5 nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ala Ijipt ga-anwụ,+ malite n’ọkpara Fero bụ́ onye nọ ọdụ n’ocheeze ruo n’ọkpara nwaanyị na-eje ozi bụ́ onye na-egwe ihe na nkume igwe nri nakwa nwa anụ ụlọ ọ bụla e bu ụzọ mụọ.+
13 N’ihi na nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ bụ nke m.+ N’ụbọchị m gburu nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ala Ijipt,+ m dooro onwe m nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Izrel nsọ, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ.+ Ha ga-abụ nke m. Abụ m Jehova.”