Job
2 Oleekwa òkè Chineke nke bi n’elu ga-ekenye m,+
Ma ọ bụ, olee ihe nketa Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nke nọ n’elu ga-enye m?
3 Ọ́ bụghị onye na-eme ihe ọjọọ ka ọdachi na-adakwasị,+
Ọ́ bụghịkwa ndị na-akpa arụ ka ihe ọjọọ na-adabara?
5 Ọ bụrụ na mụ na ndị na-adịghị eme ihe n’eziokwu na-eje ije,+
Ọ bụrụkwa na ụkwụ m na-eme ngwa ịgbaga n’aghụghọ,+
6 Ọ ga-eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi tụọ m,+
Chineke ga-amarakwa na m na-eguzosi ike n’ezi ihe.+
7 Ọ bụrụ na ụkwụ m agahie ụzọ,+
Ma ọ bụ, ọ bụrụ na obi m ejesowo naanị ihe anya m na-ahụ,+
Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ntụpọ ọ bụla araparawo n’ọbụ aka m,+
8 Ka m kụọ mkpụrụ, ma ka onye ọzọ rie ya,+
Ka e fopụkwa ụmụ m.
9 Ọ bụrụ na a ratawo obi m iche banyere nwaanyị ọzọ,+
M wee nọrọ n’ọnụ ụzọ mmadụ ibe m chebiri ya,+
10 Ka nwunye m gweere nwoke ọzọ nri,
Ka ndị ikom ọzọ gbaakwa agada n’elu ya.+
12 N’ihi na nke ahụ bụ ọkụ ga-erepịa ihe ruo ná mbibi,+
Ọ ga-agbanyekwa mgbọrọgwụ n’etiti ihe niile m rụpụtara.
13 Ọ bụrụ na m na-ajụbu ime ka ohu m nwoke
Ma ọ bụ ohu m nwaanyị nweta ikpe ziri ezi n’okwu ikpe ha nwere megide m,
14 Gịnịzi ka m ga-eme mgbe Chineke biliri ọtọ?
Mgbe ọ ga-achọ ka m zaa ajụjụ, gịnị ka m ga-aza ya?+
16 Ọ bụrụ na m na-egbochibu ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha inweta ihe na-atọ ha ụtọ,+
Ọ bụrụkwa na m na-eme ka anya nwaanyị di ya nwụrụ gharakwa ịhụ ụzọ,+
17 Ọ bụrụkwa na ọ bụ naanị m na-eribu obere nri m,
Ma nwa na-enweghị nna esoghị m rie ya+
18 (N’ihi na ọ nọ n’aka m too dị ka à ga-asị na m bụ nna ya malite n’oge m bụ nwata,
Ọ bụkwa malite n’afọ nne m ka m nọ na-edu ya);
19 Ọ bụrụ na m na-ahụbu onye ọ bụla ka ọ na-anwụ n’ihi enweghị uwe,+
Ma ọ bụ, na onye dara ogbenye enweghị uwe;
20 Ọ bụrụ na úkwù ya agọzighị m,+
Ma ọ bụ, ọ bụrụ na o jighị ajị a kpachapụtara+ n’ụmụ ebule m mee ka ahụ́ kporo ya ọkụ;
21 Ọ bụrụ na m ji iwe na-atụ nwa na-enweghị nna aka,+
Mgbe m hụrụ ka ọ nọ n’ọnụ ụzọ ámá na-achọ enyemaka m,+
22 Ka ọkpụkpụ ubu m chikwapụ,
Ka ogwe aka m kwokapụkwa na nkwonkwo ubu m.
24 Ọ bụrụ na mụ emewo ka ọlaedo bụrụ obi ike m,
Ma ọ bụ na asịwo m ọlaedo, ‘Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi!’+
25 Ọ bụrụ na m na-aṅụrịbu ọṅụ n’ihi na ihe onwunwe m bara ụba,+
Nakwa n’ihi na aka m enwetawo ọtụtụ ihe;+
26 Ọ bụrụ na m na-ahụbu ìhè ma o nwuo,
Ma ọ bụ ọnwa dị ebube mgbe ọ na-aga,+
27 E wee malite ịra obi m ụrà na nzuzo,+
M wee susuo aka m ọnụ,
28 Nke ahụkwa ga-abụ mmejọ nke ndị ikpe ga-eleba anya,
N’ihi na ọ ga-apụta na mụ agọnahụwo ezi Chineke bi n’elu.
29 Ọ bụrụ na m na-aṅụrịbu ọṅụ mgbe e bibiri onye kpọrọ m oké asị,+
Ma ọ bụ na m nwere obi ụtọ n’ihi na ihe ọjọọ dakwasịrị ya—
30 Ekweghịkwa m ka okpo ọnụ m mehie
Site n’ikwu ka ọ ṅụọ iyi ga-emegide mkpụrụ obi ya.+
31 Ọ bụrụ na ndị bi n’ụlọikwuu m asịghị,
‘Ònye ga-amụ onye ọ bụla nke nri ya na-ejughị afọ?’+
32 Ọ dịghị mbịarambịa nke na-arahụ n’èzí;+
Eghewere m ọnụ ụzọ m oghe maka ndị njem.
33 Ọ bụrụ na mụ ekpuchie njehie m dị ka mmadụ na-eme+
Site n’izo mmejọ m n’ime akpa uwe m—
34 N’ihi na m na-ama jijiji n’ihi oké ìgwè mmadụ,
Ma ọ bụ, n’ihi na nlelị a na-elelị ezinụlọ dị iche iche na-emenye m ụjọ,
M wee gba nkịtị, esighịkwa m n’ụlọ m pụọ.
35 A sị nnọọ na m nwere onye na-ege m ntị,+
Nakwa na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-aza m dị ka aka m bịanyere si dị!+
Ma ọ bụkwanụ, a sị na onye mụ na ya nwere okwu ikpe nwere ihe o dere n’akwụkwọ!
36 N’ezie, m gaara eburu ya n’ubu m;
M gaara eke ya n’isi m ka ọ dị ka nnukwu okpueze.
38 Ọ bụrụ na ala m etie mkpu enyemaka megide m,
Ọ bụrụkwa na ebe niile a kọrọ akọ akwaa ákwá n’otu mgbe;
39 Ọ bụrụ na mụ erie mkpụrụ ya n’akwụghị ụgwọ,+
Meekwa ka mkpụrụ obi nke ndị nwe ya sụọ ude,+
40 Ka ahịhịa ogwu pulite n’ọnọdụ ọka wit,+
Ka ahịhịa na-esi ísì puokwa n’ọnọdụ ọka bali.”
Okwu Job agwụla.