5 Seraị wee sị Ebram: “Ka ihe ọjọọ e mere m dịrị n’isi gị. Mụ onwe m kpọnyere gị nwaanyị na-ejere m ozi ka ọ dabere n’obi gị, o wee mata na ya adịla ime, o wee malite ileda m anya. Ka Jehova kpee ikpe n’etiti mụ na gị.”+
3 N’ihi na ọbụna anyị onwe anyị nwere mgbe anyị bụ ndị na-amaghị ihe, ndị na-enupụ isi, ndị a na-eduhie eduhie, bụrụ ohu nke ọchịchọ na ihe ụtọ dị iche iche, na-eme ihe ọjọọ, na-enwekwa anyaụfụ, bụrụ ndị a na-asọ oyi, ndị na-akpọ ibe anyị asị.+