1 Samuel
ma ọ bụ, dị ka e si dee ya ná nsụgharị Septuagint nke Grik, NDỊ EZE NKE MBỤ
1 E nwere otu nwoke onye Ramateyim-zofim+ n’ógbè Ifrem nke bụ́ ugwu ugwu,+ aha ya bụ Elkena,+ nwa Jeroham, nwa Elaịhu, nwa Tohu, nwa Zọf,+ onye Ifrem. 2 Ọ lụrụ ụmụ nwaanyị abụọ, aha otu bụ Hana, aha nke ọzọ abụrụ Penina. Penina mụrụ ụmụ, ma Hana amụghị nwa ọ bụla.+ 3 Nwoke ahụ na-esi n’obodo ya agbago kwa afọ ịkpọ isiala+ na ịchụrụ Jehova nke ụsụụ ndị agha àjà na Shaịlo.+ Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ụmụ Ilaị ndị ikom abụọ, bụ́ Họfnaị na Finihas,+ bụ ndị nchụàjà Jehova.+
4 O ruru otu ụbọchị mgbe Elkena chụrụ àjà, o kenyere Penina nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom niile òkè;+ 5 ma o kenyere Hana otu òkè. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ Hana ka ọ hụrụ n’anya,+ ma, Jehova mechiri akpa nwa ya.+ 6 Nwunye di ya kpasukwara ya iwe+ nke ukwuu iji mee ka obi ghara iru ya ala n’ihi na Jehova emechiwo akpa nwa ya. 7 Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ na-eme kwa afọ,+ mgbe ọ bụla ọ gara n’ụlọ Jehova.+ Otú ahụ ka ọ na-akpasu ya iwe, nke na-eme ka ọ na-akwa ákwá ma ghara iri nri. 8 Elkena di ya wee sị ya: “Hana, gịnị mere i ji na-akwa ákwá, gịnị mere na ị naghị eri nri, gịnịkwa mere na obi adịghị gị mma?+ N’ebe ị nọ, ọ̀ bụ na akaghị m ụmụ ndị ikom iri mma?”+
9 Hana wee bilie mgbe ha risịrị nri na Shaịlo, mgbe ha ṅụsịkwara ihe ọṅụṅụ, ka Ilaị onye nchụàjà nọ ọdụ n’oche dị n’akụkụ awara ụzọ nke ụlọ nsọ+ Jehova. 10 Ọ na-ewutekwa ya ná mkpụrụ obi,+ o wee malite ikpeku Jehova ekpere,+ na-akwakwa ákwá nke ukwuu.+ 11 O wee kwe nkwa,+ sị: “Jehova nke ụsụụ ndị agha, ọ bụrụ nnọọ na i lekwasị anya ná mmekpa ahụ́ nke ohu gị nwaanyị+ ma cheta m,+ wee ghara ichefu ohu gị nwaanyị ma nye ohu gị nwaanyị nwa nwoke, m ga-enye ya Jehova ụbọchị ndụ ya niile, ọ dịghịkwa agụba ga-emetụ ya n’isi.”+
12 O wee ruo na ka ọ na-ekpe ekpere ruo ogologo oge+ n’ihu Jehova, Ilaị nọ na-ele ya anya n’ọnụ. 13 Ma Hana nọ na-ekwu okwu n’ime obi ya;+ naanị egbugbere ọnụ ya na-emegharị emegharị, a nụghịkwa olu ya. Ma Ilaị chere na mmanya na-egbu ya.+ 14 Ilaị wee sị ya: “Ruo ole mgbe ka ị ga na-eme ka onye mmanya na-egbu?+ Mee ka mmanya pụọ gị n’anya.” 15 Hana wee zaa, sị: “Ee e, onyenwe m! Abụ m nwaanyị ihe na-esogbu na mmụọ; ọ dịghịkwa mmanya na ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu m ṅụrụ, kama m na-awụpụ mkpụrụ obi m dị ka mmiri n’ihu Jehova.+ 16 Emela ohu gị nwaanyị dị ka ọ̀ bụ nwaanyị na-abaghị n’ihe,+ n’ihi na ọ bụ oké nchegbu m na iwe m mere m ji na-ekwu okwu ruo ugbu a.”+ 17 Ilaị wee zaa ya, sị: “Laa n’udo,+ ka Chineke Izrel meekwara gị ihe ị rịọrọ ya.”+ 18 O wee sị: “Ka ohu gị nwaanyị nweta ihu ọma gị.”+ Nwaanyị ahụ wee laa ma riwe ihe,+ ihu ya agbarụghịkwa agbarụ ọzọ.+
19 Ha wee bilie n’isi ụtụtụ, daakwa n’ala n’ihu Jehova, e mesịa, ha lara ma bata n’ụlọ ha na Rema.+ Elkena na nwunye ya bụ́ Hana wee nwee mmekọahụ,+ Jehova wee malite icheta ya.+ 20 O wee ruo mgbe otu afọ gwụchara na Hana tụụrụ ime wee mụọ nwa nwoke ma gụọ ya+ Samuel, n’ihi na ọ sịrị, “ọ bụ n’aka Jehova ka m rịọtara+ ya.”
21 Ka oge na-aga, nwoke ahụ bụ́ Elkena kpọọrọ ezinụlọ ya dum gbagoo ịchụrụ Jehova àjà a na-achụ kwa afọ+ nakwa inye onyinye o kwere ná nkwa.+ 22 Ma Hana agbagoghị,+ n’ihi na ọ gwara di ya, sị: “Ngwa ngwa a kwụsịrị nwa a ara,+ m ga-akpọta ya, ọ ga-abịakwa n’ihu Jehova ma biri n’ebe ahụ ruo mgbe a na-akaghị aka.”+ 23 Elkena di ya+ wee sị ya: “Mee ihe dị gị mma.+ Nọrọ n’ụlọ ruo mgbe ị kwụsịrị ya ara. Naanị ka Jehova mezuo okwu ya.”+ Ya mere, nwaanyị ahụ nọọrọ n’ụlọ wee na-enye nwa ya ara ruo mgbe ọ kwụsịrị ya ara.+
24 O wee ruo na ngwa ngwa ọ kwụsịrị ya ara, ọ kpọọrọ ya gbagoo, kpụrụkwa oké ehi dị afọ atọ ma buru otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ntụ ọka* na nnukwu ite mmanya,+ o wee banye n’ụlọ Jehova nke dị na Shaịlo.+ Ọ kpọkwa nwa okoro ahụ. 25 Ha wee gbuo oké ehi ahụ ma kpọtara Ilaị+ nwa okoro ahụ. 26 O wee sị: “Biko, onyenwe m! Dị nnọọ ka mkpụrụ obi gị dị ndụ,+ onyenwe m, ọ bụ m bụ nwaanyị ahụ gị na ya guzo n’ebe a nke kpekuru Jehova ekpere.+ 27 Ọ bụ maka nwa okoro a ka m kpere ekpere ka Jehova meere m ihe+ m rịọrọ ya.+ 28 Ma mụ onwe m agbazinyewo ya Jehova.+ Ụbọchị niile ọ dị ndụ, ọ bụ onye a rịọtaara Jehova.”
Elkena wee kpọọrọ Jehova isiala+ n’ebe ahụ.