27 Devid wee bilie, ya na ndị ikom ya gaa gbuo+ narị ndị ikom abụọ n’etiti ndị Filistia, Devid wee chịtara eze apị́+ niile ọ sịrị ya weta, ka ya na eze wee gọọ ọgọ. Sọl wee kpọnye ya Maịkal nwa ya nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.+
13 O wee sị: “Ọ dị mma! Mụ na gị ga-agba ndụ. Naanị otu ihe ka m na-achọ n’aka gị: ‘Ị gaghị ahụ ihu m+ ọ gwụkwala ma ì bu ụzọ kpọta Maịkal,+ ada Sọl, mgbe ị ga-abịa ịhụ ihu m.’”