ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 21
ABỤ NKE 21 Buru Ụzọ Na-achọ Alaeze Chineke
Na-achọ Obodo nke Na-adịgide Adịgide
“Anyị na-echeresi [obodo] na-abịa abịa ike.”—HIB. 13:14.
IHE A GA-AMỤ
Otú ihe e kwuru ná Ndị Hibru isi 13 ga-esi baara anyị uru taa nakwa n’ọdịnihu.
1. Gịnị ka Jizọs kwuru ga-eme Jeruselem n’oge ndịozi?
ỤBỌCHỊ ole na ole tupu Jizọs anwụọ, o buuru ndị na-eso ụzọ ya amụma. Amụma ahụ mezuru nke mbụ ya mgbe e bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ ya. O kwuru na otu ụbọchị, ‘ìgwè ndị agha ga-agba Jeruselem gburugburu.’ (Luk 21:20) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ha hụ ndị agha ndị ahụ, ha kwesịrị ịgbapụ na Judia ozugbo. Ihe a o kwuru mezuru. Ndị agha Rom mechara gbaa Jeruselem gburugburu.—Luk 21:21, 22.
2. Gịnị ka Pọl onyeozi chetaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru bi na Judia na Jeruselem?
2 Afọ ole na ole tupu ndị agha Rom agbaa Jeruselem gburugburu, Pọl onyeozi dere akwụkwọ ozi bara ezigbo uru. Ihe a na-akpọ ya ugbu a bụ akwụkwọ Ndị Hibru. N’akwụkwọ ozi ahụ, o nyere Ndị Kraịst nọ na Judia na Jeruselem ndụmọdụ ga-enyere ha aka ijikere maka ihe ga-eme n’oge na-adịghị anya. Gịnị ga-eme n’oge na-adịghị anya? A ga-ebibi Jeruselem. Ọ bụrụ na Ndị Kraịst ndị ahụ chọrọ ịlanahụ, ha kwesịrị ịdị njikere ịhapụ ụlọ ha na ihe ha ji akpata ego. N’ihi ya, Pọl dere gbasara Jeruselem, sị: “Anyị enweghị obodo nke na-adịgide adịgide n’ebe a.” Ọ sịkwara: “Kama anyị na-echeresi nke na-abịa abịa ike.”—Hib. 13:14.
3. Gịnị bụ “obodo nwere ezigbo ntọala,” gịnịkwa mere anyị ji na-echeresi ya ike?
3 Ọ ga-abụ na a kwara Ndị Kraịst kpebiri ịhapụ Jeruselem na Judia emo ma katọọ ha. Mana mkpebi ahụ ha mere chebere ha. Taa, a na-akwa anyị emo n’ihi na anyị atụkwasịghị ndị mmadụ obi ma ọ bụ were ịchụ akụnụba ka ihe kacha mkpa. Ma, gịnị mere anyị ji mee mkpebi a? Anyị ma na ụwa ochie a agaghị adịgide. Anyị na-achọ “obodo nwere ezigbo ntọala,” ya bụ, “nke na-abịa abịa,” nke bụ́ Alaeze Chineke.a (Hib. 11:10; Mat. 6:33) N’isiokwu nta nke ọ bụla dị n’isiokwu a, anyị ga-eleba anya (1) n’otú akwụkwọ ozi Pọl si n’ike mmụọ nsọ dee si nyere Ndị Kraịst n’oge ndịozi aka ‘icheresi obodo ahụ na-abịa abịa ike,’ (2) n’otú Pọl si kwadebe ha maka ihe ndị ga-eme n’oge na-adịghị anya, nakwa (3) n’otú ndụmọdụ ya ga-esi baara anyị uru taa.
TỤKWASỊ JEHOVA OBI MAKA NA O MEKATAGHỊ GBAKỤTA GỊ AZỤ
4. Gịnị mere Ndị Kraịst ji were Jeruselem ka ebe dị mkpa?
4 Ndị Kraịst weere Jeruselem ka ebe dị mkpa. Ọ bụ n’obodo ahụ ka e hiwere ọgbakọ Ndị Kraịst mbụ n’afọ 33. Ụmụnna so n’òtù na-achị isi bikwa n’ebe ahụ. Ihe ọzọ bụ na Ndị Kraịst nwere ụlọ, kpatakwa akụ̀ n’obodo ahụ. Ma Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ọ ga-adị mkpa ka ha si na Jeruselem nakwa na Judia gbapụ.—Mat. 24:16.
5. Olee otú Pọl si kwadebe Ndị Kraịst maka ihe na-aga ime?
5 Iji kwadebe Ndị Kraịst maka ihe na-aga ime, Pọl nyeere ha aka iche banyere otú Jehova si were Jeruselem. Pọl chetaara ha na n’anya Jehova, ụlọ nsọ, ndị nchụàjà, na àjà niile a na-achụ na Jeruselem adịghịzi nsọ. (Hib. 8:13) Ọtụtụ ndị bi na Jeruselem ajụla Mezaya. Ọ dịghịzi mkpa ka ndị mmadụ na-aga Jeruselem ịga fee Jehova, kama a ga-ebibi Jeruselem na ụlọ nsọ ya.—Luk 13:34, 35.
6. Gịnị mere ndụmọdụ Pọl nyere Ndị Kraịst ná Ndị Hibru 13:5, 6 ji daba adaba?
6 Mgbe Pọl degaara ndị Hibru akwụkwọ ozi, Jeruselem bụ obodo na-akpọtụ akpọtụ. Otu onye Rom na-ede akwụkwọ n’oge ahụ kpọrọ Jeruselem “obodo a kacha mara amara gburugburu ebe ahụ.” Ndị Juu na-esi ná mba dị iche iche abịa Jeruselem kwa afọ ime ememme dị iche iche. Ha na-emefukwa ego buru ibu n’obodo ahụ. O doro anya na ihe a mere ka ụfọdụ Ndị Kraịst si na ya na-enweta ezigbo ego. O nwere ike ịbụ ya mere Pọl ji gwa ha, sị: “Ka otú unu si ebi ndụ gosi na unu ahụghị ego n’anya, kama ka ihe ndị dị ugbu a ju unu afọ.” Ọ gwaziri ha ihe na-emesi obi ike e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ, ebe Jehova sịrị: “E nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị, e nweghịkwa ihe ga-eme ka m gbakụta gị azụ.” (Gụọ Ndị Hibru 13:5, 6; Diut. 31:6; Ọma 118:6) Ọ ga-emecha dị mkpa ka e chetara Ndị Kraịst bi na Jeruselem nakwa na Judia nkwa a Jehova kwere. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na obere oge Pọl degachaara ha akwụkwọ ozi ahụ, ha ga-ahapụ ụlọ ha, ihe ha ji akpata ego, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha nwere si na Jeruselem gbapụ. Ha ga-ebidozi ụwa n’isi n’ebe ọ bụla ha ga-agbaga, nke na-agaghịkwanụ adị mfe.
7. Gịnị mere anyị ji kwesị ịtụkwasịkwu Jehova obi ugbu a?
7 Ihe anyị na-amụta: Olee ihe ga-eme n’oge na-adịghị anya? Ọ bụ mbibi a ga-ebibi ụwa ochie a ‘n’oké mkpagbu.’ (Mat. 24:21) Dị ka Ndị Kraịst n’oge ndịozi, anyị kwesịrị ịmụrụ anya ma na-eche nche. (Luk 21:34-36) N’oge oké mkpagbu, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị hapụ ihe ụfọdụ ma ọ bụ ihe niile anyị nwere, tụkwasị Jehova obi anyị niile na ọ gaghị ahapụ anyị. Ugbu a, tupudị oké mkpagbu amalite, anyị nwere ohere igosi ihe ma ọ bụ onye anyị tụkwasịrị obi. Jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe ndị m na-eme na ihe ndị m na-achụ hà na-egosi na m tụkwasịrị Chineke obi ka o lekọta m, ọ bụghị ego?’ (1 Tim. 6:17) Ọ bụ eziokwu na e nwere ihe anyị ga-amụta n’ihe mere n’oge ndịozi, ma “oké mkpagbu” na-abịanụ ga-abụ nke a na-enwetụbeghị ụdị ya. N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi mara ihe anyị ga-eme ma oké mkpagbu ahụ malite?
NA-ERUBERE NDỊ NA-EDUZI ANYỊ ISI
8. Gịnị ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee?
8 Afọ ole na ole Pọl degachaara ndị Hibru akwụkwọ ozi ahụ, Ndị Kraịst hụrụ ka ndị agha Rom gbara Jeruselem gburugburu. Ọ pụtara na oge eruola ka ha gbapụ. A ga-ebibi Jeruselem n’oge na-adịghị anya. (Mat. 24:3; Luk 21:20, 24) Ma, olee ebe ha ga-agbaga? Naanị ihe Jizọs gwara ha bụ: “Ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu.” (Luk 21:21) E nwere ọtụtụ ugwu n’ebe ndị dị ha nso. N’ihi ya, ebee ka ha ga-agbaga?
9. Gịnị nwere ike ime ka Ndị Kraịst chewe ugwu ha ga-agbaga? (Kọwaakwa map.)
9 Chegodị gbasara ugwu Ndị Kraịst nwere ike ịgbaga, ya bụ, ugwu ndị dị na Sameria, ugwu ndị dị na Galili, Ugwu Hemọn na ugwu ndị dị na Lebanọn, nakwa ugwu ndị dị n’ofe Jọdan. (Lee map.) Ụfọdụ obodo ndị dị n’ebe ugwu ndị ahụ dị nwere ike iyi ka o nweghị ihe ga-eme onye gbabara na ha. Dị ka ihe atụ, obodo Gamla dị n’elu nnukwu ugwu. Ọ ga-esikwa ezigbo ike iru ebe ahụ. Ụfọdụ ndị Juu weere obodo ahụ ka ebe mmadụ ga-agbaga e nweghị ihe ga-eme ya. Ma, Gamla mechara bụrụ ebe ndị Juu na ndị Rom nọ lụọ ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ndị Rom gbukwara ọtụtụ ndị bi na ya.b
E nwere ọtụtụ ugwu Ndị Kraịst n’oge ndịozi nwere ike ịgbaga, mana ọ bụghị na ha niile ka ha ga-agbaga aka aghara ịkpa ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)
10-11. (a) Olee otú ọ ga-abụ na Jehova si duzie Ndị Kraịst n’oge ndịozi? (Ndị Hibru 13:7, 17) (b) Olee uru Ndị Kraịst ritere mgbe ha rubeere ndị na-eduzi ha isi? (Kọwaakwa foto.)
10 O yiri ka Jehova ò ji ndị na-eduzi ọgbakọ ya duzie Ndị Kraịst ịma ihe ha ga-eme. Otu nwoke na-akọ ihe mere n’oge ochie aha ya bụ Yusebiọs mechara dee banyere oge ahụ. Ọ sịrị na Chineke mere ka ụfọdụ ụmụnna nọ na Jeruselem mata na Ndị Kraịst kwesịrị ịhapụ Jeruselem gbaga Pela bụ́ obodo dị na Peria. Obodo Pela bụ ebe magburu onwe ya Ndị Kraịst kwesịrị ịgbaga. Ọ dịghị anya ma e si Jeruselem gawa ya. N’ihi ya, ịgbaga ebe ahụ esirighị ha oké ike. Ihe ọzọ bụ na ọtụtụ ndị nọ na Pela abụghị ndị Juu. N’ihi ya, ha anọghị na-agba mbọ ịlụso ndị Rom ọgụ.—Lee map.
11 Ndị Kraịst gbagara n’ugwu mere ihe Pọl gwara ha, nke bụ́ ka ha ‘na-erubere ndị na-eduzi’ ọgbakọ isi. (Gụọ Ndị Hibru 13:7, 17.) N’ihi ya, ndị Chineke lanahụrụ. Ebe ọ bụ na ha tụkwasịrị Alaeze Chineke obi, nke bụ́ “obodo nwere ezigbo ntọala,” Jehova ahapụghị ha.—Hib. 11:10.
E nweghị ihe mere Ndị Kraịst gbagara Pela dị ha nso (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11)
12-13. Olee otú Jehova si duzie ndị ya n’oge ihe siri ike?
12 Ihe anyị na-amụta: Jehova na-eji ndị o ji eduzi ndị ya enye ntụziaka doro anya. Baịbụl gwara anyị banyere ọtụtụ oge Jehova mere ka e nwee ndị ọzụzụ atụrụ ga-eduzi ndị ya mgbe ihe siri ike. (Diut. 31:23; Ọma 77:20) N’oge anyị a kwa, anyị ahụla ọtụtụ ihe gosiri na Jehova ka na-eji ndị na-eduzi ndị ya enye anyị ntụziaka.
13 Dị ka ihe atụ, mgbe ọrịa koronavaịrọs malitere, ‘ndị na-eduzi anyị’ nyere anyị ntụziaka. Ndị okenye nwetara ndụmọdụ gbasara otú ọgbakọ ga-esi na-enwe ọmụmụ ihe ma na-efe Jehova. Obere oge ọrịa koronavaịrọs malitechara, anyị nwere mgbakọ a na-agaghị echefu echefu n’ihe karịrị narị asụsụ ise (500). Ụmụnna anyị si n’Ịntanet ma ọ bụ na tiivi lee ihe omume ahụ ma ọ bụkwanụ si na redio gere ya. A kwụsịghị inye ụmụnna anyị nri si n’Okwu Chineke. O mere ka anyị na-adị n’otu. Ka obi sie anyị ike na n’agbanyeghị ihe ọ bụla nwere ike ime n’ọdịnihu, Jehova ga na-enyere ndị o ji na-eduzi ndị ya aka ikpebi ihe kacha mma ndị ya ga-eme. E wezụga ịtụkwasị Jehova obi na irubere iwu ya isi, olee àgwà ndị ọzọ ga-enyere anyị aka ịkwadebe maka oké mkpagbu nakwa ịna-eme ihe gosiri na anyị ma ihe ma oké mkpagbu bido?
HỤ ỤMỤNNA GỊ N’ANYA KA ỤMỤNNE GỊ, NA-ELEKWA HA ỌBỊA
14. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 13:1-3, olee àgwà ọ dị mkpa ka Ndị Kraịst gosi afọ ole na ole tupu e bibie Jeruselem na ụlọ nsọ ya?
14 Oké mkpagbu malite, ọ ga-adị mkpa ka anyị gosi ibe anyị na anyị hụrụ ha n’anya otú anyị na-emetụbeghị. Ọ ga-adị mkpa ka anyị mee ihe Ndị Kraịst nọ na Jeruselem na Judia mere. Ha na-egosi ibe ha ịhụnanya. (Hib. 10:32-34) Afọ ole na ole tupu e bibie Jeruselem, ha kwesịrị ‘ịna-ahụ ibe ha n’anya ka ụmụnne’ na ‘ịna-ele ọbịa’ karịa otú ha na-eme.c (Gụọ Ndị Hibru 13:1-3.) Anyịnwa kwesịkwara ịna-eme otú ahụ ka oké mkpagbu ji ọsọ na-abịa.
15. Gịnị mere ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst ji kwesị ịhụ ụmụnna ha n’anya ka ụmụnne ma na-ele ibe ha ọbịa mgbe ha gbapụrụ na Jeruselem?
15 Mgbe ndị agha Rom gbara Jeruselem gburugburu ma mechaa hapụ ebe ahụ na mberede, Ndị Kraịst weere ihe ole na ole si na ya gbapụ. (Mat. 24:17, 18) Ọ pụtara na ha ga na-enyere ibe ha aka ka ha nọ n’ụzọ na-agbaga n’ugwu. Ha ruokwa Pela, ha ga na-enyere ibe ha aka ka ha nwee ike ịchọta ebe ha ga-ebi na ihe ha ga na-arụ. O doro anya na a ga-enwe ọtụtụ “ndị nọ n’ezigbo mkpa.” Ọtụtụ Ndị Kraịst ndị ahụ ga-eji ohere ahụ gosi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya ma na-ele ibe ha ọbịa n’eziokwu. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-enyere ibe ha aka na ịna-enye ibe ha ihe.—Taị. 3:14.
16. Olee otú anyị ga-esi gosi ụmụnna anyị ihe na-esiri ike na anyị hụrụ ha n’anya? (Kọwaakwa foto.)
16 Ihe anyị na-amụta: Anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya. N’ihi ya, anyị na-enyere ha aka mgbe ihe siiri ha ike. E nweela ụfọdụ ụmụnna anyị gbara ọsọ ndụ n’ihi agha ma ọ bụ ọdachi ndị na-emere onwe ha. Ọtụtụ ụmụnna anyị ji obi ụtọ nye ụmụnna ndị a gbatara ọsọ ndụ ihe ndị dị ha mkpa, jirikwa Okwu Chineke gbaa ha ume ịnọsi ike n’ofufe Jehova. Otu nwanna nwaanyị bụ́ onye Yukren hapụrụ ụlọ ya n’ihi agha. Ọ sịrị: “Anyị ahụla otú Jehova si jiri ụmụnna anyị na-eduzi anyị ma na-elekọta anyị. Ha ji obiọma nabata anyị ma nyere anyị aka na Yukren, Họngarị, nakwa na Jamanị ebe a.” Anyị na Jehova na-arụkọ ọrụ ma anyị na-ele ụmụnna anyị ọbịa ma na-egboro ha mkpa ha.—Ilu 19:17; 2 Kọr. 1:3, 4.
Anyị kwesịrị inyere Ndị Kraịst gbatara ọsọ ndụ aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)
17. Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị na-ahụ ụmụnna anyị n’anya ka ụmụnne ma na-elekwa ha ọbịa ugbu a?
17 O doro anya na anyị kwesịrị inyere ibe anyị aka n’ọdịnihu karịa otú anyị na-eme ugbu a. (Hab. 3:16-18) Jehova na-azụ anyị ugbu a ka anyị mụta ịhụ ụmụnna anyị n’anya ka ụmụnne nakwa ka anyị na-ele ha ọbịa. Àgwà ndị a ga-aba ezigbo uru n’oge ahụ.
GỊNỊ GA-EME N’ỌDỊNIHU?
18. Olee otú anyị ga-esi mee ka Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru n’oge ndịozi?
18 Ndị Kraịst ndị rubere isi ma gbaga n’ugwu anwụghị mgbe e bibiri Jeruselem. Ha hapụrụ obodo ahụ. Ma, Jehova ahapụghị ha. Anyịnwa kwanụ? Anyị amaghị kpọmkwem otú ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu ga-esi eme. Ma, Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị dịrị njikere irube isi. (Luk 12:40) Anyị kwesịkwara ịna-atụgharị uche na ndụmọdụ Pọl onyeozi degaara ndị Hibru n’akwụkwọ ozi ya ma mee ihe ọ gwara ha. Anyị kwesịkwara ịna-echeta nkwa Jehova kwere na ọ gaghị ahapụ anyị ma ọ bụ gbakụta anyị azụ. (Hib. 13:5, 6) Ka anyị na-echeresi obodo nke na-adịgide adịgide ike, nke bụ́ Alaeze Chineke, ma nweta ngọzi ga-adịru mgbe ebighị ebi ọ ga-ewetara anyị.—Mat. 25:34.
ABỤ NKE 157 Udo Ga-emecha Dị
a N’oge e dere Baịbụl, ọtụtụ mgbe, ọ bụ eze na-achị obodo. E nwere ike iwere ụdị obodo ahụ ka alaeze.—Jen. 14:2.
b Ihe a mere n’afọ 67 Oge Ndị Kraịst, n’oge na-adịghị anya Ndị Kraịst si na Judia na Jeruselem gbapụ.
c Okwu a sụgharịrị ‘ịhụ ibe anyị n’anya ka ụmụnne’ nwere ike ịpụta ụdị ịhụnanya anyị na-ahụ ndị ezinụlọ anyị. Ma Pọl ji ya kọwaa ezigbo ịhụnanya ndị nọ n’ọgbakọ kwesịrị ịhụ ibe ha.