ndị mkpọrọ 90 ọzọ eritewokwa uru site n’ọmụmụ Bible a na-enwe kwa izu. E mewokwa ndị mkpọrọ ndị ọzọ baptism mgbe a tọhapụsịrị ha n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ mgbe a kpọfesịrị ha n’ụlọ mkpọrọ ndị ọzọ.
Anyị bụ́ ndị na-aga n’ụlọ mkpọrọ mere ihe akụkọ kwa izu iji nyere ndị mkpọrọ nwere ezi nchegharị aka nwere ekele ije ozi ndị Kraịst a pụrụ iche. (Ọrụ 3:19; 2 Ndị Kọrint 7:8-13) N’agbanyeghị ọnọdụ dị mwute nke ebe e nwere ụlọ elu ndị nche bu égbè na-anọ, ndị nche, ibo ọnụ ụzọ ámá ndị ji ike eletrik arụ ọrụ, na waya ndị a hịkọrọ ahịkọ bụ́ ndị na-egbukepụ egbukepụ ma nwee ágụbá ndị dị nkọ, obi anyị ejupụtawo n’ọṅụ, anyị enwewokwa oké ihe ijuanya ịhụ ndị omempụ gọọmenti etiti ji eji ka ha na-echigharị ma na-aghọ ụmụ amaala na-eme ihe n’eziokwu na ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Chineke.—1 Ndị Kọrint 6:9-11.—Onye ọzọ dere ya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nweta nkọwa zuru ezu banyere okwu ikpe ahụ, lee akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peeji nke 647-656, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
b A gbanwewo aha ndị mkpọrọ.
c Ụlọ Nche nke April 15, 1991, gbara ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ume iji obi ebere na-eleta ọtụtụ ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst. Nzube nke ime ihe dị otú ahụ ga-abụ ịgba ha ume ịlaghachikwute Jehova.—2 Ndị Kọrint 2:6-8.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]
“Unu Elekọtawo Ụfọdụ n’Ime Ezi Ndị Enyi M”
N’APRIL 1983, Frederick W. Franz, bụ́ onye na-eje ozi mgbe ahụ n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, mere nleta n’ụlọ mkpọrọ United States dị n’Atlanta. Ọ nọwo na-agụsi ya agụụ ike ileta ụlọ mkpọrọ a. Mgbe ọ banyere n’ụlọ ahụ, o ji olu dara ụda gwa onye nche nọ ọdụ n’oche dị n’ebe a na-anabata ndị ọbịa, sị: “Achọrọ m ka ị mara na unu elekọtawo ụfọdụ n’ime ezi ndị enyi m n’ebe a!” N’ekwufeghị okwu, nke ahụ gbagwojuru onye nche ahụ anya. Gịnị ka Franz nọ na-ekwu banyere ya?
Ọ bụ afọ 64 tupu mgbe ahụ ka a mara Joseph F. Rutherford na ndị enyi ya asaa ikpe na-ezighị ezi maka ịgba izu mmegide. Rutherford na Franz mesịrị ghọọ ezi ndị enyi na ndị rụkọrọ ọrụ. Ugbu a, ihe karịrị afọ 40 Rutherford nwụsịrị—mgbe ya onwe ya dịkwa ihe dị ka afọ 90—Franz nwere obi ụtọ ileta ebe ahụ a tụrụ enyi ya mkpọrọ ogologo oge gara aga. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na o chere banyere ọrụ Rutherford na ndị enyi ya rụworo n’ụlọ mkpọrọ ahụ. Gịnị ka ọ bụ?
Obere oge mgbe Rutherford na ndị enyi ya rutesịrị, osote onyeisi ndị nlekọta ụlọ mkpọrọ ahụ gwara ha, sị: “Anyị ga-enye unu ọrụ unu ga-arụ. Ugbu a, olee ihe unu pụrụ ime?”
“Osote onyeisi,” ka A. H. Macmillan, bụ́ otu n’ime mmadụ asatọ ahụ zara, “ọ dịbeghị ihe ọ bụla m mere ná ndụ m ma e wezụga ime nkwusa. Ùnu nwere ihe dị otú ahụ n’ebe a?”
“Ee e, ọga! Ọ bụ ya mere unu ji nọrọ n’ebe a, ka m gwakwa unu ugbu a na unu agaghị eme nkwusa ọ bụla n’ebe a.”
Ọtụtụ izu gafere. A chọrọ ka ndị mkpọrọ nile na-aga chọọchị na Sunday, ndị chọrọnụ pụkwara ịnọgide mgbe e mesịrị maka Sunday school. Ndị ikom asatọ ahụ kpebiri ihiwe klas ọmụmụ Bible nke ha, bụ́ nke ha na-eme otu onye duzitụ onye ọzọ eduziwe. “Ụfọdụ ndị chọrọ ịmata ihe na-aganụ malitere ịbịa, ọbụna ọtụtụ ndị ọzọ bịakwara,” ka Rutherford mesịrị kọwaa. N’oge na-adịghị anya, obere ìgwè ahụ dị mmadụ 8 mụbara ruo mmadụ 90!
Olee otú ndị mkpọrọ ahụ si meghachi omume n’ebe klas ọmụmụ Bible ahụ dị? Otu onye mkpọrọ kwuru, sị: “Adị m afọ iri asaa na abụọ, ọ bụkwa nanị mgbe m gara mkpọrọ ka m nụrụ eziokwu ahụ. Enwere m obi ụtọ maka ihe a mere e ji tụọ m mkpọrọ.” Onye ọzọ kwuru, sị: “Anọzuwela m oge e nyere m; ọ na-ewute m na aghaghị m ịla . . . Ùnu pụrụ ịgwa m ebe m pụrụ ịchọta ndị dị ka unu mgbe m si n’ebe a pụọ?”
Abalị na-esote ụbọchị a tọhapụrụ ndị ikom asatọ ahụ, ha natara akwụkwọ ozi na-emetụ n’ahụ si n’aka otu nwa okorobịa na-abịabu klas ha. O dere, sị: “Achọrọ m ka unu mara na unu emewo ka m nwee ọchịchọ ịbụ nwoke ka mma, nke nwere ihe ịga nke ọma karị, ma ọ bụrụ na ozu rụrụ arụ dị ka m, nke ike ụwa gwụwokwara pụrụ imecha dị otú ahụ. . . . Enwere m adịghị ike, gabiga ókè, ọ dịghị onye maara nke ahụ karịa m, ma aga m agbalị ma dọlịa ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, iji mee ka mkpụrụ a unu kụworo mịa mkpụrụ dị ukwuu, ka m wee nwee ike inyere ọ bụghị nanị onwe m, kamakwa ndị gbara m gburugburu aka. Nke a pụrụ iju unu anya, ịbụ nke si n’ọnụ onye dị ka m, ma n’ime ime, n’ala ala obi m, ejighị m ya n’egwuregwu, ihe ọ bụla m kwuru si m n’obi.”
Taa, ka ihe karịrị nnọọ afọ 80 gasịrị, Ndịàmà Jehova ka na-akụ mkpụrụ nke eziokwu Bible n’ụlọ mkpọrọ Atlanta—nakwa n’ọtụtụ ụlọ mkpọrọ ndị ọzọ.—1 Ndị Kọrint 3:6, 7.