Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w08 8/1 p. 5-6
  • Oge A Bụ Oge Dị Oké Egwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oge A Bụ Oge Dị Oké Egwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Ihe Na-egosi na Anyị Nọ n’Oge Ikpeazụ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dịla Nso?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ànyị Bi “n’Ụbọchị Ikpeazụ” n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
w08 8/1 p. 5-6

Oge A Bụ Oge Dị Oké Egwu

BAỊBỤL buru amụma na ụmụ mmadụ ga-ebi n’oge “dị oké egwu, nke tara akpụ.” Ọ kpọrọ oge a ‘oge ikpeazụ.’ (2 Timoti 3:1-5; 2 Pita 3:3-7) Jizọs Kraịst kwukwara banyere oge a mgbe ọ na-aza ajụjụ ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya banyere “ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Matiu 24:3) Ànyị bi ugbu a n’oge ikpeazụ ahụ? Were amụma Baịbụl buru tụnyere ihe ndị mere n’oge na-adịbeghị anya bụ́ ndị e dere n’ebe a, mgbe ahụ, jirizie aka gị kpebie.

Baịbụl buru amụma na a ga-enwe agha n’ebe niile n’ụwa—Luk 21:10; Mkpughe 6:4.

Akụkọ ndị e nwetara na nso nso a kwuru, sị: “Ndị nwụrụ n’agha n’ime otu narị afọ gara aga ji ihe gafere okpukpu atọ karịa ndị niile nwụrụ n’agha kemgbe otu puku afọ na narị itoolu, malite n’oge a mụrụ Kraịst.”—Worldwatch Institute.

Baịbụl buru amụma na a ga-enwe ụkọ nri na ọrịa—Luk 21:11; Mkpughe 6:5–8.

Akụkọ ndị e nwetara na nso nso a kwuru, sị: N’afọ 2004, ihe dị ka narị nde mmadụ asatọ, nde iri isii na nde atọ nọ n’ụwa anaghị eri ezigbo nri. Ọnụ ọgụgụ a ji nde mmadụ asaa karịa otú ọ dị n’afọ 2003.—Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Nri na Ọrụ Ugbo.

Ihe dị ka otu ijeri mmadụ bi n’ebe ndị e nwere mkpọmkpọ ụlọ; ihe gafere ijeri mmadụ abụọ na ọkara bi n’ebe ndị ruru unyi; ihe gafere otu ijeri mmadụ enweghị ezigbo mmiri ọṅụṅụ.—Worldwatch Institute.

Narị nde mmadụ ise na-arịa ịba; nde mmadụ iri anọ bu nje ọrịa o biri n’ájá ọcha, ebe ụfọdụ n’ime ha na-arịa ọrịa o biri n’ájá ọcha; ụkwara nta gburu ihe karịrị otu nde mmadụ na ọkara n’afọ 2005.—Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike.

Baịbụl buru amụma banyere: mbibi a na-ebibi ụwa—Mkpughe 11:18.

Akụkọ ndị e nwetara na nso nso a kwuru, sị: “Ihe ụmụ mmadụ na-eme n’ụwa nwere ike ime ka a ghara inwe ụdị anụmanụ dị iche iche na osisi dị iche iche n’ụwa.” “Ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na n’ụwa dum ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ihe ụwa na-arụrụ ụmụ mmadụ akwụsịla.”—Millennium Ecosystem Assesment.

“Ikuku ọjọọ ndị na-esi n’ihe ụmụ mmadụ na-emepụta apụta bụ́ ndị na-eme ka ụwa kporo ọkụ emebiela ikuku dị n’ụwa nke ukwuu. O nwekwara ike ịkpatara ụwa anyị a ọdachi.”—NASA, Goddard Institute for Space Studies.

Baịbụl buru amụma banyere: ozi ọma a ga-ekwusa n’ụwa dum—Matiu 24:14; Mkpughe 14:6, 7.

Akụkọ e nwetara na nso nso a kwuru, sị: N’afọ 2007, nde Ndịàmà Jehova isii na narị puku itoolu na puku iri ise na asaa na narị asatọ na iri ise na anọ ji ihe fọrọ ntakịrị ka o ruo otu ijeri awa na ọkara kwusaa ozi ọma banyere Alaeze Chineke, na narị ala abụọ na iri atọ na isii.—2008 Yearbook of Jehovah’s Witnesses.

Dị ka e kwuru na mbụ, Baịbụl buru amụma na n’agbanyeghị akụkọ ọjọọ niile a na-anụ, na o nwere ihe mere anyị ga-eji nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Jizọs kwuru banyere “ozi ọma” nke Alaeze Chineke. Gịnị bụ Alaeze Chineke? Olee otú ọ ga-esi mee ka ụmụ mmadụ nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu? Olee otú Alaeze Chineke ga-esi metụta gị?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Baịbụl buru amụma banyere ihe ndị anyị na-ahụ na-eme n’ụwa taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya