-
Nkebi nke Mbụ: Ihe Ndị Kraịst KweereNdị A Haziri Ime Uche Jehova
-
-
AJỤJỤ A GA-AJỤ NDỊ CHỌRỌ IME BAPTIZIM
Nkebi nke Mbụ: Ihe Ndị Kraịst Kweere
Ọmụmụ ihe gị na Ndịàmà Jehova emeela ka ị mara eziokwu dị na Baịbụl. Ihe ndị ị mụtara emeekwala ka gị na Chineke dịrị ná mma. O meela ka i nwee olileanya na Chineke ga-agọzi gị, gị adị ndụ ebighị ebi na Paradaịs mgbe Alaeze ya ga na-achị ụwa. O meekwala ka obi sikwuo gị ike na Okwu Chineke bụ eziokwu. Ọmụmụ ihe Ndị Kraịst ị na-aga abaarala gị ezigbo uru. Ị ghọtakwala ụzọ Jehova si emeso ndị ya ihe taa.—Zek. 8:23.
Ebe ọ bụ na ị chọrọ ime baptizim, ọ ga-abara gị uru ma gị na ndị okenye tụlee ihe ndị na-ataghị akpụ Ndị Kraịst kweere. (Hib. 6:1-3) Ka Jehova gọzie mbọ ị na-agba ịmata onye ọ bụ. Ka o nyekwa gị ndụ ebighị ebi ahụ o kwere anyị ná nkwa.—Jọn 17:3.
1. Gịnị mere i ji chọọ ime baptizim?
2. Ònye bụ Jehova?
• “Jehova bụ ezi Chineke n’eluigwe nakwa n’ụwa. E nweghị ọzọ.”—Diut. 4:39.
• “Gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.”—Ọma 83:18.
3. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị na-akpọ Chineke aha ya?
• “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.’”—Mat. 6:9.
• “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.”—Rom 10:13.
4. Olee okwu ụfọdụ e ji kọwaa Jehova na Baịbụl?
• “Jehova, bụ́ Onye kere nsọtụ niile nke ụwa, bụ Chineke ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịza. 40:28.
• “Nna anyị nke bi n’eluigwe.”—Mat. 6:9.
• “Chineke bụ ịhụnanya.”—1 Jọn 4:8.
5. Olee ihe i nwere ike inye Jehova?
• “Jiri obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum, jirikwa ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”—Mak 12:30.
• “Ọ bụ Jehova Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.”—Luk 4:8.
6. Gịnị mere i kwesịrị iji na-erubere Jehova isi?
• “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.”—Ilu 27:11.
7. Ònye ka ị na-ekpegara ekpere, ọ̀ bụkwa n’aha onye?
• “N’ezie, n’ezie, ana m [Jizọs] asị unu, ọ bụrụ na unu arịọ Nna m ihe ọ bụla, ọ ga-enye ya unu n’aha m.”—Jọn 16:23.
8. Olee ụfọdụ ihe ndị i nwere ike ikpe ekpere maka ha?
• “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe. Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa; gbaghara anyị ụgwọ anyị ji, dị ka anyị gbaghakwaara ndị ji anyị ụgwọ. Ekwela ka anyị daba n’ọnwụnwa, kama napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.’”—Mat. 6:9-13.
• “Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.”—1 Jọn 5:14.
9. Olee ihe nwere ike ime ka Jehova ghara ịza ekpere mmadụ?
• “Ha ga-akpọku Jehova maka enyemaka, ma ọ gaghị aza ha . . . n’ihi ihe ọjọọ ha mere.”—Maị. 3:4.
• “Anya Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike; ma ihu Jehova na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”—1 Pita 3:12.
10. Ònye bụ Jizọs Kraịst?
• “Saịmọn Pita zara, sị: ‘Ị bụ Kraịst, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.’”—Mat. 16:16.
11. Gịnị mere Jizọs ji bịa n’ụwa?
• “Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”—Mat. 20:28.
• “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.”—Luk 4:43.
12. Olee otú ị ga-esi egosi na obi dị gị ụtọ maka àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ?
• “Ọ nwụkwara maka mmadụ niile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị onye ahụ ndụ, bụ́ onye nwụrụ n’ihi ha, e wee kpọlite ya.”—2 Kọr. 5:15.
13. Olee ikike Jehova nyere Jizọs?
• “E nyewo m ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.”—Mat. 28:18.
• “Chineke buliri ya elu ka ọ nọrọ n’ọkwá ka elu, o jikwa obiọma nye ya aha dị elu karịa aha ọ bụla ọzọ.”—Fil. 2:9.
14. Ì kwetara na Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova bụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” nke Jizọs họpụtara?
• “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, nke nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị?”—Mat. 24:45.
15. Gịnị bụ mmụọ nsọ?
• “Mmụọ ozi ahụ zara ya, sị: ‘Mmụọ nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi nke ahụ, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ, Ọkpara Chineke.’”—Luk 1:35.
• “Ya mere, ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!”—Luk 11:13.
16. Olee otú Jehova sirila jiri mmụọ nsọ ya rụọ ọrụ?
• “Ọ bụ site n’okwu Jehova ka e kere eluigwe, ọ bụkwa site na mmụọ nke ọnụ ya ka e kere ihe niile dị n’ime ya.”—Ọma 33:6.
• “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà m . . . ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.”—Ọrụ 1:8.
• “Ọ dịghị amụma Akwụkwọ Nsọ nke si ná nkọwa mmadụ pụta. N’ihi na ọ dịghị mgbe e si n’uche mmadụ buo amụma ọ bụla, kama ndị mmadụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.”—2 Pita 1:20, 21.
17. Gịnị bụ Alaeze Chineke?
• “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—Dan. 2:44.
18. Olee ihe Alaeze Chineke ga-emere gị?
• “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpu. 21:4.
19. Olee otú i si mara na oge Chineke ga-emezu ihe o kwere anyị ná nkwa n’Alaeze ya eruwela?
• “Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya naanị ha, sị ya: ‘Gwa anyị, Olee mgbe ihe ndị a ga-eme, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?’ Jizọs zara ha, sị: ‘. . . Mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha, a ga-enwekwa ụkọ nri na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche. A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.’”—Mat. 24:3, 4, 7, 14.
• “N’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, ndị na-eme ka hà nwere nsọpụrụ Chineke ma na-agọnahụ ike ya; zere ndị dị otú a.”—2 Tim. 3:1-5.
20. Olee otú ị ga-esi egosi na Alaeze ahụ dị gị mkpa?
• “Ya mere, burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.”—Mat. 6:33.
• “Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, na-eso m mgbe niile.’”—Mat. 16:24.
21. Ònye bụ Setan, oleekwa ndị bụ́ ndị mmụọ ọjọọ?
• “Unu sitere ná nna unu bụ́ Ekwensu . . . Onye ahụ bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere.”—Jọn 8:44.
• “E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, a chụdara ya na ndị mmụọ ozi ya.”—Mkpu. 12:9.
22. Olee ebubo Setan boro Jehova na ndị na-efe Jehova?
• “Nwaanyị ahụ wee sị agwọ ahụ: ‘Anyị nwere ike iri mkpụrụ si n’osisi ndị dị n’ubi a. Ma, a bịa n’iri mkpụrụ si n’osisi dị n’etiti ubi a, Chineke sịrị: “Unu erila mkpụrụ si na ya, ee e, unu emetụla ya aka ka unu ghara ịnwụ.”’ Agwọ ahụ wee sị nwaanyị ahụ: ‘Unu agaghị anwụ ma ọlị. N’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu riri mkpụrụ si na ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-adịkwa ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.’”—Jen. 3:2-5.
• “Ma Setan zara Jehova, sị: ‘Akpụkpọ ahụ́ laara akpụkpọ ahụ́, ọ bụkwa ihe ọ bụla mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ mkpụrụ obi ya.’”—Job 2:4.
23. Olee otú ị ga-esi egosi na ebubo Setan ndị ahụ bụ ụgha?
• “Jirikwa obi gị dum . . . jeere [Chineke] ozi.”—1 Ihe 28:9.
• “Ruo mgbe m kubiri ume, m gaghị akwụsị iguzosi ike n’ezi ihe.”—Job 27:5.
24. Gịnị mere ndị mmadụ ji anwụ anwụ?
• “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.”—Rom 5:12.
25. Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?
• “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.”—Ekli. 9:5.
26. Ndị nwụrụ anwụ hà ga-adị ndụ ọzọ?
• “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”—Ọrụ 24:15.
27. Mmadụ ole ga-aga eluigwe iji soro Jizọs chịa?
• “Lee! Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo n’Ugwu Zayọn, ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị e dere aha ya na aha Nna ya n’egedege ihu ha.”—Mkpu. 14:1.
-
-
Nkebi nke Abụọ: Otú Ndị Kraịst Si Ebi NdụNdị A Haziri Ime Uche Jehova
-
-
AJỤJỤ A GA-AJỤ NDỊ CHỌRỌ IME BAPTIZIM
Nkebi nke Abụọ: Otú Ndị Kraịst Si Ebi Ndụ
Baịbụl ị na-amụ emeela ka ị mara ihe Jehova chọrọ ka ị na-eme na otú ị ga-esi na-eme ha. O nwekwara ike ịbụ na o meela ka ị gbanwee otú i si akpa àgwà na otú i si ele ndụ a anya. Ugbu a i kpebiri ịna-eme ihe Jehova chọrọ, i ruru eru ijere ya ozi otú dị ya mma.
Ịtụleghachi ajụjụ ndị a na-esonụ ga-eme ka ị ghara ichefu ihe ndị Jehova chọrọ ka ị na-eme. Ha ga-emekwa ka i cheta ihe ụfọdụ ị ga na-eme ka ihe gị na-adị ya mma. Ajụjụ ndị a ga-eme ka ị mara na i kwesịrị iji akọnuche dị ọcha na-eme ihe niile ị na-eme ma si otú ahụ na-enye Jehova otuto.—2 Kọr. 1:12; 1 Tim. 1:19; 1 Pita 3:16, 21.
Ugbu a ị mụtarala ihe ndị a, o doro anya na ị chọsiri ike ịna-erubere Jehova isi, chọsiekwa ike ịnọ ná nzukọ ya. Ajụjụ na amaokwu Baịbụl ndị a e depụtara ga-enyere gị aka ịma ihe ị ghọtara mgbe Jehova sịrị ka anyị na-erubere ndị ọchịchị isi, na-erube isi n’ọgbakọ nakwa n’ezinụlọ. Ọ ga-eme ka i jiri nhazi ndị Jehova mere maka ịkụziri ndị ya ihe na ime ka okwukwe ha sie ike, kpọrọkwuo ihe. Ụfọdụ n’ime ha bụ ọmụmụ ihe ọgbakọ i kwesịrị ịna-agachi anya ma na-azakwa ajụjụ na ya ma ọ bụrụ na ọnọdụ gị kwere gị.
Ihe ọzọ a ga-atụle n’isiokwu a bụ uru ịgachi ozi ọma anya bara. Ọ na-eme ka anyị nyere ndị mmadụ aka ka ha mara Jehova na ihe ndị ọ na-emere ụmụ mmadụ. (Mat. 24:14; 28:19, 20) N’ikpeazụ, ọ ga-eme ka ị mara na i kwesịrị iji nnyefe i nyefere Jehova Chineke onwe gị na baptizim a ga-eme gị kpọrọ ihe. Ka o doo gị anya na obi na-atọ Jehova ụtọ maka otú i si jiri obi gị niile na-ejere ya ozi n’ihi amara o meere gị.
1. Olee ụdị alụmdi na nwunye Chineke kwadoro? Olee naanị ihe Baịbụl kwuru mmadụ ga-eji maka ya gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm?
• “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị wee sị, ‘N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’? Nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya . . . Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko, wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko.”—Mat. 19:4-6, 9.
2. Gịnị mere ndị na-alụghị alụ tupu ha ebiri kwesịrị iji lụọ otú iwu gọọmenti kwuru? Ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwunye, ùnu lụrụ otú iwu gọọmenti kwuru?
• “Nọgide na-echetara ha ka ha na-edo onwe ha n’okpuru ọchịchị na ikike dị iche iche ka ha na-erubekwara ha isi.”—Taị. 3:1.
• “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile, ka ihe ndina alụmdi na nwunye gharakwa ịbụ ihe e merụrụ emerụ, n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.”—Hib. 13:4.
3. Olee ọrụ gị n’ezinụlọ?
• “Nwa m, ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.”—Ilu 1:8.
• “Di bụ isi nke nwunye ya dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ . . . Ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya.”—Efe. 5:23, 25.
• “Ndị bụ́ nna, unu emela ụmụ unu ihe iwe, kama na-azụlitenụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.”—Efe. 6:4.
• “Unu ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe niile, n’ihi na nke a na-atọ Onyenwe anyị ụtọ.”—Kọl. 3:20.
• “Unu ndị bụ́ nwunye, doonụ onwe unu n’okpuru di unu.”—1 Pita 3:1.
4. Gịnị mere anyị ji kwesị iji ndụ kpọrọ ihe?
• “[Chineke] na-enye mmadụ niile ndụ na ume na ihe niile. . . . N’ihi na ọ bụ ya nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-ejegharị, na-adị ndụ.”—Ọrụ 17:25, 28.
5. Gịnị mere na anyị ekwesịghị igbu onye ọ bụla ma nwa ebu n’afọ?
• “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-alụ ọgụ, ha ewee merụọ nwaanyị dị ime ahụ́, . . . ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’ihe mberede a, ị ga-eme ka mkpụrụ obi laara mkpụrụ obi.”—Ọpụ. 21:22, 23.
• “Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ, e dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị, bụ́ ụbọchị a kpụrụ ha, mgbe a na-enwebeghị ọbụna otu n’ime ha.”—Ọma 139:16.
• ‘Jehova kpọrọ aka na-awụfu ọbara nke na-emeghị ihe ọjọọ asị.’—Ilu 6:16, 17.
6. Olee iwu Chineke nyere banyere ọbara?
• “Na-ezere . . . ọbara na anụ a nyagburu anyagbu.”—Ọrụ 15:29.
7. Gịnị mere anyị ji kwesị ịhụ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị n’anya?
• “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:34, 35.
8. Ka onye na-arịa ọrịa na-efe efe ma ọ bụ ọrịa nwere ike igbu mmadụ ghara ibunye ya ndị ọzọ, gịnị mere na o kwesịghị (a) ịmakụ mmadụ ma ọ bụ isutụ ya ọnụ? (b) iwe iwe ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị ekweghị asị ya bịa na nke ha? (ch) Gịnị mere onye rịatụrụla ọrịa na-efe efe ma ọ bụ metụrụla ihe nwere ike ime ka o bute ọrịa na-efe efe kwesịrị iji gaa ka e lee ya ahụ́ tupu ya na mmadụ akpawa maka ọlụlụ? (d) Gịnị mere onye na-arịa ọrịa na-efe efe kwesịrị iji gwa onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ tupu e mee ya baptizim?
• “Unu ejila onye ọ bụla ụgwọ ihe ọ bụla, ma e wezụga ịhụ ibe unu n’anya; . . . ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ Ịhụnanya adịghị eme onye agbata obi mmadụ ihe ọjọọ.”—Rom 13:8-10.
• “Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”—Fil. 2:4.
9. Gịnị mere Jehova ji chọọ ka anyị na-agbaghara ndị ọzọ?
• “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.”—Kọl. 3:13.
10. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na nwanna kwutọọ aha gị ma ọ bụ rigbuo gị?
• “Ọ bụrụkwa na nwanna gị emehie, gaa mee ka ọ mara ebe o mejọrọ n’ebe naanị gị na ya nọ. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritewo nwanna gị n’uru. Ma ọ bụrụ na o geghị ntị, kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ, ka e wee site n’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ atọ mara na okwu ọ bụla bụ eziokwu. Ọ bụrụ na o geghị ha ntị, gwa ọgbakọ. Ọ bụrụ na o geghị ọbụna ọgbakọ ntị, ka ọ dịrị gị ka onye mba ọzọ na onye ọnaụtụ.”—Mat. 18:15-17.
11. Olee otú Jehova si ele mmehie ndị a anya?
▪ Ịkwa iko
▪ Iji foto na ihe a kpụrụ akpụ efe ya
▪ Nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị
▪ Izu ohi
▪ Igba chaa chaa
▪ Ịṅụbiga mmanya ókè
• “Unu ekwela ka e duhie unu. Ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ma ọ bụ ndị ikom ndị na-ekwe ka ndị ikom dinaa ha, ma ọ bụ ndị ikom na-edina ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị aṅụrụma, ma ọ bụ ndị na-ekwujọ mmadụ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, agaghị eketa alaeze Chineke.”—1 Kọr. 6:9, 10.
12. Ịkwa iko bụ mmadụ iso onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya na-enwe mmekọahụ. Ọ gụnyekwara ụzọ dị iche iche e si enwe mmekọahụ. Olee ihe i kpebiri ime gbasara ịkwa iko?
• “Gbaaranụ ịkwa iko ọsọ.”—1 Kọr. 6:18.
13. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịṅụ ọgwụ ike ma ọ bụrụ na dọkịta asịghị anyị ṅụọ ya maka ọrịa anyị na-arịa?
• “Nyefee Chineke ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke mma, ya bụ, ozi dị nsọ site n’ike iche echiche unu. Kwụsịkwanụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị, kama gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.”—Rom 12:1, 2.
14. Olee ụzọ ụfọdụ ndị mmadụ si na-efe ndị mmụọ ọjọọ nke Chineke kpọrọ asị?
• “A gaghị ahụ n’etiti unu . . . onye ọ bụla nke na-agba afa, onye na-eme anwansi ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu ma ọ bụ dibịa anwansi, ma ọ bụ onye na-akọ ndị ọzọ ọgwụ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase ma ọ bụ onye ọrụ ya bụ ịkọ ọdịnihu ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase.”—Diut. 18:10, 11.
15. Ọ bụrụ na mmadụ mere mmehie dị oké njọ ma chọọ ka ya na Jehova dịghachị ná mma, olee ihe o kwesirị ime ozugbo?
• “Ekwupụtaara m gị mmehie m, ekpuchighịkwa m njehie m. Asịrị m: ‘M ga-ekwupụtara Jehova mmebi iwu m.’”—Ọma 32:5.
• “È nwere onye ọ bụla na-arịa ọrịa n’etiti unu? Ka ọ kpọọ ndị okenye nke ọgbakọ, ka ha kpeekwara ya ekpere, teekwa ya mmanụ n’aha Jehova. Ekpere e ji okwukwe kpee ga-emekwa ka ahụ́ dị onye ahụ nke ahụ́ na-adịghị ike mma, Jehova ga-emekwa ka o bilie. Ọ bụrụkwa na o mewo mmehie, a ga-agbaghara ya.”—Jems 5:14, 15.
16. Olee ihe i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị ma na nwanna mere mmehie dị oké njọ?
• “Ọ bụrụ na mkpụrụ obi emehie site n’ịnụ ka a nọ n’ihu ọha na-abụ ọnụ, o wee bụrụ na ọ nọ mgbe o mere, ma ọ bụ, na ọ hụrụ ya ma ọ bụ mara banyere ya, ma o kwughị ya, ọ ga-aza ajụjụ maka njehie ya.”—Lev. 5:1.
17. Ọ bụrụ na a maa ọkwa na mmadụ abụghịzi Onyeàmà Jehova, olee otú ị ga-esi na-emeso ya ihe?
• “Ka unu na onye ọ bụla a na-akpọ nwanna bụ́ onye na-akwa iko ma ọ bụ onye anyaukwu ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị ma ọ bụ onye na-ekwujọ mmadụ ma ọ bụ onye aṅụrụma ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe kwụsị ịdị na-akpakọ, ka unu na onye dị otú a ghara ọbụna irikọ ihe.”—1 Kọr. 5:11.
• “Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute unu ma o wetaghị ozizi a, unu anabatala ya n’ebe obibi unu, unu ekelekwala ya.”—2 Jọn 10.
18. Gịnị mere ezigbo ndị enyi gị kwesịrị iji bụrụ ndị hụrụ Jehova n’anya?
• “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.”—Ilu 13:20.
• “Unu ekwela ka e duhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”—1 Kọr. 15:33.
19. Olee ihe mere Ndịàmà Jehova anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?
• “Ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.”—Jọn 17:16.
20. Olee ihe mere i ji kwesị ịna-erubere ndị ọchịchị isi?
• “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị ọchịchị, n’ihi na ọ dịghị ọchịchị ọ bụla dị ma ọ́ bụghị Chineke debere ya; ọ bụ Chineke debere ọchịchị ndị dị adị n’ọnọdụ ha nọ n’okpuru ya.”—Rom 13:1.
21. Ọ bụrụ na ndị ọchịchị asị anyị mee ihe Chineke sị anyị emela, olee ihe ị ga-eme?
• “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.
22. Olee amaokwu Baịbụl ndị nwere ike inyere gị aka ịdị iche n’ụwa mgbe ị na-ahọrọ ụdị ọrụ ị ga-arụ?
• “Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.”—Maị. 4:3.
• “Ndị nke m, sinụ n’ime ya [Babịlọn Ukwu ahụ] pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya kere òkè ná mmehie ya, ma ọ bụrụkwa na unu achọghị ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya.”—Mkpu. 18:4.
23. Olee ụdị ntụrụndụ i kwesịrị ịhọro, oleekwa ụdị ndị ị ga-ajụ?
• “Jehova . . . kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.”—Ọma 11:5.
• “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, jidesienụ ezi ihe ike.”—Rom 12:9.
• “Ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu, ihe ọ bụla nke dị mkpa, ihe ọ bụla nke ziri ezi, ihe ọ bụla nke dị ọcha, ihe ọ bụla nke na-akpali ịhụnanya, ihe ọ bụla nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya, omume ọma ọ bụla dịnụ na ihe ọ bụla dịnụ nke kwesịrị otuto, na-echebaranụ ihe ndị a echiche.”—Fil. 4:8.
24. Gịnị mere Ndịàmà Jehova anaghị eso okpukpe ndị ọzọ efe ofufe?
• “Unu apụghị ịdị na-aṅụ iko Jehova na iko ndị mmụọ ọjọọ.”—1 Kọr. 10:21.
• “‘Kewapụnụ onwe unu,’ ka Jehova sịrị, ‘kwụsịkwanụ imetụ ihe na-adịghị ọcha aka’; ‘m ga-akpọbatakwa unu.’”—2 Kọr. 6:17.
25. Olee ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ikpebi ma ị̀ ga-eso eme ememme ndị ọzọ na-eme?
• “Ha na ndị mba ọzọ wee na-emekọ ihe, ha wee mụta ihe ha na-eme. Ha nọkwa na-efe arụsị ha, arụsị ndị ahụ ewee ghọọrọ ha ọnyà.”—Ọma 106:35, 36.
• “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.”—Ekli. 9:5.
• “Ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.”—Jọn 17:16.
• “Oge gafere agafe ezuworo unu ịrụzu ihe ndị mba ọzọ na-achọ, mgbe unu jere ije n’omume rụrụ arụ, n’agụụ ihe ọjọọ, n’ịṅụ oké mmanya, n’oriri oké mkpọtụ, n’ịma aka n’ịṅụ mmanya, na n’ikpere arụsị jọgburu onwe ya.”—1 Pita 4:3.
26. Olee otú ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl mere ememme ncheta ọmụmụ ha ga-esi enyere gị aka ikpebi ma ị̀ ga-eme ememme ncheta ọmụmụ?
• “Ụbọchị nke atọ wee bụrụ ụbọchị ncheta ọmụmụ Fero, o wee meere ndị niile na-ejere ya ozi oriri ma kpọpụta onyeisi ndị obu ihe ọṅụṅụ, kpọpụtakwa onyeisi ndị na-eme achịcha n’etiti ndị na-ejere ya ozi. O wee nyeghachi onyeisi ndị obu ihe ọṅụṅụ ọrụ ya dị ka obu ihe ọṅụṅụ . . . Ma ọ kwụwara onyeisi ndị na-eme achịcha n’osisi.”—Jen. 40:20-22.
• “Ma mgbe a na-eme ememme ụbọchị ọmụmụ Herọd, ada Herodias gbara egwú n’ihu ndị ọbịa, wee mee Herọd obi ụtọ nke ukwuu nke na ọ ṅụrụ iyi wee kwe nkwa inye ya ihe ọ bụla ọ rịọrọ. Ya mere, ọ gbasoro ntụziaka nne ya wee sị: ‘Bunye m isi Jọn Onye Na-eme Baptizim n’efere dị mbadamba.’ O wee zipụ ozi ma mee ka e gbupụ Jọn isi n’ụlọ mkpọrọ.”—Mat. 14:6-8, 10.
27. Gịnị mere i kwesịrị iji na-erubere ndị okenye isi?
• “Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru ha, n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ; ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị ịsụ ude, n’ihi na nke a ga-emebiri unu ihe.”—Hib. 13:17.
28. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka gị na ndị ezinụlọ gị wepụta oge unu ga na-eji agụ Baịbụl, nakwa oge unu ga na-eji amụ Baịbụl?
• “Iwu Jehova na-atọ ya ụtọ, ọ na-agụkwa iwu ya n’olu dị ala ehihie na abalị. Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi, nke na-amị mkpụrụ ya n’oge ya, akwụkwọ ya adịghịkwa akpọnwụ akpọnwụ, ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.”—Ọma 1:2, 3.
29. Gịnị mere ịga ọmụmụ ihe na ịza ajụjụ ji atọ gị ụtọ?
• “M ga-akọsara ụmụnna m aha gị; M ga-anọ n’ime ọgbakọ too gị.”—Ọma 22:22.
• “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.”—Hib. 10:24, 25.
30. Olee ọrụ kacha mkpa Jizọs gwara anyị na-arụ?
• “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim . . . Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.”—Mat. 28:19, 20.
31. Olee ihe na-amasị Jehova mgbe anyị na-enye onyinye maka ozi ọma Alaeze anyị na-ekwusa nakwa iji nyere ụmụnna anyị aka?
• “Jiri ihe gị ndị dị oké ọnụ ahịa sọpụrụ Jehova.”—Ilu 3:9.
• “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.”—2 Kọr. 9:7.
32. Olee nsogbu ụfọdụ Ndị Kraịst na-atụ anya nwere ike ịbịara ha?
• “Obi ụtọ na-adịrị ndị a kpagbuworo n’ihi ezi omume, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, na-aghagide unu ụgha, na-ekwukwa ụdị ihe ọjọọ niile megide unu n’ihi m. Ṅụrịanụ ọṅụ, nweekwanụ obi ụtọ nke ukwuu, n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe; n’ihi na otú ahụ ka ha kpagburu ndị amụma bu unu ụzọ.”—Mat. 5:10-12.
33. Olee ihe mere mmadụ ime baptizim ma ghọọ Onyeàmà Jehova ji bụrụ ihe ùgwù pụrụ iche?
• “Okwu gị ruru m aka, m wee rie ya; okwu gị wee bụrụ ihe na-enye m ọṅụ na ihe na-eme ka obi tọọ m ụtọ; n’ihi na a kpọkwasịwo m aha gị, Jehova Chineke.”—Jere. 15:16.
-
-
Ihe Ikpeazụ Ndị Na-aga Ime Baptizim na Ndị Okenye Ga-atụleNdị A Haziri Ime Uche Jehova
-
-
AJỤJỤ A GA-AJỤ NDỊ CHỌRỌ IME BAPTIZIM
Ihe Ikpeazụ Ndị Na-aga Ime Baptizim na Ndị Okenye Ga-atụle
Ọ na-abụkarị ná mgbakọ Ndịàmà Jehova ka a na-anọ eme ndị mmadụ baptizim. Tupu onye na-ekwu okwu baptizim emechie okwu ya, ọ ga-agwa ndị a na-aga ime baptizim ka ha bilie ọtọ zaa ajụjụ abụọ a n’olu dara ụda:
1. Ì chegharịala ná mmehie gị, nyefee Jehova onwe gị, ma na-ebi ndụ gosiri na i kwetara na o si n’aka Jizọs Kraịst azọpụta anyi? (Gịnị ka ị zara?)
2. Ị̀ ghọtara na baptizim a ga-eme gị na-egosi na ị ghọọla Onyeàmà Jehova nọ ná nzukọ Jehova? (Gịnị ka ị zara?)
Ọ bụrụ na ndị a na-aga ime baptizim azaa ee n’ajụjụ abụọ a, ọ pụtara na ha emeela “nkwupụta ihu ọha” nakwa na ha nwere okwukwe n’àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. Ọ pụtakwara na ha enyefeela Jehova onwe ha kpamkpam. (Rom 10:9, 10) Ndị chọrọ ime baptizim kwesịrị ibu ụzọ chebara ajụjụ ndị a echiche ma kpee ekpere banyere ha ka ihe ha ga-aza bụrụ ihe ha ghọtara.
Ì nyefeela Jehova onwe gị n’ekpere, kwe ya nkwa na ọ bụ naanị ya ka ị ga-efe, nakwa na ị ga-eme ka ime uche ya bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị?
Obi ò siri gị ike ugbu a na e kwesịrị ime gị baptizim?
Olee ụdị uwe mmadụ kwesịrị iyi mee baptizim? (1 Tim. 2: 9, 10; Jọn 15:19; Fil. 1:10)
Anyị kwesịrị iji ejiji na-egosi na anyị ‘na-emeru ihe n’ókè’ nakwa na anyị “nwere uche zuru okè” iji gosi na anyị “na-asọpụrụ Chineke.” N’ihi ya, ndị a na-aga ime baptizim ekwesịghị iyi uwe na-ahụ ụzọ e ji egwu mmiri bịa ime baptizim. Ha ekwesịghịkwa ịdị nkịrịka n’anya ma ọ bụ yiri uwe e dere ihe ma ọ bụ nke e sere ihe na ya. Ha kwesịrị iyi uwe kwesịrị ekwesị.
Olee otú mmadụ kwesịrị isi mee omume mgbe a na-eme ya baptizim? (Luk 3:21, 22)
Baptizim e mere Jizọs na-akụziri Ndị Kraịst ihe taa. Ọ ghọtara na baptizim bụ ihe dị mkpa, o gosikwara ya n’ihe o mere mgbe a na-eme ya baptizim. N’ihi ya, ebe a na-eme baptizim ekwesịghị ịbụ ebe a ga-anọ na-eme ihe ọchị, ebe a ga-anọ na-egwu mmiri, ma ọ bụ ebe a ga-anọ eme ihe ndị ọzọ ga-eme ka o yie ka à bịara egwuregwu. Onye e mere baptizim ọhụrụ ekwesịghịkwa ịṅụrịbiga ọṅụ ókè ka à ga-asị na ọ bụ ebe okwu biri. Ọ bụ eziokwu na baptizim bụ ihe obi ụtọ, e kwesịrị inwe obi ụtọ ahụ otú kwesịrị ekwesị.
Olee otú ịgachi ọmụmụ ihe anya ga-esi nyere gị aka ịna-eme ihe ị gwara Jehova mgbe ị na-enyefe ya onwe gị?
E mechagodị gị baptizim, gịnị mere i kwesịrị iji nọgide na-amụchi ihe anya ma na-agachi ozi ọma anya?
-