Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Abụ Ọma 38
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Abụ Ọma

      • Ekpere onye chegharịrị echegharị kpere

        • ‘M na-echegbu onwe m, obi dara m mbà’ (6)

        • Jehova na-aza ekpere ndị na-echere ya (15)

        • “Mmehie m nọ na-ewute m” (18)

Abụ Ọma 38:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jer 10:24

Abụ Ọma 38:2

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “Aka gị na-abịada m.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 32:4

Abụ Ọma 38:3

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “Udo adịrịghị ọkpụkpụ m.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 6:2; 41:4; 51:8

Abụ Ọma 38:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ezr 9:6; Ọm 40:12

Abụ Ọma 38:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 38:3

Abụ Ọma 38:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 6:7

Abụ Ọma 38:12

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Sa 16:7; Ọm 62:4

Abụ Ọma 38:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Sa 16:11
  • +Ọm 39:2, 9

Abụ Ọma 38:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Sa 16:12; Ọm 123:2
  • +Ọm 138:3

Abụ Ọma 38:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 77:2

Abụ Ọma 38:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 32:5
  • +Ọm 51:3

Abụ Ọma 38:19

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “dị ndụ.”

Abụ Ọma 38:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 22:11; 35:22

Abụ Ọma 38:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 27:1; 62:2; Aịz 12:2

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọma 38:1Jer 10:24
Ọma 38:2Ọm 32:4
Ọma 38:3Ọm 6:2; 41:4; 51:8
Ọma 38:4Ezr 9:6; Ọm 40:12
Ọma 38:7Ọm 38:3
Ọma 38:10Ọm 6:7
Ọma 38:122Sa 16:7; Ọm 62:4
Ọma 38:132Sa 16:11
Ọma 38:13Ọm 39:2, 9
Ọma 38:152Sa 16:12; Ọm 123:2
Ọma 38:15Ọm 138:3
Ọma 38:17Ọm 77:2
Ọma 38:18Ọm 32:5
Ọma 38:18Ọm 51:3
Ọma 38:21Ọm 22:11; 35:22
Ọma 38:22Ọm 27:1; 62:2; Aịz 12:2
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Abụ Ọma 38:1-22

Abụ Ọma

Abụ Devid, nke e ji echeta ihe.

38 Jehova, biko, abarala m mba n’iwe gị,

Ejikwala iwe dọọ m aka ná ntị.+

 2 N’ihi na akụ́ gị abamiela n’ahụ́ m,

Ahụhụ ị na-ata m na-enyekwa m nsogbu n’ahụ́.*+

 3 Ahụ́ niile na-egbu m mgbu n’ihi iwe gị.

Obi anaghị ezu m ike* n’ihi mmehie m.+

 4 N’ihi na mmehie ndị m mere erikpuola isi m.+

Ha dị ka ibu na-anyị arọ. Agaghị m ebuli ha.

 5 Ọnyá ndị dị m n’ahụ́ na-esi ísì, na-abasakwa abasa

N’ihi nzuzu m.

 6 M na-echegbu onwe m, obi dakwara m mbà.

Iwe juru m obi malite n’ụtụtụ ruo n’abalị.

 7 Ime ahụ́ na-ere m ọkụ.

Ahụ́ niile na-egbu m mgbu.+

 8 Ahụ́ akụnwụọla m, ike ụwa agwụkwala m.

M na-asụsi ude ike n’ihi otú iwe si ju m obi.

 9 Jehova, ị ma ihe niile m chọrọ,

Ị na-anụkwa ọsụ m na-ama.

10 Obi na-akụ m kpum kpum. Ike agwụla m,

Anya m anaghịkwa ahụ ụzọ.+

11 Ndị enyi m na ndị mụ na ha na-akpa na-agbara m ọsọ n’ihi ọrịa m,

Ndị mụ na ha dị n’ezigbo mma anaghịkwa abịa m nso.

12 Ndị na-achọ igbu m* na-esiri m ọnyà.

Ndị na-achọ imerụ m ahụ́ na-akpa otú ha ga-esi laa m n’iyi.+

Ihe ha na-ekwu malite n’ụtụtụ ruo n’abalị bụ aghụghọ ha ga-aghọ.

13 Ma m na-eme ka onye ntị chiri. Anaghị m ege ihe ha na-ekwu.+

M na-eme ka onye ogbi. Anaghị m ekwu ihe ọ bụla.+

14 M dịzi ka onye na-anaghị anụ ihe,

Ka onye na-enweghị ihe ọ ga-ekwu iji zara ọnụ ya.

15 N’ihi na ọ bụ gị, Jehova, ka m cheere,+

I wee za m, Jehova Chineke m.+

16 N’ihi na m sịrị: “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m,

Ekwekwala ka ha maliwe elu ma ụkwụ m mịchapụ.”

17 N’ihi na ọ fọrọ obere ka m daruo ala.

Ahụ́ na-egbu m mgbu mgbe niile.+

18 M kwupụtara ihe ọjọọ m mere.+

Mmehie m nọ na-ewute m.+

19 Ma ndị iro m siri ike,* bụrụkwa ndị dike.

Ndị kpọrọ m asị n’enweghị ihe m mere ha dịzi ọtụtụ.

20 Ha ji ihe ọjọọ kwụọ m ụgwọ ihe ọma.

Ha nọ na-enye m nsogbu maka na ha achọghị ka m na-eme ihe dị mma.

21 Jehova, biko, ahapụla m.

Chineke m, biko, anọla m n’ebe dị anya.+

22 Jehova, onye na-azọpụta m,+

Biko, bịa ngwa ngwa ka i nyere m aka.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya