38 Zedọk+ onye nchụàjà na Netan+ onye amụma na Benaya+ nwa Jehoyada na ndị Keretaịt+ na ndị Peletaịt+ wee gbadaa, mee ka Sọlọmọn nọkwasị n’elu nne ịnyịnya nke Eze Devid,+ durutekwa ya Gaịhọn.+
11 Heman wee chịrị uwe,+ kpụrụkwa ịnyịnya gaa yiwe Mọdekaị+ uwe, meekwa ka ọ nọkwasị n’elu ịnyịnya ahụ wee gbagharịa n’ámá+ obodo ahụ, nọrọkwa ya n’ihu na-eti, sị:+ “Otú a ka a na-emere nwoke eze nwere mmasị ịkwanyere ùgwù.”+