Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g04 8/8 p. 2-4
  • Ndị A Mụrụ Ịmụta Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị A Mụrụ Ịmụta Ihe
  • Teta!—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú E Si Azụlite Mmasị Maka Ịmụ Ihe
    Teta!—2004
  • Mkpịsị Ugodi nke Mmụta Dị Mma
    Teta!—1996
  • M̀ Pụrụ Ime nke Ọma Karị n’Ụlọ Akwụkwọ?
    Teta!—1998
Teta!—2004
g04 8/8 p. 2-4

Ndị A Mụrụ Ịmụta Ihe

“Ụmụ nnụnụ na-efe efe, azụ̀ na-egwu mmiri; mmadụ na-eche echiche ma na-amụta ihe.”—JOHN HOLT, BỤ́ ONYE EDEMEDE NA ỌKÀ NKỤZI.

MGBADA a mụrụ ọhụrụ na-enwe oké mkpali nke iji ụkwụ ogologo ya ndị na-ama jijiji guzoro ọtọ ma soro nne ya. N’aka nke ọzọ, nwa a mụrụ ọhụrụ nwere ike ọ gaghị aga ije ma ó rughị otu afọ. N’agbanyeghị nke ahụ, e kenyere ụmụ mmadụ ụbụrụ dị ịtụnanya n’ezie nke karịrị nnọọ nke anụmanụ ọ bụla. A na-egosipụta nkarị a n’ọchịchọ a na-adịghị emejụ emejụ nke nwatakịrị na-enwe ịmata ihe na mmasị dị ukwuu ọ na-enwe ịchọpụta ihe na inweta ihe ọmụma.

Iji mejụọ ọchịchọ ahụ, ụmụ ọhụrụ ndị ahụ́ siri ike na-eme ka ụwa ha ghọọ ebe nchọpụta ihe. Ọ bụrụ na i nye ha ihe, ha ga-eji ikike ndị ha ji amata ihe, gụnyere ire ha, mee ihe n’ịchọpụta ihe ọ bụ! Ọ bụghịkwa ebe ahụ ka nchọpụta ahụ na-ejedebe. Dị ka nne ma ọ bụ nna ọ bụla maara, ụmụ ọhụrụ ga-ahịọji ihe, kụọ ihe aka, yọgharịa ihe, ma kụwaa ihe—mgbe mgbe na-eji ọṅụ eme ha—ka ha na-achọsi ike ịghọta na ịmata ihe ndị dị ha gburugburu.

Ọchịchọ siri ike ụmụaka na-enwe maka ihe ọmụma na-apụta ìhè ọbụna karị mgbe ha malitere ikwu okwu—nke bụ́ ịkpa ike dị egwu n’onwe ya! Na mberede, ọ na-eyizi ka ajụjụ adịghị akọ ha akọ n’ọnụ. Ajụjụ dị iche iche, dị ka ‘Gịnị mere nke a . . . ?’ ‘Gịnị mere nke ahụ . . . ?’ na-apụ ha n’ọnụ n’ike n’ike, bụ́ nke ha na-ajụgide, iwe achọwazie iwe ọtụtụ ndị nne na nna. Ha “na-eji oké mkpali na oké mmasị amụta ihe ndị ka ukwuu n’ihe ndị ha na-amụta, n’ime mkpirikpi oge dịgasị iche iche,” ka onye edemede bụ́ Holt kwuru.

E mesịa, afọ ole na ole n’ihu, ụmụaka ndị nọ n’ọtụtụ ala na-abanye n’ụwa ọhụrụ nke ịmụ ihe—nke e nwere ndị nkụzi, akwụkwọ ọgụgụ, tebụl, na ikekwe ọtụtụ narị ụmụaka ndị ọzọ na ya. N’ụzọ dị mwute, mgbe ọtụtụ ụmụaka nọsịrị ọtụtụ afọ n’ụlọ akwụkwọ, ha adịghịzi enwe oké ọchịchọ ịmụ ihe n’ụzọ dị otú ahụ. Ọbụna ụfọdụ na-abịa lewe ụlọ akwụkwọ anya dị ka ihe na-agwụ ike ma ọ bụ dị ka ihe na-adịghị akpali mmasị. Ikekwe ha enweghị mmasị n’ihe ọmụmụ ụfọdụ ma ọ bụ ná ndị nkụzi ụfọdụ. Ma ọ bụkwanụ, ma eleghị anya, nrụgide nke ịgbata ihe n’ule na-eme ka ha na-enwe nchekasị gabigara ókè.

Echiche ọjọọ ndị e nwere n’ebe ụdị ịmụ ihe dị otú ahụ dị pụrụ ịdịgide ruo mgbe mmadụ toruru ogo mmadụ nakwa ọbụna mgbe o mere agadi, na-eme ka ndị nwere nsogbu a na-agbara ihe ọ bụla metụtara iche echiche, ọmụmụ ihe, ma ọ bụ nnyocha ọsọ. Ndị agadi nwere ihe mgbochi ọzọ ha na-aghaghị ịlụso ọgụ—nkwenkwe bụ́ na mmadụ kahaala nká, ọ gaghịzi amụta ihe. Ma dị ka anyị ga-ahụ, echiche ahụ ezighị ezi.

Ị̀ chọrọ ime ka ikike na mmasị i nwere n’ịmụta ihe ka mma, n’agbanyeghị afọ ole ị dị? Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị̀ chọrọ ka ụmụ gị bụrụ ụmụ akwụkwọ na-eme nke ọma nakwa ịbụ ndị ga-anụ ụtọ ịmụ ihe n’oge nile ha na-aga akwụkwọ nakwa mgbe ha gasịrị akwụkwọ? Ọ bụrụ otú ahụ, biko gụrụ gaa n’ihu.

[Foto dị na peeji nke 2]

Ụmụaka na-enwe mmasị n’ịmụ ihe

[Foto dị na peeji nke 3]

N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị ntorobịa na-eche nrụgide na nchekasị ihu n’ụlọ akwụkwọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya