7 Ha agakwaghị na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ yiri ewu,+ bụ́ ndị ha na ha na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ,+ àjà ha. Nke a ga-abụrụ unu ụkpụrụ na-adịru mgbe a na-akaghị aka, ruo ọgbọ unu niile.”’
8 Ọ hapụghịkwa akwụna ọ malitere ịgba n’Ijipt, n’ihi na ha na ya dinara mgbe ọ bụ nwa agbọghọ, ọ bụkwa ha pịrị ya aka n’ara mgbe ọ na-amabeghị nwoke. Ha nọkwa na-awụkwasị ya mmekọahụ rụrụ arụ dị ka mmiri.+