Gịnị Mere Anyị Ga-eji “Na-anụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ”?
Ị̀ na-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ? Onye nkwusa ọ bụla kwesịrị ime otú ahụ. N’ihi gịnị? Ka anyị leba anya n’ihe Taịtọs 2:11-14 kwuru.
Amaokwu nke 11: Gịnị bụ “obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ”? Olee otú o sirila baara anyị uru?—Rom 3:23, 24.
Amaokwu nke 12: Gịnị ka obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ na-enyere anyị aka ime?
Amaokwu nke 13 na nke 14: Ebe ọ bụ na a sachaala anyị, olee olileanya anyị nwere? Oleekwa ezigbo ihe mere e ji sachapụ anyị àgwà ọjọọ n’ahụ́?
Olee otú amaokwu ndị a ga-esi mee ka ị na-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ?