Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 9
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 9
Abụ nke 9 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 20 ¶1-7 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Ikpe 11-14 (Nkeji 8)
Nke 1: Ndị Ikpe 13:15-25 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Lidia, Geyọs na Faịlimọn Banyere Ile Ọbịa? (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Baịbụl Kwuru Ọ̀ Dabara n’Ihe Ndị Sayensị Chọpụtara?—igw p. 7 ¶1-3 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Na-anụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ”—Taị. 2:14.
Nkeji 15: “Gịnị Mere Anyị Ga-eji ‘Na-anụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ’?” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kwuokwa ihe dị n’Ụlọ Nche Jun 1, 2002, peeji nke 23, paragraf nke 17-19.
Nkeji 15: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Iji Telefon Ezi Ozi Ọma.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ụmụnna ka ha kọọ otú ndị mmadụ si gee ha ntị mgbe ha ji telefon zie ha ozi ọma. A ga-eji nkeji ole na ole mee ihe ngosi otú e nwere ike isi mee ihe e kwuru n’isiokwu a. Ọ bụrụ na a naghị ejikarị telefon ezi ozi ọma n’ókèala unu, jụọ ụmụnna ajụjụ ndị a iji dochie ihe a gaara amụ n’ihe omume a: (1) Olee ihe ndị nwere ike ime ka izi ozi ọma na-esiri anyị ike ma ọ bụ mee ka anyị daa mbà n’ịrụ ezi ọrụ? (2) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ndị ahụ mee ka anyị ghara iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ọma? (Rom 10:14) (3) Olee otú ibu ụzọ kwadebe ihe anyị ga-agwa ndị mmadụ n’ozi ọma ga-esi mee ka anyị na-anụ ọkụ n’obi? (2 Tim. 2:15) (4) Olee uru dị n’ichebara ihe anyị chọrọ ịgwa mmadụ echiche nakwa ịma oge kacha mma ikwu ya? (Ilu 25:11, 15) A ga-eji nkeji ole na ole mee ihe ngosi otú e nwere ike isi zie ndị mmadụ ozi ọma n’agbanyeghị ihe ha na-ekwukarị iji gbochie anyị izi ha ozi ọma.
Abụ nke 33 na Ekpere