Igbe Ajụjụ
◼ Ò kwesịrị ekwesị ka ọgbakọ ma ọ bụ onye ọ bụla tinye akara ndị e ji mara ihe Ndịàmà Jehova nwe n’elu akwụkwọ ozi ha ma ọ bụ n’ihe ọ bụla ha nwe?
Akara bụ aha, ihe osise, ma ọ bụ ihe nnọchianya na-eme ka ọ dị mfe ịmata ndị ọ bụ ha kpọmkwem nwe ihe e mepụtara. Akara Watch Tower bụ ihe na-anọchi anya Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania na ụlọ ọrụ ndị ọzọ nzukọ a ji arụ ọrụ. A na-ese Baịbụl a saghere asaghe n’elu akwụkwọ ozi ọ bụla si n’aka Christian Congregation of Jehovah’s Witnesses ka ọ bụrụ ihe e ji mara ha. Ụlọ ọrụ ndị ọzọ Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ nwekwara akara dị iche iche e ji mara ha.
Ọgbakọ ma ọ bụ onye ọ bụla ekwesịghị itinye akara ndị e ji mara ụlọ ọrụ ndị nzukọ a ji arụ ọrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, na saịn bọọdụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, n’elu akwụkwọ ozi ha, n’ihe ndị ha nwe, nakwa n’ihe ndị ọzọ. Ime nke a nwere ike ịgbagwoju ndị ọrụ gọọmenti, ndị nkwusa ọgbakọ, na ndị ọzọ anya, n’ihi na ha ga na-eche ma ò nwere ihe ọ bụla jikọrọ ụlọ ọrụ ndị nzukọ a ji arụ ọrụ na onye ahụ ma ọ bụ ọgbakọ ahụ. Ihe ọzọ bụ na o nwere ike ime ka onye e detaara akwụkwọ ozi chee na akwụkwọ ozi ahụ si n’isi ụlọ ọrụ anyị ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị.
E kwesịghị itinye akara Watch Tower ma ọ bụ akara ndị ọzọ nzukọ a nwere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a ga-arụ n’ọdịnihu ya bụrụgodị na ọ bụ Watch Tower nwe Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Achọghị ka ọgbakọ ndị Ụlọ Nzukọ Alaeze ha bu akara Watch Tower malite ozugbo wepụwa ha n’ihi na nke a nwere ike ịchọ ka a rụgharịwa ọtụtụ ihe, bụ́kwa nke ga-ewe ọtụtụ oge, nnukwu ọrụ, ma ọ bụkwanụ fuo oké ego. Ma, e nwere ike iwepụ akara ndị ahụ ma ọ bụrụ na ọ gaghị esi ike ime ya, nakwa ma ọ bụrụ na ọ gaghị ewe oké ego na nnukwu oge. Ọ bụrụ na nnukwu ọrụ dị n’ịrụzigharị ya, unu nwere ike ịhapụ ya ruo mgbe unu rụzigharịwara Ụlọ Nzukọ Alaeze unu ma ọ bụ saịn bọọdụ unu.