Job
5 “Biko, kpọọ òkù. È nwere onye na-aza gị?
Ònye n’ime ndị nsọ* ka ị ga-akpọ ka o nyere gị aka?
2 N’ihi na iwe ga-egbu onye nzuzu,
Anyaụfụ ga-egbukwa onye na-amaghị ihe.
3 Ahụla m ka ihe na-agaziri onye nzuzu.
Ma na mberede, a na-abụ ụlọ ya ọnụ.
4 Ụmụ ya ejighị ndụ ha n’aka.
A na-emegbu ha n’ọnụ ụzọ ámá obodo,+ e nweghịkwa onye na-anapụta ha.
5 Onye agụụ na-agụ na-eri ihe onye ahụ wetara n’ubi.
Ọ na-eweredị ihe ndị dị n’ebe e nwere ogwu,
A na-eburukwa ihe ha n’ike.
6 Ma, ihe ọjọọ anaghị esi n’ájá epupụta,
Nsogbu anaghịkwa esi n’ala epulite.
7 O doro anya na ikerike ọkụ ga-esirịrị n’ọkụ gbalie elu.
Otú ahụkwa ka o doro anya na mmadụ ga-enwerịrị nsogbu ná ndụ ya.
8 Ma, m ga-arịọ Chineke arịrịọ,
Ọ bụkwa Chineke ka m ga-ewegara okwu m,
9 Onye na-eme oké ihe na ihe ndị a na-enweghị ike ịchọpụta achọpụta,
Ihe ndị dị ebube a na-enweghị ike ịgụta ọnụ.
10 Ọ na-eme ka mmiri zoo n’ụwa,
Na-emekwa ka mmiri zoo n’ubi.
11 Ọ na-ebuli onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya elu,
Na-azọpụtakwa onye ike ụwa gwụrụ.
12 Ọ na-akụghasị atụmatụ ndị aghụghọ,
Ka ihe ha na-eme ghara inwe isi.
14 Ọchịchịrị na-agbachi ha n’ehihie,
Ha na-asọgharịkwa ìsì n’etiti ehihie ka à ga-asị na ọ bụ abalị.
15 Ọ na-anapụta mmadụ n’okwu si ha n’ọnụ apụta nke dị ka mma agha,
Na-anapụta ogbenye n’aka onye siri ike,
16 Ka onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya nwee olileanya,
Ma a na-emechi ọnụ onye ajọ omume.
17 Lee, onye Chineke dọrọ aka ná ntị na-enwe obi ụtọ;
N’ihi ya, ajụla aka ná ntị Onye Pụrụ Ime Ihe Niile na-adọ gị.
18 Ọ na-eme mmadụ ihe ga-egbu ya mgbu, ma ọ na-ekechi ọnyá onye ahụ.
Ọ na-emerụ mmadụ ahụ́, ma ọ na-eji aka ya agwọ onye ahụ.
19 Ọ ga-anapụta gị ná nsogbu ọ bụla bịaara gị,
Ọ bụrụgodị nsogbu isii ma ọ bụ asaa.
20 N’oge ụnwụ, ọ ga-anapụta gị ka ọnwụ ghara igbu gị,
Napụtakwa gị n’oge agha, ka mma agha ghara igbu gị.
22 Ị gaghị atụ egwu na a ga-ebibi gị ma ọ bụ na agụụ ga-agụgbu gị,
Ị gaghịkwa atụ anụ ọhịa egwu.
24 Obi ga-eru gị ala n’ụlọikwuu gị,
E nweghịkwa anụ ị ga-achọ achọ mgbe ị ga-eleru ebe ụmụ anụmanụ gị na-ata ahịhịa anya.
25 Ị ga-enwe ọtụtụ ụmụ,
Ụmụ ụmụ gị ga-adịkwa ọtụtụ ka ahịhịa dị n’ala.
26 Ike ka ga-adị gị n’ahụ́ mgbe ị ga-anwụ,
Ka ùkwù ọka e gbutere n’oge ya.
27 Lee, anyị elebala ihe a anya. Ọ bụ otú ọ dị.
Gee ntị ma nabata ya.”