8 Manoa wee malite ịrịọ Jehova, sị: “Biko, Jehova.+ Onye nke ezi Chineke ahụ i zitere, biko, ya bịakwute anyị ọzọ ma gwa+ anyị ihe anyị ga-eme nwa ahụ a ga-amụ.”+
9 Ezi Chineke wee gee ntị n’olu Manoa,+ mmụọ ozi nke ezi Chineke wee bịakwute nwaanyị ahụ ọzọ mgbe ọ nọ ọdụ n’ubi, ma Manoa di ya esoghị ya nọrọ n’ebe ahụ.