1 Ihe E Mere
23 Devid emewo agadi,+ ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ, o wee mee Sọlọmọn+ nwa ya eze Izrel. 2 O wee kpọkọta ndị isi niile+ nke Izrel na ndị nchụàjà+ na ndị Livaị.+ 3 E wee gụọ ndị Livaị ọnụ malite ná ndị gbara afọ iri atọ gbagowe;+ ọnụ ọgụgụ ndị ikom niile, n’otu n’otu, dị puku iri atọ na asatọ. 4 N’ime ndị a, ndị ga-arụ ọrụ dị ka ndị nlekọta nke ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova dị puku iri abụọ na puku anọ; ndị ga-arụkwa ọrụ dị ka ndị isi+ na ndị ikpe+ dị puku mmadụ isii; 5 tinyere puku mmadụ anọ ndị ga-abụ ndị nche ọnụ ụzọ ámá+ na puku mmadụ anọ ndị na-eji ngwá egwú enye Jehova otuto,+ bụ́ ngwá egwú+ Devid kwuru banyere ha, sị, “Emere m ha maka iji ha na-enye otuto.”
6 Devid wee kee ha n’ìgwè n’ìgwè+ kenye ụmụ Livaị,+ bụ́ Geshọn, Kohat na Meraraị. 7 O kenyere ụmụ Geshọn Ledan na Shimiaị. 8 Ụmụ Ledan bụ Jehayel+ bụ́ onyeisi nakwa Zitam na Joel,+ mmadụ atọ. 9 Ụmụ Shimiaị bụ Shelomọt na Heziel na Heran, mmadụ atọ. Ọ bụ ndị a bụ ndị isi nke ndị bụ́ nna ụlọ Ledan. 10 Ụmụ Shimiaị bụ Jehat, Zaịna na Jiọsh na Beraya. Mmadụ anọ a bụ ụmụ Shimiaị. 11 Jehat wee bụrụ onyeisi, Zaịza wee bụrụ onye nke abụọ. Ma Jiọsh na Beraya amụghị ọtụtụ ụmụ; ha wee bụrụ otu ọnụmara+ nke na-arụ otu ọrụ.
12 Ụmụ Kohat+ bụ Amram, Izha,+ Hibrọn+ na Ọziel,+ mmadụ anọ. 13 Ụmụ Amram bụ Erọn+ na Mozis.+ Ma e doro Erọn iche+ ka o wee na-edo Ebe Kasị Nsọ nsọ,+ ya na ụmụ ya ndị ikom, ruo mgbe a na-akaghị aka, isure ihe nsure+ ọkụ n’ihu Jehova, ijere ya ozi+ na iji aha ya na-agọzi+ ndị mmadụ ruo mgbe a na-akaghị aka. 14 Ma a na-agụnye ụmụ Mozis bụ́ onye nke ezi Chineke+ n’ebo ndị Livaị.+ 15 Ụmụ Mozis bụ Geshọm+ na Elịiza.+ 16 Ụmụ Geshọm bụ Shebuel+ bụ́ onyeisi. 17 Ụmụ Elịiza bụ Rehabaya+ bụ́ onyeisi; Elịiza amụghị ụmụ ọzọ, ma ụmụ Rehabaya dị nnọọ ọtụtụ. 18 Ụmụ Izha+ bụ Shelomit+ bụ́ onyeisi. 19 Ụmụ Hibrọn bụ Jeraya bụ́ onyeisi, Amaraya bụ́ onye nke abụọ, Jahazayel bụ́ onye nke atọ nakwa Jekamiam+ bụ́ onye nke anọ. 20 Ụmụ Ọziel+ bụ Maịka bụ́ onyeisi na Ịs-shaya bụ́ onye nke abụọ.
21 Ụmụ Meraraị+ bụ Malaị na Mushaị.+ Ụmụ Malaị bụ Elieza+ na Kish. 22 Ma Elieza nwụrụ; ọ mụtaghị ụmụ ndị ikom, kama ọ bụ ụmụ nwaanyị ka ọ mụrụ. Ụmụ Kish bụ́ ụmụnne ha wee lụrụ ha.+ 23 Ụmụ Mushaị bụ Malaị na Ida na Jeremọt,+ mmadụ atọ.
24 Ọ bụ ndị a bụ ụmụ Livaị dị ka ụlọ ndị nna ha si dị,+ bụ́ ndị isi nke ụlọ ndị nna ha, dị ka ndị a họpụtara ahọpụta n’ime ha si dị, dị ka aha ha e debara n’akwụkwọ si dị, ha niile n’otu n’otu, ya bụ, ndị na-arụ ọrụ maka ozi+ a na-eje n’ụlọ Jehova, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe.+ 25 N’ihi na Devid sịrị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel enyewo ndị ya ezumike,+ ọ ga-ebikwa na Jeruselem ruo mgbe a na-akaghị aka.+ 26 Ndị Livaị agaghịkwa na-ebugharị ụlọikwuu ahụ ma ọ bụ arịa ya ọ bụla nke e ji eje ozi na ya.”+ 27 N’ihi na dị ka okwu ikpeazụ+ Devid kwuru si dị, ọ bụ ndị a ka a gụrụ ọnụ n’ime ụmụ Livaị malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe. 28 N’ihi na ọ bụ ụmụ Erọn+ na-enye ha ọrụ n’ọrụ a na-arụ n’ụlọ Jehova, ya bụ, ịhụ maka ogige ya+ na ụlọ iri ihe+ na ido ihe ọ bụla dị nsọ ọcha+ na ịhụ maka ọrụ metụtara ozi a na-eje n’ụlọ ezi Chineke, 29 ọbụna ịhụ maka achịcha a na-edo n’usoro+ na ntụ ọka e gwere nke ọma+ maka ịchụ àjà ọka na ịhụ maka achịcha na-ekoghị eko+ dị fere fere+ na achịcha e ji ite ghee+ na ntụ ọka* a gwọrọ agwọ+ na ihe niile e ji atụ ihe n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ iji mata ole ihe dị na otú ihe hà;+ 30 nakwa maka iguzo+ kwa ụtụtụ+ ikele+ Jehova na ito ya+ nakwa ime otú ahụ ná mgbede; 31 nakwa maka ịchụ àjà nsure ọkụ ọ bụla a na-achụ mgbe niile n’ihu Jehova, bụ́ ndị a na-achụrụ Jehova n’ụbọchị izu ike,+ n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ+ nakwa n’oge ememme dị iche iche,+ n’ọnụ ọgụgụ ha dị ka ụkpụrụ na-achị ha si dị. 32 Ha na-ahụkwa maka iche ụlọikwuu nzute nche+ na iche ebe nsọ ahụ nche+ na iche ụmụ Erọn bụ́ ụmụnne ha nche, maka ozi a na-eje n’ụlọ Jehova.+