27 Devid wee bilie, ya na ndị ikom ya gaa gbuo+ narị ndị ikom abụọ n’etiti ndị Filistia, Devid wee chịtara eze apị́+ niile ọ sịrị ya weta, ka ya na eze wee gọọ ọgọ. Sọl wee kpọnye ya Maịkal nwa ya nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.+
11 E mesịa, Sọl zipụrụ ndị ozi+ ka ha chee ụlọ Devid nche, ka ha gbuokwa ya n’ụtụtụ;+ ma Maịkal nwunye Devid gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na i kweghị ka mkpụrụ obi gị gbapụ n’abalị a, echi ị ga-abụ onye e gburu egbu.”
29 O wee ruo na mgbe igbe ọgbụgba ndụ+ Jehova rutere n’Obodo Devid, Maịkal+ nwa Sọl si na windo leda anya wee hụ Eze Devid ka ọ na-awụligharị elu na-enwe aṅụrị;+ o wee leda ya anya+ n’obi ya.