35 O wee jiri eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa mee ákwà mgbochi.+ Ọ kpara cherọb na ya, dị ka nke onye na-akpa ihe n’ákwà kpara.+
2 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Gwa Erọn nwanne gị nwoke na ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga na-abata n’ebe nsọ,+ n’ime ákwà mgbochi ahụ,+ n’ihu ihe mkpuchi e ji kpuchie Igbe ahụ, ka ọ ghara ịnwụ;+ n’ihi na m ga na-apụta n’ígwé ojii+ n’elu ihe mkpuchi ahụ.+