16 Mgbe ahụ, ị ga-alụtara ụmụ gị ndị ikom ụmụ ha ndị inyom,+ ụmụ ha ndị inyom na chi ha ga-enwe mmekọahụ rụrụ arụ, ha ga-emekwa ka ụmụ gị ndị ikom na chi ha nwee mmekọahụ rụrụ arụ.+
12 “Ma ọ bụrụ na unu anwaa anwaa laghachi azụ,+ unu ewee rapara n’ahụ́ ndị fọdụrụ ná mba ndị a,+ bụ́ ndị a fọdụrụ n’etiti unu, unu na ha ewee na-agọ ọgọ,+ unu na ha ana-akpakọrịtakwa,
12 Unu ekenyekwala ụmụ ha ndị ikom+ ụmụ unu ndị inyom, unu alụtarala ụmụ unu ndị ikom ụmụ ha ndị inyom; unu emekwala ihe ga-ewetara ha udo+ na ọganihu, ruo mgbe a na-akaghị aka, ka unu wee dị ike+ ma rie ihe ọma dị n’ala ahụ ma weghara ya maka ụmụ unu ruo mgbe a na-akaghị aka.’+
2 Shekanaya nwa Jehayel,+ nke bụ́ otu n’ime ụmụ Ilam,+ zara Ezra, sị: “Anyị onwe anyị emesowo Chineke anyị omume ekwesịghị ntụkwasị obi, anyị wee si n’etiti ndị ala a lụbata ndị inyom mba ọzọ.+ Ma n’ihe a, Izrel ka nwere olileanya.+
14 Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu,+ nke bụ́ nkekọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi na olee ihe jikọrọ ezi omume na mmebi iwu?+ Ma ọ bụ, olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?+