Job
3 Ọ bụ mgbe ihe a mechara ka Job kwuziri okwu ma bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ.*+ 2 Job sịrị:
4 Ka ụbọchị ahụ gbaa ọchịchịrị.
Ka Chineke chefuo ya.
Ka ìhè gharakwa inwu na ya.
5 Ka oké ọchịchịrị gbachie ya.
Ka urukpuru kpuchie ya.
Ka oké ọchịchịrị kpuchie ìhè ya.
6 Ka oké itiri gbaa n’abalị ahụ.+
Ka a ghara ịṅụrị ọṅụ n’ụbọchị ahụ n’ime ụbọchị ndị e nwere n’afọ,
Ka ọ ghara iso n’ụbọchị ndị e nwere n’ọnwa.
7 N’eziokwu, ọ gaara aka mma ma a sị na e nweghị onye a mụrụ n’abalị ahụ.
Ka a ghara iti mkpu ọṅụ na ya.
9 Ka kpakpando nke pụtara mgbe chi malitere iji n’abalị ahụ gbaa ọchịchịrị.
Ka o chere ìhè, ma ka ìhè ghara ịdị,
Ka ọ gharakwa ịhụ ìhè na-apụta ma chi bọwa.
11 Gịnị mere na anwụghị m mgbe a na-amụ m?
Gịnị mere na anwụghị m mgbe m si n’akpa nwa pụta?+
12 Gịnị mere mama m ji kuru m n’ụkwụ ya,
Nyekwa m ara ka m ṅụọ?
13 N’ihi na ugbu a, m gaarala edinara ala n’enweghị onye na-enye m nsogbu.+
M gaarala na-ehi ụra, na-ezukwa ike,+
14 Mụ na ndị eze ụwa na ndị na-adụ ha ọdụ,
Ndị ebe ndị ha rụụrụ onwe ha dakpọsịziri adakpọsị,*
15 Ma ọ bụ, mụ na ụmụ ndị eze* bụ́ ndị nwere ọlaedo,
Ndị ọlaọcha juru n’ụlọ ha.
16 Ma ọ bụ, gịnị mere na ime apụghị mama m mgbe ọ dị ime m,
Mụ anwụọ ka ụmụaka ndị na-ahụtụghị ìhè?
17 N’ebe ahụ, ndị ajọ omume anaghịzi echegbu onwe ha.
Ndị ike gwụrụ na-ezu ike n’ebe ahụ.+
18 Ndị mkpọrọ niile na-atụsara ahụ́ n’ebe ahụ.
Ha anaghị anụ olu onye na-amanye ha ịrụ ọrụ.
21 Gịnị mere na ọnwụ anaghị egbu ndị chọrọ ịnwụ?+
Ndị na-achọ ya karịa otú e si achọ akụ̀ zoro ezo,
22 Ndị na-aṅụrị nnukwu ọṅụ,
Ndị obi na-atọ ụtọ ịnwụ.*
24 N’ihi na m na-ama ọsụ kama iri ihe.+
Ude m na-asụ+ dị ka ebe mmiri na-agba n’akwụsịghị akwụsị.
25 N’ihi na ihe m tụrụ ụjọ ya abịarala m,
Ihe m tụrụ egwu ya emeekwala m.
26 E nweghị mgbe obi ruru m ala. E nweghị mgbe m nọ jụụ. E nweghị mgbe m zuru ike,
Kama nsogbu nọ na-abịa.”