Ntụziaka e nyere onye nduzi ụbọ akwara. Abụ ọma Devid.
61 Chineke, biko, nụrụ ákwá m na-ebesara gị.+
Ṅaa ntị n’ekpere m.+
2 M ga-esi na nsọtụ ụwa tikuo gị, mgbe obi m dara mbà.+
Duru m ka m rịgoro n’elu oké nkume nke dị elu karịa m.+
3 N’ihi na ị bụụrụ m ebe mgbaba,+
Bụkwaara m ụlọ elu siri ike n’ihu onye iro.+
4 M ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị ruo mgbe ebighị ebi;+
M ga-agbaba n’okpuru nku gị.+ Sila.
5 N’ihi na gị onwe gị, Chineke, egewo ntị ná nkwa m kwere.+
I nyewo m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị.+
6 Ị ga-eme ka ụbọchị eze dịkwuo ogologo;+
Ọ ga-adị ogologo ndụ dị ka à ga-asị na ọ bụ site n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.+
7 Ọ ga-ebi n’ihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi;+
Biko, zite obiọma na eziokwu, ka ha wee chebe ya.+
8 N’ihi ya m ga na-abụku aha gị abụ olu ụtọ ruo mgbe ebighị ebi,+
Ka m wee na-emezu nkwa m kwa ụbọchị.+