11 otu nwa ewu ga-abụ maka àjà mmehie, ma e wezụga àjà mmehie nke ikpuchi mmehie+ na àjà nsure ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya, tinyere àjà ihe ọṅụṅụ ha.+
21 Ha wee kpụta oké ehi asaa na ebule asaa+ na ụmụ ebule asaa na mkpi asaa ka ha bụrụ àjà mmehie+ maka alaeze ahụ na ebe nsọ ahụ nakwa maka Juda. O wee gwa ụmụ Erọn bụ́ ndị nchụàjà+ ka ha chụọ ha n’àjà n’ebe ịchụàjà Jehova.
17 Maka ịrara ụlọ Chineke a nye, ha wetara otu narị ehi, narị ebule abụọ, narị ụmụ atụrụ anọ, na mkpi iri na abụọ ka ọ bụrụ àjà mmehie maka Izrel dum, dị ka ole ebo Izrel dị.+