Abụ olu ụtọ Devid, nke e ji echeta ihe.
38 Jehova, biko, abarala m mba n’iwe gị,+
Ejikwala iwe gbazie m.+
2 N’ihi na akụ́ gị abamiwo abami n’ahụ́ m,+
Aka gị abịakwasịwo m.+
3 Ahụ́ niile na-egbu m mgbu n’ihi amamikpe gị.+
Ọkpụkpụ m ezughịkwa ike n’ihi mmehie m.+
4 N’ihi na njehie m erikpuwo isi m;+
Dị ka ibu dị arọ, ọ dị arọ nke na agaghị m ebuli ya.+
5 Ọnyá m esiwela ísì, ọ basawo,
N’ihi nzuzu m.+
6 Obi erukwaghị m ala, adawo m mbà nke ukwuu;+
Ejegharịwo m ná mwute ogologo ụbọchị dum.+
7 N’ihi na úkwù m niile na-ere m ọkụ,
Ahụ́ niile na-egbu m mgbu.+
8 Ahụ́ akụnwụwo m, e gbuwokwa mmụọ m nke ukwuu;
Ebigbọwo m n’ihi ịsụ ude nke obi m.+
9 Jehova, ọ bụ n’ihu gị ka ọchịchọ m dum dị,
Ịsụ ude m abụghịkwa ihe zoro ezo n’ebe ị nọ.+
10 Obi m na-akụsi ike, ike agwụwokwa m,
Anya m adịkwaghị ahụ ụzọ.+
11 Ma ndị m hụrụ n’anya na ndị enyi m na-agbara m ọsọ n’ihi ọrịa m,+
Ndị mụ na ha na-akpachi anya eguzopụwokwa iche n’ebe dị anya.+
12 Ma ndị na-achọ mkpụrụ obi m na-esi ọnyà,+
Ndị na-akpa nkata ka ọdachi dakwasị m ekwuwokwa okwu banyere ahụhụ,+
Ha na-atamukwa okwu aghụghọ ogologo ụbọchị dum.+
13 Ma mụ onwe m, dị ka onye ntị chiri, anụghị m ihe ha na-ekwu;+
Dị ka onye ogbi, emegheghị m ọnụ.+
14 M wee dị ka onye na-adịghị anụ ihe,
Enweghị m ihe m ga-aza ha.
15 N’ihi na ọ bụ gị, Jehova, ka m cheere;+
Gị onwe gị, Jehova Chineke m, wee za.+
16 N’ihi na m sịrị: “Ma ọ́ bụghị ya, ha ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe mere m;+
Mgbe ụkwụ na-esighị m ike n’ala,+ ha ga-ebuli onwe ha elu megide m.”+
17 N’ihi na ọ fọrọ nke nta ka m tee ụkwụ,+
Ihe mgbu m dịkwa n’ihu m mgbe niile.+
18 N’ihi na m kọrọ njehie m;+
M wee malite ichegbu onwe m n’ihi mmehie m.+
19 Ndị iro m bụ́ ndị dị ndụ ewee dị ike,+
Ndị kpọrọ m asị na nkịtị ewee dị ọtụtụ.+
20 Ha ji ihe ọjọọ na-akwụ m ụgwọ ihe ọma;+
Ha nọ na-eguzogide m n’ihi na m na-achụso ihe ọma.+
21 Jehova, biko, ahapụla m.
Chineke m, biko, anọla m n’ebe dị anya.+
22 Bịa ngwa ngwa nyere m aka,+
Jehova bụ́ nzọpụta m.+