21 “‘Ọ bụrụ na mmadụ ewetara Jehova àjà udo+ iji mezuo ihe o kwere ná nkwa+ ma ọ bụ weta ya dị ka onyinye afọ ofufo, ọ ga-abụ nke ahụ́ dị mma nke si n’ìgwè ehi ma ọ bụ n’ìgwè ewu na atụrụ, iji nweta ihu ọma. Ọ gaghị enwe nkwarụ ọ bụla.
12Ya mere, ụmụnna m, eji m ọmịiko nke Chineke na-arịọsi unu ike ka unu nyefee Chineke ahụ́ unu+ dị ka àjà+ dị ndụ,+ dị nsọ,+ nke dị Chineke mma,+ ya bụ, ozi dị nsọ+ site n’ike iche echiche unu.+
27 ka o wee chee ọgbakọ ahụ n’ihu onwe ya n’ịma mma ya,+ n’enweghị ntụpọ ma ọ bụ ahụ́ ndọlị ma ọ bụ ihe ọ bụla dị otú ahụ, kama ka o wee dị nsọ, gharakwa inwe mmerụ.+
26 N’ihi na ụdị nnukwu onye nchụàjà a kwesịrị anyị,+ onye na-eguzosi ike n’ihe,+ onye na-adịghị aghụghọ,+ onye a na-emerụghị emerụ,+ onye e kewapụrụ n’ebe ndị mmehie nọ,+ o wee dị elu karịa eluigwe.+