-
Gịnị Bụ Alaeze Chineke?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
ISI NKE 31
Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
Ihe kacha gbaa ọkpụrụkpụ e kwuru okwu gbasara ya na Baịbụl bụ Alaeze Chineke. Jehova ga-eji Alaeze ahụ eme ihe niile o bu n’obi kee ụwa. Gịnị ka Alaeze ahụ bụ? Olee otú anyị si mara na ọ chịwala ugbu a? Gịnị na gịnị ka o merela? Gịnịkwa ka ọ ga-eme n’ọdịnihu? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a nakwa n’isiokwu abụọ na-eso ya.
1. Gịnị bụ Alaeze Chineke? Ònyekwa bụ Eze ya?
Alaeze ahụ bụ ọchịchị Jehova hiwere. Eze ya, bụ́ Jizọs Kraịst, nọ n’eluigwe na-achị. (Matiu 4:17; Jọn 18:36) Baịbụl kwuru gbasara Jizọs, sị: “Ọ ga-achị . . . ruo mgbe ebighị ebi.” (Luk 1:32, 33) Ọ ga-achị ndị niile bi n’ụwa n’ihi na ọ bụ ya bụ Eze Alaeze Chineke.
2. Ole ndị ga-eso Jizọs chịa?
Ọ bụghị naanị Jizọs ga na-achị n’Alaeze Chineke. Ya na ndị si ‘n’ebo niile, ndị na-asụ asụsụ niile, ndị agbụrụ niile nakwa ndị mba niile ga na-achị ụwa.’ (Mkpughe 5:9, 10) Ole ka ndị ga-eso Kraịst achị dị? Ọtụtụ nde mmadụ aghọọla ndị na-eso ụzọ Jizọs kemgbe ọ bịachara n’ụwa. Ma, ọ bụ naanị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-aga eluigwe ma soro Jizọs chịa n’Alaeze Chineke. (Gụọ Mkpughe 14:1-4.) Ndị Kraịst ndị ọzọ ga-ebi n’ụwa, Alaeze ahụ ana-achị ha.—Abụ Ọma 37:29.
3. Olee otú Alaeze Chineke si kara ọchịchị ụmụ mmadụ mma?
Ụfọdụ ndị ọchịchị na-agbalị ka ha rụọ ọrụ dị mma n’ọchịchị ha, ma, ike ha anaghị eru ịrụ ihe niile ha chọrọ ịrụ. Ka a na-eme ka a na-eme, ndị ọzọ anọchie ha. Ndị ahụ nọchiri ha nwere ike bụrụ ndị ọchịchị ọjọọ na-anaghị arụrụ ndị ha na-achị ọrụ. Ma, o nweghị onye ga-anọchi Eze Alaeze Chineke, bụ́ Jizọs. Chineke emeela “ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị.” (Daniel 2:44) Jizọs ga na-achị ụwa niile. Ọ gaghị na-emegbu ụfọdụ ndị, na-emenyere ndị ọzọ. Ọ hụrụ mmadụ niile n’anya, jiri obiọma na-emeso ha ihe. Ọ na-ekpekwa ikpe ziri ezi. Ọ ga-akụzikwara ụmụ mmadụ ka ha na-emeso ibe ha otú yanwa si emeso ha, ya bụ, ka ha hụ ibe ha n’anya, jiri obiọma na-emeso ha ihe ma na-ekpe ikpe ziri ezi.—Gụọ Aịzaya 11:9.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe mere Alaeze Chineke ji kara ọchịchị ụmụ mmadụ mma.
4. Alaeze Chineke ga-achị ụwa
O nweghị onye ọchịchị ike ya haruru ka nke Jizọs. Gụọnụ Matiu 28:18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ike Jizọs si kara ike mmadụ ọ bụla na-achị achị?
Ndị mmadụ na-agbanwekarị ndị na-achị ha. Onye ọchịchị nke ọ bụla na-enwekwa mpaghara ụwa ebe ọ na-achị. Olee maka Alaeze Chineke? Gụọnụ Daniel 7:14. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị mere o ji dị mma na ‘a gaghị ebibi’ Alaeze Chineke ebibi?
Gịnị mere o ji dị mma na ọ ga na-achị ụwa niile?
5. Alaeze Chineke ga-anọchirịrị ọchịchị ụmụ mmadụ
Olee ihe mere Alaeze Chineke ga-eji nọchie ọchịchị ụmụ mmadụ? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị ka ọchịchị ụmụ mmadụ kpataara anyị?
Gụọnụ Ekliziastis 8:9. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Ì chere na Alaeze Chineke kwesịrị ịnọchi ọchịchị ndị mmadụ? Maka gịnị?
6. Ndị ọchịchị Alaeze Chineke ma otú ihe si dịrị anyị
Eze anyị, bụ́ Jizọs, nwere mgbe o biri n’ụwa. N’ihi ya, ọ ga-aghọtali “na anyị adịghị ike.” (Ndị Hibru 4:15) Jehova si “n’ebo niile, n’asụsụ niile, n’agbụrụ niile nakwa na mba niile” họpụta ezigbo Ndị Kraịst dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-eso Jizọs chịa n’Alaeze ya.—Mkpughe 5:9.
Otú a ị matara na Jizọs na ndị ga-eso ya achị ma otú ihe si dịrị ụmụ mmadụ ọ̀ na-akasi gị obi? Maka gịnị?
Jehova na-ahọpụta ụdị ndị dị iche iche, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, ka ha na Jizọs chịa n’Alaeze ya
7. Iwu Chineke nyere ndị Alaeze ya ga-achị ka iwu ndị mmadụ na-enye ndị ha na-achị mma
Ndị ọchịchị na-eme iwu ndị kwesịrị ịbara ndị ha na-achị uru ma chebe ha. Alaeze Chineke nwekwara iwu ndị ọ na-achị kwesịrị ịna-edebe. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú i chere ụwa ga-adị ma mmadụ niile na-edebe iwu Chineke?a
Ì chere na Jehova kwesịrị ịgwa ndị Alaeze ya na-achị ka ha na-edebe iwu ndị o nyere ha? Maka gịnị?
Olee ihe gosiri na ndị na-anaghị edebe iwu ndị a nwere ike ịgbanwe?—Leruonụ anya n’amaokwu nke 11.
Ndị ọchịchị na-eme iwu ndị ga-echebe ndị ha na-achị ma baara ha uru. Alaeze Chineke nwere iwu ndị ka iwu ụmụ mmadụ mere mma. Iwu ndị ahụ ga-echebe ndị Alaeze ahụ ga-achị, baakwara ha uru
MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe bụ́ Alaeze Chineke.
Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?
NCHỊKỌTA
Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị n’eluigwe nke ga-achị ụwa niile.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Ole ndị ga-abụ ndị eze Alaeze Chineke?
Olee otú Alaeze Chineke si kara ọchịchị ụmụ mmadụ mma?
Gịnị na gịnị ka Jehova chọrọ n’aka ndị Alaeze ya ga-achị?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe Jizọs kwuru gbasara ebe Alaeze ahụ dị.
Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji akwado Alaeze Chineke kama ịkwado ọchịchị ụmụ mmadụ?
Chọpụta ihe Baịbụl kwuru gbasara otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị Jehova họpụtara ka ha na Jizọs chịa n’Alaeze ya.
Gịnị mere otu nwaanyị nọ mkpọrọ ji kweta na ọ bụ naanị Chineke ga-eme ka mmegbu ghara ịdị n’ụwa?
a Anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ n’ime iwu ndị ahụ ná Nkebi nke atọ n’akwụkwọ a.
-
-
Alaeze Chineke Na-achị Achị Ugbu ANa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
ISI NKE 32
Alaeze Chineke Na-achị Achị Ugbu A
Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914. Ọ bụkwa mgbe ahụ ka oge ọgwụgwụ nke ọchịchị ụmụ mmadụ malitere. Olee otú anyị si mara? Anyị ga-eleba anya n’amụma ndị dị na Baịbụl gbasara oge ọgwụgwụ, lebakwa anya n’ihe na-emegasị n’ụwa nakwa n’otú ụmụ mmadụ si akpa àgwà kemgbe afọ 1914.
1. Gịnị ka amụma dị na Baịbụl na-egosi?
Akwụkwọ Daniel na-egosi na Alaeze Chineke ga-amalite ịchị n’ọgwụgwụ nke oge Baịbụl kpọrọ “oge asaa.” (Daniel 4:16, 17) Ka ọtụtụ narị afọ gachara, Jizọs kpọrọ otu oge ahụ “oge ndị mba ọzọ,” kwuokwa na ọ gwụbeghị. (Luk 21:24) Dị ka anyị ga-ahụ, oge asaa ahụ gwụrụ n’afọ 1914.
2. Olee ihe ndị na-emegasị n’ụwa kemgbe afọ 1914? Oleekwa otú ndị mmadụ si akpa àgwà kemgbe ahụ?
Ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ga-abụ ihe àmà nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ oge a?’ (Matiu 24:3) Mgbe Jizọs na-aza ha ajụjụ a, o kwuru ọtụtụ ihe ga na-eme ma ya malitechaa ịchị n’Alaeze Chineke n’eluigwe. Ụfọdụ n’ime ha bụ agha, ụkọ nri, na ala ọma jijiji. (Gụọ Matiu 24:7.) Baịbụl kwukwara na otú ndị mmadụ ga-esi na-akpa àgwà ‘n’oge ikpeazụ’ ga-eme ka ibi ndụ ‘taa akpụ.’ (2 Timoti 3:1-5) Ihe ndị ahụ a ga-eji mara oge ikpeazụ na-eme aghara aghara kemgbe afọ 1914. Ndị mmadụ na-akpakwa àgwà ndị ahụ Baịbụl kwuru a ga-eji mara mgbe ikpeazụ kemgbe afọ 1914 karịa mgbe ọ bụla ọzọ.
3. Olee ihe mere ihe ji ka njọ kemgbe Alaeze Chineke malitere ịchị?
Obere oge Jizọs ghọchara Eze Alaeze Chineke, ọ lụsoro Setan na ndị mmụọ ọjọọ agha n’eluigwe. O meriri Setan n’agha ahụ. Baịbụl kwuru na “a chụdatara [Setan] na ndị mmụọ ozi ya” n’ụwa. (Mkpughe 12:9, 10, 12) Ezigbo iwe na-ewe Setan n’ihi na ọ ma na a ga-ebibi ya. Ọ bụ ya mere o ji mee ka ihe isi ike na ahụhụ jupụta ụwa. Ihe a ga-enyere anyị aka ịma ihe mere ụwa ji bụrụ chi bọọ, a nụ ọzọ. Ma, Alaeze Chineke ga-akwụsị nsogbu a niile.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta otú anyị si mara na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914. Chọpụtakwa otú anyị ga-esi gosi na anyị kwetara na Alaeze ahụ na-achị achị ugbu a.
4. Oge e ji amụma ndị dị na Baịbụl gụkọọ na-egosi na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914
Chineke mere ka Nebukadneza, eze Babịlọn, rọọ nrọ, ya egosi ya ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Nrọ ahụ na otú Daniel si kọwaa ya gosiri na ọ gbasara ma ọchịchị Nebukadneza ma Alaeze Chineke.—Gụọnụ Daniel 4:17.a
Gụọnụ Daniel 4:20-26. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
(A) Gịnị ka Nebukadneza hụrụ ná nrọ ya?—Leruonụ anya n’amaokwu nke 20 na nke 21.
(B) Gịnị ga-eme osisi ahụ?—Leruonụ anya n’amaokwu nke 23.
(CH) Gịnị ga-eme ma “oge asaa” ahụ gafechaa?—Leruonụ anya n’amaokwu nke 26.
Otú Nrọ ahụ Si Gbasa Alaeze Chineke
AMỤMA (Daniel 4:20-36)
Ọchịchị
(A) Nnukwu osisi
A kwụsịrị ọchịchị
(B) “Gbutuonụ osisi ahụ” ka “oge asaa” gafee
E weghachiri ọchịchị
(CH) “Ị ga-emecha chịwakwa n’alaeze gị”
Mgbe amụma a mezuru nke mbụ ya . . .
(D) Ònye ka osisi ahụ nọchiri anya ya?—Leruonụ anya n’amaokwu nke 22.
(E) Olee mgbe ọ kwụsịrị ịchị?—Gụọnụ Daniel 4:29-33.
(F) Gịnị mere Nebukadneza mgbe “oge asaa” ahụ gafechara?—Gụọnụ Daniel 4:34-36.
MMEZU NKE MBỤ
Ọchịchị
(D) Nebukadneza, Eze Babịlọn
A kwụsịrị ọchịchị
(E) Mgbe afọ 606 T.O.N.K. gachara, isi gbakara Nebukadneza. O nweghịkwa ike ịchị ruo mgbe afọ asaa zuru ezu gafere
E weghachiri ọchịchị
(F) Isi bịara dị Nebukadneza mma, ya amalitekwa ịchị ọzọ
Mgbe amụma a mezuru nke abụọ ya . . .
(G) Ònye ka osisi ahụ nọchiri anya ya?—Gụọnụ 1 Ihe E Mere 29:23.
(H) Olee mgbe a kwụsịrị ọchịchị ha? Olee otú anyị si mara na ha anaghị achị mgbe Jizọs nọ n’ụwa?—Gụọnụ Luk 21:24.
(I) Olee mgbe a maliteghachiri ọchịchị a? Oleekwa ebe a maliteghachiri ya?
MMEZU NKE ABỤỌ
Ọchịchị
(G) Ndị eze Izrel, ndị na-anọchi anya ọchịchị Chineke
A kwụsịrị ọchịchị
(H) Mbibi e bibiri Jeruselem mere ka a kwụsị ọchịchị ndị Izrel ruo puku afọ abụọ na narị ise na iri abụọ
E weghachiri ọchịchị
(I) Jizọs malitere ịchị n’Alaeze Chineke n’eluigwe
Oge asaa ahụ ọ̀ bụ afọ ole?
Amaokwu ụfọdụ dị na Baịbụl na-enyere anyị aka ịghọta amaokwu ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Mkpughe kwuru na oge atọ na ọkara bụ otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii. (Mkpughe 12:6, 14) E were abụọ mụbaa ụbọchị ole ahụ, ya abụrụ puku ụbọchị abụọ na narị ise na iri abụọ. Mgbe ụfọdụ na Baịbụl, otu ụbọchị na-anọchi anya otu afọ. (Ezikiel 4:6) Ọ bụ otú a ka a ga-esi ghọta oge asaa ahụ dị n’akwụkwọ Daniel. N’ihi ya, oge asaa ahụ na-anọchi anya puku afọ abụọ na narị ise na iri abụọ.
5. Ụwa agbanweela kemgbe afọ 1914
Jizọs buru amụma otú ụwa ga-adị ma ya ghọchaa Eze. Gụọnụ Luk 21:9-11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee nke ị na-ahụ ma ọ bụ nke ị na-anụ gbasara ya n’ime ihe a niile anyị gụpụtara na Baịbụl?
Pọl onyeozi kwuru otú ndị mmadụ ga-esi na-akpa àgwà n’oge ọgwụgwụ nke ọchịchị ụmụ mmadụ. Gụọnụ 2 Timoti 3:1-5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee àgwà nke ị na-ahụ ndị mmadụ na-akpa n’ime àgwà ndị a?
6. Gosi na i kwetara na Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a
Gụọnụ Matiu 24:3, 14. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee ọrụ dị mkpa a na-arụ n’ụwa nke na-egosi na Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a?
Olee otú ị ga-esi soro na-arụ ọrụ a?
Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a n’eluigwe, ọ fọkwara obere ka ọ malite ịchị ụwa. Gụọnụ Ndị Hibru 10:24, 25. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ime ka anyị “na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso”?
Ị mata ihe nwere ike inyere ndị ọzọ aka ma ọ bụ zọọ ha ndụ, gịnị ka ị ga-eme?
MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere Ndịàmà Jehova ji akpụkarị afọ 1914 n’ọnụ.
Gịnị ka ị ga-aza onye jụrụ gị ụdị ihe a?
NCHỊKỌTA
Amụma ndị dị na Baịbụl, oge e ji amụma ndị ahụ gụkọọ, na ihe ndị na-eme n’ụwa na-egosi na Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a. Otú anyị si egosi na anyị kwetara ihe a bụ ịna-agwa ndị ọzọ gbasara ya nakwa ịna-aga ọmụmụ ihe.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Gịnị mere mgbe oge asaa ahụ akwụkwọ Daniel kwuru gbasara ya gwụrụ?
Gịnị mere i ji kweta na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914?
Olee otú ị ga-esi gosi na i kwetara na Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme na ndị ọzọ kwuru gbasara otú ihe si agbanwe n’ụwa kemgbe afọ 1914.
“Mgbe Omume Ọma Bidoro Lawa n’Ike n’Ike” (Teta!, Eprel 2007)
Chọpụta otú amụma dị na Matiu 24:14 si gbanwee ndụ otu nwoke.
“E Nweghị Ihe Na-atọ M Ụtọ Ka Ịkụ Bezbọl.” (Ụlọ Nche Nke 3 2017)
Olee otú anyị si mara na amụma dị na Daniel isi anọ gbasara Alaeze Chineke?
“Olee Mgbe Alaeze Chineke Malitere Ịchị? (Agba nke Mbụ)” (Ụlọ Nche, Ọktoba 1, 2014)
Olee ihe na-egosi na “oge asaa” Daniel isi anọ kwuru okwu ya gwụrụ n’afọ 1914?
“Olee Mgbe Alaeze Chineke Malitere Ịchị? (Agba nke Abụọ)” (Ụlọ Nche, Nọvemba 1, 2014)
a Gụọ isiokwu Ụlọ Nche abụọ dị ná ngwụcha isiokwu a, n’ebe a kpọrọ Ihe Ị Ga-elebakwu Anya.
-
-
Ihe Alaeze Chineke Ga-emere AnyịNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
ISI NKE 33
Ihe Alaeze Chineke Ga-emere Anyị
Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka ọtụtụ ihe gbanwee n’ụwa. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere gị.
1. Olee otú Alaeze Chineke ga-esi mee ka udo dịrị n’ụwa, a na-ekpekwa ikpe ziri ezi na ya?
Jizọs bụ́ Eze Alaeze Chineke, ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ, bibiekwa ọchịchị ụmụ mmadụ n’agha Amagedọn. (Mkpughe 16:14, 16) N’oge ahụ, nkwa a dị na Baịbụl ga-emezuru n’isi. Baịbụl sịrị: “N’oge na-adịghị anya, ndị ajọ omume agaghịzi anọ.” (Abụ Ọma 37:10) Jizọs ga-eji Alaeze ahụ mee ka udo dịrị ebe niile n’ụwa, a na-ekpekwa ikpe ziri ezi.—Gụọ Aịzaya 11:4.
2. Olee otú ndụ ga-adị mgbe uche Chineke ga-eme n’ụwa?
Alaeze Chineke chịwa ụwa “ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Chegodị otú ụwa ga-adị mgbe ndị niile bi na ya bụ ndị ezi omume hụrụ ma Jehova ma mmadụ ibe ha n’anya. O nweghị onye ga-arịa ọrịa. Ha niile ga-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
3. Olee ihe Alaeze Chineke ga-emere anyị ma e bibicha ndị na-eme ihe ọjọọ?
E bibicha ndị na-eme ihe ọjọọ, Jizọs ga-achị otu puku afọ. N’oge ahụ, ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ndị ga-eso ya achị ga-eme ka ndị mmadụ zuo okè, gharakwa ịna-eme mmehie. Ná ngwụcha otu puku afọ ahụ, ụwa niile ga-abụ paradaịs mara ezigbo mma. Ndị niile bi na ya ga-enwe obi ụtọ n’ihi na ha na-erubere Jehova isi. Jizọs ga-enyeghachizi Nna ya, bụ́ Jehova, ọchịchị ka ọ chịrị gawa. N’oge ahụ, ‘a ga-edo aha Chineke nsọ’ otú a na-edotụbeghị ya na mbụ. (Matiu 6:9, 10) Ọ ga-edo ewu na ọkụkọ anya mgbe ahụ na Jehova bụ ezigbo onye ọchịchị, onye ihe gbasara ndị ọ na-achị na-emetụ n’obi. Jehova ga-ebibizi Setan, ndị mmụọ ọjọọ, na onye ọ bụla ọzọ na-enupụrụ ya isi. (Mkpughe 20:7-10) Ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere anyị ga-adịru mgbe ebighị ebi.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Chineke ga-eji Alaeze ya mezuo ihe niile o kwuru na Baịbụl na ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu.
4. Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ
Baịbụl kwuru na “mmadụ nọ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.” (Ekliziastis 8:9) Jehova ga-eji Alaeze ya mee ka ọchịchị nchịgbu a kwụsị.
Gụọnụ Daniel 2:44 na 2 Ndị Tesalonaịka 1:6-8. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ga-eme ndị ọchịchị na ndị niile na-akwado ha?
Olee otú ihe ị mụtarala gbasara Jehova na Jizọs si eme ka obi sie gị ike na ha agaghị emegbu onye ọ bụla?
5. O nweghị eze dị ka Jizọs
Jizọs, bụ́ Eze Alaeze Chineke, ga-emere ndị ọ ga na-achị n’ụwa ọtụtụ ihe ọma. Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ otú Jizọs sirila gosi na inyere ndị mmadụ aka na-agụ ya agụụ nakwa na Chineke nyere ya ikike inyere ha aka.
Ihe ndị Jizọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa gosiri anyị ihe ndị Alaeze Chineke ga-emere anyị. N’ihe ndị e depụtara ebe a Jizọs ga-emere anyị, olee ndị ị kacha atụ anya ịhụ mgbe ha ga-eme? Gụọnụ amaokwu Baịbụl ya na nkwa nke ọ bụla so ka unu mụtakwuo gbasara nkwa ahụ.
MGBE JIZỌS NỌ N’ỤWA, . . .
JIZỌS GA-ESI N’ELUIGWE . . .
ọ baara oké ifufe mba.—Mak 4:36-41.
mezie ihe niile ndị mmadụ mebirila n’ụwa.—Aịzaya 35:1, 2.
ọ rụrụ ọrụ ebube nye ọtụtụ puku mmadụ nri.—Matiu 14:17-21.
mee ka agụụ kwụsị n’ụwa.—Abụ Ọma 72:16.
ọ gwọrọ ọtụtụ ndị ọrịa ha na-arịa.—Luk 18:35-43.
hụ na e nweghịzi onye na-arịa ọrịa.—Aịzaya 33:24.
ọ kpọlitere ndị nwụrụ anwụ.—Luk 8:49-55.
kpọlite ndị nwụrụ anwụ, meekwa ka ọnwụ gharazie ịdị.—Mkpughe 21:3, 4.
6. Ihe Alaeze Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu magburu onwe ya
Alaeze Chineke ga-eme ka ọmarịcha ihe niile Jehova bu n’obi imere ụmụ mmadụ ruo ha aka. Ha ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi mgbe ọ ga-abụ paradaịs. Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ ihe ndị Jehova si n’aka Ọkpara ya na-eme iji mezuo ihe o bu n’obi.
Gụọnụ Abụ Ọma 145:16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú obi dị gị ịmara na Jehova ga-eji “ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ”?
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ọ bụrụ na anyị niile agbakọọ aka na anyị ga-akwụsịli nsogbu ndị dị n’ụwa.
Olee nsogbu ndị Alaeze Chineke ga-akwụsị, ndị ọchịchị ụmụ mmadụ na-agaghị akwụsịli?
NCHỊKỌTA
Alaeze Chineke ga-eme ihe Chineke chọrọ ka o mee. Ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, ndị ga-ebikwa na ya bụ ndị ga na-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Olee otú Alaeze Chineke ga-esi doo aha Chineke nsọ?
Olee ihe mere anyị ga-eji kwere na nkwa ndị dị na Baịbụl ga-emezu n’Alaeze Chineke?
N’ime ihe niile Alaeze Chineke ga-emere anyị, olee nke ị kacha atụ anya ya?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe Amagedọn bụ.
Chọpụta ihe ndị ga-eme n’oge Jizọs kpọrọ “oké mkpagbu.”—Matiu 24:21.
Chọpụta otú ezinụlọ nwere ike isi nọkọọ tụgharịa uche n’ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere ha n’ọdịnihu.
Gụọ isiokwu bụ́ “Ọtụtụ Ihe Nọ Na-enye M Nsogbu n’Obi” ka ị hụ otú otu onye na-enupụburu ọchịchị isi si chọta ihe ọ na-achọ.
“Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” (Ụlọ Nche, Jenụwarị 1, 2012)
-