Abụ ọma Devid.
א [Alef]
37 Ewela iwe n’ihi ndị na-eme ihe ọjọọ.+
Ekwosola ndị na-eme ajọ omume ekworo.+
2 N’ihi na ha ga-akpọnwụ ọsọ ọsọ dị ka ahịhịa,+
Ha ga-achanwụkwa dị ka ahịhịa ndụ nke puru ọhụrụ.+
ב [Bet]
3 Tụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọma;+
Biri n’ụwa, na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi.+
4 Ka ihe Jehova na-atọkwa gị ụtọ nke ukwuu,+
Ọ ga-enyekwa gị ihe niile obi gị na-arịọ.+
ג [Gimel]
5 Nyefee ụzọ gị n’aka Jehova,+
Dabere n’ebe ọ nọ,+ ya onwe ya ga-emekwa ihe.+
6 Ọ ga-eme ka ezi omume gị nwuo dị ka ìhè,+
Meekwa ka ikpe ziri ezi gị na-acha dị ka etiti ehihie.+
ד [Dalet]
7 Gbachie nkịtị n’ihu Jehova,+
Cheresie ya ike.+
Ewesola onye ọ bụla nke na-eme ka ụzọ ya gaa nke ọma iwe,+
Bụ́ onye na-eme ihe o chepụtara.+
ה [Hee]
8 Hapụ iwe, hapụkwa ọnụma;+
Ewela iwe naanị iji mee ihe ọjọọ.+
9 N’ihi na a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ,+
Ma ọ bụ ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enweta ụwa.+
ו [Wọọ]
10 N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ;+
Ị ga-elekwa anya n’ebe ọ na-anọ, ma ọ gaghị anọ ya.+
11 Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa,+
Ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.+
ז [Zayin]
12 Onye ajọ omume na-akpa nkata megide onye ezi omume,+
Ọ na-atakwa ikikere ezé megide ya.+
13 Jehova ga-achị ya ọchị,+
N’ihi na ọ na-ahụ na ụbọchị a ga-ebibi ya ga-abịa.+
ח [Het]
14 Ndị ajọ omume amịpụtawo mma agha, ha ekwewokwa ụta ha,+
Iji mee ka onye nọ n’ahụhụ na onye ogbenye daa,+
Iji gbuo ndị ụzọ ha ziri ezi.+
15 Mma agha nke ha ga-aba n’obi ha,+
A ga-agbajikwa ụta ha.+
ט [Tet]
16 Ntakịrị ihe onye ezi omume nwere dị mma+
Karịa ihe buru ibu ọtụtụ ndị ajọ omume nwere.+
17 N’ihi na a ga-agbaji ogwe aka ndị ajọ omume,+
Ma Jehova ga na-akwado ndị ezi omume.+
י [Yod]
18 Jehova maara ụbọchị niile nke ndị na-enweghị ntụpọ,+
Ihe nketa ha ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi.+
19 Ihere agaghị eme ha n’oge ọdachi,+
Afọ ga-ejukwa ha n’oge ụnwụ.+
כ [Kaf]
20 N’ihi na ndị ajọ omume ga-ala n’iyi,+
Ndị iro Jehova ga-adịkwa ka ebe mara mma anụ na-ata ahịhịa;
Ha ga-akpọnwụ.+ Ha ga-aghọ anwụrụ ọkụ, ha agakwaghị anọ.+
ל [Lamed]
21 Onye ajọ omume na-agbaziri ihe ma ọ dịghị akwụghachi ya,+
Ma onye ezi omume na-eme amara, na-enyekwa onyinye.+
22 N’ihi na ndị ọ na-agọzi ga-enweta ụwa,+
Ma a ga-ebipụ ndị ọ na-akọcha.+
מ [Mem]
23 Ọ bụ Jehova na-eme ka nzọụkwụ nke dimkpa guzosie ike,+
Ụzọ ya na-atọkwa Ya ụtọ.+
24 Ọ bụrụgodị na ọ daa, ọ gaghị akụ afọ n’ala,+
N’ihi na Jehova ji ya aka.+
נ [Nun]
25 Ọ dị mgbe m bụ nwata, emewokwa m agadi,+
Ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume kpamkpam,+
Ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.+
26 Ọ na-eme amara ogologo ụbọchị dum, na-agbazinyekwa ihe,+
N’ihi ya, ụmụ ya ga-enweta ngọzi.+
ס [Samek]
27 Hapụ ihe ọjọọ, meekwa ihe ọma,+
Ka i wee biri ruo mgbe ebighị ebi.+
28 N’ihi na Jehova hụrụ ikpe ziri ezi n’anya,+
Ọ gaghịkwa ahapụ ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ.+
ע [Ayin]
A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi;+
Ma a ga-ebipụ ụmụ ndị ajọ omume.+
29 Ndị ezi omume ga-enweta ụwa,+
Ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.+
פ [Pee]
30 Ọ bụ ọnụ onye ezi omume na-ekwupụta amamihe n’olu dị ala,+
Ọ bụkwa ire ya na-ekwu ihe ziri ezi.+
31 Iwu Chineke ya dị n’obi ya;+
Ụkwụ agaghị ama ya jijiji.+
צ [Sadee]
32 Onye ajọ omume na-echebiri onye ezi omume,+
Na-achọkwa igbu ya.+
33 Ma Jehova agaghị ahapụ ya n’aka onye ahụ,+
Ọ gaghịkwa akpọ ya onye ajọ omume mgbe a na-ekpe ya ikpe.+
ק [Kof]
34 Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, debekwa ụzọ ya,+
Ọ ga-ebulikwa gị elu inweta ụwa.+
Mgbe a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ị ga-ahụ ya.+
ר [Resh]
35 Ahụwo m onye ajọ omume nke na-achị n’aka ike,+
Na-agbasakwa onwe ya dị ka osisi na-ama pokopoko n’ala a kụrụ ya.+
36 N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nwụrụ, ma, lee, ọ nọkwaghị;+
Anọ m na-achọ ya, ma ahụghị m ya.+
ש [Shin]
37 Legide onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta anya, legidekwa onye ziri ezi anya, +
N’ihi na ọ ga-enwe udo n’ọdịnihu.+
38 Ma a ga-ala ndị niile na-emebi iwu n’iyi;+
Ndị ajọ omume agaghị enwe ọdịnihu.+
ת [Tọọ]
39 Nzọpụta ndị ezi omume na-esi n’aka Jehova;+
Ọ bụ ebe ha e wusiri ike n’oge ahụhụ.+
40 Jehova ga-enyere ha aka ma meere ha ụzọ mgbapụ.+
Ọ ga-emere ha ụzọ ha ga-esi gbapụ n’aka ndị ajọ omume, ọ ga-azọpụtakwa ha,+
N’ihi na ha agbabawo n’ime ya.+