5 “Ndị nchụàjà bụ́ ụmụ Livaị ga-abịarukwa nso, n’ihi na ọ bụ ha ka Jehova bụ́ Chineke gị họọrọ ka ha na-ejere ya ozi+ nakwa ka ha jiri aha Jehova na-agọzi ndị mmadụ,+ ọ bụkwa ọnụ ha ga-ekpe ikpe esemokwu ọ bụla metụtara ime ihe ike ọ bụla.+
7 N’ihi na egbugbere ọnụ onye nchụàjà kwesịrị ichekwa ihe ọmụma, ndị mmadụ kwesịkwara ịchọ iwu n’ọnụ ya;+ n’ihi na ọ bụ onye ozi Jehova nke ụsụụ ndị agha.+