5 N’ihi na, lee! ị ga-atụrụ ime, ị ga-amụkwa nwa nwoke, agụba ọ bụla agaghị emetụ ya n’isi,+ n’ihi na onye Naziraịt+ nke Chineke ka nwa ahụ ga-abụ ozugbo o si n’afọ pụta;+ ọ bụkwa ya ga-ebute ụzọ n’ịzọpụta Izrel n’aka ndị Filistia.”+
31 N’ikpeazụ, ụmụnne ya na ndị ezinụlọ nna ya dum gbadatara wee bulie ya, buru ya laa wee lie ya n’agbata Zora+ na Eshtaọl,+ n’ebe ili ozu nke Manoa+ nna ya. O kpere Izrel ikpe ruo afọ iri abụọ.+
27 N’ihi ya, i nyefere ha n’aka ndị iro ha,+ bụ́ ndị nọ na-enye ha nsogbu;+ ma n’oge ha na-ata ahụhụ, ha na-etiku gị,+ gị onwe gị na-anọ n’eluigwe nụrụ;+ n’ihi ebere gị nke dị ukwuu,+ ị na-enye ha ndị nzọpụta,+ ndị na-azọpụta ha n’aka ndị iro ha.+
32 Gịnị ọzọkwa ka m ga-ekwu? N’ihi na oge ga-agwụnahụ m ma ọ bụrụ na m gaa n’ihu ịkọ banyere Gidiọn,+ Berak,+ Samsịn,+ Jefta,+ Devid+ na Samuel+ na ndị amụma ndị ọzọ,+