Job
2 “Ọ bụrụ na mmadụ agbalịa ka ọ gwa gị okwu, ike ọ̀ ga-agwụ gị ige ya ntị?
Ma ònye ga-agbachili nkịtị ghara ikwu okwu?
3 N’eziokwu, ị kụzierela ọtụtụ ndị ihe.
Ị na-agbabu ndị ike gwụrụ ume.
4 Okwu gị na-agba onye ọ bụla na-ada mbà ume,
Ị na-emekwa ka ndị chọrọ ịda ada kwụsie ike.
5 Ma ugbu a, nsogbu abịarala gị, ike ụwa agwụ gị.
O ruola gị ahụ́, gị adaa mbà.
6 Ọ̀ bụ na nsọpụrụ ị na-asọpụrụ Chineke anaghị eme ka obi sie gị ike?
Ọ̀ bụ na otú i si kwụsie ike n’ebe Chineke nọ+ anaghị eme ka i nwee olileanya?
7 Biko, è nwetụla onye aka ya dị ọcha i chetara nwụchuru ọnwụ?
Olee mgbe e bibitụrụla onye ezi omume?
8 Ihe m hụrụla bụ na ndị na-akụ ihe ọjọọ ka mkpụrụ
Na ndị na-agha nsogbu ka mkpụrụ ga-aghọrọ otu ihe.
9 Ume Chineke kupụrụ na-ebibi ha,
Ha na-anwụkwa ma o wee ezigbo iwe.
10 Ọdụm na-agbọ ụja, nwa ọdụm na-abakwa mba,
Ma a na-agbaji ezé ọdụm siri ike.
11 Ọdụm na-anwụ n’ihi na e nweghị anụ ọ ga-eri,
Ụmụ ọdụm na-agbasasịkwa.
12 E nwere okwu a gwara m na nzuzo.
A takwunyeere m ya ná ntị.
13 N’abalị, mgbe ndị mmadụ nọ n’oké ụra,
M hụrụ ọhụụ mere ka obi ghara izu m ike.
14 Ezigbo ụjọ jidere m,
Ọkpụkpụ m niile ana-ama jijiji.
15 Otu mmụọ gafere n’ihu m,
Akpata oyi awụọ m n’ahụ́.
16 Ọ kwụụrụ otu ebe,
Ma amataghị m ihe ọ bụ.
E nwere ihe guzo n’ihu m.
Ebe niile dara jụụ, m wee nụ otu olu nke sịrị:
17 ‘Mmadụ efu ò nwere ike ịka Chineke bụrụ onye ezi omume?
Mmadụ ò nwere ike ịka Onye kere ya bụrụ onye aka ya dị ọcha?’
18 Lee, ọ tụkwasịghị ndị ohu ya obi,
Ọ na-atakwa ndị mmụọ ozi ya* ụta,
19 Ma ya fọdụzie ndị mmadụ e ji ájá kpụọ,
Ndị a na-azọpịa ọsọ ọsọ ka egu.*
20 Ha nọ ndụ n’ụtụtụ, ma tupu mgbede eruo, a zọpịachaala ha.
A na-ebibi ha ruo mgbe ebighị ebi, e nweghịkwa onye na-ama.
21 Ọ̀ bụ na ha adịghị ka ụlọikwuu e fopụsịrị ụdọ e ji jide ya efopụ?
Ha na-anwụ n’amaghị ihe ọ bụla.