Job
30 “Ugbu a, ha achịwo m ọchị,+
Bụ́ ndị m tọrọ atọ,+
Ndị m na-agaraghị ekwe ka nna ha
Soro nkịta ndị na-edu ìgwè ewu na atụrụ m nọrọ.
3 Ha enweghị ume n’ihi ịnọ n’ụkọ na agụụ,
Ha na-ata ihe n’ógbè mmiri na-adịghị,+
N’ebe e nwere oké ifufe na mbibi ụnyaahụ.
4 Ha nọ na-akụrụ ahịhịa nnu n’ọhịa,
Nri ha bụkwa mgbọrọgwụ osisi brum.
6 Ha ga-ebi ná mkpọda ndagwurugwu,
N’ọnụ ndị a tụrụ n’ala nakwa na nkume.
7 Ha ga-anọ n’ime ọhịa na-eti mkpu;
Ha ga-agbakọta ọnụ n’okpuru ahịhịa akụwa.
11 N’ihi na ọ tọpụrụ ụdọ m wee weda m ala,
Ha enweghịkwa ihe na-egbochi ha ime m ihe ọjọọ.
12 Ha na-ebili n’aka nri m dị ka otu ìgwè;
Ha atọhapụwo ụkwụ m,
Ma ha wuru ihe mgbochi ọjọọ ha wee na-emegide m.+
13 Ha emebiwo okporo ụzọ m;
Naanị uru ha bara bụ ịkpatakwuru m ahụhụ,+
N’enweghị onye na-enyere ha aka.
14 Ha na-abịa dị ka ọ̀ bụ n’oghere sara mbara ka ha si;
Ha enukọrọwo na-abịa mgbe oké ifufe mmiri na-efe.
15 E mewo ka ụjọ mberede jide m;
A na-ekusasị ùgwù m dị ka ihe ifufe na-efesasị,
Nzọpụta m agabigawokwa dị ka ígwé ojii.
18 Ike ya nke dị ukwuu na-eme ka uwe m gbanwee;
Ọ na-agba m gburugburu dị ka olu uwe mwụda m.
19 O wedawo m n’ájá,
M wee dị ka ájá na ntụ.
22 Ị na-ekugoro m n’ikuku, ị na-eme ka o buru m;
I wee mee ka m jiri oké ụzụ daa kụrie.
23 N’ihi na amaara m nke ọma na ị ga-eme ka m laghachikwuru ọnwụ,+
N’ụlọ nke onye ọ bụla dị ndụ ga-aga.
24 Ọ bụ naanị na ọ dịghị onye na-esetị aka ya imegide ihe e kpofuru ekpofu,+
Ọ dịghịkwa onye na-etiri ihe ndị ahụ mkpu enyemaka mgbe mmadụ na-ada ada.
26 Ọ bụ ezie na ọ bụ ihe ọma ka m nọ na-echere, ọ bụ ihe ọjọọ bịara;+
M nọkwa na-echere ìhè, ma, ọ bụ ọchịchịrị bịara.
27 E mere ka eriri afọ m gbaa ghara ghara, ọ nọghịkwa jụụ;
Ụbọchị nhụjuanya bịakwasịrị m.
28 M nọ na-ejegharị ná mwute+ mgbe ìhè anyanwụ na-adịghị;
Ebiliri m ọtọ n’etiti ìgwè mmadụ, m nọ na-eti mkpu enyemaka.
31 Ụbọ akwara m wee bụrụ naanị maka iru uju,
Ọjà m abụrụkwa maka olu ndị na-akwa ákwá.