8 Ma ọ bụrụ na ọ gaghị ewetali atụrụ, ọ ga-ewere nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ,+ otu maka àjà nsure ọkụ, otu maka àjà mmehie, onye nchụàjà ga-ekpuchikwara ya mmehie ya,+ ọ ga-adịkwa ọcha.
17 N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ọ dị ka “ụmụnna” ya n’ụzọ niile,+ ka o wee ghọọ nnukwu onye nchụàjà na-eme ebere, nke kwesịrị ntụkwasị obi n’ijere Chineke ozi,+ ka o wee chụọ àjà ime udo+ maka mmehie nke ndị mmadụ.+