Abụ Ọma 149 Toonụ Jaa!+ Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ,+Bụọnụ abụ otuto ya n’ime ọgbakọ nke ndị na-eguzosi ike n’ihe.+ 2 Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ n’ime Onye Ukwu kere ya,+Ka ụmụ Zayọn ṅụrịa ọṅụ n’ime Eze ha.+ 3 Ka ha jiri ịgba egwú too aha ya.+Ka ha were obere ịgbà na ụbọ akwara bụkuo ya abụ olu ụtọ.+ 4 N’ihi na ihe ndị Jehova na-atọ ya ụtọ.+Ọ na-eji nzọpụta achọ ndị dị umeala n’obi mma.+ 5 Ka ndị na-eguzosi ike n’ihe ṅụrịa ọṅụ ná nsọpụrụ ha;Ka ha tie mkpu ọṅụ n’elu ihe ndina ha.+ 6 Ka abụ e ji eto Chineke dịrị n’akpịrị ha,+Ka mma agha ihu abụọ dịrị n’aka ha,+ 7 Iji bọọ ọbọ n’ahụ́ mba dị iche iche,+Baakwara mba dị iche iche mba,+ 8 Iji kee ndị eze ha agbụ,+Tụọkwa ndị ha a na-asọpụrụ ịgà ígwè. 9 Iji mezuo mkpebi ikpe e dere ede n’isi ha.+Ịma mma dị otú ahụ bụ nke ndị niile na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ.+Toonụ Jaa!+