Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/13 p. 12-13
  • Mgbe M Gara Kameruun

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe M Gara Kameruun
  • Teta!—2013
Teta!—2013
g 1/13 p. 12-13
[Foto dị na peeji nke 12]

OBODO NA NDỊ BI NA YA

Mgbe M Gara Kameruun

[Map dị na peeji nke 12]

OYIRI ka ọ̀ bụ ndị akakpọ bucha ndị niile bi na Kameruun ụzọ biri ebe ahụ. Ma, ndị Pọchụgal batara n’obodo ahụ ihe dị ka narị afọ ise gara aga. Mgbe narị afọ ụfọdụ gara, ndị Fulani gara biri n’ebe ugwu ya. Taa, e kee ndị Kameruun ụzọ iri, ụzọ anọ sị na ha bụ Ndị Kraịst. Ụzọ abụọ bụ ndị alakụba, ebe ụzọ anọ ndị nke ọzọ bụ ndị ọgọ mmụọ.

[Foto dị na peeji nke 13]

Ihe a bụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara n’asụsụ Basa, bụ́ nke a na-asụ na Kameruun. Ha na-eji ya akụziri ndị mmadụ Baịbụl

Ndị bi n’ime ime obodo ndị dị na Kameruun anaghị eji ile ọbịa egwu egwu. Ọ na-abụ mmadụ bịa na nke ha, ha kelechaa ya, ha akpọbata ya ụlọ, kunye ya mmiri ọṅụṅụ, nyekwa ya nri. Ọ bụrụ na mmadụ ajụ ka e meere ya ụdị ihe a, onye ọ bịara na nke ya na-ewere ya na ọ kparịrị ya. Ma, ọ bụrụ na o kwe ka e lee ya ọbịa, ọ pụtara na obi dị ya ụtọ.

Ị gaa na nke onye Kameruun, ị ga-ebu ụzọ kelee ndị niile nọ ebe ahụ ma jụọ ha otú ha mere tupu i kwuwe ihe mere i ji bịa. A na-ajụdị ha otú anụ ụlọ ha mere. Onye Kameruun aha ya bụ Joseph kwuru, sị: “Onye bịara na nke gị chọwa ịla, ị gaghị asị ya naanị gaa nke ọma. Ị ga-aga dupụ ya, gị na ya ga na-akparịtakwa ụka n’ụzọ. I duruo ya ebe ị chọrọ, gị asị ya gaa nke ọma. Obi agaghị adị ya mma ma ọ bụrụ na ị gaghị dupụ ya.”

[Foto dị na peeji nke 13]

Ihe a bụ Osimiri Sanaga. E nwere ike iji ihe ọ bụla rụọ ọtụtụ ụgbọ epeepe ndị na-agba na ya

A bịa iri nri, enyi na enyi nwere ike iri nri n’otu efere. Mgbe ụfọdụ, ha na-ejidị aka nkịtị eri ya. Ha na-eji ihe a ha na-eme egosi na ha dị n’otu. Ọ bụrụ na enyi na enyi esee okwu ma mechaa kpezie, ha abụọ nwere ike irikọ nri. Ihe mere ha ji eme ya bụ ka ha gosi na ha ekpeziela.

[Foto dị na peeji nke 13]

Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara magazin a. Ha nwere ihe karịrị narị ọgbakọ atọ na Kameruun. Ha na-amụkwara ihe dị ka iri puku mmadụ isii na puku ise Baịbụl n’obodo a

IHE ỤFỌDỤ I KWESỊRỊ ỊMA BANYERE KAMERUUN

[Foto dị na peeji nke 13]

Ndị isi ojii abụọ a bụ ndị akakpọ. Ọtụtụ n’ime ha anaghị etofe otú a

  • Mmadụ ole bi na ya: Ihe dị ka nde mmadụ iri abụọ

  • Isi obodo ya: Yawunde

  • Otú ebe ahụ na-adị: Ebe ugwu ya na-ekpokarị ọkụ, mmiri anaghị ezokarịkwa n’ebe ahụ. Ma, mmiri na-ezokarị n’ebe ndịda ya

  • Ihe ndị ha na-eresị ndị mba ọzọ: Mmanụ, koko, kọfị, ogho, osisi, na alụminiọn

  • Asụsụ ndị ha na-asụ: Bekee, French, na narị asụsụ abụọ na iri asaa ndị ọzọ a na-asụ n’Afrịka

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya