2 ndị si ná mba ndị ahụ Jehova gwara ụmụ Izrel banyere ha, sị: “Abanyela n’etiti ha,+ ha onwe ha ekwesịghịkwa ịbata n’etiti unu; n’eziokwu, ha ga-enweta obi unu iso chi ha.”+ Ọ bụ ha ka Sọlọmọn rapaara n’ahụ́+ ịhụ ha n’anya.
26 Ọ́ bụghị n’ihi ihe ndị a ka Sọlọmọn eze Izrel ji mehie?+ N’etiti ọtụtụ mba, ọ dịghị eze dị ka ya;+ ọ bụkwa onye Chineke ya hụrụ n’anya,+ Chineke wee mee ya eze Izrel dum. Ọbụna ya onwe ya ka ndị inyom ọ lụtara ná mba ọzọ mere ka o mehie.+